Ndị Bụ́ nwunye—Na-akwanyerenụ Di Unu Ùgwù Miri Emi
Ndị Bụ́ nwunye—Na-akwanyerenụ Di Unu Ùgwù Miri Emi
“Ndị bụ́ nwunye na-edo onwe [unu] n’okpuru ndị di [unu].”—NDỊ EFESỌS 5:22.
1. Olee ihe mere o ji esikarị ike mmadụ ịkwanyere di ya ùgwù?
N’ỌTỤTỤ ala, n’ụbọchị di na nwunye lụrụ, nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-ekwe di ya nkwa ịsọpụrụ ya n’ụzọ dị omimi. Otú ọ dị, otú ọtụtụ ndị di si emeso nwunye ha ihe nwere ike ime ka nkwa ahụ siere ha ike imezu ma ọ bụ ka ọ dịrị ha mfe. Ma, alụmdi na nwunye magburu nnọọ onwe ya mgbe ọ malitere. Chineke weere otu ọgịrịga n’ahụ́ Adam, bụ́ nwoke mbụ, ma jiri ya mee nwanyị. Adam tipụrụ, sị: “Ehee! nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ́ si n’anụ ahụ́ m pụta.”—Jenesis 2:19-23.
2. Olee ihe merelanụ n’oge ndị na-adịbeghị anya n’ihe banyere ụmụ nwanyị na alụmdi na nwunye?
2 N’agbanyeghị na alụmdi na nwunye malitere nke ọma, obere oge ka afọ 1960 gasịrị, ụmụ nwanyị malitere ime mgbalị inwere onwe ha pụọ n’aka ndị nwoke na United States. N’oge ahụ, a ga-agụta narị ndị di atọ hapụrụ ezinụlọ ha tupu a gụta otu nwanyị mere otú ahụ. Ka ọ na-erule ihe dị ka n’afọ 1969, a na-agụtazi otu narị ndị di hapụrụ nwunye ha tupu a na-agụta otu nwanyị hapụrụ di ya. O yiri ka ụmụ nwanyị hà na-akpọzi iyi, na-aṅụ mmanya, na-ese siga, ma na-eme omume rụrụ arụ ka ndị nwoke. N’ihi ya, ànyị ga-asị na ụmụ nwanyị enwekwuola obi ụtọ? Ee e. Ná mba ụfọdụ, ihe dị ka ọkara nke ndị lụrụ di na-emesị gbaa alụkwaghịm. Mgbalị ụfọdụ ụmụ nwanyị na-eme iji meziwanye alụmdi na nwunye ha ọ̀ na-eme ka ihe ka mma ka ọ̀ na-eme ka ọ ka njọ?—2 Timoti 3:1-5.
3. Olee nsogbu bụ́ isi na-emetụta alụmdi na nwunye?
3 Olee isi ihe bụ́ nsogbu? Ihe na-akpata ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a bụ otu nsogbu nke dịworo kemgbe mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi, “bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” duhiere Iv. (Mkpughe 12:9; 1 Timoti 2:13, 14) Setan na-emegide ihe ndị Chineke na-akụzi. Dị ka ihe atụ, Ekwensu emeela ka alụmdi na nwunye yie ihe sibigara ike ókè na ihe na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ozizi ụgha o ji usoro mgbasa ozi nke ụwa a—nke ọ na-achị—na-akpọsa bụ iji mee ka iwu Chineke yie iwu mmegbu na nke na-abaghịzi uru. (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Ma ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi tụlee ihe Chineke kwuru banyere ọrụ nwanyị n’alụmdi na nwunye, anyị ga-ahụ na amamihe dị n’Okwu Chineke na ọ ka bakwara uru.
Ndụmọdụ Maka Ndị Lụrụ Di
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa mmadụ ịkpachara anya mgbe ọ na-eche echiche ịbanye n’alụmdi na nwunye? (b) Gịnị ka nwanyị kwesịrị ime tupu ya ekweta ịlụ mmadụ?
