Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwoke na Nwanyị Ọrụ Dị Ùgwù Onye nke Ọ Bụla n’Ime Ha Na-arụ

Nwoke na Nwanyị Ọrụ Dị Ùgwù Onye nke Ọ Bụla n’Ime Ha Na-arụ

Nwoke na Nwanyị Ọrụ Dị Ùgwù Onye nke Ọ Bụla n’Ime Ha Na-arụ

JEHOVA CHINEKE bu ụzọ kee Adam, ma mesịa kee Iv. Tupu e kee Iv, Adam adịla ndụ ruo oge ụfọdụ. N’oge ahụ, Jehova nyere ya ntụziaka dị iche iche. (Jenesis 2:15-20) Adam ga-abụ ọnụ na-ekwuru Chineke site n’ịgwa nwunye ya banyere ntụziaka ndị a. Nke ahụ pụtara na ọ bụ ya ga na-edu ndú n’ihe nile metụtara ofufe.

Ndokwa yiri nke ahụ dị n’ọgbakọ Ndị Kraịst, anyị pụkwara irite uru site n’ịtụle ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Enyeghị m nwanyị ikike . . . inwe ikike n’ebe nwoke nọ, kama ka ọ na-agbachi nkịtị. N’ihi na e bu ụzọ kpụọ Adam, e mesịa Iv.” (1 Timoti 2:12, 13) Nke a apụtaghị na nwanyị ga-agbachi nkịtị kpamkpam mgbe a gara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ọ ga-agbachi nkịtị n’echiche bụ́ na o kwesịghị ịrụwa nwoke ụka. Ọ gaghị eleda ozi a họpụtara nwoke ije anya ma ọ bụ na-achọ izi ihe n’ọgbakọ. E nyere ndị ikom ọrụ nlekọta na izi ihe n’ọgbakọ, ma ndị inyom na-eme nnọọ ka ọmụmụ ihe na-aga nke ọma site n’ikere òkè n’ụzọ dị iche iche.

Pọl onyeozi mere ka anyị mara ọrụ dị iche iche ndị nwoke na ndị nwanyị na-arụ ná ndokwa Chineke mgbe o dere, sị: “Nwoke esighị na nwanyị pụta, kama nwanyị siri na nwoke pụta . . . E wezụga nke ahụ, n’ihe metụtara Onyenwe anyị, e nweghị nwanyị ma nwoke anọghị ya, e nweghịkwa nwoke ma nwanyị anọghị ya [ọ dịghị onye nke ibe ya na-adịghị mkpa]. N’ihi na dị nnọọ ka nwanyị si na nwoke pụta, otú a kwa ka nwoke sitere na nwanyị; ma ihe nile na-esi na Chineke apụta.”—1 Ndị Kọrint 11:8-12.

Ụmụ Nwanyị Nwere Ezigbo Ihe Ùgwù

Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel nyere ụmụ nwanyị ọtụtụ ihe ùgwù, ha nwekwaara onwe ha ime ihe ụfọdụ n’echeghị ka a gwa ha agwa. Dị ka ihe atụ, Ilu 31:10-31 kwuru banyere “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” bụ́ onye na-azụta ezigbo àkwà ma kwaara ndị ezinụlọ ya uwe ndị mara nnọọ mma. Lee, “uwe ákwà ọcha ka nwanyị ahụ kpaworo, wee ree ya”! (Amaokwu nke 13, 21-24) “Dị ka ụgbọ onye ahịa,” ezi nwanyị a na-azụta ezigbo nri, n’agbanyeghị na o nwere ike ịga ebe ndị dị anya zụta ya. (Amaokwu nke 14) “O zuwo ìzùzù ọhịa, wee nweta ya,” ọ ‘kụwokwa ubi vaịn.’ (Amaokwu nke 16) Ebe “ihe ahịa ya dị mma,” ọ ga-enweta uru na ya. (Amaokwu nke 18) E wezụga ịdị “na-eche ojije nile nke ezinụlọ ya nche nke ọma,” nwanyị a bụ́ onye na-agba mbọ ma na-atụ egwu Jehova na-eji achọghị ọdịmma onwe onye enyere ndị ọzọ aka. (Amaokwu nke 20, na 27) Ka a sịkwa ihe mere e ji too ya!—Amaokwu nke 31.

