Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ndị Ọzọ Aka Irube Isi N’ihe Ndị Bible Na-akụzi

Nyere Ndị Ọzọ Aka Irube Isi N’ihe Ndị Bible Na-akụzi

Nyere Ndị Ọzọ Aka Irube Isi N’ihe Ndị Bible Na-akụzi

“Ma ndị ahụ dị n’ezi ala, ndị a bụ ndị, mgbe ha jisịworo ezi obi nke dị mma nụrụ okwu ahụ, na-ejigide ya, na-ejikwa ntachi obi amị mkpụrụ.”—LUK 8:15.

1, 2. (a) Olee ihe mere e ji bipụta akwụkwọ ahụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? (b) Olee otú Jehova sirila gọzie mgbalị nke ndị ya n’afọ ndị na-adịbeghị anya?

“AKWỤKWỌ ahụ magburu nnọọ onwe ya. Ọ na-atọgbu ndị mụ na ha na-amụ ihe atọgbu. Ọ na-atọkwa m ụtọ. Akwụkwọ a na-eme ka o kwe omume ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Bible n’ọnụ ụzọ ha.” Nke ahụ bụ ihe otu onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova kwuru banyere akwụkwọ ahụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?  * Otu onye nkwusa Alaeze merela agadi kwukwara banyere otu akwụkwọ ahụ, sị: “Enweela m ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ mmadụ aka ịmata Jehova kemgbe afọ 50 m jewere ozi. Ma aghaghị m ikwu na akwụkwọ a bụ ọpụrụiche. Ihe atụ na ihe osise ndị na-akpali akpali dị na ya dị egwu.” Nke ahụ ọ̀ bụ ihe i chere banyere akwụkwọ Bible Na-akụzi? E dere akwụkwọ a e ji amụ Bible iji nyere gị aka irubere iwu a Jizọs nyere isi, nke bụ́: “Ya mere, gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

2 O doro anya na Jehova ga na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ na-ahụ ka ihe dị ka nde Ndịàmà isii na narị puku isii ji obi ha na-erubere iwu ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya isi. (Ilu 27:11) Jehova na-agọzi nnọọ mgbalị ha. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2005, e kwusara ozi ọma ahụ na narị ala abụọ na iri atọ na ise, ná nkezikwa, e duziiri ihe karịrị nde mmadụ isii, iri puku isii na otu na narị ise ọmụmụ Bible. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ ‘nụrụ okwu Chineke ma nakwere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.’ (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) N’ime afọ abụọ gara aga, ihe karịrị ọkara nde mmadụ emewo ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ Jehova ma rara onwe ha nye Chineke.

3. Olee ajụjụ ndị metụtara ụzọ a ga-esi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi mee ihe bụ́ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ì nweela ọṅụ nke iduziri mmadụ ọmụmụ Bible na nso nso a? Gburugburu ụwa, a ka nwere ndị nwere “ezi obi dị mma” bụ́ ndị ‘ga-ejide Okwu Chineke ma jiri ntachi obi mịa mkpụrụ’ mgbe ha nụrụ ya. (Luk 8:11-15) Ka anyị tụlee otú ị pụrụ isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi mee ihe n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Anyị ga-atụle ajụjụ atọ: (1) Olee otú i nwere ike isi malite ọmụmụ Bible? (2) Olee ụzọ ndị kasị dị irè isi zie ihe? (3) Olee otú i nwere ike isi nyere mmadụ aka ịghọ, ọ bụghị nanị onye a na-amụrụ ihe, kamakwa, onye nkụzi nke Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible?

Otú Ị Pụrụ Isi Malite Ọmụmụ Bible

4. Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-ala azụ ịmụ Bible, oleekwa otú i nwere ike isi mee ka ha kwụsị ịtụ ụjọ?

4 Ọ bụrụ na a sị gị wụfee iyi sara mbara n’azọnyeghị ụkwụ na ya, i nwere ike ịjụ. Ma ọ bụrụ na e tinyegasịrị okwute na ya bụ́ ebe ndị ị ga-azọnye ụkwụ gafere ya, i nwere ike ikwe ịgafe ya. N’otu aka ahụ, o nwere ike obi agaghị akacha onye na-anaghị enwe ohere ịmalite ịmụ Bible. Onye ahụ nwere ike iche na ịmụ ya ga-ewe oge dị ukwuu ma na-agwụ ike. Olee otú i nwere ike isi nyere ya aka ịkwụsị ịtụ ụjọ? I nwere ike iji akwụkwọ Bible Na-akụzi nyere ya aka ịmụchi Okwu Chineke anya site n’iji ya duziere ya ọmụmụ ihe ndị na-adịghị ewe oge, bụ́kwa ndị ọ ga-amụta ihe na ha. Ọ bụrụ na ị na-akwado nke ọma, nletaghachi nke ọ bụla ị gara na nke ya ga-enyekwuru ya aka ná mgbalị ọ na-eme ịghọ enyi Jehova.

5. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ị gụọ akwụkwọ Bible Na-akụzi?

5 Otú ọ dị, tupu i nwee ike iji akwụkwọ Bible Na-akụzi nyere mmadụ aka, ọ ga-adị mkpa ka ị mara ihe dị n’ime ya nke ọma. Ị̀ gụchaala akwụkwọ ahụ? Otu di na nwunye ji akwụkwọ ahụ gaa ezumike ma na-agụ ya ka ha nọ na-ezuru ike n’akụkụ osimiri. Ka otu nwanyị onye obodo ahụ nke na-eresị ndị ọbịa ihe bịarutewere ebe ha nọ, ọ hụrụ aha akwụkwọ ahụ, nke bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ gwara di na nwunye ahụ na ya kpegaara Chineke ekpere nanị awa ole na ole tupu mgbe ahụ, na-arịọ ya ka o nyere ya aka ịmata azịza nke ajụjụ ahụ. Obi tọrọ di na nwunye ahụ ụtọ inye nwanyị ahụ otu akwụkwọ ahụ. Ị̀ ‘zụpụtawo oge’ iji gụọ akwụkwọ a, ikekwe nke ugboro abụọ, ka ị na-eche mmadụ ma ọ bụ n’oge ezumike n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ? (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-amata ihe dị n’ime akwụkwọ a e ji amụ Bible nke ọma, o nwekwara ike ime ka i nweta ohere iji gwa ndị ọzọ ihe ndị dị n’ime ya.

6, 7. Olee otú i nwere ike isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malite ọmụmụ Bible?

6 Mgbe ị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ahụ n’ozi ubi, jiri ihe osise, akụkụ Akwụkwọ Nsọ, na ajụjụ ndị dị na peeji nke 4, nke 5, na nke 6 mee ihe nke ọma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịmalite mkparịta ụka site n’ịjụ, sị, “Ebe ọtụtụ nsogbu na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu taa, olee ebe i chere a ga-esi nweta nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi?” Mgbe ị tọsịrị ntị n’ala ma nụ ihe onye ahụ zara, gụọ 2 Timoti 3:16, 17, ma kọwaa na Bible na-agwa anyị ihe ga-akwụsị nnọọ nsogbu ụmụ mmadụ kpamkpam. Gwazie onye nwe ụlọ ka o lee anya na peeji nke 4 na nke 5, jụọkwa ya, sị: “N’ime ọnọdụ ndị e sere na peeji ndị a, olee nke na-echegbu gị karịsịa?” Mgbe onye nwe ụlọ gwara gị nke ọ bụ, gwa ya ka o jide akwụkwọ ahụ ka ị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ihe osise ahụ na Bible gị. Mgbe nke ahụ gasịrị, gụọ peeji nke 6 ma jụọ onye nwe ụlọ, sị, “N’ime ajụjụ isii dị n’ala ala peeji a, olee nke ọ ga-amasị gị ka a zaa?” Mgbe onye ahụ họọrọ otu, gosi ya isiokwu nke zara ajụjụ ahụ, nye ya akwụkwọ ahụ, unu ekwuokwa kpọmkwem mgbe ị ga-abịaghachi iji zaa ajụjụ ahụ.

7 Ihe ahụ e kwuru n’elu ga-ewe ihe dị ka minit ise iji kwuchaa ya. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ime minit ole na ole ahụ, ị ga-amatala ihe na-echegbu onye ahụ nwe ụlọ, gụọ ụzọ ebe abụọ n’Akwụkwọ Nsọ ma kọwaara ya ha, jụọkwa ajụjụ ị ga-aza mgbe ị bịara nletaghachi. O nwere ike ịbụ na mkparịta ụka ahụ na-egbughị oge gị na onye ahụ nwe ụlọ nwere bụ nke kasị agba ume ma na-akasi obi ya na mmadụ nwerela kemgbe ogologo oge. N’ihi ya, ọbụna onye na-anaghị enwe ohere nwere ike ịnọ na-atụ anya mgbe ọzọ gị na ya ga-anọ minit ole na ole ka ị na-enyere ya aka ịzọpụkwu ụkwụ iji banye ‘n’okporo ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ.’ (Matiu 7:14) Ka oge na-aga, ka mmasị onye nwe ụlọ na-eto, e kwesịrị ịgbatịkwu oge a na-eji amụ akwụkwọ ahụ. E nwere ike ime nke ahụ site n’unu ikpebi kpọmkwem oge ka ogologo unu ga na-eji nọrọ ọdụ mụọ ihe.

