Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iwu Ụlọ Ihe Atụ ‘n’Ụlọ Nkume’

Iwu Ụlọ Ihe Atụ ‘n’Ụlọ Nkume’

Iwu Ụlọ Ihe Atụ ‘n’Ụlọ Nkume’

Aha mba a dị n’Africa pụtara “Ụlọ Nkume.” Ọ bụ mba e ji Nsọda Mmiri Victoria na ọtụtụ anụ ọhịa dị na ya mara. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ya kasị nwee ụlọ ochie ná mba ndị dị n’ebe ndịda Ọzara Sahara. Ugwu dị larịị nke okwute “granite” dị na ya si n’etiti ya gafee. Ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị n’elu ugwu ahụ mere ka o nwee ọtụtụ ahịhịa ndụ. Mba a bụ Zimbabwe, bụ́ obodo ihe dị ka nde mmadụ 12 bi na ya.

N’IHI gịnị ka e ji kpọọ ya Ụlọ Nkume? N’afọ 1867, otu onye dinta, bụ́kwa onye na-eme nchọpụta nke aha ya bụ Adam Renders hụrụ ọtụtụ nnukwu ụlọ ndị e ji nkume wuo n’ebe dị ihe karịrị narị hekta asaa na iri abụọ. Ọ nọwo na-eme njem n’ala Africa jupụtara n’ahịhịa, bụ́ ebe e ji ájá, osisi, na akịrịka wuo ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ndị dị n’ebe ndị ahụ. O mesịrị rute n’otu nnukwu mkpọmkpọ obodo nke e ji nkume wuo ụlọ ndị dị na ya, bụ́ nke a na-akpọ Great Zimbabwe ugbu a.

Mkpọmkpọ ebe a dị nnọọ n’ebe ndịda nke ebe a na-akpọ Masvingo ugbu a. Ụfọdụ n’ime mgbidi nke ụlọ ndị ahụ karịrị mita itoolu n’elu, mgbidi ndị a bụ nkume granite dịgasị n’elu ibe ha bụ́ ndị a na-ejighị simenti doo. Mkpọmkpọ ebe ahụ nwere otu ụlọ elu pụrụ iche nke yiri okoso nke ala ya dị mita 6 n’obosara, ya adịkwa mita 11 n’elu. Ọ dịbeghị onye maara kpọmkwem ihe mere e ji wuo ụlọ ahụ. E kwuru na mkpọmkpọ ebe ahụ nọ kemgbe narị afọ asatọ nke O.A., ma e nwere ihe àmà na-egosi na e biri n’ebe ahụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ.

N’afọ 1980, mba a bụ́ nke a maara dị ka Rhodesia n’oge ahụ bịara nwere onwe ya site n’aka ndị Britain, a gụgharịkwara ya aha ma kpọwazie ya Zimbabwe. Ndị bụ́ isi bi na ya bụ agbụrụ abụọ—ndị Shona, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ka ukwuu ná mba ahụ, na ndị Ndebele. Ndị ahụ na-ele ọbịa nke ọma, bụ́ nke Ndịàmà Jehova hụrụla ọtụtụ mgbe ka ha na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mgbe ụfọdụ, tupu a matadị onye na-akụ aka, a na-agwa ya, sị, “Batawa” na “Biko nọdụ ala.” Ọtụtụ ndị Zimbabwe na-akwanyere nnọọ Bible ùgwù, ha na-ahụkarị na ụmụ ha nọdụrụ ala ma gee ntị mgbe a na-akparịta ụka site n’Akwụkwọ Nsọ.

Izi Ndị Mmadụ Ozi Nkasi Obi

“Ọrịa AIDS” na “oké ọkọchị” bụ okwu ndị a na-anụkarị n’usoro mgbasa ozi mgbe a na-ekwu banyere Zimbabwe. Mmụba nke ọrịa AIDS ebelatawo nnọọ ọnụ ọgụgụ na akụnụba nke ndị bi ná mba Africa ndị dị n’ebe ndịda Sahara. N’ebe a, ndị nọ n’ụlọ ọgwụ na-abụkarị ndị bu ọrịa HIV na AIDS. Ọrịa a akpaala ọtụtụ ezinụlọ aka ọjọọ.

