Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta n’Aka Ụmụaka?

Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta n’Aka Ụmụaka?

Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta n’Aka Ụmụaka?

“Ị NA-EMECHA ka ụmụaka!” Obi anaghị adị anyị mma ma a gwa anyị ụdị okwu a. Ọ bụ ezie na onye ọ bụla na-enwe mmasị n’ebe ụmụaka nọ, ụmụaka etozubeghị okè, ha enwebeghị ahụmahụ na amamihe mmadụ na-enwe ka ọ na-eto.—Job 12:12.

Ka o sina dị, n’otu oge, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ezie, asị m unu, Ọ gwụla ma ùnu chigharịrị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze nke eluigwe ma ọlị.” (Matiu 18:3) Gịnị ka Jizọs bu n’uche? Olee àgwà ndị ụmụaka nwere bụ́ ndị ndị toworo eto kwesịrị iṅomi?

Ịdị Umeala n’Obi Dị Ka Ụmụaka

Tụlee ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a o kwuru. Ka Jizọs mesịrị ogologo njem rute Kapaniọm, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka ya n’okporo ụzọ?” Ndị ahụ na-eso ụzọ ihere jidere gbachiri nkịtị n’ihi na ha rụrụ ụka n’etiti onwe ha banyere onye ka ibe ya ukwuu. Ha mechara kata obi jụọ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye kasị ukwuu n’alaeze nke eluigwe?”—Mak 9:33, 34; Matiu 18:1.

O nwechara ka ọ dị na ndị a na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị ha na ya nọrọla ihe fọrọ obere ka o ruo afọ atọ, ka na-azọ ọkwá. Otú ọ dị, a zụlitere ha n’okpukpe ndị Juu, bụ́ ebe e ji ọkwá kpọrọ oké ihe. Ọ pụrụ ịbụ na ihe mere ndị ahụ na-eso ụzọ ji na-eche echiche otú a bụ n’ihi ụdị okpukpe a a nọrọ na ya zụlite ha, tinyere ezughị okè mmadụ.

Jizọs nọdụrụ ala, kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ ya, ma gwa ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ n’ebe mmadụ nile nọ na onye na-ejere mmadụ nile ozi.” (Mak 9:35) Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs kwuru riri ndị ahụ na-eso ụzọ ya ọnụ. Ọ dị nnọọ iche n’otú ndị Juu si ele ịdị ukwuu anya! Jizọs kpọketeziri otu nwatakịrị. Ọ makụrụ nwatakịrị ahụ, ma kọwazie ihe o bu n’uche site n’ikwu, sị: “N’ezie asị m unu, Ọ gwụla ma ùnu chigharịrị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze nke eluigwe ma ọlị. Ya mere, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya n’ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze nke eluigwe.”—Matiu 18:3, 4.

Nke a na-akụzi nnọọ ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere ịdị umeala n’obi! Weregodị anya nke uche gị hụ ihe na-emenụ. Ìgwè ndị dimkpa gbara otu nwatakịrị gburugburu ma wụkwasị ya anya. Ihere na-eme ya, ma dị ka ọ na-adị ụmụaka, ọ dị njikere ịtụkwasị onye ọ bụla obi. O nweghị onye ya na ya na-ese, ọ dịghịkwa onye o buuru ihe ọjọọ n’obi. Ọ na-erube nnọọ isi, ọ dịghịkwa ebuli onwe ya elu. N’ezie, nwatakịrị ahụ bụ ezigbo ihe atụ nke ụdị ịdị umeala n’obi Chineke chọrọ.

Ihe Jizọs kwuru doro anya. Anyị ga-adịrịrị umeala n’obi ka nwatakịrị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iketa Alaeze Chineke. Ekwesịghị inwe ịsọ mpi ma ọ bụ ịnya isi n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ́ nke yiri ezinụlọ. (Ndị Galeshia 5:26) N’ezie, ọ bụ àgwà ndị a mere Setan bụ́ Ekwensu ji nupụrụ Chineke isi. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kpọọ àgwà ndị a asị!—Ilu 8:13.

Ezi Ndị Kraịst na-agbalị ijere ndị ọzọ ozi, ọ bụghị igosi na ha nwere ikike. Ezigbo ịdị umeala n’obi na-akpali anyị ijere ndị ọzọ ozi n’agbanyeghị ma ozi ahụ ọ bụ nke e ledara anya, ma ọ bụkwanụ na anyị karịrị onye anyị na-ejere ya. Ije ụdị ozi a e ledara anya na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-anabata otu n’ime ụmụntakịrị dị otú a n’aha m, na-anabata m; onye ọ bụla nke na-anabatakwa m, na-anabata, ọ bụghị nanị m, kamakwa onye ahụ nke zitere m.” (Mak 9:37) Ịdị na-emesapụ aka ma na-adị umeala n’obi ka nwatakịrị, na-eme ka anyị na Onye kachasịnụ n’eluigwe na ala na Ọkpara ya dịrị ná mma. (Jọn 17:20, 21; 1 Pita 5:5) Anyị ga-enwetakwa obi ụtọ na-abịa site n’inye ihe. (Ọrụ 20:35) Anyị na-enwekwa afọ ojuju na anyị so na-eme ka udo na ịdị n’otu dịgide n’etiti ndị Chineke.—Ndị Efesọs 4:1-3.

