Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Iji Zere Imebiga Ihe Ókè?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Iji Zere Imebiga Ihe Ókè?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Iji Zere Imebiga Ihe Ókè?

JEHOVA bụ onye kasị emeru ihe n’ókè. “Ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ,” ọ naghịkwa eji obi ọjọọ ekpe ikpe ziri ezi, n’ihi na ikpe ziri ezi ya na-agụnye ebere mgbe nile. (Deuterọnọmi 32:4) Ọ dịghị mgbe ọ na-egosi ịhụnanya ya aghara aghara, n’ihi na ọ na-eme ihe kwekọrọ n’iwu ya zuru okè. (Abụ Ọma 89:14; 103:13, 14) E kere nne na nna anyị mbụ imeru ihe n’ókè n’ihe nile. Ha enweghị ọchịchọ nke imebiga ihe ókè. Otú ọ dị, mmehie webatara “ọrụ”—ya bụ ezughị okè—nke mere ka ha kwụsị imeru ihe n’ókè.—Deuterọnọmi 32:5.

Dị ka ihe atụ: Ị̀ nọtụla n’ụgbọala ma ọ bụ igwe nke nwere ebe taya ya fụliri nnọọ elu? Ọ ghaghị ịbụ na nsogbu ahụ o nwere mere ka njem ahụ ghara ịga werewere. Ọ ga-adị mkpa ka a rụọ taya ahụ ọrụ tupu nsogbu ya aka njọ ma ọ bụ ya agbawaa. N’otu aka ahụ, ezughị okè anyị na-eduga anyị n’ime ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị ahapụ “ebe ndị ahụ fụliri elu” ka ha nọgide na-afụli, njem anyị na-eme ná ndụ agaghị nnọọ na-aga werewere, ọ ga-adịdị ize ndụ.

Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike imebiga ihe ziri ezi anyị na-eme ókè. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na Iwu Mozis kwuru ka ndị Izrel kwanye ihe dị yọghịrị yọghịrị n’ọnụ ọnụ uwe ha, ndị Farisii n’oge Jizọs, bụ́ ndị chọrọ ka ha pụọ nnọọ iche n’ebe ọha mmadụ nọ, ‘mere ka ọnụ ọnụ uwe ha sakwuo mbara’ gabiga ókè. Ihe ha bu n’uche eme nke a bụ ka ha yie ndị dị nsọ karịa ibe ha. —Matiu 23:5; Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40.

Taa, ụfọdụ ndị mmadụ na-eme ihe ọ bụla ha hụrụ iji mee ka a hụ ha, ọbụna na-eme ihe ndị ga-awụ ndị ọzọ akpata oyi n’ahụ́. Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ihe ha ji nke a na-eme bụ iti mkpu, sị: “Hụkwanụnụ m! Abụkwanụ m mmadụ ka ibe m!” Ma, Onye Kraịst imebiga ihe ókè n’ihe banyere ejiji, àgwà, na omume ya agaghị egboro ya nnọọ mkpa ya.

Ile Ọrụ Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Onye ọ sọrọ anyị bụrụ, na ebe ọ sọrọ anyị biri, ịrụ ọrụ kwesịrị ekwesị bụ otu ihe na-enye aka eme ka anyị nwee obi ụtọ ná ndụ. E kere anyị inweta afọ ojuju n’ọrụ dị otú ahụ. (Jenesis 2:15) N’ihi ya, Bible katọrọ umengwụ. Pọl onyeozi kwuru hoo haa, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) N’ezie, mmadụ ịdị umengwụ n’ọrụ nwere ike ịkpata ịda ogbenye na enweghị afọ ojuju, meekwa ka Chineke ghara ịgọzi onye ahụ.

Ihe ọtụtụ ndị na-emekwanụ bụ ịrụbiga ọrụ ókè, mara ụma mee onwe ha ohu nke ọrụ ha. Ndị na-ahapụ ụlọ ha n’isi ụtụtụ ma lọta n’uhuruchi nwere ike iche na ọrụ ha na-arụ bụ nnọọ maka ọdịmma ezinụlọ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ezinụlọ ha nwere ike ịdị na-ata ahụhụ n’ihi ọrụ ahụ ha na-arụbiga ókè. Otu nwanyị di ya na-anaghị alọta ọrụ ngwa ngwa kwuru, sị: “Mmadụ sị m nye ya ihe nile dị ná nnukwu ụlọ anyị a ka di m nwee ike ịdị na-anọnyere mụ na ụmụ anyị, m ga-eji obi ụtọ nye ya ha.” Ndị họọrọ ịdị na-arụbiga ọrụ ókè kwesịrị ichebara nnọọ ihe Eze Solomọn chọpụtara n’onwe ya echiche, nke bụ́: “Mụ onwe m wee chee ọrụ m nile nke aka m abụọ rụrụ ihu, echekwara m ndọgbu nke m dọgburu onwe m n’ọrụ ime ihu: ma, lee, ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 2:11.

Ee, n’ihe banyere ọrụ, anyị aghaghị izere ma ịdị umengwụ ma ịrụbiga ọrụ ókè. Anyị pụrụ ịbụ ndị na-arụsi ọrụ ike, ma buru n’obi na anyị ịbụ ohu ọrụ ga-anapụ anyị obi ụtọ na ma eleghị anya ihe karịrị ya.—Eklisiastis 4:5, 6.