4 Ọ dị otu ịdọ aka ná ntị Bible na-enye anyị. O kwuru na n’ụwa a Ekwensu na-achị, ọbụna ndị alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma ga-enwe “mkpagbu.” N’ihi ya, n’agbanyeghị na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye, Bible na-adọ ndị na-achọ ịbanye na ya aka ná ntị ka ha kpachara anya. Otu onye e nyere ike mmụọ nsọ nke so dee Bible kwuru banyere nwanyị di ya nwụrụ nke nweziri ohere ịlụ di ọzọ, sị: “Obi ga-adị ya ụtọ karị ma ọ bụrụ na ọ nọrọ otú ọ nọ.” Jizọs gbakwara ndị ga-enwe ike “ime ohere 1 Ndị Kọrint 7:28, 36-40; Matiu 19:10-12.
maka [ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye]” ume ka ha mee otú ahụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ahọrọ ịlụ, o kwesịrị ịlụ onye nọ “n’ime Onyenwe anyị,” ya bụ, onye na-efe Chineke nke raarala onwe ya nye, e meekwa ya baptizim.—5 Otu ihe mere nwanyị karịsịa kwesịrị iji chebara onye ọ ga-alụ echiche bụ ịdọ aka ná ntị a Bible nyere, nke bụ́: “Iwu kegidere nwanyị lụrụ di n’ebe di ya nọ.” Ọ bụ nanị ma di ya ọ̀ nwụrụ ma ọ bụ kwaa iko, di na nwanye ahụ agbaakwa alụkwaghịm ga-eme ka nwanyị ahụ ‘nwere onwe ya pụọ n’iwu ya.’ (Ndị Rom 7:2, 3) Mmasị mmadụ nwere n’ahụ́ nwoke ma ọ bụ nwanyị mgbe mbụ ọ hụrụ ya nwere ike ime ka ha bụrụ ezigbo enyi, ma nke ahụ ezughị ezu iji banye n’alụmdi na nwunye nke ga-eweta obi ụtọ. N’ihi ya, nwanyị na-alụbeghị di kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Àdị m njikere ịbanye ná ndokwa nke ga-eme ka m nọrọ n’okpuru iwu nwoke a?’ Mgbe o kwesịrị ịjụ onwe ya ajụjụ a bụ mgbe ha na-alụbeghị, ọ bụghị mgbe ha lụcharala.
6. Olee mkpebi ihe ka ọtụtụ n’ụmụ nwanyị nwere ike imere onwe ha, n’ihi gịnịkwa ka mkpebi ahụ ji dị mkpa?
6 N’ọtụtụ ebe taa, nwanyị nwere ike ikwere mmadụ di ma ọ bụ jụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ime mkpebi amamihe dị na ya banyere nke a nwere ike ịbụ ihe kasị sie ike nwanyị ahụ metụrụla, ebe ọ bụ na mkpachi anya na ịhụnanya a na-enweta n’alụmdi na nwunye nwere ike ịdị na-agụ ya agụụ nke ukwuu. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ihe gụsiri anyị agụụ ike ime—ma ọ bụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ịrị ugwu—na-emekarị ka anyị leghara ihe ụfọdụ anya ma kwere nanị ihe anyị chọrọ ịnụ.” Onye na-elezighị anya tupu ya arịwa ugwu nwere ike ịnwụ; ịlụkwa onye anyị na-ekwesịghị ịlụ pụkwara ịkpata ọdachi.
7. Olee ndụmọdụ amamihe dị na ya e nyerela banyere mmadụ ịchọ onye ọ ga-alụ?
7 Nwanyị kwesịrị ichesi echiche ike banyere ihe ịnọ n’okpuru iwu nke nwoke chọrọ ịlụ ya ga-achọ ya n’aka. Ọtụtụ afọ gara aga, otu nwa agbọghọ bụ́ onye India ji ịdị umeala n’obi kweta sị: “Ndị mụrụ anyị tọrọ anyị ma mara ihe karịa anyị, a gakwaghị aghọgbu ha ngwa ngwa otú e nwere ike isi ghọgbuo anyị. . . . M nwere nnọọ ike ime mkpebi na-ezighị ezi.” Enyemaka e nwere ike inweta n’aka nne na nna na ndị ọzọ dị mkpa. Otu onye ndụmọdụ maara ihe gbara ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ume ruo ọtụtụ afọ ka ha mata nne na nna nke onye ha na-achọ ịlụ, jirikwa nlezianya tụlee otú onye ahụ na nne na nna ya na ụmụnne ya si emekọrịta ihe.
