Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Nanị Ndị Ọzọ Kwesịrị Ịdị Na-ekwu Eziokwu?

Ọ̀ Bụ Nanị Ndị Ọzọ Kwesịrị Ịdị Na-ekwu Eziokwu?

Ọ̀ Bụ Nanị Ndị Ọzọ Kwesịrị Ịdị Na-ekwu Eziokwu?

OTU nwa agbọghọ dị afọ iri na isii kwuru, sị: “Akpọrọ m ụgha asị, ọ dịghịkwa amasị m ma mmadụ ghaara m ụgha.” Ọtụtụ n’ime anyị na-ekwu ihe a nwa agbọghọ a kwuru. Anyị na-achọ ka ihe ọ bụla a gwara anyị, ma è kwuru ya ekwu ma è dere ya ede, bụrụ eziokwu. Ma ànyị na-ekwu eziokwu mgbe anyị na-akọrọ ndị ọzọ ihe?

N’otu nnyocha e mere na Germany, ọnụ ọgụgụ buru ibu ná ndị e ji mee nnyocha ahụ kwuru na “ọ dịghị ihe o mere ma mmadụ ghaa ụgha n’obere ihe iji chebe onwe ya ma ọ bụ iji chebe ndị ọzọ, ee, ọ dịdị mkpa mmadụ ịghatụ ụgha iji mee ka ya na ndị ọzọ nọgide na-adị ná mma.” Otu odeakụkọ dekwara, sị: “Ikwu eziokwu mgbe nile dị mma ma ọ na-eme ka ndụ ghara ịdị ụtọ.”

Ọ̀ na-amasị anyị nnọọ ka ndị ọzọ na-agwa anyị eziokwu ma ọ́ na-adị anyị mgbe ụfọdụ ka anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji ghara ikwu eziokwu? Ọ̀ dị ihe o mere ma anyị kwuru eziokwu ma ọ̀ bụ na anyị ekwughị? Olee nsogbu ikwu ihe na-abụghị eziokwu na-akpata?

Otú Ikwu Ihe Na-abụghị Eziokwu Si Emebi Ihe

Ikwu ihe na-abụghị eziokwu pụrụ imebi ihe. Ụgha na-eme ka di na nwunye nakwa ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ghara ịtụkwasị ibe ha obi. Asịrị na-abụghị eziokwu na-emebi aha ọma mmadụ. Aghụghọ ndị ọrụ na-aghọ ụlọ ọrụ ha na-eme ka ego e ji elekọta ụlọ ọrụ ha na-arị elu ma na-eme ka ihe ha na-emepụta na-adịkwu oké ọnụ. Ụgha ndị mmadụ na-agha iji zere ịtụ ụtụ isi ruuru ha na-eme ka gọọmenti ghara inweta ego ha kwesịrị inweta n’ụtụ isi iji rụọrọ ọhaneze ọrụ ndị dị ha mkpa. Ụgha ndị na-eme nchọpụta na-agha banyere ihe ndị ha chọpụtara na-emebi ọrụ aka ha ma mebie aha ụlọ ọrụ ndị a ma ama na-akwado ha. Achụmnta ego zụọ taa baa echi nke wayo juru n’ime ya na-anapụ ndị mmadụ ego nile ha nwere ná ndụ ma ọ bụ na-akpata nsogbu ndị karịrị nke ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji gwa anyị na “ire okwu ụgha” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” so n’ihe ndị Jehova Chineke kpọrọ asị.—Ilu 6:16-19.

Ọ bụrụ na ụgha agbasaa ọ pụrụ imebiri ma onye ahụ ghara ụgha ma ọha mmadụ ihe. O siri ike ịhụ onye ga-asị na nke a abụghị eziokwu. Ma, gịnịzi mere ndị mmadụ ji ama ụma ekwu ihe na-abụghị eziokwu? Ikwu ihe na-abụghị eziokwu na ịgha ụgha hà bụ otu? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a nakwa ajụjụ ndị ọzọ n’isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ụgha na-eme ka di na nwunye ghara ịtụkwasị ibe ha obi