Iwu Jehova nyere site n’aka Mozis nyere nnọọ ụmụ nwanyị ohere imeziwanye mmekọrịta ha na Chineke. Dị ka ihe atụ, na Joshua 8:35, anyị na-agụ, sị: “Ọ dịghị okwu ọ bụla n’ihe nile nke Mozis nyere n’iwu nke Jọshụa na-agụghị n’ihu mkpọkọta nile nke Izrel, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa ndị na-eje ije n’etiti ha.” Bible kwuru banyere Ezra bụ́ onye nchụàjà, sị: “[O] wee weta iwu ahụ n’ihu mkpọkọta Izrel, ma ndị ikom ma ndị inyom, ma onye ọ bụla nke na-aghọta ịnụ ihe, n’ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa. O wee gụọ n’ime ya n’ihu ámá nke dị n’ihu ọnụ ụzọ ámá mmiri site n’ìhè ụtụtụ ruo etiti ehihie, n’ihu ndị ikom na ndị inyom na ndị na-aghọta ihe; ndị ahụ nile wee ṅaa ntị akwụkwọ iwu ahụ.” (Nehemaịa 8:2, 3) Ụmụ nwanyị ritere uru n’Iwu ahụ a gụrụ. Ha sokwa mee ememe okpukpe dị iche iche. (Deuterọnọmi 12:12, 18; 16:11, 14) Nke kasị mkpa bụ na ndị inyom n’Izrel oge ochie na Jehova Chineke mekọrịtara ihe, ha nwekwara ike ikpegara ya ekpere n’otu n’otu.—1 Samuel 1:10.

Na narị afọ mbụ O.A., ndị inyom tụrụ egwu Chineke nwetara ihe ùgwù nke ijere Jizọs ozi. (Luk 8:1-3) Otu nwanyị wụsara Jizọs mmanụ n’isi na n’ụkwụ n’otu oge Jizọs na-eri nri abalị na Betani. (Matiu 26:6-13; Jọn 12:1-7) Ụmụ nwanyị so ná ndị Jizọs mere ka ha hụ ya anya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. (Matiu 28:1-10; Jọn 20:1-18) Mgbe Jizọs rịgosịrị n’eluigwe, “ụmụ nwanyị ụfọdụ na Meri nne Jizọs” so n’ime ìgwè ahụ nke ruru otu narị mmadụ na iri abụọ bụ́ ndị gbakọtara ọnụ. (Ọrụ 1:3-15) Ọ ghaghị ịbụ na ọtụtụ n’ime ụmụ nwanyị ndị a ma ọ bụ ha nile nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. mgbe a wụsara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ, ha ejirikwa asụsụ dị iche iche kwuo okwu n’ụzọ ọrụ ebube.—Ọrụ 2:1-12.

Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị socha ná ndị amụma ahụ e buru na Joel 2:28, 29 mezuru n’isi ha, bụ́ nke Pita onyeozi hotara n’ụbọchị Pentikọst ahụ, nke bụ́: “M [Jehova] ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwanyị ga-ebukwa amụma . . . Ọbụnakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke na n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwanyị ka m ga-awụkwasị mmụọ m n’ụbọchị ndị ahụ.” (Ọrụ 2:13-18) Ruo oge ụfọdụ ka Pentikọst 33 O.A. gasịrị, ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst nwere onyinye nke mmụọ nsọ. Ha sụrụ asụsụ mba ọzọ ma buo amụma, ọ bụchaghị na ha kwuru ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu kama ha kụziri eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ.

