Gịnị Mere A Ga-eji Na-ekwu Eziokwu?
Gịnị Mere A Ga-eji Na-ekwu Eziokwu?
MGBE Manfred dị afọ iri na asatọ, ọ malitere ịnara ọzụzụ n’otú e si arụ ọrụ n’ọfịs. * Ụlọ ọrụ ọ na-arụrụ ọrụ mere ndokwa ka ya na ọtụtụ ndị ọzọ a na-enyekwa ọzụzụ jiri ụbọchị abụọ n’izu ọ bụla na-aga anara ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ na-akụzi aka ọrụ. Otu ụbọchị, ha gbasara n’oge. Iwu ụlọ ọrụ ahụ bụ na ọ bụrụ na ndị a na-enye ọzụzụ agbasaa n’oge, ha kwesịrị iji oge fọdụrụnụ laghachi n’ụlọ ọrụ ahụ gaa rụwa ọrụ. Kama ịgaghachi n’ọrụ, ha nile gawara ikpori ndụ, ewezụgakwa Manfred, bụ́ onye laghachiri n’ọrụ. Ma otú ihe si eme, onyeisi ụlọ ọrụ ahụ nke na-ahụ maka ndị ahụ a na-enye ọzụzụ gafetara ebe Manfred nọ na-arụ ọrụ. Mgbe ọ hụrụ Manfred, ọ jụrụ ya, sị: “Gịnị mere ị gaghị klas taa? Oleekwa ebe ndị ọzọ gị na ha so na-anara ọzụzụ nọ?” Gịnị ka Manfred ga-ekwu?
Nsogbu a Manfred nọ na ya abụghị ihe ọhụrụ. Ọ̀ ga-ekwu eziokwu ka ọ̀ ga-agha ụgha iji zọta isi ụmụ klas ya? Ọ bụrụ na o kwuo eziokwu, nke ahụ ga-etinye ndị ọzọ ná nsogbu ma mee ka ha lewe ya anya ọjọọ. Ma ịgha ụgha n’ọnọdụ ndị dị otú a ò kwesịrị ekwesị? Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ gị? Anyị ka ga-alọghachi n’akụkọ banyere Manfred, ma tupu anyị emee otú ahụ, ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị nọ n’ọnọdụ chọrọ ka anyị tụlee ma ànyị ga-ekwu eziokwu ma ọ bụ na anyị agaghị ekwu.
Ọgụ na Mgba Dị n’Etiti Eziokwu na Ihe Na-abụghị Eziokwu
Mgbe e kere mmadụ, a na-eme ihe nile n’eziokwu. E nweghị onye na-agbagọ eziokwu, ọ dịghịkwa onye na-ekwu ihe na-abụchaghị eziokwu ma ọ bụ na-agha ụgha. Onye Okike bụ́ Jehova, bụ “Chineke nke eziokwu.” Okwu ya bụ eziokwu; ọ pụghị ịgha ụgha, ọ katọkwara ụgha na ndị ụgha.—Abụ Ọma 31:5; Jọn 17:17; Taịtọs 1:2.
Ọ bụrụ otú ahụ, oleezi otú ndị mmadụ si malite ikwu ihe ndị na-abụghị eziokwu? Jizọs Kraịst nyere azịza ya mgbe ọ gwara ndị okpukpe na-achọ ụzọ isi gbuo ya, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ọchịchọ nke nna unu. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ obi ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa Jọn 8:44) N’ezie, Jizọs nọ na-ekwu banyere ihe ahụ mere n’ogige Iden, bụ́ mgbe Setan mere ka nwoke mbụ na nwanyị mbụ ahụ nupụrụ Chineke isi, ha e si otú a ghọọ ndị ikpe mmehie na ọnwụ mara.—Jenesis 3:1-5; Ndị Rom 5:12.
nna nke ụgha.” (Ihe a Jizọs kwuru kọwara Setan nke ọma dị ka “nna nke ụgha,” onye ụgha na ihe na-abụghị eziokwu sitere n’aka. Setan ka bụkwa onye bụ́ isi na-akwado ihe na-abụghị eziokwu, n’ezie, ọ “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” Ọ bụ ya bụ isi sekpụ ntị kpatara nsogbu nke ụgha buterela ụmụ mmadụ taa.—Mkpughe 12:9.
