Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị bụ ‘agha nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’ nke a ga-alụ na Ha-Magedọn, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?—Mkpughe 16:14, 16.
N’igbu ya nkenke, agha Ha-Magedọn bụ agha a ga-alụ n’ụwa nile n’ọdịnihu, bụ́ mgbe Eze Jehova họpụtara bụ́ Jizọs Kraịst ga-ebibi ndị iro Chineke. Bible na-akọwa na e ji okwu sitere “ná mkpali nke ndị mmụọ ọjọọ” na-akwali ndị iro a, bụ́ “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” ma na-achịkọta ha “gaa n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile . . .n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.”—Mkpughe 16:14, 16.
Ọ bụghị n’ebe nkịtị ka ndị ahụ na-aga ibu agha a ga-ezukọ. Okwu ahụ bụ́ Ha-Magedọn, bụ́ nke a kpọrọ “Amagedọn” na Bible ụfọdụ, pụtara “Ugwu Megido.” (Mkpughe 16:16) E nweghị ugwu ọ bụla nwe aha ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dịghị otú “ndị eze nke ụwa na usuu ndị agha ha” ga-esi zukọọ n’otu ebe nkịtị. (Mkpughe 19:19) Kama nke ahụ, “ebe ahụ” a kpọtụrụ aha na-ezo aka n’ọnọdụ nke a na-eduga ndị na-achị ụwa na ndị na-akwado ha na ya, nke bụ́ ọnọdụ nke imegide Jehova na “usuu ndị agha nọ n’eluigwe,” bụ́ ndị “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ nke ndị nwenụ,” bụ́ Jizọs Kraịst, na-edu.—Mkpughe 19:14, 16.
N’ụzọ dị ịrịba ama, okwu ahụ bụ́ “Ha-Magedọn” nwere ihe jikọrọ ya na obodo Megido nke e nwere n’Izrel oge ochie. Megido dị n’ebe dị mma n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Kamel, ọ dị n’etiti okporo ụzọ bụ́ isi e si aga ahịa na nke e si aga agha n’ógbè ahụ n’oge ochie. A nọkwa na ya buo agha ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ “n’akụkụ mmiri Megido” ka Onyeikpe Berak meriri ndị agha Kenan bụ́ aka ochie n’agha, ndị onye ndú ha bụ Ọchịagha Sisera. (Ndị Ikpe 4:12-24; 5:19, 20) Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka Onyeikpe Gidiọn nọ merie ndị Midian. (Ndị Ikpe 7:1-22) Site n’ijikọ agha ahụ na-abịanụ na Megido, Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke, site n’aka Ọkpara ya, ga-emeri ndị nile na-emegide Chineke.
Gịnị ga-esi n’agha ahụ pụta? Agha Ha-Magedọn ga-ekpochapụ nrụrụaka na ajọ omume nile n’ụwa. Ọ ga-eme ka e nwee oge kasị mma n’ụwa. (Mkpughe 21:1-4) N’Alaeze Chineke nke ịhụnanya ga-ejupụta na ya, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs ebe ndị ezi omume ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:29.