Otú Jizọs Si Doo Onwe Ya n’Okpuru
8, 9. (a) Olee otú Jizọs si lee ido onwe ya n’okpuru Chineke anya? (b) Olee uru ido onwe onye n’okpuru nwere ike ịba?
8 Ọ bụ ezie na o nwere ike isi ike mmadụ ido onwe ya n’okpuru onye ọzọ, ụmụ nwanyị kwesịrị ile ya anya dị ka ihe dị ùgwù, dịkwa nnọọ ka Jizọs si lee ya anya. N’agbanyeghị na ido onwe ya n’okpuru Chineke mere ka ọ taa Luk 22:41-44; Ndị Hibru 5:7, 8; 12:3) Ụmụ nwanyị nwere ike iji Jizọs mere ihe nlereanya, n’ihi na Bible kwuru, sị: “Isi nke nwanyị bụ nwoke; n’aka nke ọzọ isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịmata na ọ bụghị nanị mgbe ụmụ nwanyị lụrụ di ka ha na-anọ n’okpuru nwoke.
ahụhụ, nke gụnyere ịnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, ido onwe ya n’okpuru Chineke wetaara ya ọṅụ. (9 Bible kọwara na ụmụ nwanyị, ma ndị lụrụ di ma ndị na-alụbeghị, kwesịrị ido onwe ha n’okpuru ndị nwoke ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ bụ́ ndị e nyere ọrụ ilekọta ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Timoti 2:12, 13; Ndị Hibru 13:17) Mgbe ụmụ nwanyị gbasoro ntụziaka ahụ Chineke nyere ha, ha na-esetịpụrụ ndị mmụọ ozi ihe nlereanya ha ga-agbaso ná nzukọ Chineke. (1 Ndị Kọrint 11:8-10) Ọzọkwa, ndị inyom lụrụ di bụ́ ndị merela agadi na-eji ezi ihe nlereanya na aro ha akụziri ụmụ agbọghọ ‘ido onwe ha n’okpuru di nke aka ha.’—Taịtọs 2:3-5.
10. Olee otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya n’ihe banyere mmadụ ido onwe ya n’okpuru?
10 Jizọs ghọtara mkpa ọ dị mmadụ ido onwe ya n’okpuru n’ụzọ ziri ezi. N’otu oge, ọ gwara Pita onyeozi ka ọ tụọrọ ndị ọchịchị ụtụ isi nke ha abụọ, ọbụna nye Pita ego ọ ga-eji tụọ ya. Pita mechara dee, sị: “N’ihi Onyenwe anyị, doonụ onwe unu n’okpuru ihe nile mmadụ kere.” (1 Pita 2:13; Matiu 17:24-27) Anyị na-agụ banyere ihe nlereanya magburu nnọọ onwe ya Jizọs setịpụrụ n’ido onwe ya n’okpuru, sị: “O mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi nke mmadụ. Ọzọkwa, mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ọdịdị nke mmadụ, o wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.”—Ndị Filipaị 2:5-8.
11. N’ihi gịnị ka Pita ji gbaa ndị nwunye ume ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ọbụna ndị di ha na-ekweghị ekwe?
11 Mgbe Pita na-agba Ndị Kraịst ume ka ha rubere ọbụna ndị ọchịchị aka ike na-ekpe ikpe na-ezighị ezi nke ụwa a isi, ọ kọwara, sị: “N’eziokwu, ọ bụ n’ụzọ a ka a kpọrọ unu, n’ihi na ọbụna Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Mgbe Pita kọwasịrị otú ahụhụ Jizọs tara si dị ọtụtụ na otú o si doo onwe ya n’okpuru ma die ha, Pita gbara ndị nwunye di ha na-ekweghị ekwe ume, sị: “N’ụzọ yiri nke ahụ, unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.”—1 Pita 3:1, 2.