Ọgụ na mgba a dị n’etiti eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu, bụ́ nke Setan bụ́ Ekwensu malitere, ka na-aga nnọọ n’ihu taa. Ọ na-emetụta ọha mmadụ n’ozuzu nakwa n’otu n’otu. Otú mmadụ si ebi ndụ na-egosi ma ọ̀ na-adịnyere eziokwu ka ọ̀ bụ ihe na-abụghị eziokwu. Ndị dịnyeere Chineke na-akpa àgwà n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu nke Okwu Chineke bụ́ Bible. Onye ọ bụla na-adịghị agbaso ụzọ nke eziokwu na-akwado Setan, ma onye ahụ ọ̀ maara na ọ bụ Setan ka ọ na-akwado ma ọ bụ na ọ maghị, n’ihi na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19; Matiu 7:13, 14.
Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Achọkarị Ịgha Ụgha?
Eziokwu ahụ bụ́ na “ụwa dum” dị n’ike Setan na-eme ka anyị mata ihe mere ọtụtụ mmadụ ji agha ụgha. Ma anyị nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị mere Setan onye bụ́ “nna nke ụgha,” ji eme nke a?’ Ọ bụ n’ihi na Setan maara na Jehova bụ onye ruru eru ịchị ihe nile O kere eke, tinyere nne na nna mbụ ahụ. N’agbanyeghị na Setan maara nke a, ọ chọrọ iweghara ọkwá a dị elu bụ́ nke pụrụ iche, bụ́kwanụ nke ọ na-erughị eru inweta. N’ihi oké ọchịchọ na anyaukwu ya, o mere atụmatụ iweghara ọkwá Jehova. Iji mezuo nke a, Setan jiri ụgha na aghụghọ mee ihe.—1 Timoti 3:6.
Oleekwanụ maka taa? Ọ̀ bụ na i kweghị na anyaukwu na oké ọchịchọ ka bụ ihe ndị kasị eme ka ọtụtụ mmadụ na-agha ụgha? Ihe jupụtara n’azụmahịa ndị mmadụ na-azụ iji ritechaa ụwa nile n’uru, ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ, na okpukpe ụgha, bụ nduhie, ụgha, aghụghọ na igwu wayo. Gịnị kpatara ya? Ọ̀ bụ na ihe na-akpata ya abụghị n’ihi na ndị mmadụ na-adịkarị anyaukwu ma chọọ ịnọ n’isi ma ọ bụ nweta akụnụba, ikike ma ọ bụ chọọ ịnọ n’ọkwá na-erughịrị ha? Onye ọchịchị maara ihe bụ́ Eze Solomọn nke Izrel oge ochie, dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-anụkpọ onwe ya [onye ọ dị ngwa ngwa] ịbụ ọgaranya, agaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” (Ilu 28:20) Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile.” (1 Timoti 6:10) A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere mmadụ inwe oké ọchịchọ maka ikike ma ọ bụ ọkwá.
Ihe ọzọ na-emekwa ka ndị mmadụ na-agha ụgha bụ ụjọ—ha na-atụ ụjọ ntaramahụhụ a ga-enye ha ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nwere ike iche ma ha kwuo eziokwu. Ọchịchọ ịbụ onye ndị ọzọ hụrụ n’anya ma ọ bụ onye so biri bụ ihe anyị bu pụta ụwa. Ma ọchịchọ a nwere ike ime ka anyị ghaa ụgha, ọ sọgodị ya ya bụrụ obere, iji kpuchie ihe ọjọọ anyị mere, iji mee ka a ghara ileda anyị anya, ma ọ bụ iji mee ka ndị mmadụ na-ele anyị anya ọma. N’ụzọ dabara nnọọ adaba, Solomọn dere, sị: “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà: ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọrọ n’elu.”—Ilu 29:25.
Irubere Chineke nke Eziokwu Isi
Gịnị ka Manfred kwuru mgbe onyeisi ụlọ ọrụ ahụ jụrụ ya ihe merenụ? Manfred gwara ya eziokwu. O kwuru, sị: “Anyị gbasara n’oge taa, mụ abịaghachi ọrụ. Ọ bụghị mụ ga-azachitere ndị nke ọzọ ọnụ ha. I nwere ike ịjụ ha n’onwe gị.”
Manfred gaara eji aghụghọ zagherie onyeisi ụlọ ọrụ ahụ anya ma ọ chọọ, si otú a mee ka ndị ahụ ha na ya na-anara ọzụzụ hụ ya n’anya. Kama ime nke a, o nwere ezi ihe mere o ji kwuo
nnọọ eziokwu. Manfred bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ikwu eziokwu ya mere ka akọnuche ya nọgide na-adị ọcha. O mekwara ka onye ọ na-arụrụ ọrụ tụkwasị ya obi. E zigaziri Manfred ịga nara ọzụzụ ná ngalaba na-ahụ maka ọla ndị dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ebe a na-adịghị ekwe ka ndị a ka na-enye ọzụzụ na-arụ ọrụ, dị ka akụkụ ọzụzụ a na-enye ya. Afọ iri na ise ka e mechara, bụ́ mgbe e buliri Manfred n’ọkwá n’ụlọ ọrụ ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ ahụ kpọrọ ya na fon iji kelee ya na iji chetaghachiri ya ihe ahụ o mere.Ebe ọ bụkwanụ na Jehova bụ Chineke nke eziokwu, onye ọ bụla chọrọ iso ya na-emekọrịta ihe ‘ga-ewepụ okwu ụgha’ ma ‘na-ekwu eziokwu.’ Onye ọ bụla na-ejere Chineke ozi kwesịrị ịhụ eziokwu n’anya. Nwoke ahụ maara ihe dere, sị: “Onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi adịghị ekwu okwu ụgha.” Ma, gịnị bụ ụgha?—Ndị Efesọs 4:25; Ilu 14:5.
Gịnị Bụ Ụgha?
Ịgha ụgha bụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu, ma ọ bụghị ihe nile na-abụghị eziokwu mmadụ kwuru bụ ịgha ụgha. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara ụgha dị ka “mmadụ ikwu ihe ọ maara ma ọ bụ kwere na ọ bụghị eziokwu iji duhie ndị ọzọ.” Ee, ịgha ụgha gụnyere ibu n’obi iduhie mmadụ. N’ihi ya, ikwu ihe na-abụghị eziokwu n’amaghị ama—dị ka ịgwa mmadụ ihe na-abụchaghị otú ihe si mee n’amaghị ama—na ịgha ụgha abụghị otu ihe.
Ọzọkwa, anyị kwesịrị ịmara ma onye ahụ na-ajụ ajụjụ ó kwesịrị ka a kọchaara ya ihe nile. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na onyeisi nke ụlọ ọrụ ọzọ jụrụ Manfred otu ajụjụ ahụ. Iwu ò ji Manfred ịgwa ya ihe nile? Mba. Ebe ọ na-adịghị mkpa na onyeisi ahụ ga-ama banyere ya, iwu ejighị Manfred ịkọrọ ya. N’eziokwu, ọbụna n’ọnọdụ a, ọ garaghị adị mma ma Manfred tụọ asị.
Olee ihe nlereanya Jizọs Kraịst setịpụrụ n’ọnọdụ a? Ọ dị otu oge Jizọs nọ na-agwa ụfọdụ ndị na-abụghị ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị chọrọ ịma otú ọ ga-esi eme njem, okwu. Ha tụụrụ ya aro, sị: “Si n’ebe a gafere ma banye na Judia.” Gịnị ka Jizọs zara ha? Ọ zara ha, sị: “Gbagowanụ maka ememe ahụ [na Jeruselem]; agbagowabeghi m maka ememe a, n’ihi na oge m a kara aka eruchabeghị.” Obere oge ka ọ gwasịrị ha nke a, Jizọs gawara Jeruselem maka ememe ahụ. Gịnị mere o ji zaa ha otú a? Ha ekwesịghị ịmacha kpọmkwem ihe nile banyere ebe ọ na-aga na ebe ọ na-anaghị aga. Ya mere, ọ bụ ezie na Jizọs ekwughị ihe na-abụghị eziokwu, o nyere ha azịza na-ezughị ezu iji belata mmerụ ahụ́ ha pụrụ ịkpatara ya ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya. Jizọs aghaghị ụgha n’ihi na Pita onyeozi dere banyere Kraịst, sị: “Ọ dịghị mmehie o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.”—Jọn 7:1-13; 1 Pita 2:22.
