Kụzie Kpọmkwem Ihe Bible Na-akụzi
Kụzie Kpọmkwem Ihe Bible Na-akụzi
“Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha . . . ihe.”—MATIU 28:19, 20.
1. Mmadụ ole nwere ike inweta Bible ugbu a?
OKWU JEHOVA, bụ́ Bible Nsọ, bụ otu n’ime akwụkwọ ndị kasị ochie, ndị a kasịkwa ekesa n’ụwa nile. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a sụgharịwo akụkụ ya ụfọdụ gaa n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị atọ. Ihe karịrị pasent 90 nke ndị bi n’ụwa nwere ya n’asụsụ ala ha.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka e ji nwee mgbagwoju anya banyere ihe Bible na-akụzi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?
2 Ọtụtụ nde mmadụ na-agụ akụkụ ụfọdụ nke Bible kwa ụbọchị. Ụfọdụ esila n’isi gụrụ ya ruo ebe ọ gwụrụ ọtụtụ ugboro. Ọtụtụ puku òtù okpukpe na-asị na ozizi ha dabeere na Bible, ma ihe ha na-ekwu na Bible na-akụzi dịgasị iche iche. Oké enweghị nkwekọrịta nke dị n’etiti ndị nọ n’otu okpukpe na-emezi ka mgbagwoju anya ahụ ka njọ. Ụfọdụ ndị nwere nkwenkwe ụgha banyere Bible, ebe e si nweta ya, na abamuru ya. Ọtụtụ ndị na-ele ya anya dị ka nanị akwụkwọ dị nsọ a na-eji eme ihe mgbe a na-ekwe nkwa ma ọ bụ mgbe a na-aṅụ iyi ikwu eziokwu n’ụlọikpe.
3 N’ezie, ihe dị na Bible bụ okwu, ma ọ bụ ozi, Chineke dere maka ụmụ mmadụ, bụ́ nke na-akpa ike. (Ndị Hibru 4:12) Ya mere, dị ka Ndịàmà Jehova, anyị chọrọ ka ndị mmadụ mata ihe Bible na-akụzi. Obi na-adị anyị ụtọ ịrụ ọrụ ahụ Jizọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe o kwuru, sị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha . . . ihe.” (Matiu 28:19, 20) Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-ahụ ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị ọgba aghara jupụtara n’okpukpe ndị dị n’ụwa na-ewute nke ukwuu. Ha chọrọ ịma ihe ndị bụ́ eziokwu banyere onye Onye Okike anyị bụ, ha chọkwara ịma ihe Bible kwuru banyere nzube nke ndụ. Ka anyị tụlee ajụjụ atọ na-enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi. Na nke ọ bụla, anyị ga-arịba ama ihe na-abụghị eziokwu ndị ndú okpukpe na-ekwu banyere ha, mgbe ahụzi, anyị atụlee kpọmkwem ihe Bible na-akụzi. Ajụjụ ndị ahụ bụ: (1) Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị? (2) N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? (3) Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị?
4, 5. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji eche na Chineke adịghị eche banyere anyị?
4 Ka anyị malite n’ajụjụ ahụ bụ́, Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị? Ọ bụ ihe dị mwute ịhụ na ọtụtụ mmadụ na-eche na azịza ya bụ ee e. N’ihi gịnị ka ha ji eche otú ahụ? Otu ihe mere ha ji eche otú ahụ bụ na ha bi n’ụwa nke ịkpọasị, agha, na ahụhụ jupụtara na ya. Ha na-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke na-eche banyere anyị n’ezie, ọ gaghị nnọọ ekwe ka ihe ọjọọ ndị dị otú ahụ na-eme.’
5 Ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji eche na Chineke anaghị eche banyere anyị bụ na ndị ndú okpukpe mere ka ha chee otú ahụ. Gịnị ka ndị ụkọchukwu na-ekwukarị mgbe e nwere ọdachi? Mgbe ụmụaka abụọ nke otu nwanyị nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala, ụkọchukwu ha gwara ya, sị: “Ọ bụ uche Chineke. Chineke chọrọ inwekwu ndị mmụọ ozi abụọ.” Mgbe ndị Jems 1:13) Jehova Chineke adịtụghị akpata ihe ọjọọ. N’ezie, “ya bụrụ Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu.”—Job 34:10.