12. Olee ihe ọma ndị si na Jizọs ido onwe ya n’okpuru pụta?
12 E nwere ike ile onye na-edo onwe ya n’okpuru mgbe a na-emegbu ya emegbu ma na-akparị ya anya dị ka onye na-adịghị ike. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka Jizọs si lee ya anya. Pita dere, sị: “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, ọ nọghị na-eyi egwu.” (1 Pita 2:23) Ụfọdụ n’ime ndị hụrụ ihe ndị Jizọs mere kweere na ya, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ, nke ahụ gụnyekwara onye ohi a kpọgidere n’osisi dịdebere nke ya na onye agha hụrụ mgbe a na-egbu ya. (Matiu 27:38-44, 54; Mak 15:39; Luk 23:39-43) Pita kwukwara ihe gosiri na ụfọdụ ndị di na-ekweghị ekwe—ọbụna ndị na-emegbu nwunye ha—ga-aghọ Ndị Kraịst mgbe ha kirisịrị otú nwunye ha si na-edo onwe ha n’okpuru ha. Nke ahụ na-emekwa taa.
Otú Ndị Nwunye Nwere Ike Isi Mee Ka A Hụ Ha n’Anya
13, 14. Olee otú nwanyị ido onwe ya n’okpuru di ya na-ekweghị ekwe siworo baa uru?
13 Ụmụ nwanyị ghọrọ ndị kwere ekwe ejirila àgwà yiri nke Kraịst rite di ha n’uru. N’otu mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova e mere na nso nso a, otu nwoke kwuru banyere nwunye ya bụ́ Onye Kraịst, sị: “Akpasoro m ya àgwà ọjọọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ kwanyeere m nnọọ ùgwù. Ọ dịtụghị mgbe ọ kparịrị m. Ọ manyeghị m ịnakwere nkwenkwe ya. O ji ịhụnanya lekọta m. Mgbe ọ bụla ọ na-aga mgbakọ, ọ na-agbalịsi ike isicha nri ma rụchaa ọrụ o
nwere n’ụlọ tupu na-aga. Àgwà ya mere ka m malite inwe mmasị na Bible. Ị hụlanụ ebe m nọ ugbu a!” Ee, n’ezie, ‘e ritela ya n’uru n’ekwughị okwu’ n’ihi àgwà nwunye ya.14 Dị ka Pita mere ka ọ pụta ìhè, ihe na-arụpụta ihe abụkarịghị ihe nwanyị kwuru kama ọ bụ ihe ọ na-eme. Anyị na-ahụ nnọọ nke a n’ihe metụtara otu nwanyị mụtara eziokwu Bible ma kpebisie ike ịdị na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Di ya tiiri ya mkpu, sị: “Agnes, i si n’ọnụ ụzọ ahụ pụọ, alọghachila n’ụlọ a!” O sighị “n’ọnụ ụzọ ahụ” pụọ, kama nke ahụ, o si n’ọnụ ụzọ ọzọ. N’ụbọchị ọmụmụ ihe ọzọ, di ya gwara ya, sị: “Ị gaghị ahụ m ma ị lọta.” Ọ hụkwanụghị ya mgbe ọ lọtara—di ya nọrọ abalị atọ tupu na-alọta. Mgbe di ya lọtara, nwanyị ahụ ji obiọma jụọ ya, sị: “Ḿ wetara gị nri?” Ọ dịghị mgbe Agnes lara azụ n’ofufe ọ na-efe Jehova. Di ya mesịrị kwere ka a mụwara ya Bible, rara ndụ ya nye Chineke, mesịakwa ghọọ onye nlekọta nke nwere ọtụtụ ibu ọrụ.