Oleekwanụ maka Pita? Pita ọ̀ ghaghị ụgha ma gọọ na ya amaghị Jizọs ugboro atọ n’abalị ahụ e jidere Jizọs? Ee, Pita tụrụ egwu mmadụ Matiu 26:69-75; Ọrụ 4:18-20; 5:27-32; Jems 3:2.
ma ghaa ụgha. Ma n’otu mgbe ahụ, ọ ‘kwara ákwá n’ụzọ dị ilu’ ma chegharịa, a gbagharakwa ya mmehie ya. Ọ mụtakwara ihe site n’ihe ahụ o mere. Ka ụbọchị ụfọdụ gasịrị, ọ kọrọ akụkọ banyere Jizọs n’ihu ọha ma jụwapụ isi ịkwụsị ikwu ihe ọ na-ekwu mgbe ndị ọchịchị ndị Juu yiri ya egwu na Jeruselem. N’eziokwu, ihe a mere Pita ruo nwa oge na otú o si nwetaghachi onwe ya ngwa ngwa kwesịrị ịgba anyị nile ume, bụ́ ndị ezughị okè nwere ike ime ka ha sụọ ngọngọ n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume mgbe ụfọdụ.—Eziokwu Ga-adịgide Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Ilu 12:19 kwuru, sị: “Egbugbere ọnụ eziokwu ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi: ma nanị ruo otu ntabi anya ka ire okwu ụgha dị.” Ee, eziokwu anaghị anwụ anwụ. Mgbe ndị mmadụ na-ekwu eziokwu ma na-eme ihe n’eziokwu, mmekọrịta ha na ibe ha na-esikwu ike, ha na-enwekwukwa afọ ojuju. N’ezie, ikwu eziokwu nwere ụgwọ ọrụ ndị na-esochi ya. Ha gụnyere akọnuche dị ọcha, ezi aha, na mmekọrịta siri ike n’etiti di na nwunye, n’ime ezinụlọ, n’etiti ndị enyi, ọbụna na-achụmnta ego.
N’aka nke ọzọ, a na-agbakarị ụgha na-anwụ ka oge na-aga. Onye na-ekwu okwu ụgha nwere ike iduhie ndị ọzọ ruo nwa oge, ma ihe na-abụghị eziokwu adịghị adịte aka. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova, onye bụ́ Chineke nke eziokwu, edotela oge ọ ga-akwụsị ihe na-abụghị eziokwu ma bibie ndị nile na-akwado ụgha. Bible kwere nkwa na Jehova ga-ewepụsị ihe nile nna nke ụgha, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, onye na-eduhie elu ụwa dum, mebiri. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-akwụsị ụgha nile, ma gbusịa ndị ụgha.—Mkpughe 21:8.
Anyị ga-enwere nnọọ onwe anyị mgbe “egbugbere ọnụ eziokwu” ga-emecha n’ikpeazụ guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Ọ bụ anyaukwu na oké ọchịchọ na-eme ka ndị mmadụ na-agha ụgha
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ịgha ụgha bụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu, ma ọ bụghị ihe nile na-abụghị eziokwu mmadụ kwuru bụ ịgha ụgha.
[Foto dị na peeji nke 6]
Gịnị ka anyị na-amụta site ná ngọnahụ Pita gọnahụrụ Kraịst?
[Foto dị na peeji nke 7]
Ikwu eziokwu na-eme ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya sikwuo ike, na-emekwa ka ha nwekwuo afọ ojuju