ụkọchukwu kwuru ihe dị otú ahụ, ha na-ata Chineke ụta n’ezie maka ihe ọjọọ ndị na-emenụ. Ma, Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (6. Olee onye kpatara ihe ọjọọ na ahụhụ ndị dị n’ụwa a?
6 N’ihi gịnịzi ka ndị mmadụ ji ata nnọọ ahụhụ? Otu ihe kpatara ya bụ na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ anabataghị Chineke dị ka Onye Ọchịchị ha, n’ihi na ha achọghị irube isi n’iwu nakwa n’ụkpụrụ ezi omume ya. Ụmụ mmadụ na-erubere Onye Iro Chineke, bụ́ Setan, isi n’amaghị ama, n’ihi na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ịmara nke ahụ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe karị ịghọta ihe mere ihe ọjọọ ji eme. Setan bụ onye ọjọọ, ọ kpọrọ ndị mmadụ asị, dị aghụghọ, dịkwa obi ọjọọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ụwa ga-adị ka onye na-achị ya. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ihe ọjọọ ji na-eme!
7. Olee ihe ụfọdụ na-akpata ahụhụ ndị anyị na-ata?
7 Ihe ọzọ mere anyị ji ata ahụhụ bụ ezughị okè mmadụ. Ụmụ mmadụ na-eme mmehie na-achọkarị ịchị ibe ha, ọchịchọ dị otú ahụ na-akpatakarị agha, mmegbu, na ahụhụ. Eklisiastis 8:9 kwuru ya n’ụzọ dabara adaba, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” Ihe ọzọkwa mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ bụ “mgbe na ihe ndapụta.” (Eklisiastis 9:11) Ọtụtụ mgbe, ọdachi na-adakwasị ndị mmadụ n’ihi na ha nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị.
8, 9. Olee otú anyị si mara na Jehova na-eche nnọọ banyere anyị?
8 Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmata na Jehova adịghị akpata nhụjuanya. Ma, ihe ndị na-eme ná ndụ anyị ọ̀ gbasara Chineke? Azịza na-enye obi ụtọ nke ajụjụ ahụ bụ ee! Anyị maara na ihe metụtara anyị na-emetụ Jehova n’obi n’ihi na Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị ihe mere o ji kwe ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ. Ihe ndị mere Chineke ji kwere ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ metụtara ihe abụọ na-ese okwu: ọbụbụeze ya na ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye Okike pụrụ ime ihe nile, iwu ejighị ya ịgwa anyị ihe mere o ji kwere ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-agwa anyị ya n’ihi na ọ na-eche banyere anyị.
9 Tụlee ihe ọzọ na-egosi na Chineke na-eche banyere anyị. ‘O wutere ya n’obi’ mgbe ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa n’oge Noa. (Jenesis 6:5, 6) Ì chere na ihe ọjọọ ndị nke na-eme n’oge a anaghị ewutekwa ya? Ọ ga na-ewute ya, n’ihi na ọ naghị agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) Ọ kpọrọ ikpe na-ezighị ezi asị, ọ dịghịkwa amasị ya ịhụ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Bible na-akụzi na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-emezi ihe ọjọọ nile ọchịchị mmadụ na Ekwensu kpatara. Nke ahụ ọ́ naghị egosi nnọọ na Chineke na-eche banyere anyị?
10. Olee otú ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata dị Jehova n’obi?
10 Ndị ndú okpukpe na-aghagide Chineke ụgha mgbe ha na-ekwu na ọdachi ndị na-adakwasị anyị ná ndụ bụ uche ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ime ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ. Pita nke Mbụ 5:7 na-ekwu, sị: “Ọ na-eche banyere unu.” Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Bible na-akụzi!
N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Nọrọ n’Ebe A?