Iji nyere ndị mmadụ aka na Zimbabwe, Ndịàmà Jehova anọgidela na-agwa ha na ụzọ kasị mma isi bie ndụ bụ mmadụ ikwe ka ụkpụrụ Chineke ndị dị na Bible na-eduzi ya. Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-akụzi na ọ bụ nanị di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ, na nwoke idina nwoke ibe ya na nwanyị idina nwanyị ibe ya bụ ihe ọjọọ n’anya Chineke, nakwa na iwu Jehova megidere mmịnye ọbara na ọgwụ ọjọọ ndị e ji atụrụ ndụ. (Ọrụ 15:28, 29; Ndị Rom 1:24-27; 1 Ndị Kọrint 7:2-5; 2 Ndị Kọrint 7:1) Ndịàmà na-agbasakwa ozi na-enye olileanya e ji n’aka, na-ekwusi ike na n’isi nso, Alaeze Chineke ga-ewepụ ọrịa nile.—Aịsaịa 33:24.

Ịgbatara Ndị Mmadụ Ọsọ Enyemaka

Oké ọkọchị emesiela ndị bi na Zimbabwe ike kemgbe afọ iri. Anụ ndị bi n’ọhịa anwụwo n’ihi agụụ na mmiri ịkọ ha n’ahụ́. Ọtụtụ narị puku ehi anwụọkwala. Ọkụ erepịala ọtụtụ hekta oké ọhịa ndị osisi dị na ha. Ọtụtụ ụmụaka na ndị agadi anwụwo n’ihi erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. Ọbụna nnukwu Osimiri Zambezi tara ruo n’ókè na ọ fọrọ obere ka ígwè ndị na-enye ọkụ ji mmiri ahụ arụ ọrụ kwụsị ịrụ ọrụ.

Ndịàmà Jehova hiwere kọmitii enyemaka asatọ n’akụkụ dị iche iche nke mba ahụ iji gbatara ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ ahụ ọsọ enyemaka. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị letara ọtụtụ ọgbakọ iji chọpụta ihe ndị dị ha mkpa n’ezie. A kọọrọ kọmitii enyemaka dị iche iche mkpa nke ọgbakọ ndị dị n’ógbè ndị ha na-elekọta nwere. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kọrọ, sị: “Kemgbe afọ ise, anyị ekeela ihe karịrị otu puku tọn ọka, tọn iri nke azụ ọkpọọ, na tọn iri nke àgwà. Ụmụnna anyị wetara tọn mufushwa [akwụkwọ nri a gbara n’anwụ] abụọ. Anyị kekwara ọtụtụ uwe nakwa ego ndị e wetara iji gboo mkpa ụmụnna anyị.” Onye nlekọta ọzọ na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Mgbe m chere echiche banyere ihe isi ike ndị anyị na-enwe n’inweta akwụkwọ ikike ndị Zimbabwe na South Africa na-achọ ka anyị nweta iji bubata ihe ndị e nyere anyị n’onyinye na ihe isi ike ndị anyị na-enwe mgbe nile n’inweta mmanụ ụgbọala ndị dị anyị mkpa iji bulata ihe enyemaka ndị a dị anyị ezigbo mkpa, nanị ihe m na-ekwubi bụ na anyị inwe ike inweta ihe ndị a bụ ihe ọzọ na-egosi na ihe ahụ Jizọs kwuru nke bụ́ na Nna anyị nke eluigwe maara na ihe a nile dị anyị mkpa bụ eziokwu.”—Matiu 6:32.

Olee otú ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eme mgbe ha bịara n’ebe ndị ahụ oké ọkọchị na-enye nsogbu na ha? Ụfọdụ na-eburu nri ha na ezinụlọ ndị ha na ha ga-anọ ga-eri. Otu n’ime ha kọrọ na otu ụbọchị ụfọdụ ụmụnna nwanyị nọ na-eche ma hà kwesịrị ịkwụsị ozi ọma iji gaa kwụrụ n’ahịrị n’ebe ndị mmadụ nọ na-eche ka gọọmenti butere ha ihe enyemaka. Ha kpebiri ịtụkwasị Jehova obi site n’ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ma na-ele anya otú a ga-esi gbooro ha mkpa ha. Ọ dịghị ihe gọọmenti butere n’ụbọchị ahụ.