Ụzọ Izi Ihe Ndị Kasị Dị Irè

8, 9. (a) Olee otú ị pụrụ isi kwadebe onye ị na-amụrụ Bible imeri ihe isi ike na ule ndị o nwere ike inweta? (b) Olee ebe a pụrụ inweta ihe ndị ọkụ na-apụghị ịgba iji wulite okwukwe siri ike?

8 Ozugbo mmadụ malitere irubere ihe Bible na-akụzi isi, a na-enwekarị nsogbu ndị nwere ike ime ka ọ ghara inwe ọganihu. Pọl onyeozi kwuru, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Pọl ji mkpagbu ndị a tụnyere ọkụ nke ga-ebibi ihe ndị na-esighị ike e ji rụọ ụlọ ma ghara ime ihe ndị dị ka ọlaedo, ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ ahịa ihe ọ bụla. (1 Ndị Kọrint 3:10-13; 1 Pita 1:6, 7) Iji nyere onye ị na-amụrụ Bible aka ịzụlite àgwà ndị dị ya mkpa iji merie ihe isi ike ndị ga-abịara ya, ọ dị mkpa ka i nyere ya aka site n’iji ihe ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu ihe.

9 Ọbụ abụ ahụ ji “okwu ọnụ Jehova” tụnyere “ọlaọcha a nụchaworo n’ite nnụcha nke na-ehusa n’ala, nke e sichaworo ugboro asaa.” (Abụ Ọma 12:6) N’ezie, Bible nwere ihe nile dị oké ọnụ ahịa e nwere ike iji wulite okwukwe siri ike. (Abụ Ọma 19:7-11; Ilu 2:1-6) Akwụkwọ Bible Na-akụzi na-egosikwa gị otú ị pụrụ isi jiri Akwụkwọ Nsọ zie ihe n’ụzọ dị irè.

10. Olee otú ị pụrụ isi mee ka onye ị na-amụrụ ihe tinye uche ya karịsịa na Bible?

10 Mgbe unu na-amụ ihe, mee ka onye ị na-amụrụ ihe tinye uche karịsịa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’isiokwu unu na-amụ. Jiri ajụjụ nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịghọta amaokwu Bible ndị bụ́ isi na otú ọ ga-esi tinye ha n’ọrụ ná ndụ ya. Kpachara anya ka ị ghara ikpebiri ya ihe ọ ga-eme. Kama nke ahụ, ṅomie ihe nlereanya Jizọs. Mgbe otu nwoke maara Iwu Mozis nke ọma jụrụ ya ajụjụ, Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị ka e dere n’Iwu ahụ? Olee otú i si agụ?” Nwoke ahụ ji ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ zaa ya, Jizọs nyekwaara ya aka ịhụ otú o nwere ike isi tinye ụkpụrụ dị na ya n’ọrụ ná ndụ ya. Jizọs jikwa otu ihe atụ nyere nwoke ahụ aka ịhụ otú ihe ahụ Akwụkwọ Nsọ na-akụzi kwesịrị isi metụta ya. (Luk 10:25-37) Akwụkwọ Bible Na-akụzi nwere ọtụtụ ihe atụ ndị dị mfe nghọta bụ́ ndị ị pụrụ iji nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta otú ọ ga-esi tinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ.

11. Paragraf ole ka unu kwesịrị ịdị na-amụ?

11 Akwụkwọ Bible Na-akụzi ji okwu ndị dị mfe nghọta na ndị na-aga kpọmkwem n’ihe a na-ekwu kọwaa Okwu Chineke, dị nnọọ ka Jizọs ji okwu ndị dị mfe nghọta kọwaa ihe ndị miri emi. (Matiu 7:28, 29) Gbasoo ihe nlereanya Jizọs. Kụzie ihe n’ụzọ ọ ga-adị mfe nghọta, doo anya ma zie ezie. Unu amụla akwụkwọ ahụ ọkụ ọkụ. Kama nke ahụ, ka ihe ga-ekpebi paragraf ole unu ga na-amụ bụrụ ikike nghọta na ọnọdụ nke onye ị na-amụrụ ihe. Jizọs maara ihe isi ndị na-eso ụzọ ya ga-ebuli, o jikwaghị ihe ndị na-adịghị ha mkpa kọjuo ha isi.—Jọn 16:12.