11. Gịnị ka okpukpe ndị dị n’ụwa na-ekwukarị banyere ndụ ụmụ mmadụ dị n’ụwa?
11 Ka anyị tụlezie ajụjụ nke abụọ na-enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi, N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? Okpukpe ndị dị n’ụwa na-azakarị ajụjụ ahụ site n’ikwu na mmadụ ga-anọ n’ụwa ruo nanị nwa oge. Ha na-ele ụwa anyị anya dị ka nanị ebe ha ga-akwụsịtụ ka ha na-eme njem aga ịdị ndụ n’ebe ọzọ. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-ezi ozizi ụgha nke bụ́ na otu ụbọchị Chineke ga-ebibi mbara ụwa a. N’ihi ozizi ndị dị otú ahụ, ọtụtụ ndị ekwubiwo na ọ ga-akara ha mma inweta ihe nile ha pụrụ inweta ná ndụ mgbe oge ka dị n’ihi na ọnwụ na-eche ha. Gịnị n’ezie ka Bible na-akụzi banyere ihe mere anyị ji nọrọ n’ụwa ebe a?
12-14. Gịnị ka Bible na-akụzi banyere nzube Chineke maka ụwa na ụmụ mmadụ?
12 Chineke nwere nzube magburu onwe ya maka ụwa na ụmụ mmadụ. “Ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere [ụwa],” kama nke ahụ, “ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ọzọkwa, Jehova “[atọwo] ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Ịmụta ihe ndị a banyere nzube Chineke maka ụwa na ụmụ mmadụ nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe mere anyị ji nọrọ n’ụwa ebe a.
13 Jenesis isi 1 na nke 2 gosiri na Jehova ji nnọọ nlezianya kee ụwa otú ọ ga-ekwe ụmụ mmadụ obibi. Mgbe Chineke kesịrị ụwa, ihe nile “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Chineke mere ka nwoke na nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, biri n’ogige Iden ahụ mara mma ma nye ha ezigbo ihe oriri n’ụba. A gwara mmadụ abụọ mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” Ha ga-amụ ụmụ zuru okè, mee ka ebe obibi ha bụ́ paradaịs gbasaruo ụwa nile ma jiri ịhụnanya chịkwaa ụmụ anụmanụ.—Jenesis 1:26-28.
14 Ọ bụ nzube Jehova ka ezinụlọ mmadụ zuru okè biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ee, e kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala. Nke ahụ bụ nzube Chineke, ọ bụkwa ya bụ kpọmkwem ihe Bible na-akụzi!
Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
15. Gịnị ka ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị e nwere n’ụwa na-akụzi banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?
15 Ugbu a, ka anyị tụlee ajụjụ nke atọ na-echegbu ọtụtụ ndị: Gịnị na-eme anyị mgbe
anyị nwụrụ? Ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị e nwere n’ụwa na-akụzi na ọ dị ihe dị n’ime mmadụ nke na-adịgide ndụ mgbe ahụ́ onye ahụ nwụsịrị. Okpukpe ụfọdụ ka na-akụzi na Chineke na-ata ndị ajọ omume ahụhụ site n’imekpa ha ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ. Ma, nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Gịnị n’ezie ka Bible na-akụzi banyere ọnwụ?16, 17. Olee ihe Bible kwuru bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?
16 Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ.” Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” ha apụghị ịnụ ihe, ịhụ ụzọ, ikwu okwu, inwe mmetụta, ma ọ bụ iche echiche. Ha anaghịzi enweta ụgwọ ọrụ. Oleekwanụ otú ha ka ga-esi na-enweta ụgwọ ọrụ? Ha apụghị ịrụ ọrụ ọ bụla! Ọzọkwa, “ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi,” n’ihi na ha apụghị igosipụta mmetụta ọ bụla.—Eklisiastis 9:5, 6, 10.
17 Ihe Bible na-ekwu n’okwu a dị mfe ma doo anya—ndị nwụrụ anwụ anaghị adị ndụ ebe ọzọ. Ọ dịghị ihe na-esi n’ahụ́ anyị apụ mgbe anyị nwụrụ ma dịgide ndụ, e wee mụgharịa ya n’ahụ́ ọzọ, dị ka ndị kweere n’ịlọ ụwa kweere. Anyị pụrụ isi otú a maa ya atụ: Ndụ anyị dị ka ire ọkụ kandụl. Mgbe a fụnyụrụ ya, ire ọkụ ya adịghị aga ebe ọ bụla. Ọ nyụrụ anyụ.
