Jehova Bụ Chineke Nwere Ekele
Jehova Bụ Chineke Nwere Ekele
“Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—NDỊ HIBRU 6:10.
1. Olee otú Jehova si gosi ekele o nwere maka ihe nwanyị Moab bụ́ Rut mere?
JEHOVA na-enwe nnọọ ekele maka mgbalị ndị ji ezi obi na-achọ ime uche ya na-eme, ọ na-akwụghachikwa ha ụgwọ n’ụba. (Ndị Hibru 11:6) Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Boaz maara àgwà Chineke a magburu onwe ya nke ọma nke mere o ji gwa nwanyị Moab bụ́ Rut, bụ́ onye ji ịhụnanya lekọta nne di ya bụ́ nwanyị di ya nwụrụ, sị: “Jehova kwụghachi gị ọrụ gị, ka ụgwọ ọrụ gị zuokwa ezuo site n’aka Jehova.” (Rut 2:12) Chineke ọ̀ gọziri Rut? À na-ajụkwa ajụ! E dekọrọnụ ihe banyere ya n’ime Bible! Tụkwasị na nke ahụ, ọ lụrụ Boaz ma ghọọ nne ochie nke ma Eze Devid ma Jizọs Kraịst. (Rut 4:13, 17; Matiu 1:5, 6, 16) Nke a bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe atụ ndị e dekọrọ na Bible bụ́ ndị na-egosi na Jehova na-enwe ekele maka mgbalị ndị ohu ya na-eme.
2, 3. (a) Gịnị mere ka obi ekele Jehova na-enwe maka mgbalị anyị dịrị ịrịba ama? (b) Olee ihe mere Jehova ji egosi ezigbo ekele maka mgbalị anyị? Nye ihe atụ.
2 Jehova ga-ele ya anya dị ka ajọ omume ịghara igosi ekele maka mgbalị anyị na-eme. Ndị Hibru 6:10 na-ekwu, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.” Ihe mere ka okwu a dịrị ịrịba ama bụ na Chineke na-egosi ekele maka mgbalị nke ndị raara onwe ha nye ya na-eme n’agbanyeghị na ha bụ ndị mmehie, ha erughịkwa ebube ya.—Ndị Rom 3:23.
3 N’ihi ezughị okè anyị, anyị pụrụ iche na ihe ndị anyị na-eme iji gosi na anyị na-atụ egwu Chineke pere mpe, n’ihi ya kwa, na anyị erughị inweta ngọzi Chineke. Ma, Jehova na-aghọta ebumnobi na ọnọdụ anyị nke ọma, o jikwa ozi anyị ji obi anyị nile na-eje kpọrọ ihe n’ezie. (Matiu 22:37) Iji maa atụ: Were ya na otu nne hụrụ otu onyinye—ihe olu dị ọnụ ala—na tebụl ya. Ọ pụrụ ile onyinye ahụ anya dị ka ihe na-abachaghị uru ma tụfuo ya. Ma kaadị ya na onyinye ahụ so gosiri na ọ bụ obere nwa ya nwanyị ji ego nile o dokọtara zụtara ya ihe olu ahụ. Nne ahụ na-abịazi lee onyinye ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ikekwe ọ ga-ejizi anya mmiri makụọ nwa ya nwanyị ahụ ma kelee ya nke ukwuu maka ihe o mere.
4, 5. Olee otú Jizọs si ṅomie Jehova n’igosipụta ekele?
