Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ya Adịla Mgbe Ị Ga-akwụsị Inwe Ekele

Ya Adịla Mgbe Ị Ga-akwụsị Inwe Ekele

Ya Adịla Mgbe Ị Ga-akwụsị Inwe Ekele

“Lee ka echiche Gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m, Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne!”—ABỤ ỌMA 139:17.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesi inwe ekele maka Okwu Chineke, oleekwa otú ọbụ abụ ahụ si kwupụta ekele o nwere?

KA A na-arụzigharị ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem, Onyeisi Nchụàjà bụ́ Hilkaịa chọtara otu ihe dị ịrịba ama. Ọ bụ “akwụkwọ iwu Jehova nke e nyere site n’aka Mozis,” ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ bụ nke ahụ Mozis ji aka ya dee ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga ka ọ chọtara! Chegodị otú obi ga-adịwo Eze Josaịa na-atụ egwu Chineke mgbe e wetaara ya akwụkwọ ahụ! N’ezie, o weere ya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ya agwakwa odeakwụkwọ bụ́ Shefan ozugbo ahụ ka ọ gụpụta ya n’olu dara ụda.—2 Ihe E Mere 34:14-18.

2 Taa, ọtụtụ ijeri mmadụ pụrụ ịgụ Okwu Chineke, nke zuru ezu ma ọ bụ nke bụ nanị Akwụkwọ Nsọ Hibru ma ọ bụ Grik. Ma nke ahụ ò mere ka Akwụkwọ Nsọ ghara ịdị mkpa ma ọ bụ baa uru? Mbanụ! A sị ka e kwuwe, ihe e dere n’ime ha bụ uche Onye Pụrụ ime ihe nile, bụ́kwanụ nke e dekọrọ maka abamuru anyị. (2 Timoti 3:16) Mgbe ọ na-ekwupụta otú obi dị ya banyere Okwu Chineke, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dere, sị: “Lee ka echiche Gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m, Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne!”—Abụ Ọma 139:17.

3. Gịnị na-egosi na Devid bụ onye ji nnọọ ofufe Jehova kpọrọ ihe?

3 Ọ dịghị mgbe Devid kwụsịrị inwe ekele maka ihe Jehova meere ya, maka Okwu Chineke, nakwa maka ndokwa ndị Jehova mere maka ezi ofufe. Ọtụtụ ọmarịcha abụ ndị Devid rọrọ gosiri otú obi dị ya. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 27:4, o dere, sị: “Otu ihe ka m rịọworo n’aka Jehova, nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe n’ụlọ ukwuu Ya.” Okwu Hibru mbụ e si na ya sụgharịta okwu bụ́ “ịjụta ihe” pụtara iji nwayọọ na-atụgharị uche, inyocha ihe nke ọma, na iji obi ụtọ na mmasị na-enyocha ihe. O doro anya na Devid bụ onye ji nnọọ ofufe Jehova kpọrọ ihe, na onye nwere nnọọ ekele maka nri ime mmụọ ndị Jehova na-enye, ọ na-atọkwa ya ụtọ ịṅa ntị n’eziokwu nile nke Chineke kpughere. Ihe nlereanya ya nke inwe ekele kwesịrị nṅomi.—Abụ Ọma 19:7-11.

Inwe Ekele Maka Ihe Ùgwù nke Ịmara Eziokwu Bible

4. Gịnị mere Jizọs ji nwee “oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ”?

4 Ọ bụghị ọgụgụ isi ma ọ bụ agụmakwụkwọ ụwa, bụ́ ihe ndị na-eme ka mmadụ dị mpako, na-enyere mmadụ aka ịghọta Okwu Chineke. Kama nke ahụ, ọ bụ obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova na-egosipụta n’ahụ́ ndị dị umeala n’obi nwere obi eziokwu ma mara mkpa ime mmụọ ha. (Matiu 5:3; 1 Jọn 5:20) Mgbe Jizọs tụgharịrị uche n’eziokwu ahụ bụ́ na a na-ede aha ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’eluigwe, “o nwere oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ, wee sị: ‘Ana m enye gị otuto n’ihu ọha, Nna, Onyenwenụ nke eluigwe na ala, n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma, i kpughewokwa ha nye ụmụ ọhụrụ.’”—Luk 10:17-21.

5. Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ Jizọs agaghị eji eziokwu banyere Alaeze Chineke nke e kpugheere ha gwurie egwu?