18. Mgbe onye a na-amụrụ Bible matara na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, olee ihe ndị o nwere ike ikwubi?
18 Cheedị banyere ihe eziokwu ahụ dị mfe ma dị ike ga-arụpụta. Mgbe onye a na-amụrụ Bible matara na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, o kwesịrị nnọọ ịghọta na n’agbanyeghị otú ndị nna nna ya nwụrụ anwụ si wee iwe mgbe ha dị ndụ, ha apụghị inye ya nsogbu ọ bụla. O kwesịkwara ịghọta ozugbo na ndị ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ apụghịzi ịnụ ihe, ịhụ ụzọ, ikwu okwu, inwe mmetụta, ma ọ bụ iche echiche. N’ihi ya, ha apụghị ịbụ ndị owu na-ama na pọgatrị ma ọ bụ ndị na-ata ahụhụ n’ebe a na-eji ọkụ emekpa mmadụ ahụ́. Otú ọ dị, Bible na-akụzi na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị Chineke na-echeta n’ọnwụ. Nke ahụ bụ nnọọ olileanya magburu onwe ya!—Jọn 5:28, 29.
Akwụkwọ Ọhụrụ Anyị Ga-eji Mee Ihe
19, 20. Dị ka Ndị Kraịst, olee ibu ọrụ anyị nwere, oleekwa akwụkwọ e ji amụ Bible nke a kwadebere karịsịa maka anyị iji ya na-eje ozi anyị?
19 Anyị atụlewo nanị ajụjụ atọ na-enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi. Ihe Bible na-akụzi banyere nke ọ bụla n’ime ha doro nnọọ anya. Ọ bụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ ịkọrọ ndị chọrọ ịma ihe Bible na-akụzi eziokwu ndị dị otú ahụ! Ma e nwere ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa ndị nwere obi eziokwu ga-achọ inweta azịza na-eju afọ banyere ha. Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere ibu ọrụ nke inyere ha aka ịchọta azịza nke ajụjụ ndị dị otú ahụ.
20 Ọ naghị adị mfe ịkụzi eziokwu Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị mfe ma doo anya nakwa n’ụzọ na-eru n’obi. Iji nyere anyị aka imeri nsogbu ahụ, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” kwadebere otu akwụkwọ nke anyị ga na-eji eje ozi anyị dị ka Ndị Kraịst. (Matiu 24:45-47) A na-akpọ akwụkwọ a nwere narị peeji abụọ na iri abụọ na anọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
21, 22. Olee ihe ụfọdụ dị ịrịba ama dị n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
21 Akwụkwọ a e wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” nke Ndịàmà Jehova nke afọ 2005/2006 nwere ihe ndị dị ịrịba ama. Dị ka ihe atụ, o nwere okwu mbido dị peeji ise nke na-enye nnọọ aka ugbu a n’ịmalite ọmụmụ Bible. O nwere nnọọ ike ịdịrị gị mfe iji ihe osise na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị na peeji ndị ahụ mee ihe. I nwekwara ike iji ihe e dere na peeji ndị a gosi ndị ị na-amụrụ ihe otú e si achọta isiakwụkwọ na amaokwu nke Bible.