Ndị A Pụrụ Izi Ihe na Ndị Dị Njikere Ịtụkwasị Mmadụ Obi

Mgbe Jizọs kwuchara banyere ịdị umeala n’obi, o kwuziri ihe ọzọ ụmụaka pụrụ ịkụziri ndị toworo eto, sị: “Onye ọ bụla nke na-anabataghị alaeze Chineke dị ka nwatakịrị ga-esi anabata ya agaghị aba n’ime ya ma ọlị.” (Mak 10:15) Ọ bụghị nanị na ụmụaka dị umeala n’obi, ha na-adị njikere ka ndị ọzọ kụziere ha ihe. Otu nne kwuru, sị, “Ha na-anabata ihe ọ bụla i kuziiri ha dị ka fom si amịkọrọ mmiri.”

N’ihi ya, iji keta Alaeze Chineke, anyị aghaghị ịnabata ozi Alaeze ahụ ma mee ihe ọ na-ekwu. (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-eme, anyị ‘ga-azụliterịrị agụụ maka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dịịrị okwu ahụ, ka anyị wee site na ya toruo nzọpụta.’ (1 Pita 2:2) Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na o yie ka ọ na-esiri anyị ike ịghọta ihe Bible na-akụzi? Otu onye nke ọrụ ya bụ ilekọta ụmụaka kwuru, sị: “Ụmụaka na-anọgide na-ajụ ajụjụ ruo mgbe ha nwetara azịza na-eju afọ.” Ọ ga-adị mma ma anyị ṅomie ihe nlereanya ha. Ya mere, nọgide na-amụ ihe. Gakwuru Ndị Kraịst nwerela ahụmahụ. Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. (Jems 1:5) Obi abụọ adịghị ya na ka oge na-aga, ekpere ị nọgidesiri ike na-ekpe ga-arụpụta ihe dị mma.—Matiu 7:7-11.

Ma ụfọdụ nwere ike ịdị na-eche, sị, ‘Ọ bụ na ọ́ gaghị adị mfe iduhie ndị dị njikere ka a kụziere ha ihe?’ Nke a agaghị eme ma ọ bụrụ na ha nwere nduzi a pụrụ ịdabere na ya. Dị ka ihe atụ, a dịghị agwa ụmụaka agwa ka ha gakwuru ndị mụrụ ha maka nduzi. Otu nna kwuru, sị: “Ndị nne na nna na-egosi na a pụrụ ịtụkwasị ha obi site n’ichebe ụmụ ha ma na-enye ha ihe ndị na-akpa ha kwa ụbọchị.” N’ezie, ihe a nwoke a kwuru bụ ihe ndị mere anyị kwesịrị iji tụkwasị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova obi. (Jems 1:17; 1 Jọn 4:9, 10) Jehova na-eji Okwu ya e dere ede na-eduzi anyị n’ụzọ na-enweghị ike ịghọ anyị ahịa. Mmụọ nsọ ya na nzukọ ya na-akasi anyị obi ma na-enyere anyị aka. (Matiu 24:45-47; Jọn 14:26) Anyị iji ihe ndị a Jehova nyere anyị na-eme ihe ga-eme ka ihe ọ bụla ghara imerụ anyị ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ.—Abụ Ọma 91:1-16.

Ịdị na-atụkwasị Chineke obi dị nnọọ ka ụmụaka si atụkwasị ndị mụrụ ha obi na-emekwa ka anyị nwee obi iru ala. Otu ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “Mgbe anyị bụ ụmụaka, anyị na-eme njem na-enweghị ego anyị ga-eji kwụọ ụgwọ ụgbọ, na-amaghịkwa ebe anyị ga-arịtu, ma anyị maara na ọ dịghị ihe ga-eme ka ndị mụrụ anyị ghara ikpọru anyị ebe anyị na-aga.” Ọ̀ bụ otú a ka anyị si atụkwasị Jehova obi n’ihe ndị anyị na-eme ná ndụ?—Aịsaịa 41:10

Ịtụkwasị Chineke obi kpamkpam na-enyere anyị aka ịkwụsị àgwà ndị pụrụ imebi mmekọrịta anyị na ya. Kama nke ahụ, obi na-esi anyị nnọọ ike n’okwu Jizọs bụ na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ ihe ọ bụla anyị na-eme nakwa na ọ bụrụhaala na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ na ezi omume Chineke, Chineke ga-elekọta anyị. Nke a ga-enyere anyị aka ịghara ikwe ka ịchụso ihe onwunwe gbochie anyị ijere Jehova ozi.—Matiu 6:19-34.