4 Jehova na-enwe ekele mgbe anyị nyere ya ihe kasị mma anyị nwere ma ọ̀ dị obere ma ò buru ibu, n’ihi na ọ maara ihe anyị bu n’obi nye ihe ahụ marakwa ihe anyị ga-emeli. Jizọs ṅomiri nnọọ Nna ya n’akụkụ a. Cheta akụkọ Luk 21:1-4.
ahụ e dekọrọ na Bible banyere obere onyinye nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ. “Ka [Jizọs] leliri anya, ọ hụrụ ndị bara ọgaranya ka ha na-atụnye onyinye ha n’ime ihe ntụnye ego. O wee hụ otu nwanyị di ya nwụrụ nke nọ ná mkpa ka ọ na-atụnye n’ebe ahụ obere mkpụrụ ego abụọ nke ihe ha ga-azụtali dị nnọọ nta, o wee sị: ‘N’eziokwu asị m unu, Nwanyị a di ya nwụrụ, ọ bụ ezie na ọ dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ka ha nile tụnyere. N’ihi na ndị a nile sitere n’ihe mafọọrọ ha wee tụnye onyinye, ma nwanyị a sitere n’ụkọ ya wee tụnye ihe nile e ji ebi ndụ o nwere.’”—5 Ee, n’ihi na Jizọs maara ọnọdụ nwanyị ahụ—na ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ na ogbenye—ọ ghọtara ezigbo ọnụ ahịa nke onyinye ya, nke a kpalikwara ya igosi ekele o nwere maka mgbalị nwanyị ahụ. Otú ahụkwa ka ọ dị Jehova. (Jọn 14:9) Ọ́ bụghị ihe na-agba ume ịmara na n’agbanyeghị ọnọdụ ị nọ na ya, ị pụrụ inweta ngọzi site n’aka Chineke anyị na Ọkpara ya bụ́ ndị na-egosipụta ekele?
Jehova Akwụghachi Onye Etiopia Na-atụ Egwu Chineke Ụgwọ
6, 7. N’ihi gịnị ka Jehova ji gosi ekele maka ihe ahụ Ebed-melek mere, oleekwa otú o si gosi ekele ya?
6 E nwere ọtụtụ ihe àmà n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-egosi na Jehova nwere ekele maka mgbalị ndị na-eme uche ya na-eme. Tụlee otú o si mesoo onye Etiopia nke na-atụ egwu Chineke bụ́ Ebed-melek ihe, bụ́ onye ya na Jeremaịa biri ndụ n’otu oge. Ebed-melek na-eje ozi n’ụlọ Eze Zedekaịa nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ onye na-achị Juda. Ebed-melek nụrụ na ndị isi Juda boro Jeremaịa onye amụma ebubo na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru ma tụba ya n’ime olulu mmiri na-adịghị ka agụụ gbuo ya ebe ahụ. (Jeremaịa 38:1-7) Ebe ọ maara na ha kpọrọ Jeremaịa asị nke ukwuu n’ihi ozi ọ na-ezisa, Ebed-melek tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ ma rịọ eze ka ọ napụta Jeremaịa. Onye Etiopia ahụ ji obi ike, kwuo sị: “Onyenwe m eze, ndị ikom ndị a emewo ihe ọjọọ n’ihe nile nke ha meworo Jeremaịa, bụ́ onye amụma, onye ha tụbaworo n’olulu ahụ; o wee nọọ n’ọnwụ n’ọnọdụ ya n’ihi oké ụnwụ.” Mgbe eze nyere iwu ka a kpọpụta Jeremaịa, Ebed-melek kpọọrọ ndị ikom iri atọ wee kpọpụta onye amụma Chineke ahụ.—Jeremaịa 38:8-13.