15. Olee ụdị “ịchọ mma” a tụụrụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst lụrụ di n’aro?
15 Pita onyeozi tụrụ aro otu ihe nke ụmụ nwanyị ndị ahụ a kpọrọ aha tinyere n’ọrụ, nke bụ́, “ịchọ mma,” ma ọ bụghị site n’itinyebiga uche ókè ‘n’ịkpa isi’ ma ọ bụ “iyi uwe elu.” Kama nke ahụ, Pita kwuru, sị: “Ka [ịchọ mma unu] bụrụ mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke.” A na-egosipụta mmụọ a site n’ụda olu na àgwà kwesịrị ekwesị, ọ bụghị site n’ịma aka ma ọ bụ isi ọnwụ. N’ihi ya, nwanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịkwanyere di ya ùgwù n’ụzọ miri emi.—1 Pita 3:3, 4.
Ihe Atụ Ndị Anyị Ga-amụrụ Ihe na Ha
16. Olee otú Sera si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst lụrụ di?
16 Pita dere, sị: “N’oge gara aga, otú ahụkwa ka ụmụ nwanyị dị nsọ ndị na-enwe olileanya na Chineke siri chọọ onwe ha mma, na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha.” (1 Pita 3:5) Ụmụ nwanyị dị otú ahụ ghọtara na ime uche Jehova site n’itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ga-emesị mee ka ha nweta obi ụtọ n’ezinụlọ ha na nkwụghachi ụgwọ nke ndụ ebighị ebi. Pita kpọtụrụ Sera aha, bụ́ nwunye ọma Ebreham, kwuo na ọ ‘na-erubere Ebreham isi, na-akpọ ya “onyenwe m.”’ Sera kwadoro di ya na-atụ egwu Chineke, bụ́ onye Chineke kenyere ọrụ ịga jee ozi n’ala dị anya. Ọ hapụrụ ndụ ntụsara ahụ́ ọ na-ebibu, ọbụnakwa tinye onwe ya n’ihe ize ndụ. (Jenesis 12:1, 10-13) Pita gwara ụmụ nwanyị ka ha ṅomie Sera n’ihi obi ike ya ma kwuo, sị: “Unu aghọwokwa ụmụ ya, ma ọ bụrụhaala na unu anọgide na-eme ihe ọma, gharakwa ịtụ egwu ihe ọ bụla na-akpata oké ụjọ.”—1 Pita 3:6.
17. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji bụrụ na Pita bu Abigail n’obi dị ka ihe nlereanya nye ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst lụrụ di?
17 Abigail bụ nwanyị ọzọ na-adịghị atụ ụjọ 1 Samuel 25:2-33.
nke nwere okwukwe na Chineke, o nwekwara ike ịbụ na Pita bukwa ya n’obi. Abigail “nwere ezi uche,” ma di ya bụ́ Nebal “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile.” Mgbe Nebal jụrụ inyere Devid na ndị ikom ya aka, Devid na ndị ikom ya jikeere ịga kpochapụ Nebal na ezinụlọ ya dum. Ma Abigail mere ihe iji chebe ezinụlọ ya. O ji ịnyịnya ibu bukọrọ nri ma zute Devid ka ya na ndị ikom ya jikeere ọgụ na-abịa n’ụlọ ha. Ozugbo ọ hụrụ Devid, ọ rịturu, daa n’ụkwụ ya, ma rịọ ya arịrịọ ka ọ ghara iji obi ọkụ mee ihe. Nke ahụ metụrụ nnọọ Devid n’obi. Devid kwuru, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke Izrel, bụ, Onye zitere gị taa izute m: ihe a gọziri agọzi ka ezi uche gị bụkwa.”—18. Ọ bụrụ na nwoke ọzọ enwee mmasị n’ahụ́ nwanyị lụrụ di, olee ihe nlereanya nwanyị ahụ kwesịrị icheta, n’ihi gịnịkwa?