5 Mgbe Jizọs kpesịrị ekpere ahụ sitere n’obi, ọ tụgharịrị chee ndị na-eso ụzọ ya ihu ma kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị anya nke na-ahụ ihe ndị unu na-ahụ. N’ihi na asị m unu, Ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha, nakwa ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.” Ee, Jizọs gbara ụmụazụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi ume ka ha ghara iji eziokwu dị oké ọnụ ahịa banyere Alaeze Chineke nke e kpugheere ha gwurie egwu. E kpughereghị ndị ohu Chineke biri ndụ tupu oge ụmụazụ Jizọs eziokwu ndị a, e kpughekwaghịrị ya “ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi” n’oge Jizọs!—Luk 10:23, 24.

6, 7. (a) Olee ihe ndị mere anyị ga-eji jiri eziokwu sitere n’aka Chineke kpọrọ ihe? (b) Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha?

6 N’oge anyị a, anyị nwedịrị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee ekele maka eziokwu ndị sitere n’aka Chineke, n’ihi na Jehova esitewo n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” mee ka ndị ya ghọtakwuo Okwu ya. (Matiu 24:45; Daniel 12:10) Daniel onye amụma dere banyere oge ọgwụgwụ, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (Daniel 12:4) Ì kweghị na ihe ọmụma banyere Chineke ‘abawo ụba’ taa nakwa na ndị ohu Jehova na-eriju nri ime mmụọ afọ?

7 E nwere nnọọ nnukwu ọdịiche dị n’etiti ụbara ihe ọmụma ime mmụọ ndị Chineke nwere na mgbagwoju anya nke Babilọn Ukwu ahụ nọ na ya. N’ihi nke a, ọtụtụ ndị okpukpe ụgha gwụworo ike na-abịazi efe Chineke ezi ofufe. Ha bụ ndị yiri atụrụ bụ́ ndị ‘na-achọghị iso Babilọn Ukwu ahụ kere òkè ná mmehie ya’ ma ọ bụkwanụ ‘nata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.’ Jehova na ndị ohu ya na-akpọ ndị dị otú a oku ka ha bata n’ọgbakọ ezi Ndị Kraịst.—Mkpughe 18:2-4; 22:17.

Ndị Nwere Ekele Agbakọta n’Ebe Chineke Nọ

8, 9. Olee otú ihe ahụ e dere na Hagaị 2:7 si na-emezu taa?

8 Jehova buru amụma banyere ebe a na-anọ efe ya ofufe, sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.” (Hagaị 2:7) Amụma a dị ịrịba ama mezuru n’oge Hagaị mgbe ndị Chineke e mere ka ha laghachi n’obodo ha wughachiri ụlọ nsọ Jeruselem. Taa, okwu Hagaị ka na-emezu n’ihe banyere oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova.

9 Ọtụtụ nde mmadụ agbakọtalarị n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ iji fee Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu,” kwa afọ kwa, ọtụtụ narị puku “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” nọgidere na-enubata. (Jọn 4:23, 24) Dị ka ihe atụ, akụkọ ozi e nwetara n’ụwa nile maka afọ ije ozi nke 2006 gosiri na e mere mmadụ 248,327 baptizim iji gosi na ha ararawo onwe ha nye Jehova. Nke ahụ bụ ihe dị ka ndị ọhụrụ 680 kwa ụbọchị! Mmasị ha nwere n’eziokwu ahụ na ọchịchọ ha ijere Jehova ozi dị ka ndị nkwusa Alaeze na-egosi na ọ bụ Chineke dọtara ha n’ezie.—Jọn 6:44, 65.

10, 11. Kọọ ahụmahụ na-egosi otú ndị mmadụ si bịa jiri eziokwu Bible kpọrọ ihe.

10 Ihe dọtara ọtụtụ n’ime ndị a nwere ezi obi n’eziokwu ahụ bụ na ha ghọtara “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.” (Malakaị 3:18) Tụlee ahụmahụ nke Wayne na Virginia, bụ́ di na nwunye na-aga otu chọọchị Protestant ma nwee ọtụtụ ajụjụ ndị a na-enweghị ike ịza ha. Ha kpọrọ agha asị, o wutekwara ha nke ukwuu mgbe ha hụrụ ka ndị ụkọchukwu na-agọzi ndị agha na ngwá agha. Ka di na nwunye ahụ na-eme agadi, ndị chọọchị ha leghaara ha anya, n’agbanyeghị na Virginia bụ onye nkụzi Sunday school ruo ọtụtụ afọ. Ha kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla bịara leta anyị ma ọ bụ gosi mmasị n’ọdịmma ime mmụọ anyị. Nanị ihe dị chọọchị anyị mkpa bụ ego anyị. Nke a kụdara anyị nnọọ mmụọ.” Ihe ọzọ kasịdị kpatara ha nkụda mmụọ bụ mgbe ndị chọọchị ha nabatara ndị na-eso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ.