7 Jehova chọpụtara na ihe mere Ebed-melek ji mee ihe ahụ o mere bụ n’ihi okwukwe o nwere, bụ́ nke nyeere ya aka ịkwụsị ịtụ egwu. N’ihi ya, Jehova gosipụtara ekele o nwere maka ihe Ebed-melek mere ma gwa ya okwu site n’ọnụ Jeremaịa, sị: “Lee, M gaje ime ka okwu m nile bịaruo obodo a ime ya ihe ọjọọ, ọ bụghị ime ya ezi ihe . . . Ma M ga-anapụta gị n’ụbọchị ahụ, . . . a gaghị enyekwa gị n’aka ndị ahụ gị onwe gị na-atụ egwu ha. N’ihi na aghaghị m ime ka i wepụga onwe gị, . . . ndụ gị ga-aghọrọ gị ihe nkwata: n’ihi na ị gbabawo n’ime m.” (Jeremaịa 39:16-18) Ee, Jehova napụtara Ebed-melek na Jeremaịa n’aka ndị isi Juda obi tara mmiri ma mesịa napụtakwa ha n’aka ndị Babilọn, bụ́ ndị bibiri Jeruselem. Abụ Ọma 97:10 na-ekwu, sị: “[Jehova] na-edebe mkpụrụ obi ndị ebere Ya; Ọ na-anapụta ha n’aka ndị na-emebi iwu.”
“Nna Gị nke Na-ahụ Ihe na Nzuzo Ga-akwụghachi Gị”
8, 9. Dị ka Jizọs gosiri, ụdị ekpere ndị dị aṅaa na-amasị Jehova?
8 Anyị na-ahụ ihe ọzọ na-egosi na Jehova ji ihe anyị na-eme iji gosi na anyị na-asọpụrụ ya kpọrọ ihe n’ihe Bible kwuru banyere ekpere. Nwoke ahụ maara ihe kwuru, sị: “Ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ [Chineke] ụtọ.” (Ilu 15:8) N’oge Jizọs, ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-ekpe ekpere n’ihu ọha, ọ bụghị n’obi ọcha, kama ha chọrọ ka ndị mmadụ too ha. Jizọs sịrị: “Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha. Ma, gị onwe gị, mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ nke aka gị, mgbe i mechisịkwara ọnụ ụzọ gị, kpegara Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere; Nna gị bụ́ onye na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụghachi gị.”—Matiu 6:5, 6.
9 Nke a apụtaghị na Jizọs na-ekwu na ọ dị njọ ikpe ekpere n’ihu ọha n’ihi na ọ dị oge ndị o kpere ekpere n’ihu ọha. (Luk 9:16) Ọ na-amasị Jehova nke ukwuu mgbe anyị ji ezi obi kpekuo ya ekpere, na-ekpeghị ya ka ndị ọzọ too anyị. Ekpere ndị anyị na-ekpe mgbe nanị anyị nọ na-egosi otú anyị hụruru Chineke n’anya nakwa otú ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ọ nọ siruru ike. Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya na ọtụtụ mgbe, Jizọs chọrọ ebe ndị dị jụụ nanị ya ga-anọ kpee ekpere. N’otu oge, o kpere ekpere ‘n’isi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbara.’ N’oge ọzọ, “ọ rịgooro n’elu ugwu nanị ya ikpe ekpere.” Tupu ya ahọrọkwa ndịozi ya iri na abụọ, Jizọs ji abalị dum kpee ekpere nanị ya.—Mak 1:35; Matiu 14:23; Luk 6:12, 13.
10. Gịnị ka anyị ga-ejide n’aka na Jehova ga-eme ma ọ bụrụ na anyị e jiri ezi obi kpee ekpere?
10 Cheedị otú Jehova ga-esiwo ṅaa nnọọ ntị n’ekpere Ọkpara ya kpere site n’ala ala obi ya! N’ezie, n’oge ụfọdụ, Jizọs “ji mkpu ákwá siri ike na anya mmiri kpesie ekpere ike . . . e jikwa ihu ọma nụrụ olu ya n’ihi egwu Chineke o nwere.” (Ndị Hibru 5:7; Luk 22:41-44) Ka obi sie anyị ike na ọ na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ ịṅa nnọọ ntị n’ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị ji ezi obi kpee ya. Ee, “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya . . . n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.