22 E dere akwụkwọ a otú ọ ga-adị mfe ọgụgụ ma doo anya. A gbalịrị ime ka ihe akwụkwọ ahụ na-ekwu ruo n’obi onye a na-amụrụ ihe site n’ịjụ ya ajụjụ n’ebe ọ bụla o kwere mee. Isi ya nke ọ bụla nwere ajụjụ ole na ole ná mmalite ya na igbe a na-akpọ “Ihe Bible Na-akụzi” ná ngwụsị ya. Igbe ahụ na-enwe azịza ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke ajụjụ ndị ahụ a jụrụ ná mmalite nke isiakwụkwọ ahụ. Ihe osise ndị magburu onwe ha na okwu nkọwa ha nakwa ihe atụ dị iche iche e ji mee ihe n’akwụkwọ a ga-eme ka ọ dịrị onye a na-amụrụ ihe mfe ịghọta ihe ndị ọ na-amabughị. Ọ bụ ezie na e dere akụkụ bụ́ isi nke akwụkwọ ahụ otú ọ ga-adị mfe nghọta, o nwere ihe odide ntụkwasị bụ́ nke ga-enyere gị aka ịtụle isiokwu 14 dị mkpa n’ụzọ miri emi karị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka onye ị na-amụrụ ihe ghọtakwuo ihe ụfọdụ.
23. Olee arọ ndị a tụrụ banyere otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi duzie ọmụmụ Bible?
23 E dere akwụkwọ Bible Na-akụzi inyere anyị aka ịkụziri ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ na ndị nọ n’okpukpe dị iche iche ihe. Ya bụrụ na onye a na-amụrụ ihe amaghị ihe ọ bụla banyere Bible, unu pụrụ ịmụ otu isiakwụkwọ ihe karịrị otu ugboro tupu unu amụchaa ya. Unu amụla akwụkwọ ahụ ọkụ ọkụ, kama gbalịa iru n’obi onye ị na-amụrụ ihe. Ọ bụrụ na ọ ghọtaghị ihe atụ e nyere n’akwụkwọ ahụ, kọwaara ya ya ma ọ bụ jiri ihe atụ ọzọ mee ihe. Kwadoo nke ọma, mee ike gị nile iji akwụkwọ ahụ kụzie ihe n’ụzọ dị irè, kpegakwara Chineke ekpere ka o nyere gị aka ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’—2 Timoti 2:15.
Jiri Oké Ihe Ùgwù Ndị E Nyere Gị Kpọrọ Ihe
24, 25. Olee oké ihe ùgwù ndị Jehova nyeworo ndị ya?
24 Jehova enyewo ndị ya ihe ùgwù ndị magburu onwe ha. O mewo ka anyị nwee ike ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ya. Anyị ekwesịtụghị iji ihe ùgwù ahụ gwurie egwu! A sị ka e kwuwe, Jehova ezochiworo ndị dị mpako nzube ya ma kpugheere ha ndị dị umeala n’obi. Jizọs kwuru banyere nke a, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.” (Matiu 11:25) Ọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche iso ná ndị dị umeala n’obi na-ejere Onyenwe Eluigwe na Ụwa, bụ́ Jehova, ozi.
25 Chineke enyewokwa anyị ihe ùgwù nke ịkụziri ndị ọzọ banyere ya. Cheta na ndị kụziworo ihe ndị na-ezighị ezi banyere ya ghagidere ya ụgha. N’ihi ya, ihe ọtụtụ ndị kweere banyere Jehova bụ ụgha, ebe ọ bụ na ha chere na ọ naghị eche banyere ha nakwa na obi kpọrọ ya nkụ. Ị̀ dị njikere, ọ̀ na-anụkwa gị ọkụ n’obi, inye aka gwa ndị mmadụ nke bụ́ eziokwu? Ị̀ chọrọ ka ndị nwere obi eziokwu n’ebe nile mata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Chineke? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịsie ike igosi na ị na-erubere Chineke isi site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ma na-akụziri ndị mmadụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi banyere isiokwu ndị dị mkpa. Ọ dị mkpa ka ndị na-achọ eziokwu mata kpọmkwem ihe Bible na-akụzi.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee otú anyị si mara na Chineke na-eche banyere anyị?
• N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ụwa ebe a?
• Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?
• Olee ihe dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi nke kasị masị gị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 22]
Bible na-akụzi na ahụhụ ga-akwụsị
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
N’elu elu aka nri, nwatakịrị nwanyị: © Bruno Morandi/age fotostock; n’aka ekpe, nwanyị: AP Photo/Gemunu Amarasinghe; n’ala ala aka nri, ndị na-agba ọsọ ndụ: © Sven Torfinn/Panos Pictures
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị ezi omume ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs