Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ji Atọ m Ụtọ

Ihe Mere Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ji Atọ m Ụtọ

Akụkọ Ndụ

Ihe Mere Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ji Atọ m Ụtọ

Dị ka Pamela Moseley si kọọ

Agha kpụ ọkụ n’ọnụ nọ na-aga n’ihu n’England na 1941 mgbe mama m kpọọrọ m gaa mgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere na Leicester. Anyị gere okwu ihu ọha pụrụ iche Joseph Rutherford kwuru banyere ụmụaka. Mgbe e mere mụ na mama m baptizim ná mgbakọ ahụ, achọpụtara m na obi dị nnọọ ndị nyeere anyị aka inwe ọganihu ruo n’ịbụ ndị e mere baptizim ụtọ. N’oge ahụ, aghọtachaghị m ọṅụ a na-enweta site n’inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

ỌGANIHU anyị nwere iji ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere na 1940. Aka m na-echeta ụbọchị ahụ na-emenye ụjọ na September 1939, bụ́ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Ahụrụ m ka mama m ji nnọọ anya mmiri na-ajụ, sị: “Gịnị mere ụwa enweghị ike ịnọtụ n’udo?” Papa m na mama m gachara ozi agha n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ ma jiri anya ha hụ ebelebe gburu n’agha ahụ. Mama m jụrụ onye ụkọchukwu nke chọọchị Anglịkan dị na Bristol ajụjụ ahụ bụ́, “Gịnị mere ụwa enweghị ike ịnọtụ n’udo?” Ma nanị ihe ụkọchukwu ahụ zara ya bụ: “A nọwo na-alụ agha kemgbe ụwa, a ga-anọgidekwa na-alụ ya.”

Otú ọ dị, obere oge ka e mechara, otu nwanyị katarala ahụ́ bịara na nke anyị. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mama m jụrụ ya otu ajụjụ ahụ bụ́: “Gịnị mere ụwa enweghị ike ịnọtụ n’udo?” Onyeàmà ahụ kọwaara ya na agha so n’ihe e ji amata na anyị bi ná ngwụsị nke usoro ihe a ime ihe ike jupụtara na ya. (Matiu 24:3-14) O teghị aka, nwa nwanyị ahụ nke nwanyị amalite mụwara anyị Bible. Ha abụọ so ná ndị ahụ ji ọṅụ kirie ka a na-eme anyị baptizim. Ma, gịnị mere inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ji eme nnọọ ndị mmadụ obi ụtọ? E mechara m chọpụta ihe kpatara ya. Ngwa ka m kọọrọ gị ụfọdụ n’ime ihe ndị m mụtarala kemgbe ihe karịrị iri afọ isii na ise m nọworo na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Ịchọpụta Ọṅụ A Na-enweta Site n’Ịkụziri Ndị Mmadụ Ihe

Amalitere m iso na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na Bristol mgbe m dị afọ iri na otu. Otu nwanna nwoke nyere m teepu e tinyere okwu ndị sitere na Bible na kaadị ịgba àmà ma gwa m, sị: “Ugbu a gaa gbaara ndị nọ n’akụkụ okporo ámá nke ọzọ a àmà.” Ozugbo ahụ, agawara m nanị m. N’ezie, ụjọ jidere m. A kpọnyeere m ndị nwe ụlọ okwu ndị sitere na Bible ma gosi ha kaadị ịgba àmà ahụ, bụ́ nke e ji agwa ndị mmadụ ka ha nara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.

N’afọ ndị sochirinụ, e kwusiweziri okwu ike na ọ dị mkpa ka anyị na-agụpụtara ndị nwe ụlọ ihe dị na Bible mgbe anyị bịara ozi ọma n’ụlọ ha. Ná mmalite, o siiri m ike ịgwa ndị m na-amaghị okwu na ịkọwara ndị mmadụ Bible n’ihi na abụ m onye ihere. Ma obi mechara kaa m. Ọ bụ mgbe ahụ obi kara m ka ije ozi ọma malitere ịtọ m ụtọ. Ụfọdụ ndị na-elebu anyị anya dị ka ndị na-ere nanị akwụkwọ, ma mgbe anyị gụụrụ ha Bible ma kọwaa ya, ha bịaziri mara anyị dị ka ndị na-akụzi Okwu Chineke. Ịgụ Bible na ịkọwa ya tọrọ m nnọọ ụtọ nke na m bịara chọọ ikerekwu òkè n’ozi. Ya mere na September 1955, amalitere m ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ.