11. Olee otú obi na-adị Jehova banyere ihe ndị anyị na-eme mgbe nanị anyị nọ?
11 Ọ bụrụ na ọ na-amasị Jehova mgbe anyị kpegaara ya ekpere na nzuzo, ọ ga-amasịkwa ya ma ọ bụrụ na anyị erubere ya isi na nzuzo! Ee, Jehova maara ihe anyị na-eme na nzuzo. (1 Pita 3:12) N’ezie, ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova na irubere ya isi mgbe nanị anyị nọ bụ ezigbo ihe àmà na-egosi na ‘obi anyị zuru okè’ n’ebe Jehova nọ, bụ́ obi nke dị ọcha nakwa nke na-agaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ime ezi ihe. (1 Ihe E Mere 28:9) Àgwà dị otú ahụ na-eme ka obi Jehova ṅụrịa!—Ilu 27:11; 1 Jọn 3:22.
12, 13. Olee otú anyị pụrụ isi chebe uche na obi anyị ma dịrị ka Nataniel bụ́ onye ahụ na-eso ụzọ nke kwesịrị ntụkwasị obi?
12 Ya mere, Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị Ndị Hibru 4:13; Luk 8:17) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike izere ime ihe ndị na-ewute Jehova, anyị ga-enwe akọnuche dị ọcha ma nwee obi ụtọ n’ihi ịmara na anyị na Chineke dị ná mma. Ee, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova na-enwe ekele maka mgbalị nke “onye na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, nke na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.”—Abụ Ọma 15:1, 2.
obi na-ezere mmehie nzuzo ndị na-emebi akọnuche, ndị dị ka ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na ikiri ndị na-eme ihe ike. Ọ bụ ezie na e nwere mmehie ndị ndị mmadụ na-adịghị ahụ, anyị maara na “ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (13 Oleekwanụ otú anyị pụrụ isi chebe obi na uche anyị n’ụwa a nke jupụtara n’ajọ omume? (Ilu 4:23; Ndị Efesọs 2:2) Tụkwasị n’iji ihe nile Jehova na-akwadebe maka ọdịmma ime mmụọ anyị kpọrọ ihe, anyị aghaghị ịgbalị izere itinye aka n’ihe ọjọọ ma na-eme ezi ihe, anyị ga-agbalị iwepụ ọchịchọ na-ezighị ezi n’obi anyị ngwa ngwa ka ọ ghara ịgbanye mgbọrọgwụ ma kpalie anyị ime mmehie. (Jems 1:14, 15) Cheedị otú obi ga-esi atọ gị ụtọ ma ọ bụrụ na Jizọs akọwaa gị otú o si kọwaa Nataniel, sị: “Lee . . . onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.” (Jọn 1:47) Nataniel, bụ́kwa onye a na-akpọ Batolomiu, mesịrị nwee ihe ùgwù nke ịghọ otu n’ime ndịozi iri na abụọ nke Jizọs.—Mak 3:16-19.
“Nnukwu Onye Nchụàjà Na-eme Ebere nke Na-ekwesịkwa Ntụkwasị Obi”
14. Gịnị dị iche n’otú Jizọs si meghachi omume n’ihe Meri mere na otú ndị ọzọ si meghachi omume?
14 Ebe ọ bụ na Jizọs “bụ onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya,” bụ́ Jehova, o ṅomiri nnọọ Nna ya n’igosi na ya nwere ekele maka mgbalị nke ndị ji obi dị ọcha na-ejere Chineke ozi na-etinye. (Ndị Kọlọsi 1:15) Dị ka ihe atụ, abalị ise tupu Jizọs ejiri ndụ ya chụọ àjà, ya na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya gara n’ụlọ Saịmọn onye Betani. N’uhuruchi nke ụbọchị ahụ, Meri, nwanne Lazarọs na Mata, ‘weere mmanụ na-esi ísì ụtọ dị otu paụnd n’ịdị arọ, bụ́ ezigbo mmanụ nad, nke dị nnọọ oké ọnụ’ (nke ọnụ ahịa ya ruru ụgwọ ọnwa otu afọ), ma wụsa ya n’isi na n’ụkwụ Jizọs. (Jọn 12:3) Ụfọdụ kwuru sị, “Gịnị kpatara mmefusị ihe nke a?” Ma Jizọs eletụdịghị ihe ahụ Meri mere anya dị ka ịla ihe n’iyi. O lere ya anya dị ka imesapụ aka nakwa dị ka ihe dị mkpa maka ọnwụ na olili ya nke dị nso. N’ihi ya, kama ịkatọ Meri, Jizọs kwanyeere ya ùgwù. O kwuru, sị: “N’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa dum, a ga na-akọkwa ihe nwanyị a mere dị ka ihe iji na-echeta ya.”—Matiu 26:6-13.