“Ụmụ Ọhụrụ n’Ebe Ihe Ọjọọ Dị”

Ọ bụ ezie na ụmụaka ezughị okè, ha dị ọcha n’obi. Nke a bụ ihe mere Bible ji na-agwa Ndị Kraịst, sị: “Bụrụnụ ụmụ ọhụrụ n’ebe ihe ọjọọ dị.”—1 Ndị Kọrint 14:20.

Tụlee ihe banyere Monique dị afọ ise, bụ́ onye ji obi ụtọ gwa mama ya, sị: “Ntutu isi enyi ọhụrụ m, bụ́ Sarah gbakụrụ agbakụ ka nke m!” Ọ kpọtụghị akpụkpọ ahụ́ Sarah na ebe o si aha. Otu nne kwuru, sị: “Ụmụaka adịghị ele anya n’akpụkpọ ahụ́. Ha amaghị ihe ọ bụla banyere agbụrụ na ịkpọasị.” Lee nnọọ ka ụmụaka si na-eṅomi Chineke anyị na-adịghị akpa oké, bụ́ onye hụrụ ndị si ná mba nile n’anya.—Ọrụ 10:34, 35.

Ụmụaka na-agbagharakwa ihe ọ bụla e mere ha ngwa ngwa. Otu nna kwuru, sị: “Mgbe Jack na Levi lụrụ ọgụ, anyị na-agwa ha ka ha rịọ ibe ha mgbaghara, n’oge na-adịghịkwa anya, ha na-amaliteghachi iji obi ụtọ na-egwu egwu. Ha adịghị ebu iwe n’obi ma ọ bụ weliteghachi ihe ndị gara aga ma ọ bụkwanụ na-achọ ihe a ga-emere ha tupu ha agbaghara ibe ha. Ha na-achịfu ihe nile ma maliteghachi egwuregwu ha.” Nke a bụ nnọọ àgwà magburu onwe ya ndị toworo eto kwesịrị iṅomi!—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ọ na-adịkwara ụmụaka mfe ịghọta na Chineke dị. (Ndị Hibru 11:6) Otú ha si ekwu otú ihe dị ha n’obi na-ezoghị ọnụ na-akpali ha ịgbara ndị ọzọ àmà na-atụghị egwu. (2 Ndị Eze 5:2, 3) Ekpere ha dị nkenke ma site n’obi na-emetụ ọbụna onye obi kpọrọ nkụ n’ahụ́. Mgbe a na-anwakwa ha ọnwụnwa, ha pụrụ ịkwụsị ike n’omume ọma. Ụmụaka bụ nnọọ onyinye magburu onwe ya!—Abụ Ọma 127:3, 4.

E Mee Ka Ihe Maghachi Mma

I nwere ike ịdị na-eche, sị, ‘Ọ̀ ga-ekwe omume onye toworo eto iṅomi nnọọ ọmarịcha àgwà ndị a e ji mara ụmụaka?’ Azịza dị mfe na nke na-emesighachi obi ike nke ajụjụ a bụ ee! N’ezie, iwu ahụ Jizọs nyere ka anyị “dịrị ka ụmụntakịrị” gosiri na ọ pụrụ ikwe omume.—Matiu 18:3.

Iji maa atụ: Ọ bụrụ na ihe osise dị oké ọnụ ahịa emebie, ìgwè ndị na-ese ihe nwere ike ịgbalịsi ike iseghachi ya. Ka ha na-eme nke a, ha na-ewepụsị unyi ndị kpụkọtara n’ihe osise ahụ, ma mezie ebe ndị e mebiri mgbe a na-achọ isezi ihe osise ahụ. Mgbe ha jisịrị ndidi gbalịa ike ha ma seghachi ihe osise ahụ, ọ na-abịa maghachi mma ma bụrụ anya lewe. N’otu aka ahụ, site n’ịnọgide na-etinye mgbalị, site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Jehova, na site ná nkwado nke ọgbakọ Ndị Kraịst ji ịhụnanya na-enye anyị, anyị pụrụ ịmalitekwa ịkpa ọmarịcha àgwà ndị a anyị naara akpa mgbe anyị bụ ụmụntakịrị.—Ndị Efesọs 5:1.

[Foto dị na peeji nke 9]

E ji ịdị umeala n’obi mara ụmụaka

[Foto dị na peeji nke 10]

Ụmụaka amaghị ihe bụ ịkpọasị, ha na-adịkwa ngwa ịgbaghara na ichefu mmejọ e mejọrọ ha