Zere Ikporibiga Ndụ Ókè

Bible buru amụma banyere oge anyị a, sị: “Ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:2, 4) Ịchụso ihe ụtọ abụrụla otu n’ime ngwá ọrụ kasị dị irè Setan ji eme ka ndị mmadụ gbakụta Chineke azụ. Ọtụtụ ndị etinyela isi ná ntụrụndụ, dị ka ihe atụ site n’igwu egwuregwu ndị nwere ike igbu mmadụ. Ụdị egwuregwu ndị ahụ na-amụba amụba, ọnụ ọgụgụ ndị na-egwu ha na-amụbakwa. Gịnị mere o ji na-ewu ewu otú ahụ? Ọtụtụ ndị na-adịghị enwe afọ ojuju n’ihe ndị ha na-eme ná ndụ na-achọ ihe ga-aka eme ha obi ụtọ. Ịnọgide na-enwe obi ụtọ dị otú ahụ na-achọkarị mmadụ itinyekwu ndụ ya n’ihe ize ndụ. Ndị Kraịst na-eji nlezianya eme ihe na-ezere egwuregwu ndị dị ize ndụ n’ihi na ha na-akwanyere ndụ na Onye nyere ya ùgwù.—Abụ Ọma 36:9.

Mgbe Chineke kere mmadụ abụọ mbụ, ebee ka o dowere ha? O dowere ha n’ogige Iden, nke pụtara n’asụsụ mbụ e ji dee Bible “Ikpori Ndụ,” ma ọ bụ “Ihe Ụtọ.” (Jenesis 2:8) N’eziokwu, ikpori ndụ, na inweta ihe ụtọ so n’ihe Jehova zubere maka ụmụ mmadụ.

Jizọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè ma a bịa n’ile ihe ụtọ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. O ji obi ya nile mee uche Jehova, ọ dịtụghị mgbe ọ kwụsịrị ibi ndụ kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ Chineke. O wepụtara ohere iji nyere ndị nọ ná mkpa aka, ọbụnadị mgbe ike gwụrụ ya. (Matiu 14:13, 14) Ee, Jizọs zara òkù ndị a kpọrọ ya ịbịa rie nri, wepụtakwa oge iji zuru ike ma kporie ndụ. Otú ọ dị, ọ maara na ụfọdụ ndị iro ya na-ele ya anya ọjọọ n’ihi ihe ndị a ọ na-eme. Ha kwuru banyere ya, sị: “Lee! Onye na-eri oké nri, nke na-aṅụkwa oké mmanya.” (Luk 7:34; 10:38; 11:37) Ma Jizọs ekwetaghị na mmadụ ife Chineke ezi ofufe na-anapụ onye ahụ ihe ụtọ nile ná ndụ.

Ọ ga-abụrụ anyị nnọọ ihe amamihe izere imebiga ihe ókè n’ihe banyere ntụrụndụ. Iwere ihe ụtọ na ntụrụndụ dị ka ihe mbụ ná ndụ adịghị mgbe ọ ga-eme ka anyị nweta ezi obi ụtọ. O nwere ike ime ka anyị leghara ihe ndị ka mkpa anya, nke gụnyere mmekọrịta anyị na Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwesịghị ịnapụ onwe anyị ihe ụtọ nile ma na-akatọ ndị na-ekpori ndụ n’ụzọ na-agabigaghị ókè.—Eklisiastis 2:24; 3: 1-4.

Nweta Obi Ụtọ Site n’Ịghara Imebiga Ihe Ókè

Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Anyị nwere ike ịsụ ngọngọ otú ahụ Jems kwuru mgbe anyị na-agba mbọ izere imebiga ihe ókè. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-emeru ihe n’ókè? Ọ dị anyị mkpa ịmata ebe ndị anyị na-emezi na ebe ndị na-esiri anyị ike. Ọ naghị adị mfe mmadụ ịgwa onwe ya eziokwu otú ahụ. Anyị nwere ike ịmalite imebigawa ihe ókè n’amaghị ama. Mgbe ahụ, ọ ga-abụrụ anyị amamihe ịdị na-akpa Ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè nso ma na-anabata ndụmọdụ ha. (Ndị Galeshịa 6:1) Anyị nwere ike ịgakwuru enyi anyị tụkwasịrị obi ma ọ bụ okenye nwerela ahụmahụ ka o nye anyị ndụmọdụ dị otú ahụ. Akwụkwọ Nsọ na ndụmọdụ ndị ahụ dabeere na Bible anyị nwetara nwere ike ịbụrụ anyị “enyo” anyị ga-eji hụ otú anyị dị nnọọ n’ihu Jehova.—Jems 1:22-25.

Anyị nwere obi ụtọ ịmara na anyị nwere ike izere imebiga ihe ókè. Site ná mgbalị siri ike anyị na-eme na nkwado Jehova, anyị pụrụ ịbụ ndị na-emeru ihe n’ókè, na ndị nwere obi ụtọ. Nke ahụ nwere ike ime ka mmekọrịta nke anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ka mma, anyị pụkwara ịbụ ndị nlereanya ka mma nye ndị anyị na-ekwusara ozi ọma. Karịsịa, anyị ga-eṅomikwu Chineke anyị na-emeru ihe n’ókè na nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova.—Ndị Efesọs 5:1.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]

©Greg Epperson/age fotostock