E mere ndokwa maka ọmụmụ ihe n’izu sochirinụ, ụmụnna nwanyị a aghaghịkwa ikpebi ihe ha ga-eme ọzọ. Hà ga-aga ọmụmụ ihe ka hà ga-aga chere ihe enyemaka? Ha mere ihe ka ha mkpa site n’ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. (Matiu 6:33) Ka ha na-abụ abụ mmechi, ha nụrụ ụda pikọp na-abịanụ. E buteere ha ihe enyemaka kpọmkwem n’ebe ahụ, site n’aka ụmụnna ha nọ na kọmitii enyemaka! Ọṅụ na ekele Ndịàma ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị bịara ọmụmụ ahụ nwere abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

Ịhụnanya Na-ewuli Elu

Omume obiọma e mesoro ndị na-abụghị Ndị Kraịst mere ka e nwee ohere ịgbara ha ezi àmà. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke bịara n’ókèala Masvingo, na ụfọdụ Ndịàmà bi n’ebe ahụ nọ na-ekwusa ozi ọma. Ọ hụrụ otu nwata nwanyị dina n’ala n’akụkụ okporo ụzọ. Ndịàmà ahụ chọpụtara na ezigbo ọrịa ji ya, n’ihi na o nweghị ike ikwu okwu nke ọma, olu ya na-amakwa jijiji. Aha nwata nwanyị ahụ bụ Hamunyari, nke pụtara n’asụsụ Shona “Ihere Ọ̀ Na-emekwa Gị?” A gwara ụmụnna ahụ na ndị chọọchị ya hapụrụ ya mgbe ha na-aga ememe okpukpe ha n’ugwu dị n’ebe ahụ. Ndịàmà ahụ ji ịhụnanya nyere nwata nwanyị ahụ aka, kpọga ya n’otu obere obodo dị nso n’ebe ahụ.

N’obodo ahụ, e nwere ụfọdụ ndị maara Hamunyari, n’ihi ya, ha ziri ozi ka ụmụnne ya bịa kpọrọ ya. Ndị obodo ahụ kwuru banyere Ndịàmà, sị: “Ọ bụ okpukpe a bụ ezi okpukpe. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-egosi.” (Jọn 13:35) Tupu ụmụnna ahụ alaa, ha nyere Hamunyari traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? *

N’izu sochiri ya, onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị letara ọgbakọ dị n’ebe Hamunyari bi. Ọ gara na nke ha iji mara ma ọ̀ lọtakwara n’udo. Ezinụlọ ahụ nile nwere obi ụtọ ịhụ onye nlekọta ahụ na ụmụnna ndị ebe ahụ. Ndị mụrụ ya kwuru, sị: “Okpukpe unu bụ ezi okpukpe. Unu zọpụtara ndụ nwa anyị nwanyị, onye a hapụrụ n’okporo ụzọ ka ọ nwụọ.” Ha jụrụ ndị chọọchị nwa ha nwanyị, sị: “Ihe aha Hamunyari pụtara ó meghị ka ihere mee unu ịhapụ ya ka ọ nwụọ?” Ndịàmà ahụ na ndị ezinụlọ Hamunyari kparịtara ihe ndị dị na Bible, ha enyekwa ha akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ha gwakwara ụmụnna ahụ ka ha bịa ọzọ ma mụọrọ ha Bible. Ụfọdụ ndị ezinụlọ ahụ na-emegidebu Ndịàmà kwụsịrị ime otú ahụ. Otu n’ime ha, bụ́ di nwanne Hamunyari, bụ onyeisi nke otu chọọchị dị n’ógbè ahụ. O kwetara ka a mụwara ya Bible.

Iwu Ụlọ Ofufe

Otu onye na-ede uri nke e nyere ike mmụọ nsọ dere ogologo oge gara aga, sị: “Chineke, . . . akpịrị Gị akpọwo mkpụrụ obi m nkụ, . . . n’ala ọkpọ nkụ na nke ịda mbà, ebe mmiri na-adịghị.” (Abụ Ọma 63:1) N’ezie, ọ bụ otú a ka ọ dị ọtụtụ ndị na Zimbabwe! Oké ọkọchị na-enye ha nsogbu, ma akpịrị ife Chineke na inweta ebere ya na-akpọkwa ha nkụ. Ị pụrụ ịhụ nke a site n’ihe si n’ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ebe ahụ pụta. Mgbe Zimbabwe malitere ịchị onwe ya n’afọ 1980, e nwere ihe dị ka puku Ndịàmà iri na-eje ozi na narị ọgbakọ anọ na iri asaa na isii dị n’ebe ahụ. Ugbu a, ka ihe dị ka afọ 27 gasịrịla, ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike amụbaala okpukpu atọ, ọ fọkwara obere ka ọgbakọ nọ n’ebe ahụ mụbaa okpukpu abụọ.

