Onye Gaferela Otu Narị Afọ nke Nwere Nzube ná Ndụ
Onye Gaferela Otu Narị Afọ nke Nwere Nzube ná Ndụ
ELIN bụ otu n’ime mmadụ 60 na Sweden bụ́ ndị e depụtara aha ha na nso nso a dị ka ndị gbarala otu narị afọ na ise ma ọ bụ karịa. Ya onwe ya dị otu narị afọ na ise. Ọ bụ ezie na o bizi n’ụlọ ebe a na-elekọta ndị agadi, ahụ́ ike ya ka na-ekwe ya ije ozi dị ka Onyeàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi, bụ́ ihe ọ bụworo ruo ihe karịrị afọ 60.
A bịa n’ihe banyere ikwusara ndị ọzọ ozi ọma, Elin gbasoro ihe nlereanya Pọl onyeozi setịpụrụ mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya. Pọl ziri ndị nile bịara ileta ya ozi ọma. (Ọrụ 28:16, 30, 31) Dị ka Pọl onyeozi, Elin na-eji ohere ọ bụla dapụtaara ya agwa ndị na-ehicha ụlọ, ndị dọkịta ezé, ndị dọkịta, ndị na-edozi isi, ndị nọọsụ, na ndị ọzọ ọ hụrụ ebe ahụ okwu, na-ezi ha ozi ọma sitere na Bible. Site n’oge ruo n’oge, ụmụnna nọ n’ọgbakọ Elin na-agwadị ndị ha na-amụrụ Bible ka ha gaa leta ya ka ha wee mụta ihe n’aka ya ma nụrụ ahụmahụ ya.
Ndị ọgbakọ Elin na-enwe mmasị n’ihu ọchị ya na mmasị ọ na-enwe ịmata ihe. Otu Onyeàmà ibe ya kwuru, sị: “Ọ na-eju m anya otú o si esozu ihe nile a na-eme n’ọgbakọ. Ọ na-echeta aha ụmụaka nile na ndị nile batara ọhụrụ n’ọgbakọ anyị.” E ji ile ọbịa, ịkpa ọchị, na inwe echiche ziri ezi banyere ndụ, mara Elin.
Gịnị nyeere Elin aka ịnọgide na-enwe ọṅụ ma nọgidesie ike ná nzube o nwere ná ndụ? Ọ na-agụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị site n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Ọ na-eji ugegbe na-eme ka mkpụrụ akwụkwọ gbaa okpotokpo agụ Bible kwa ụbọchị. Elin na-akwado maka ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enwe kwa izu, ọ bụkwa ezie na ọ naghị agali ọmụmụ ihe ndị ahụ, ọ na-egere ha na rekọd. Ịgụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible mgbe nile na ịgachi ọmụmụ ihe anya, pụrụ inyere anyị aka ibi ndụ rijuru afọ na nke nwere nzube n’agbanyeghị afọ ndụ anyị.—Abụ Ọma 1:2; Ndị Hibru 10:24, 25.