Ịtachi Obi Na-eweta Ụgwọ Ọrụ

Otu n’ime ihe ndị m buru ụzọ mụta bụ na ịtachi obi pụrụ iweta ụgwọ ọrụ. E nwere mgbe m nyere otu nwanyị aha ya bụ, Violet Morice magazin Ụlọ Nche. Mgbe m gaghachiri ịhụ ya, o meghere nnọọ ụzọ ya, gbakụọ aka ya ma ṅaa nnọọ ntị ka m na-akọwara ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. O yiri ka ọ na-enwekarị nnọọ mmasị mgbe ọ bụla m bịara. Ma, mgbe m gwara ya ka m mụwara ya Bible, ọ jụrụ ma kwuo na ya ga-amụ Bible mgbe ụmụ ya toro. Nke a wutere m nnọọ! Bible kwuru na e nwere “mgbe ịchọ achọ, na mgbe ime ka ihe laa n’iyi.” (Eklisiastis 3:6) Ekpebiri m ịnọgide na-aga na nke ya.

Ka otu ọnwa gasịrị, agaghachiri m ná nke Violet ma soro ya tụlekwuo akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịnọ n’ọnụ ụzọ ya na-amụrụ ya Bible n’izu ọ bụla. Otu mgbe o kwuru, sị: “Ọ̀ gaghị a ka mma ma ị bata n’ime ụlọ?” Violet mesịrị ghọọ onye kwere ekwe ibe m na ezigbo enyi m. E mere Violet baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Otu ụbọchị, ọ tụrụ Violet n’anya mgbe ọ nụrụ na di ya e reela ụlọ ha n’ebughị ụzọ mee ka ọ mara, ma gbahapụ ya. Ma, ọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ na n’ehihie ahụ ihe a mere, otu Onyeàmà chọtaara ya ụlọ ọzọ. Iji gosi na obi dị ya ụtọ n’ihe a Jehova meere ya, Violet kpebiri na ya ga-eji afọ ndụ ya fọdụrụnụ jee ozi dị ka onye ọsụ ụzọ. Mgbe m hụrụ otú mmụọ nsọ Jehova si mee ka ọ na-anụ nnọọ ọkụ n’obi maka ezi ofufe, aghọtara m ihe mere inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ji eweta obi ụtọ. Aga m arụ ọrụ a ná ndụ m nile.

Na 1957, a gwara mụ na Mary Robinson ka anyị gaa sụọ ụzọ na Rutherglen bụ́ ebe a na-emepụta ngwá ahịa na Glasgow, Scotland. Anyị jere ozi ọma mgbe mmiri na-abụsịsị, n’oge ifufe na-efe, n’oge mmiri ozuzo na snow, ma mgbalị nile a anyị mere n’ihi ozi ọma ahụ efughị ọhịa. Otu ụbọchị, ezutere m Jessie. Ọ na-amasị m nnọọ ịmụrụ ya Bible. Na mmalite, di ya bụ́ Wally, bụ́ onye ọchịchị Kọmunist, achọghị iji anya ahụ m. Ma, o nwere nnọọ obi ụtọ mgbe ọ mụwara Bible ma chọpụta na ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-ewetara ụmụ mmadụ ọnọdụ ka mma. Ka oge na-aga, ha abụọ sooro na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Otú Ndị Mmadụ Si Meghachi Omume ná Mbụ Pụrụ Imegharị Anya

Ebe ọzọ e zigara anyị bụ Paisley, bụ́ nke dị na Scotland. Otu ụbọchị ka m nọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ, otu nwa agbọghọ kwachiri ụzọ ya mgbe ọ hụrụ m. Ma o mechara na-achọgharị m iji rịọ m mgbaghara. Ọ gwara m mgbe m laghachiri n’izu ọzọ, sị: “Ọ dị m nnọọ ka m hụrụ Chineke kwachie ụzọ. Ọ bụ ya mere m ji sị na m ga-agarịrị chọọ gị.” Aha nwa agbọghọ a bụ Pearl. Ọ gwara m na ya rịọrọ Chineke ka o nye ya ezigbo enyi n’ihi na ndị enyi ya na ndị ikwu ya emewaala ya obi. O kwukwara, sị: “Mgbe ahụzi ị bịara n’ụlọ m. Ọ bụ ugbu a ka m bịara ghọta na ọ ga-abụ gị bụ ezigbo enyi ahụ m rịọrọ maka ya.”