Pọl onyeozi ji ịhụnanya jaa “nwanna anyị nwanyị bụ́ Fibi” mma n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bi na Rom ma gwa ha ka ha nabata ya. O kwukwara banyere Traịfina na Traịfosa, na-akpọ ha “ụmụ nwanyị na-arụsi ọrụ ike n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 16:1, 2, 12) Ọ bụ ezie na ndị inyom a ejeghị ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ dị ka ndị nlekọta ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi, ha na ọtụtụ ndị inyom ndị ọzọ nwetara ihe ùgwù nke ịbụ ndị Chineke họọrọ dị ka ndị ha na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe.—Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Galeshia 3:28, 29.

Ndị inyom nke oge a na-atụ egwu Chineke nwere nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya! Abụ Ọma 68:11 na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị na-enye okwu: ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ bụ ụsụụ bara ụba.” E kwesịrị ịja ndị inyom dị otú ahụ mma. Dị ka ihe atụ, nkà ha na-eji ezi ihe mgbe ha na-amụrụ ndị mmadụ Bible na-eme ka ọtụtụ ndị na-anabata ezi ozizi nke na-atọ Chineke ụtọ. E kwesịkwara ito ndị inyom Ndị Kraịst lụrụ di, bụ́ ndị na-enyere ụmụ ha aka ịghọ ndị kwere ekwe ma na-akwado di ha bụ́ ndị nwere ọtụtụ ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ. (Ilu 31:10-12, 28) Ụmụ nwanyị na-alụbeghị di nwekwara ọrụ di ùgwù ná ndokwa Chineke mere, a dụkwara ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘na-arịọ ụmụ nwanyị meworo okenye arịrịọ dị ka ndị nne, ụmụ agbọghọbịa dị ka ụmụnne ndị nwanyị n’ịdị ọcha nile.’—1 Timoti 5:1, 2.

Ọrụ Dị Iche Iche Nwoke Na-arụ

Nwoke bụ́ Onye Kraịst nwere ọrụ Chineke nyere ya ịrụ, a na-atụkwa ya anya n’aka ka ọ rụọ ya. Pọl kwuru, sị: “Achọrọ m ka unu mara na isi nke nwoke ọ bụla bụ Kraịst ahụ; n’aka nke ọzọ isi nke nwanyị bụ nwoke; n’aka nke ọzọ isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Nwoke nwekwara onyeisi—ya bụ Kraịst. N’ezie, nwoke ga-aza Kraịst, nakwa Chineke ajụjụ. Chineke na-atụkwa anya ka nwoke na-eji ịhụnanya na-abụ onyeisi. (Ndị Efesọs 5:25) Nke ahụ bụ ihe Chineke na-atụ nwoke anya n’aka kemgbe o kere mmadụ.

Bible gosiri na Chineke nyere nwoke ọrụ ndị kwekọrọ n’ọnọdụ ya dị ka onyeisi. Dị ka ihe atụ, Jehova nyere nwoke ahụ bụ́ Noa ọrụ iwu ugbo iji chebe ndụ n’oge Iju Mmiri ahụ. (Jenesis 6:9-7:24) E kwekwara nwoke ahụ bụ́ Ebreham nkwa na ọ bụ site ná mkpụrụ ya ka ezinụlọ nile na mba nile nọ n’ụwa ga-agọzi onwe ha. Akụkụ bụ́ isi nke mkpụrụ ahụ bụ Kraịst Jizọs. (Jenesis 12:3; 22:18; Ndị Galeshia 3:8-16) Chineke họpụtara nwoke ahụ bụ́ Mozis iduru ndị Izrel pụọ n’Ijipt. (Ọpụpụ 3:9, 10, 12, 18) Jehova si n’aka Mozis nye iwu nke a maara dị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ma ọ bụ Iwu Mozis. (Ọpụpụ 24:1-18) Ndị nile dere Bible bụ ndị nwoke.

Dị ka Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, Jizọs “nyere onyinye n’ụdị mmadụ.” (Ndị Efesọs 1:22; 4:7-13) Mgbe Pọl na-edepụta ihe a chọrọ n’aka ndị ga-abụ ndị nlekọta, o dere ya maka ndị nwoke. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) N’ihi ya, ọ bụ ndị nwoke na-eje ozi dị ka ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. (Ndị Filipaị 1:1, 2; 1 Timoti 3:8-10, 12) Ọ bụ nanị ndị nwoke ga-abụ ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Pita 5:1-4) Ma, dị ka anyị kwurula, Chineke nyere ụmụ nwanyị ihe ùgwù ndị magburu onwe ha.

