Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Emọs Ọ̀ Bụ Onye Na-ekpokọta Mkpụrụ Osisi Fig Ka Ọ̀ bụ Onye Na-arụpusị Mkpụrụ Osisi Fig?

Emọs Ọ̀ Bụ Onye Na-ekpokọta Mkpụrụ Osisi Fig Ka Ọ̀ bụ Onye Na-arụpusị Mkpụrụ Osisi Fig?

Emọs Ọ̀ Bụ Onye Na-ekpokọta Mkpụrụ Osisi Fig Ka Ọ̀ bụ Onye Na-arụpusị Mkpụrụ Osisi Fig?

NA NARỊ afọ nke itoolu T.O.A., ajọ mmadụ bụ́ Amazaịa onye na-efe nwa chi ehi nyere Emọs iwu ka ọ kwụsị ibu amụma n’Izrel. Emọs jụwapụrụ isi, ma zaa ya, sị: “Abụ m onye na-azụ anụ nakwa onye na-arụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ. Jehova wee si n’ebe m nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ kpọrọ m. Jehova wee gaa n’ihu ịsị m, ‘Gaa buoro ndị m bụ́ Izrel amụma.’” (Emọs 7:14, 15 NW) Ee, ọ bụghị Emọs mere onwe ya onye amụma kama ọ bụ Jehova họọrọ ya. Ma, gịnị ka Emọs bu n’uche mgbe o kwuru na ya bụ “onye na-arụpusị” mkpụrụ fig nke osisi sikamọ?

Okwu Hibru a e si otú a sụgharịa pụtara nanị otu ugboro a na New World Translation. Nsụgharị Bible ndị ọzọ sụgharịrị ya ịbụ “onye na-edozi,” “onye na-ebechasị,” “onye na-azụ” mkpụrụ osisi sikamọ kama ịsụgharị ya ịbụ “onye na-arụpusị” mkpụrụ osisi sikamọ. Otú ọ dị, otu akwụkwọ na-akọ banyere ihe ndị a kụrụ n’ala kwuru na ụzọ kwesịrị ekwesị isi sụgharịa ya bụ “onye na-arụpusị” mkpụrụ osisi sikamọ, n’ihi na okwu a na-ezo aka n’ihe pụrụ iche onye na-akụ mkpụrụ osisi sikamọ na-eme.

Irụpusị mkpụrụ fig bụ ihe a maara nke ọma n’Ijipt na Saịprọs kemgbe gboo. Ma taa, adịghịzi arụpusị mkpụrụ fig n’Izrel n’ihi na ha na-akụzi ụdị mkpụrụ fig ndị ọzọ. Otú ọ dị, n’oge Emọs, ndị Izrel na-arụpusị mkpụrụ osisi fig n’ihi na e si n’Ijipt weta osisi sikamọ ndị a na-akụ n’Izrel n’oge ahụ.

Eleghị anya, ihe mere e ji arụpusi mkpụrụ fig bụ ka o nwee ike ịmịta mmiri ma mee ka mkpụrụ ya bụrụ mmiri mmiri. Ọ na-emekwa ka o mepụtakwuo mmiri ọgwụ nke na-emekwu ka mkpụrụ osisi ahụ na-acha ngwa ngwa, meekwa ka mkpụrụ ya bukwuo ibu ma na-atọkwu ụtọ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụrụ na ọ chaa ngwa ngwa, ebu agaghị enwe ike imebisị ya.

N’agbanyeghị na Emọs na-arụ ọrụ e ledara anya nke bụ́ ịzụ anụ na irụpusi mkpụrụ fig, o kweghị ka ndị iro ya menye ya ụjọ. Kama ịtụ ụjọ, Emọs jiri obi ike kpọsaa ikpe Jehova megide Izrel. Nke a bụụrụ nnọọ ndị ohu Jehova taa, bụ́ ndị na-akpọsakwa ozi ndị mmadụ na-achọghị iji ntị anụ, ihe nlereanya magburu onwe ya!—Matiu 5:11, 12; 10:22.