12. Olee otú e kwesịrị isi jiri ihe odide ntụkwasị ahụ mee ihe?

12 Akwụkwọ Bible Na-akụzi nwere ihe odide ntụkwasị tụlere isiokwu 14. Dabere ná mkpa nke onye ị na-amụrụ ihe, gịnwa bụ́ onye nkụzi kwesịrị ịma otú unu ga-esi mụọ ihe odide ntụkwasị ahụ. Dị ka ihe atụ, ya bụrụ na otu ihe unu na-amụ esiere onye ị na-amụrụ ihe ike nghọta ma ọ bụ ya abụrụ na o nwere ajụjụ banyere ihe ụfọdụ n’ihi ihe o kwebuuru, ọ pụrụ ịbụ na nanị ihe ọ dị gị mkpa ime bụ ịgwa ya ebe a tụlere isiokwu ahụ n’ihe odide ntụkwasị ahụ ma hapụ ya ka ọ gaa gụọ ya n’onwe ya. N’ọnọdụ ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka gị na onye ị na-amụrụ ihe tụlee isiokwu ahụ. Ihe odide ntụkwasị ahụ nwere isiokwu ndị bụ́ isi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka “‘Mkpụrụ Obi’ na ‘Mmụọ’—Gịnị n’Ezie Ka Okwu Ndị A Pụtara?” na “Ịmata Ihe ‘Babilọn Ukwu ahụ’ Bụ.” I nwere ike ịchọ ka gị na onye ị na-amụrụ ihe tụlekọọ isiokwu ndị a ọnụ. Ebe ọ bụ na isiokwu ndị dị n’ihe odide ntụkwasị ahụ enweghị ajụjụ, ọ ga-adị mkpa ka ị mara ihe ndị dị na ya iji jụọ ajụjụ ndị ga-ewepụta isi ihe ndị dị na ya.

13. Olee ọrụ ekpere na-arụ n’iwusi okwukwe ike?

13 Abụ Ọma 127:1 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” N’ihi ya, ka ị na-akwado iduzi ọmụmụ Bible, kpegara Jehova ekpere ka o nyere gị aka. Ka ekpere ị na-ekpe tupu unu amalite ọmụmụ ihe na nke ị na-ekpe mgbe unu mụsịrị na-egosi na gị na Jehova nwere mmekọrịta miri emi. Gwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ na-ekpe ekpere ka Jehova nye ya amamihe ịghọta Okwu Ya na ike iji tinye ndụmọdụ ndị dị na ya n’ọrụ. (Jems 1:5) Ọ bụrụ na o na-eme otú ahụ, ọ ga-ewusi onye ahụ ị na-amụrụ ihe ike idi ihe isi ike ma nọgide na-ewusi okwukwe ya ike.

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Bible Aka Ịghọ Ndị Nkụzi

14. Olee ọganihu ọ dị mkpa ka ndị a na-amụrụ Bible nwee?

14 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị anyị na-amụrụ ihe debe “ihe nile” Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya n’iwu, ọ dị mkpa ka ha si n’ịbụ ndị a na-amụrụ Okwu Chineke ghọọ ndị na-akụzi ya akụzi. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:6-8) Olee ihe i nwere ike ime iji nyere onye ị na-amụrụ ihe aka inwe ụdị ọganihu ahụ?

15. Olee ihe mere i kwesịrị iji gbaa onye ị na-amụrụ Bible ume ịbịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst?

15 Malite n’ụbọchị mbụ gị na mmadụ mụrụ ihe kpọwa ya òkù iso gị abịa ọmụmụ ihe ọgbakọ. Kọwaara ya na ọ bụ n’ọmụmụ ihe ka a na-azụ gị ịbụ onye nkụzi nke Okwu Chineke. Ruo ọtụtụ izu, na-ewepụta minit ole na ole mgbe unu mụchara ihe iji kọwaara ya ihe ndị ị na-amụta n’ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche. Na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwu okwu banyere uru ndị ị na-erite n’ọmụmụ ihe na mgbakọ ndị a. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ozugbo onye ị na-amụrụ ihe malitere ịbịachi ọmụmụ ihe anya, o nwere nnọọ ike ịghọ onye nkụzi nke Okwu Chineke.

16, 17. Olee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ onye a na-amụrụ Bible nwere ike isetịpụ ma ruo?