Ọrụ Ha Juru Ha Afọ

Ndị ikom na ndị inyom ịrụ ọrụ Chineke nyere ha na-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. A na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye mgbe ndị di na nwunye gbasoro ihe nlereanya nke Kraịst na ọgbakọ ya. Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya . . . Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya.” (Ndị Efesọs 5:25-33) N’ihi ya, a chọrọ ka ndị bụ́ di jiri achọghị ọdịmma onwe onye na ịhụnanya na-edu ezinụlọ ha. Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs hụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya. N’otu aka ahụ, di bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya ma na-elekọta ya.

Onye Kraịst bụ́ nwunye “kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) N’akụkụ a, ọ pụrụ iji ọgbakọ mere ihe nlereanya. Ndị Efesọs 5:21-24 na-asị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru ibe unu n’egwu Kraịst. Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ, ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a. N’eziokwu, dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst ahụ, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe ọ bụla.” Ọ bụ ezie na o nwere ike isiri nwunye ike ịnọ n’okpuru di ya mgbe ụfọdụ, ma ime otú ahụ bụ ihe “kwesịrị ekwesị n’Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18) Ọ bụrụ na nwunye na-cheta na nke a ga-amasị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ọ ga-adịrị ya mfe karị ịnọ n’okpuru di ya.

Nwunye bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ido onwe ya n’okpuru ịbụisi di ya ma ọ bụrụgodị na di ya abụghị onye kwere ekwe. Pita onyeozi kwuru, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.” (1 Pita 3:1, 2) Sera, bụ́ onye kwanyeere di ya, bụ́ Ebreham, ùgwù nwetara ihe ùgwù nke ịmụ Aịzik ma ghọọ nne ochie Jizọs Kraịst. (Ndị Hibru 11:11, 12; 1 Pita 3:5, 6) Ndị nwunye kpara ezi àgwà ka Sera ga-eji n’aka na Chineke ga-akwụghachi ha ụgwọ.

Udo na-adị mgbe nwoke na nwanyị rụrụ ọrụ Chineke nyere onye nke ọ bụla n’ime ha. Nke a na-eme ka ha nwee obi ụtọ na afọ ojuju. Ọzọkwa, onye nke ọ bụla n’ime ha ime ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ ya n’aka na-eme ka ha nwee ùgwù Chineke kere ha inwe.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Otú Ọrụ Chineke Nyere Ha Dị Ha n’Obi

Susan kwuru, sị: “Di m na-eji ịhụnanya na obiọma edu ndú. Anyị na-ekwurịtakarị ihe tupu ya emee mkpebi banyere ha, mgbe o kpebikwara ihe anyị ga-eme ma ọ bụ ihe anyị na-agaghị eme, m na-ama na ọ bụ maka abamuru anyị. Ọrụ Jehova nyere ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-eme m obi ụtọ ma na-ewusi alụmdi na nwunye anyị ike. Anyị na-akpachi anya ma na-arụkọ ọrụ ọnụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ anyị n’ofufe Chineke.”

Otu nwanyị aha ya bụ Mindy kwuru, sị: “Ọrụ Jehova nyere ndị ohu ya ndị nwanyị na-emesi anyị obi ike na ọ hụrụ anyị n’anya. Echere m na ịkwanyere di m ùgwù na ịsọpụrụ ya nakwa ịkwado ya n’ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ bụ ụzọ m ga-esi kelee Jehova maka ọrụ o nyere m.”

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Chineke nyere Noa, Ebreham, na Mozis ọrụ dị iche iche ndị kwekọrọ n’ọnọdụ Chineke nyere nwoke dị ka onyeisi

[Foto dị na peeji nke 7]

“Ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ bụ ụsụụ bara ụba”