Ịbụ enyi Pearl adịghị mfe. Ụlọ ya dị n’otu elu ugwu siri ike ọrịrị, bụ́ nke m na-eji ụkwụ arị. Ọ fọrọ obere ka ifufe na mmiri butuo m mgbe m gara n’ụlọ ya ka mụ na ya soro gaa ọmụmụ ihe mbụ ya. Atụfuru m nchemmiri m mgbe ọ ghakasịrị. Ka nanị ọnwa isii Pearl kwachisiri ụzọ ya mgbe ọ hụrụ m gasịrị, e mere ya baptizim iji gosi na ọ rarawo onwe ya nye Chineke.

N’oge na-adịghị anya ka Pearl mechara baptizim, di ya kpebiri ka a mụwara ya Bible, obere oge ka anyị mụwara Bible, o so m gaa ozi ụlọ n’ụlọ. Mmiri nọ na-ezo dị ka ọ na-ezokarị. Ma ọ gwara m, sị: “Enyela onwe gị nsogbu banyere m. Ana m eguzo na mmiri ruo ọtụtụ awa ma m gaa ikiri ndị na-agba bọl, apụkwara m iguzo ná mmiri maka Jehova.” Ụdị obi ndị Scotland nwere na-amasị m.

Ọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ mgbe m laghachiri Scotland ka ọtụtụ iri afọ gasịrị ma hụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị m mụụrụ Bible ka nọgidere n’ozi Jehova. Nke a bụ ọṅụ a na-enweta site n’inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (1 Ndị Tesalonaịka 2:17-20) Na 1966, ka m jisiri afọ asatọ jee ozi ọsụ ụzọ na Scotland, a kpọrọ m oku ịga Watchtower Bible School of Gilead iji nara ọzụzụ dị ka onye ozi ala ọzọ.

Ije Ozi ná Mba Ọzọ

E zigara m na Santa Cruz nke bụ́ obodo na-enwekarị okpomọkụ dị na Bolivia, bụ́ ebe enwere otu ọgbakọ mmadụ iri ise mejupụtara. Obodo ahụ na-echetara m obodo Wild West nke a na-ahụ na fim ndị America. Ka m na-echetaghachi oge ndị gara aga, ọ na-adị m ka ozi ala ọzọ nke m adịghị ka nke ibe m. Ọ dịtụbeghị mgbe agụ iyi tara m, ìgwè na-eme ihe ike ezutetụbeghịkwa m, ọ dịbeghịkwa mgbe m furu n’ime oké ọhịa ma ọ bụ ụgbọ m e kpuo n’oké osimiri. Ma, inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs a nọwo na-atọkwu m ụtọ.

Antonia so n’otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị mbụ m mụụrụ Bible na Santa Cruz. Iji Spanish akụziri ndị mmadụ Bible bụụrụ m ọgụ na mgba. Ọ dị otu oge nwa Antonia jụrụ ya, sị: “Mama, ihe mere o ji na-akpọhie okwu ọ̀ bụ iji mee ka anyị na-achị ọchị?” Antonia na nwa ya nwanyị bụ́ Yolanda mechara ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Yolanda nwere otu enyi na-agụ akwụkwọ iji bụrụ ọkàiwu onye utu aha ya bụ Dito, bụ́ onye malitekwarala ịmụ Bible na ịbịa ọmụmụ ihe anyị. Ọ dị ihe m mụtara n’aka Dito banyere ịkụzi eziokwu Bible: Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ chọrọ ka e nutụ ha aka.

Mgbe Dito kwụsịrị ịmụchi ihe anya, a gwara m ya, sị: “Dito Jehova adịghị amanye gị ijere ya ozi. Ọ bụ gị ga-ahọrọ n’onwe gị.” Mgbe o kwuru na ya chọrọ ife Chineke, agwara m ya, sị: “I nwere ọtụtụ foto nke onye ndú nke ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru. Ọ bụrụ na mmadụ abịa n’ụlọ gị ma hụ foto ndị a, ọ̀ ga-ekweta na ị họrọwo ịkwado Alaeze Chineke?” Nke a bụ ihe ọ chọrọ iji teta n’ụra.