16 Nyere onye ahụ ị na-amụrụ Bible aka isetịpụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ ndị ọ pụrụ iru. Dị ka ihe atụ, gbaa ya ume ka ọ na-akọrọ enyi ya ma ọ bụ onye ikwu ya ihe ndị ọ na-amụta. Tụọkwara ya aro ka o setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịgụcha Bible. Ọ bụrụ na i nyere ya aka ime ka ịgụchi Bible anya mara ya ahụ́, nke a ga-enyere ya aka ruo ogologo oge ka o mesịrị baptizim. Ọzọkwa, gịnị ma ị tụọrọ onye ahụ ị na-amụrụ ihe aro ka o setịpụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ nke icheta ya dịkarịala ala otu amaokwu Bible zara otu n’ime ajụjụ ndị bụ́ isi dị n’isiokwu nke ọ bụla nke akwụkwọ Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ọ na-eme otú ahụ, ọ ga-aghọ “onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Timoti 2:15.

17 Kama ịkụziri onye ị na-amụrụ ihe ịdị na-eburu ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwuru n’isi ma ọ bụ ịdị na-akọ isi ihe ndị dị na ha, na-agba ya ume ịkọwa otú amaokwu Bible dị iche iche si metụta ihe ndị o kweere mgbe ọ na-azaghachi ndị jụrụ ya ihe mere o ji kwere ha. Gị na ya ịmụgharịtụ ihe ọ ga-ekwu nwere ike inye aka, gị anọọrọ ya dị ka onye ikwu ma ọ bụ onye ọrụ ibe ya nke gwara ya ka ọ kọwaara ya ihe ndị o kweere. Ka onye ahụ ị na-amụrụ ihe na-azaghachi, gosi ya otú ọ ga-esi na-eji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi” na-aza ajụjụ.—1 Pita 3:15.

18. Mgbe onye ị na-amụrụ Bible ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, olee otú ị pụrụ isi nyekwuoro ya aka?

18 Ka oge na-aga, onye ahụ ị na-amụrụ ihe nwere ike iru eru ịga ozi ọma. Mee ka ọ ghọta na ikwe ka mmadụ kerewe òkè n’ọrụ a bụ ihe ùgwù. (2 Ndị Kọrint 4:1, 7) Ozugbo ndị okenye kpebiri na onye ahụ ị na-amụrụ ihe eruola ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, nyere ya aka ịkwadebe ihe dị mfe ọ ga-ekwu n’ozi ubi ma soro ya gaa. Gị na ya nọgide na-arụchi anya n’akụkụ dị iche iche nke ozi ubi, kụziekwara ya otú e si akwadebe ma mee nletaghachi dị irè. Ezi ihe nlereanya gị ga-enyere ya aka.—Luk 6:40.

‘Zọpụta Ma Onwe Gị Ma Ndị Na-ege Gị Ntị’

19, 20. Olee ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị isetịpụrụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?

19 O doro anya na ọ naghị adị mfe inyere mmadụ aka inweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enye ọṅụ dị ukwuu inyere mmadụ aka irube isi n’ihe Bible na-akụzi. (1 Ndị Tesalonaịka 2:19, 20) Ọ bụ nnọọ oké ihe ùgwù anyị ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” n’ọrụ izi ihe a zuru ụwa ọnụ!—1 Ndị Kọrint 3:9.

20 N’isi nso, Jehova ga-esi n’aka Jizọs Kraịst na ndị mmụọ ozi dị ike jụọ “ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube is n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs” ajụjụ. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8) Okwu a bụ okwu ọnwụ na ndụ. Ì nwere ike ime ya ihe mgbaru ọsọ gị iduzi ya dịkarịala ala otu ọmụmụ Bible n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ka ị na-arụ ọrụ a, ị na-enwe ohere nke ‘ịzọpụta ma onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.’ (1 Timoti 4:16) Ọ dị mkpa ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla ka anyị nyere ndị ọzọ aka irube isi n’ihe Bible na-akụzi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee ihe e bu n’obi dee akwụkwọ Bible Na-akụzi?

• Olee otú i nwere ike isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malite ọmụmụ Bible?

• Olee ụzọ ndị kasị dị irè isi zie ihe?

• Olee otú ị pụrụ isi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọ onye nkụzi nke Okwu Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ì ji akwụkwọ a na-eme ihe nke ọma?

[Foto dị na peeji nke 27]

Mkparịta ụka dị mkpirikpi nwere ike ime ka agụụ ihe ọmụma Bible gụọ mmadụ

[Foto dị na peeji nke 29]

Olee ihe i nwere ike ime iji dọrọ uche onye ị na-amụrụ ihe gaa na Bible?

[Foto dị na peeji nke 30]

Nyere onye ị na-amụrụ Bible aka inwe ọganihu