15, 16. Olee otú anyị si erite uru site n’obibi Jizọs biri n’ụwa dị ka mmadụ na n’ozi o jeere Chineke?
15 Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na ọ bụ onye nwere ekele dị ka Jizọs bụ Onye ndú anyị. N’ezie, ndụ Jizọs biri dị ka mmadụ kwadebere ya maka ọrụ Jehova ga-enye ya—ọrụ ije ozi dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà na Eze, mbụ maka ndị e tere mmanụ, e mesịa maka ụwa nile.—Ndị Kọlọsi 1:13; Ndị Hibru 7:26; Mkpughe 11:15.
16 Tupu Jizọs abịa n’ụwa, o nwere nnọọ mmasị n’ebe mmadụ nile nọ, ihe ha na-atọkwa ya ụtọ. (Ilu 8:31) Jizọs ibi ndụ dị ka mmadụ mere ka ọ ghọta ihe isi ike ndị anyị na-enwe n’ozi anyị na-ejere Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “[Jizọs] ji ụgwọ ịdị ka ‘ụmụnna’ ya n’ụzọ nile, ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere nke na-ekwesịkwa ntụkwasị obi . . . N’ihi na ebe ya onwe ya taworo ahụhụ mgbe a na-ele ya ule, o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.” Jizọs nwere ike “imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị” n’ihi na ‘a nwalewo ya n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị, o nweghịkwa mmehie.’—Ndị Hibru 2:17, 18; 4:15, 16.
17, 18. (a) Olee otú akwụkwọ ozi ahụ e degaara ọgbakọ asaa ndị ahụ dị n’Eshia Maịnọ si gosi otú Jizọs nweruru ekele maka mgbalị ndị na-eso ụzọ ya na-etinye? (b) Gịnị ka a na-akwadebe Ndị Kraịst e tere mmanụ ime?
17 Eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs ghọtara ihe isi ike ụmụazụ ya na-enwe nke ọma pụtara ìhè Mkpughe 2:8-10.
mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ. Tụlee akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ asaa dị n’Eshia Maịnọ site n’aka Jọn onyeozi. Jizọs gwara ọgbakọ dị na Smaịna, sị: “Amaara m mkpagbu na ịda ogbenye gị.” Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ihe Jizọs nọ na-ekwu ebe a bụ, ‘Aghọtara m nsogbu gị nke ọma; ama m nnọọ ihe gị na ya na-alụ.’ Mgbe o kwusịrị nke a, n’ihi ahụhụ ya onwe ya tara ruo ọnwụ, o jizi ọmịiko mesie ha obi ike, sị: “Gosipụta na ị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze bụ́ ndụ.”—18 Ihe jupụtara n’akwụkwọ ozi ahụ e degaara ọgbakọ asaa ndị ahụ bụ okwu ndị na-egosi na Jizọs maara ihe isi ike ndị na-eso ụzọ ya na-enwe nakwa ekele sitere n’obi o nwere maka otú ha si nọgide na-eme ezi ihe. (Mkpughe 2:1–3:22) Cheta na ndị ahụ Jizọs gwara okwu bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị nwere olileanya iso ya chịa n’eluigwe. Dị ka e mere Onyenwe ha, a nọ na-akwadebe ha maka ọrụ dị ukwuu bụ́ iji ọmịiko nye aka n’ime ka ụmụ mmadụ na-arịa ọrịa rite uru zuru ezu site n’àjà mgbapụta Kraịst.—Mkpughe 5:9, 10; 22:1-5.