Nanị izu abụọ ka m gwasịrị ya okwu a, nsogbu tiwapụrụ. Ụmụ akwụkwọ mahadum na ndị uwe ojii malitere ịkwarịta mgbọ. Dito gwara otu enyi ya, sị: “Ngwa ka anyị pụọ ebe a!” Ka enyi ya bu égbè ma gbara ọsọ na-agbago n’elu ụlọ nke ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ, ọ zara Dito, sị: “Mba! Nke a bụ oké ụbọchị anyị nọ na-atụ anya ya kemgbe.” O so n’otu n’ime ndị enyi Dito asatọ nwụrụ n’ụbọchị ahụ. Chetụkwala ụdị ọṅụ m nwere ịhụ nwoke a bụ́ Dito, bụ́ onye gaara anwụ ma a sị na o kpebibeghị ịghọ ezi Onye Kraịst?

Ịhụ Ebe Mmụọ Jehova Nọ n’Ọrụ

Otu ụbọchị ka m na-agafe otu ọnụ ụlọ n’ihi na echere m na anyị eziela ozi ọma n’ụlọ ahụ, otu nwa agbọghọ kpọrọ m òkù. Aha ya bụ́ Ignacia. Ọ maara Ndịàmà Jehova nke ọma, ma ọ kwụsịrị ịmụ ihe n’ihi mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ o nwetara site n’aka di ya bụ́ Adalberto, onye bụ́ onye uwe ojii nke gbara nnọọ agba. Ọtụtụ ozizi ndị bụ́ isi na Bible gbagwojuru Ignacia anya, n’ihi ya amalitere m ịmụrụ ya Bible. Ọ bụ ezie na Adalberto gbalisiri ike ịkwụsị ọmụmụ Bible ahụ, mụ na ya kwurịtara okwu n’isiokwu ndị ọzọ ọtụtụ ugboro. Otú a ka mụ na ya si dịwa ná mma.

Chetụkwala ụdị ọṅụ m nwere mgbe m hụrụ ka Ignacia ghọrọ onye nkwusa na-eme nke ọma n’ọgbakọ, na-enyere ọtụtụ ndị chọrọ ka a kasie ha obi n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ nkịtị aka. Ka oge na-aga, di ya na ụmụ ya atọ ghọrọ Ndịàmà. N’ezie, mgbe Adalberto mechara ghọta ihe ozi ọma ahụ pụtara, ọ laghachiri n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ma jiri ịnụ ọkụ n’obi zie ha ozi ọma, nke a kpaliri ndị uwe ojii ahụ isite n’aka ya tụọ ọda ka a na-ewetere ha Ụlọ Nche na Teta! ruru narị abụọ.

Jehova Na-eme Ka O Too

Ka m jesịrị ozi na Santa Cruz ruo afọ isii, e zigara m La Paz, nke bụ́ obodo a kasị mara amara na Bolivia, bụ́ ebe m jiri afọ iri abụọ na ise ọzọ jee ozi. Ná mmalite afọ ndị 1970, e nwere nanị mmadụ iri na abụọ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na La Paz. Ka ọrụ nkwusa ahụ na-agakwu n’ihu, ọ bịara dị mkpa na a ga-ewukwu ihe owuwu ndị bukwuru ibu. E wuru alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’obodo Santa Cruz nke bụ́ obodo ndị mmadụ na-ebijupụta na ya n’ike n’ike. A kwafere n’alaka ụlọ ọrụ ahụ a rụrụ na Santa Cruz na 1998, ma kpọọ m ka m sonye n’otu n’ime ihe karịrị mmadụ iri ise na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ugbu a.

E sila n’otu ọgbakọ ahụ e nweere na Santa Cruz na 1966, kewapụta ihe karịrị ọgbakọ iri ise. Narị Ndịàmà isii na iri anọ e nwere na Bolivia nile n’oge ahụ, fọrọ obere ka ha ruo puku iri na asatọ taa!

Obi dị m ụtọ na ozi m jere na Bolivia rụpụtara ihe dị mma. Otú ọ dị, ikwesị ntụkwasị obi nke Ndị Kraịst gburugburu ụwa, na-agbakarị m ume. Anyị nile na-enwe ọṅụ ka anyị na-ahụ ka Jehova na-agọzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. N’ezie, ikere òkè n’ọrụ nke inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-enye nnọọ ọṅụ.—Matiu 28:19, 20.

[Foto dị na peeji nke 13]

Mgbe m na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na Scotland

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Mgbe m na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Bolivia; (n’ime) mụ na ndị ọzọ na-agụsị akwụkwọ na klas nke iri anọ na abụọ nke Gilead