11 Ka ihe a nọ na-eme, nwa nwa Wayne na Virginia ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nwa ha nwanyị mesịkwara ghọọ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ ezie na nke a were Wayne na Virginia iwe ná mmalite, ha mesịrị gbanwee obi ha ma kwere ka a mụwara ha Bible. Wayne kwuru, sị: “N’ime nanị ọnwa atọ, ihe anyị mụtara na Bible karịrị ihe anyị mụtara n’ime afọ iri asaa gara aga! Anyị amatụghị na aha Chineke bụ Jehova, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla anyị maara banyere Alaeze Chineke na Paradaịs elu ala.” N’oge na-adịghị anya, di na nwunye a nwere obi eziokwu malitere ịga nzukọ Ndị Kraịst na ije ozi ọma. Virginia kwuru, sị: “Anyị chọrọ ịgwa onye ọ bụla banyere eziokwu ahụ.” E mekwara ha baptizim n’afọ 2005 mgbe ha abụọ dị afọ iri asatọ na ụma. Ha kwuru, sị: “Anyị achọtala ọgbakọ Ndị Kraịst ebe ahụ́ ruru anyị ala.”

Inwe Ekele n’Ihi ịbụ ‘Onye A Kwadebere Maka Ezi Ọrụ Ọ Bụla’

12. Gịnị ka Jehova na-enye ndị ohu ya mgbe nile, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji rite uru na ya?

12 Jehova na-enyere ndị ohu ya aka mgbe nile ime uche ya. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Noa kpọmkwem otú ọ ga-esi wuo ụgbọ ahụ—bụ́ ụgbọ a ga-arụtarịrị n’otu ugboro! A rụtakwara ihe a chọrọ. Gịnị mere ka nke a kwe omume? Ọ bụ n’ihi na Noa ‘mere dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.’ (Jenesis 6:14-22) Taakwa, Jehova na-akwadebe ndị ohu ya nke ọma ime uche ya. N’ezie, ọrụ anyị bụ́ isi bụ ikwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke nke e guzobeworo na inyere ndị kwesịrị ekwesị aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Dịkwa ka ọ dị Noa, anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma nanị ma ọ bụrụ na anyị erube isi. Anyị aghaghị iji nrubeisi gbasoo ntụziaka Jehova na-enye site n’Okwu ya na nzukọ ya.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

13. Gịnị ka Jehova ji enye anyị ọzụzụ?

13 Iji rụzuo ọrụ ahụ, anyị aghaghị ịmụta otú e si ‘ejizi’ ngwá ọrụ anyị bụ́ isi, bụ́ Okwu Chineke, ejizi. Okwu Chineke ‘bara uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.’ (2 Timoti 2:15; 3:16, 17) Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, Jehova na-enye anyị ọzụzụ bara uru site n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Taa, n’ọgbakọ 99,770 e nwere n’ụwa nile, a na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi kwa izu iji nyere anyị aka n’ozi ubi. Ị̀ na-egosi na i nwere ekele maka nzukọ ndị a dị mkpa site n’ịgachi ha anya na itinye ihe ndị ị na-amụta na ha n’ọrụ?—Ndị Hibru 10:24, 25.

14. Olee otú ndị ohu Jehova si egosi na ha nwere ekele maka ihe ùgwù nke ijere Chineke ozi? (Gụnye ihe ndị e kwuru na chaatị nke dị na peeji nke 27 ruo 30.)

14 Ọtụtụ nde ndị Chineke n’ụwa nile na-egosi na ha nwere ekele maka ọzụzụ ha na-enweta site n’itinye mgbalị siri ike n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’afọ ije nke 2006, ndị nkwusa Alaeze dị 6,741,444 tinyere awa 1,333,966,199 n’akụkụ nile nke ọrụ anyị gụnyere ịmụrụ mmadụ 6,286,618 Bible n’ebe obibi ha. Nke a bụ nanị ole na ole n’ime akụkọ ndị na-agba ume sitere n’akụkọ ozi anyị n’ụwa nile. Anyị na-agwa gị ka i leruo akụkọ a anya ma nweta agbamume site na ya, dị nnọọ ka ụmụnna anyị na narị afọ mbụ nwetara agbamume dị ukwuu mgbe ha nụrụ banyere mmụba nke ọrụ nkwusa ahụ n’oge ha.—Ọrụ 1:15; 2:5-11, 41, 47; 4:4; 6:7.

