Ọ̀ Dị Ihe O Mere Ma Ị Họrọ Okpukpe Ọ Bụla Masịrị Gị?
Ọ̀ Dị Ihe O Mere Ma Ị Họrọ Okpukpe Ọ Bụla Masịrị Gị?
Ọ NA-AMASỊ ọtụtụ n’ime anyị inwe ọtụtụ ihe ndị anyị ga-esi na ha họrọ ihe mgbe anyị gara ịzụ ihe n’ahịa. Ọ bụrụ na anyị agaa ịzụ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri n’ahịa, anyị na-ahọrọ ndị nke na-akasị amasị anyị na ezinụlọ anyị. Ọ bụrụ na e nwee ụdị uwe dịgasị iche iche na ndị nwere àgwà dị iche iche n’ebe anyị gara ịzụ ákwà, anyị pụrụ ịhọrọ ndị ga-akasị adị anyị mma n’ahụ́. Ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị na-ahọrọ ná ndụ bụ nanị n’ihi na ha masịrị anyị. Ma, ihe ndị ọzọ anyị na-ahọrọ na-emetụta ndụ anyị, dị ka ihe atụ, anyị ịhọrọ iri nri ndị na-edozi ahụ́ ma ọ bụ ịhọrọ ezigbo ndị enyi. Oleekwanụ maka ụdị okpukpe anyị họọrọ? Ànyị kwesịrị ile otú anyị ga-esi na-efe Chineke anya dị ka ihe anyị nwere nnọọ ike ịhọrọ nke dị anyị mma? Ka ọ̀ bụ ihe metụtara nnọọ ndụ anyị?
E nwere ọtụtụ okpukpe mmadụ nwere ike isi na ha họrọ nke ọ ga-ekpe. N’ọtụtụ mba taa, ndị mmadụ nweere onwe ha ịhọrọ okpukpe ha chọrọ, nke a na-emekwa ka ọtụtụ mmadụ nwere onwe ha ịhapụ okpukpe ndị mụrụ ha na-ekpe ma họrọ nke ha. N’otu nnyocha e mere na United States, a chọpụtara na e kee ndị America ụzọ iri, ụzọ asatọ n’ime ha “kweere na ọ bụghị nanị otu okpukpe na-eduga ná nzọpụta.” N’otu nnyocha ahụ e mere, e kwukwara na, “otu onye n’ime mmadụ ise a gbara ajụjụ kwuru na ha esila n’otu okpukpe gafee n’ọzọ kemgbe ha tolitere.” Nnyocha e mere na Brazil gosiri na ọ bụrụ na e kee ndị Brazil ụzọ anọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ agbanweela okpukpe ha.
N’oge mbụ, ndị mmadụ na-arụrịta ụka banyere ọdịiche dị na nkwenkwe otu okpukpe na ibe ya. Ugbu a, ihe ndị mmadụ na-ekwukarị bụ, ‘Okpukpe mmadụ họọrọ ịga abụghị ya bụ isi.’ Ma, nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Okpukpe ị họọrọ ọ̀ pụrụ imetụta ndụ gị?
Dị nnọọ ka ọ bụ ihe amamihe dị na ya na onye bịara ịzụ ihe ga-ajụ ajụjụ banyere ebe ihe ọ chọrọ
ịzụ sitere, otú ahụ ka ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ịjụ, sị: ‘Olee otú okpukpe nile a e nwere n’ụwa si malite, gịnịkwa mere ha ji malite?’ Bible zara ajụjụ ndị a.Olee Otú Okpukpe Dị Iche Iche Si Malite?
N’Izrel oge ochie, ihe dị ka otu puku afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, Eze Jeroboam hiwere otu okpukpe ọhụrụ. Jeroboam bụ eze mbụ nke alaeze ebe ugwu nke Izrel. O nwere ọrụ tara akpụ ọ ga-arụ, nke bụ́ ime ka ndị obodo ya kwadosie ọchịchị ya ike. “Eze wee mee ka a dụọ ya ọdụ, o wee mee ụmụ ehi abụọ nke ọlaedo; ọ sị ha, Unu arịgozuwo Jeruselem; lee chi gị, Israel, ndị mere ka i si n’ala Ijipt rịgopụta.” (1 Ndị Eze 12:28) O doro anya na eze ahụ chọrọ iji okpukpe mee ka ndị ọ na-achị kwadosie ọchịchị ya ike site n’igbochi ha ịga Jeruselem, bụ́ ebe ha na-aga efe Chineke. Okpukpe ahụ Jeroboam hiwere nọrọ ọtụtụ narị afọ ma kpatara ọtụtụ nde mmadụ ọnwụ mgbe Chineke mesịrị kpee mba Izrel ahụ kwụsịrị ife ya ofufe ikpe. Ihe mere Jeroboam ji hiwe okpukpe a o hiwere bụ ka ọchịchị ya wee kwụsie ike. Ihe mekwara e ji hiwe ọtụtụ okpukpe ndị bụ́ isi e nwere n’ọtụtụ mba taa bụ ka ọchịchị mba ndị ahụ kwụsie ike.