19, 20. Olee otú “oké ìgwè mmadụ” ahụ si na-egosi na ha nwere ekele nye Jehova na Ọkpara ya?
19 N’ezie, Jizọs hụkwara “atụrụ ọzọ” ahụ n’anya dị ka ọ hụrụ ụmụazụ ya e tere mmanụ. Ọtụtụ nde ndị so ‘n’atụrụ ọzọ a’ na-emejupụta “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba . . . nile pụta,” bụ́ ndị ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9, 14) Ndị a na-agbakọta n’akụkụ Jizọs n’ihi na ha nwere ekele maka àjà mgbapụta ọ chụrụ nakwa n’ihi olileanya ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi. Olee otú ha si egosipụta na ha nwere ekele? Ha na-eme nke a site ‘n’ijere Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị.’—Mkpughe 7:15-17.
20 Akụkọ ozi sitere n’ụwa nile maka afọ ije ozi nke 2006, bụ́ nke gbara na peeji nke iri abụọ na asaa ruo iri atọ, na-enye ihe àmà doro anya na ndị ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ‘ozi dị nsọ n’ezie ehihie na abalị.’ N’ezie, n’ime otu afọ ahụ, ha na ntakịrị ọnụ ọgụgụ fọdụrụnụ n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ ji awa 1,333,966,199 kwusaara ọha mmadụ ozi ọma—ihe ha ka afọ 152,283!
Nọgide Na-egosi na I Nwere Ekele
21, 22. (a) N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ga-eji kpachara anya taa mgbe a bịara n’ihe banyere mmadụ igosipụta na ya nwere ekele? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 Jehova na Ọkpara ya na-egosipụta nnọọ n’ụzọ dị ịrịba ama na ha nwere ekele dị ukwuu maka mgbalị ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-etinye. Ma ọ dị mwute na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ adịghị eche banyere ihe ndị metụtara Chineke kama ha na-eche nanị banyere onwe ha. Mgbe Pọl na-akọwa ndị ga-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ,” o dere, sị: “Ụmụ mmadụ ga-abụ ndị na-eche nnọọ nanị banyere onwe ha, ndị nwere akpịrị ego . . . ha ga-abụ nnọọ ndị na-enwetụghị ekele.” (2 Timoti 3:1-5, dị ka e si sụgharịa ya na Phillips Bible) Lee ka ndị a si dị nnọọ iche n’ebe ezi Ndị Kraịst nọ, bụ́ ndị na-egosi na ha nwere ekele maka ihe nile Chineke meere ha site n’ikpegara ya ekpere sitere n’obi, site n’iji obi ọcha ha na-erubere ya isi, nakwa site n’iji obi ha dum na-ejere ya ozi!—Abụ Ọma 62:8; Mak 12:30; 1 Jọn 5:3.
22 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ọtụtụ ndokwa ndị Jehova ji ịhụnanya meere anyị. Ka anyị na-atụgharị uche ‘n’ezi onyinye ndị a,’ ka anyị nọgide na-enwe ekele maka ihe ndị Jehova meere anyị.—Jems 1:17.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee otú Jehova siworo gosi na ya bụ Chineke nwere ekele?
• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka obi Jehova ṅụrịa mgbe nanị anyị nọ?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si gosi na ya nwere ekele?
• Olee otú ibi ndụ dị ka mmadụ si nyere Jizọs aka ịghọ onye ọchịchị dị ọmịiko na nke nwere ekele?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
Dị nnọọ ka nne si enwe obi ụtọ mgbe nwa ya ji obi ya dum nye ya obere onyinye, otú ahụ ka ọ na-amasị Jehova mgbe anyị nyere ya ihe kasị mma anyị nwere