15. N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị inwe onye na-enwe nkụda mmụọ n’ihi ozi o ji obi ya dum na-ejere Jehova?

15 Oké mkpu otuto nke a na-etiku Chineke kwa afọ na-egosi ekele sitere nnọọ n’obi nke ndị ohu Jehova nwere n’ihi ihe ùgwù ha nwere nke ịmara Jehova na ịgba àmà banyere ya. (Aịsaịa 43:10) N’ezie, a pụrụ iji àjà otuto ụfọdụ ụmụnna ndị merela agadi, ndị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ndị ahụ́ na-esichaghị ike na-achụ tụnyere obere onyinye nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Ma ka anyị ghara ichefu na Jehova na Ọkpara ya na-enwe nnọọ ekele maka mgbalị nke ndị nile ji obi ha dum na-ejere Chineke ozi na-etinye, ka ha na-eme ihe nile ha nwere ike ime.—Luk 21:1-4; Ndị Galeshia 6:4.

16. Olee ngwá ọrụ ndị e ji akụzi ihe bụ́ ndị Chineke nyeworo anyị n’oge ndị na-adịbeghị anya?

16 E wezụga ịzụ anyị maka ije ozi ọma, Jehova na-esi ná nzukọ ya enye anyị ngwá ọrụ ndị bụ́ ịgba e ji akụzi ihe. N’ime afọ iri ole na ole gara aga, anyị enweela akwụkwọ ndị dị ka Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nakwa Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? bụ́ nke e wepụtara n’oge na-adịbeghị anya. Ndị nwere ekele n’ezie maka ihe ndị a na-eji ha eme ihe nke ọma n’ozi.

Jiri Akwụkwọ Bible Na-akụzi Na-eme Ihe nke Ọma

17, 18. (a) Olee akụkụ akwụkwọ Bible Na-akụzi nke na-amasịkarị gị iji na-eme ihe mgbe ị nọ n’ozi ọma? (b) Gịnị ka otu onye nlekọta sekit kwuru banyere akwụkwọ Bible Na-akụzi?

17 Akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke e ji okwu ndị dị mfe nghọta dee bụ́ nke nwere isiokwu iri na itoolu na ihe odide ntụkwasị ndị a kọwara nke ọma, anọwo na-aba uru dị ukwuu n’ozi. Dị ka ihe atụ, isi nke iri na abụọ tụlere isiokwu bụ́ “Ibi Ndụ n’Ụzọ Na-amasị Chineke.” Isiokwu a kọwaara onye na-amụ Bible otú ọ pụrụ isi ghọọ enyi Chineke, bụ́ ihe ọtụtụ ndị na-echeghị na ọ ga-ekwe omume. (Jems 2:23) Olee ihe ndị mmadụ chere banyere akwụkwọ a e ji amụ Bible?

18 Otu onye nlekọta sekit n’Australia kọrọ na akwụkwọ Bible Na-akụzi “na-adọrọ mmasị ozugbo ma na-eme ka onye nwe ụlọ kwere ikwurịta okwu.” O kwukwara na akwụkwọ ahụ dị mfe iji ya eme ihe nke na o “mewo ka obi kakwuo ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze mgbe ha nọ n’ozi meekwa ka ha nwee ọṅụ ije ozi ọma. Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị n’ebe a ji na-akpọ ya Ọlaedo!”

19-21. Kọọ ahụmahụ ụfọdụ ndị na-egosi uru akwụkwọ Bible Na-akụzi bara.

19 Otu nwanyị bi na Guyana gwara otu onye ọsụ ụzọ bịara n’ụlọ ya, sị: “Ọ ghaghị ịbụ Chineke zitere gị.” Ọ dịbeghị anya nwoke ya na ya bi hapụrụ ya na ụmụ ha abụọ ka dị obere. Onye ọsụ ụzọ ahụ meghere isi nke mbụ nke akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gụpụta paragraf nke iri na otu, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Olee Mmetụta Chineke Na-enwe Banyere Ikpe Na-ezighị Ezi Anyị Na-eche Ihu?” Onye ọsụ ụzọ ahụ kwuru, sị: “Ihe ndị e kwuru n’ebe ahụ metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. O biliri ma gaa nnọọ n’azụ shed ya bee ezigbo ákwá.” Nwanyị a kwere ka nwanna nwanyị nọ n’ógbè ya bịa mụwara ya Bible, ọ nọgidewo na-enwe ọganihu.