Ọ bụ ọgbakọ ole na ole n’ime ọgbakọ ndị a nwere ebe ndị ha na-anọ efe ofufe. Na January 2001, ọ bụ nanị ọgbakọ iri itoolu na asatọ n’ihe karịrị narị ọgbakọ asatọ dị na Zimbabwe nwere ụlọ ofufe—ya bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze—ebe ha na-ezukọ. Ọtụtụ ọgbakọ mụrụ ihe n’okpuru osisi ma ọ bụkwanụ n’ụlọ akịrịka e ji ájá rụọ.

N’ihi onyinye afọ ofufo na ọrụ afọ ofufo nke Ndịàmà bi gburugburu ụwa, Ndịàmà nọ na Zimbabwe amalitela usoro ihe owuwu nke na-eme ka e nwekwuo ọgbakọ ndị nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị na-efughị oké ego ma maa mma ha na-amụ ihe na ha. Ndịàmà si ná mba ofesi bụ́ ndị nwere nkà iwu ihe mere ndokwa ịga Zimbabwe ma soro ụmụnna ndị ebe ahụ rụọ ọrụ. Otu n’ime Ndịàmà bi n’ebe ahụ kwuru, sị: “Anyị ji obi anyị nile na-ekele ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị si n’ọtụtụ mba bịa Zimbabwe iji nyere anyị aka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mara mma. Anyị kelekwara unu nile maka itinye ego n’Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ́ nke mere ka ọrụ ahụ nwee isi.”

N’ebe ọwụwa anyanwụ mba ahụ, ụmụnna mụrụ ihe n’okpuru otu nnukwu osisi yiri mango ruo afọ 50. Mgbe a gwara ndị okenye nke ọgbakọ dị n’ebe ahụ na a ga-ewuru ha ezigbo ụlọ ofufe, ọ dịkarịa ala otu n’ime ha malitere ibe ákwá. Otu okenye dị iri afọ itoolu na otu nke nọ n’ọgbakọ dị nso n’ebe ahụ kwuru, sị: “Ebekuola m Jehova ákwá ruo ogologo oge ka ihe dị otú a mee!”

Ọtụtụ ndị kwuru okwu banyere otú e si wuo ụlọ ndị ahụ mara mma ọsọsọ. Otu onye hụrụ ihe na-emenụ kwuru, sị: “Unu na-eji ehihie arụ ọrụ n’ụlọ a, ma ọ ghaghị ịbụ na Chineke na-eji abalị arụ nke ya!” Ndị mmadụ hụkwara ịdị n’otu na obi ụtọ nke ndị na-ewu ihe owuwu ndị ahụ. Ka ọ dị ugbu a, e wuchaala ihe karịrị narị Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ na iri ise ná mba ahụ nile. Nke a emeela ka narị ọgbakọ ise na iri atọ na anọ nwee Ụlọ Nzukọ Alaeze siri ike e ji brik wuo bụ́ ebe ndị ha ga na-amụ ihe.

A ka na-ewu ọmarịcha ihe owuwu ihe atụ na Zimbabwe. Mgbe anyị chere echiche banyere ihe ndị a rụzurula, ọ na-akpali anyị inye Jehova otuto, bụ́ onye ngọzi ndị dị otú ahụ si n’aka. Ee, “ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.”—Abụ Ọma 127:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Map ndị dị na peeji 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ZIMBABWE

HARARE

Masvingo

Great Zimbabwe

[Foto dị na peeji nke 9]

Ụlọ elu yiri okoso

[Foto dị na peeji nke 12]

Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, Ọgbakọ Concession

[Foto dị na peeji nke 12]

Ụmụnna nọ n’Ọgbakọ Lyndale ka ha nọ n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ha

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 9]

Mkpọmkpọ ebe nwere steepụ: ©Chris van der Merwe/AAI Fotostock/age fotostock; ụlọ elu dị n’etiti: ©Ingrid van den Berg/AAI Fotostock/age fotostock