18 Onye ọzọ bụụrụ ụmụ nwanyị lụrụ di ezi ihe nlereanya bụ nwa agbọghọ Shulam ahụ bụ́ onye nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye onye ọzụzụ atụrụ na-enweghị ka ọ ha ya nke kwerela ya nkwa ịlụ ya. Ịhụnanya o nwere n’ahụ́ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ajụghị oyi n’agbanyeghị mmasị otu eze bara ọgaranya nwere n’ahụ́ ya. O kwuru otú obi dị ya n’ebe nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ nọ, sị: “Tụkwasị m dị ka mgbaaka akara n’obi gị, dị ka mgbaaka akara n’ogwe aka gị: n’ihi na ịhụnanya dị ike dị ka ọnwụ . . . Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri nile agaghị erikpukwa ya.” (Abụ nke Abụ 8:6, 7) Ka ndị nile kweere mmadụ di kpebisiekwa ike ikwesị ntụkwasị obi nye di ha ma na-akwanyere ha ùgwù miri emi.
Ndụmọdụ Ọzọ Sitere n’Aka Chineke
19, 20. (a) Olee ihe mere ụmụ nwanyị kwesịrị iji na-edo onwe ha n’okpuru di ha? (b) Olee ihe nlereanya e setịpụụrụ ụmụ nwanyị lụrụ di?
19 Ná mmechi, tụlee ihe a na-ekwu mgbe e kwuru ihe ahụ dị n’amaokwu Bible isiokwu a dabeere na ya, nke bụ́: “Ndị bụ́ nwunye na-edo onwe [unu] n’okpuru ndị di [unu].” (Ndị Efesọs 5:22) Olee ihe mere o ji dị mkpa ka nwanyị doo onwe ya n’okpuru di ya? Amaokwu sochiri ya kwuru, sị: “N’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” N’ihi ya, a gbara ụmụ nwanyị lụrụ di ume, sị: “Dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst ahụ, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe ọ bụla.”—Ndị Efesọs 5:23, 24, 33.
20 Ka ụmụ nwanyị lụrụ di nwee ike irubere iwu a isi, ọ dị ha mkpa ịmụ ma ṅomie ihe nlereanya nke ọgbakọ Kraịst nke ụmụazụ ya e tere mmanụ. Biko gụọ 2 Ndị Kọrint 11:23-28 ma hụ ebe ahụ ihe otu onye nọ n’ọgbakọ ahụ, bụ́ Pọl onyeozi, diri iji kwesị ntụkwasị obi ya nye Isi ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Dị ka Pọl, ụmụ nwanyị lụrụ di na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ kwesịrị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jizọs. Ndị bụ́ nwunye na-eme nke a site n’ido onwe ha n’okpuru di ha.
21. Olee ihe nwere ike ịkpali ụmụ nwanyị ịnọgide na-edo onwe ha n’okpuru di ha?
21 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ụmụ nwanyị lụrụ di anaghị achọ ịnọ n’okpuru di ha, nwanyị maara ihe ga-atụle uru ndị ọ na-aba. Dị ka ihe atụ, ya bụrụ onye di ya na-ekweghị ekwe, ya ido onwe ya n’okpuru di ya n’ihe nile na-agaghị emebi iwu ma ọ bụ ụkpụrụ Chineke nwere nnọọ ike ịrụpụta ihe bara uru site n’ime ka ọ ‘zọpụta di ya.’ (1 Ndị Kọrint 7:13, 16) Ọzọkwa, ọ ga-enwe obi ụtọ ịmata na obi dị Jehova Chineke ụtọ n’ebe ọ nọ nakwa na ọ ga-agọzi ya maka ịgbaso ezi ihe nlereanya nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.
Ì Chetara?
• Olee ihe mere o nwere ike iji siere nwanyị ike ịkwanyere di ya ùgwù?
• Olee ihe mere ikwere mmadụ di ji bụrụ mkpebi gbara ọkpụrụkpụ?
• Olee otú Jizọs si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ụmụ nwanyị lụrụ di, oleekwa uru ịgbaso ihe nlereanya ya nwere ike ịba?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 19]
Olee ihe mere ikwere mmadụ di ji bụrụ mkpebi gbara ọkpụrụkpụ?
[Foto dị na peeji nke 21]
Olee ihe ụmụ nwanyị lụrụ di nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya nke ndị e kwuru banyere ha na Bible dị ka Abigail?