20 Nwunye José, bụ́ onye bi na Spen, nwụrụ n’ihe ọghọm okporo ụzọ. Ọ malitere ịṅụ ọgwụ ike iji nwee ike idi ihe dakwasịrị ya, ọ gakwukwara ndị ọkachamara maka enyemaka. Ma ndị ọkachamara apụghị ịza ya ajụjụ kasị enye ya nsogbu n’obi, bụ́: “Gịnị mere Chineke ji kwere ka nwunye m nwụọ?” Otu ụbọchị José zutere Francesc, bụ́ onye na-arụ n’ụlọ ọrụ José na-arụ ọrụ. Francesc gwara José ka ha kwurịta ihe dị n’isi iri na otu nke akwụkwọ Bible Na-akụzi bụ́ nke isiokwu ya bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?” Otú e si jiri Akwụkwọ Nsọ kọwaa isiokwu ahụ na ihe atụ nke onye nkụzi na nwata akwụkwọ dị n’akwụkwọ ahụ masịrị José nke ukwuu. Ọ malitere ịmụchi Bible anya, soro gaa mgbakọ sekit, ugbu a, ọ na-agakwa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ya.

21 Roman, onye bụ́ ọchụnta ego dị afọ iri anọ nke bi na Poland, na-akwanyere nnọọ Okwu Chineke ùgwù. Ma n’ihi na ọrụ ya anaghị enye ya ohere, ọ mụtụrụ ihe ma kwụsị. Ka o sina dị, ọ gara mgbakọ distrikti ma nweta akwụkwọ Bible Na-akụzi. Mgbe o nwetasịrị akwụkwọ a, o nwere ọganihu pụtara ìhè. O kwuru, sị: “Akwụkwọ a mere nnọọ ka otú ozizi nile bụ́ isi nke Bible si nwee njikọ doo anya.” Roman na-amụchizi Bible anya ugbu a ma na-enwekwa ezigbo ọganihu.

Nọgide Na-enwe Ekele

22, 23. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-egosi na anyị nwere ekele maka olileanya e debere anyị n’ihu?

22 Dị ka a kọwara n’ọmarịcha Mgbakọ Distrikti bụ́ “Nnapụta Dị Nso!,” “mgbapụ ebighị ebi” nke Chineke kwere ná nkwa, bụ́ nke ọbara Jizọs Kraịst a wụsịrị mere ka o kwe omume, na-agụsi ezi Ndị Kraịst agụụ ike. Ọ dịghị ụzọ kasị mma isi gosipụta ekele anyị nwere maka olileanya a dị oké ọnụ ahịa karịa ịnọgide na-adị ọcha “pụọ n’ọrụ nwụrụ anwụ ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ.”—Ndị Hibru 9:12, 14.

23 Ee, ọ bụ ihe dị ịrịba ama n’ezie na ihe karịrị nde mmadụ isii na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ nọgidesiri ike na-ejere Chineke ozi n’oge a ọchịchọ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ bụ nanị maka ọdịmma onwe ha. Nke a na-egosikwa na ndị Jehova ji ihe ùgwù nke ijere Chineke ozi kpọrọ ihe n’ezie ebe ha maara na ‘ndogbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ abụghị n’efu n’ihe metụtara Onyenwe anyị.’ Ya adịla mgbe anyị ga-akwụsị inwe ekele dị otú a!—1 Ndị Kọrịnt 15:58; Abụ Ọma 110:3.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka ọbụ abụ ahụ na-akụziri anyị banyere ikele Chineke maka ihe o meere anyị nakwa maka ndokwa o mere maka ịzụ anyị n’ụzọ ime mmụọ?

• Olee otú e si emezu ihe e dere na Hagaị 2:7 taa?

• Olee otú Jehova siworo kwadebe ndị ohu ya ijere ya ozi nke ọma?

• Gịnị ka ị pụrụ ime iji gosi ekele i nwere maka ịdị mma Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 27-30]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 2006 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto dị na peeji nke 25]

Jehova na-akwadebe anyị nke ọma ime uche ya