Pọl onyeozi kwuru ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji ehiwe okpukpe, mgbe o kwuru, sị: “Amaara m na mgbe m pụsịrị, nkịta ọhịa ndị obi tara mmiri ga-abata n’etiti unu, ha agaghịkwa emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro, ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie ma na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:29, 30) Ndị ọchịchị dị mpako na-ehiwekarị okpukpe n’onwe ha iji meere onwe ha aha. Ndị mmadụ na-esi na chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst dọwara ma gaa hiwe chọọchị nke ha.
Ònye Ka Okpukpe Na-achọ Ime Ihe Na-amasị Ya?
Ụfọdụ na-ehiwekarị okpukpe iji mee ihe dị ọha mma. Dị ka ihe atụ, otu magazin kọrọ akụkọ banyere chọọchị ụfọdụ ndị e lere anya na ha kạ ibe ha na United States. Magazin ahụ kwuru na chọọchị ndị a na-amụba n’ike n’ike n’ihi na ha “kweere na ha kwesịrị ịdị na-emeta ndị òtù ha mma mgbe nile ma ọ bụrụ na ha chọrọ inwe ọganihu, dị nnọọ ka ndị ọchụ nta ego kweere na ọ dị oké mkpa imeta ndị ahịa ha mma.” Ụfọdụ “na-eme ka chọọchị ha na-ekwo ekwo site n’itinyere ha vidio, na-emere ha ihe nkiri ma na-akụrụ ha egwu ndị na-ewu ewu.” Ụfọdụ ndị ndú nke chọọchị ndị a na-asị na ha na-akụziri ndị chọọchị ha ka e si “aba ọgaranya na ihe ha ga-eme ahụ́ ana-adị ha mma nakwa otú ha ga-esi ghara ịdị na-echegbu onwe ha.” Magazin ahụ kwukwara na ọ bụ ezie na a na-akatọ chọọchị ndị a na ha aghọziela ụlọ ọrụ na-eme ihe ntụrụndụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị na-enyere ndị mmadụ aka igbo mkpa ha, nke bụ́ eziokwu bụ na ha na-eme ihe ndị òtù ha chọrọ. Ná mmechi, magazin ahụ kwuru, sị: “Ijikọta okpukpe na achụmnta ego enweela nnọọ ihe ịga nke ọma pụtara ìhè.”
Ọ bụ ezie na okpukpe ndị ọzọ anaghị ekwe ka ọ pụtachaa ìhè na ha na-achụ nta ego, chọọchị ndị na-eme ihe dị ọha mma na-echetara anyị ịdọ aka ná ntị Pọl. O dere, sị: “N’ihi na a ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ; ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gaa n’akụkọ ụgha.”—2 Timoti 4:3, 4.
Ebe ọ bụ na ihe mere e ji hiwe ọtụtụ okpukpe bụ n’ihi na ndị hiwere ha chọrọ ime ka ọchịchị ha kwụsie ike, ka a na-anụ aha ha anụ, nakwa iji mee ihe na-amasị ọha mmadụ kama ime ihe na-amasị Chineke, ọ bụghị ihe iju anya na okpukpe na-etinye aka n’ihe ọjọọ ndị dị ka imetọ ụmụaka, igwu wayo, agha, ma ọ bụ iyi ọha egwu. Ọtụtụ mgbe, okpukpe na-eduhie ndị mmadụ. Olee otú ị ga-esi zere ịbụ onye e duhiere?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Ihe mere e ji hiwe ọtụtụ okpukpe bụ n’ihi na ndị hiwere ha chọrọ ime ka ọchịchị ha kwụsie ike, ka a na-anụ aha ha anụ, nakwa iji mee ihe na-amasị ọha mmadụ kama ime ihe na-amasị Chineke