Ọ Dị Mfe Ọgụgụ, Ma Ihe Dị n’Ime Ya Ò Ziri Ezi?
Ọ Dị Mfe Ọgụgụ, Ma Ihe Dị n’Ime Ya Ò Ziri Ezi?
NA September 2005, Chọọchị England ji obi ụtọ kwadoo mwepụta nke The 100-Minute Bible (Bible A Na-agụcha n’Otu Narị Minit). A chịkọtara akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru nke nsụgharị a ka o nwee nkebi iri na asaa n’otu peeji ma chịkọta nke Grik ka o nwee nkebi iri atọ na atọ, otú a ga-enwe ike ịgụcha Bible n’otu narị minit. Dị ka otu onye nnyocha si kwuo ya, e si otú a wepụ “ihe nile na-agwụ ike ọgụgụ na Bible.” Ọ dị mfe ọgụgụ, ma ihe dị n’ime ya ò ziri ezi?
E wezụga na e wepụrụ aha Chineke, bụ́ Jehova n’ime ya, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-ezighị ezi n’ime ya, bụ́ ndị ndị na-amụchi Bible anya ga-achọpụta. (Abụ Ọma 83:18) Dị ka ihe atụ, nkebi nke mbụ kwuru na Chineke “kere eluigwe na ụwa n’ime ụbọchị isii.” Ma nanị ihe Jenesis 1:1, kwuru bụ: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, ihe ndekọ mbụ ahụ kọwawaziri ihe ndị ọzọ e kere n’ụwa, bụ́ nke were “ụbọchị” isii, ma ọ bụ oge ụfọdụ. Jenesis 2:4 chịkọtaziri oge dum o were iji kee ihe ma na-akpọ ya ‘ụbọchị ahụ mgbe Jehova, bụ́ Chineke, mere ụwa na eluigwe.’
Dị ka The 100-Minute Bible si kwuo, “otu n’ime ndị na-ejere [Chineke] ozi, bụ́ Setan, . . . onye ọrụ ya bụ ibo ụmụ mmadụ ebubo,” kpara Job aka ọjọọ. Ị̀ hụrụ otú nke a si na-emegiderịta onwe ya? Okwu ahụ bụ́ “Setan” pụtara “Onye Nguzogide.” Kama ịbụ onye na-ejere Chineke ozi, ihe Setan bụ n’ezie bụ onyeisi ndị iro Chineke na onye ji aka ya ghọọ onye na-ebo ụmụ mmadụ ebubo.—Mkpughe 12:7-10.
Kedụkwanụ maka akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke Bible ahụ bụ́ The 100-Minute Bible? N’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu, Bible a kwuru na Jizọs ga-agọzi ndị nyeere “onye ọ bụla aka, n’agbanyeghị otú ihe ha mere dịruru ná ntakịrị,” ma ihe Jizọs kwuru n’ezie bụ na ndị ya ga-agọzi bụ ndị meere ụmụazụ ya, ya bụ́, “ụmụnna” ya ihe ọma. (Matiu 25:40) N’okwu dị nkenke e ji kọwaa akwụkwọ Mkpughe, a gwara ndị na-agụ akwụkwọ ahụ na “a ga-ebibi Rom, bụ́ Babilọn ukwu ahụ, kpamkpam.” Ma ndị na-amụ Bible maara na ọ dịghị ebe ọ bụla ihe odide ndị mbụ kwuru na ọ bụ Rom bụ “Babilọn Ukwuu ahụ.”—Mkpughe 17:15–18:24.
Nye ndị chọrọ ịmara Onye kere anyị ma ghọta nzube ya, ọ dịghị ebe ọzọ ha pụrụ ịga mee nke a karịa na Bible zuru ezu. Ọ bụ eziokwu na ịgụcha Bible zuru ezu ga-ewe ihe karịrị otu narị minit, ma ime nke ahụ na-abara onye na-agụ ya uru dị ukwuu. (Jọn 17:3) Egwu atụla gị ịnakwere ọrụ nke ịgụ Bible ma rite uru dị n’ime otú ahụ.—2 Timoti 3:16, 17.