Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Banyere Africa

Akụkọ Banyere Africa

Akụkọ Banyere Africa

Ọnụ Ọgụgụ Ala: 57

Ọnụ Ọgụgụ Mmadụ: 802,232,357

Ọnụ Ọgụgụ Ndị Nkwusa: 1,043,396

Ọnụ Ọgụgụ Ọmụmụ Bible: 1,903,665

Rwanda Afọ ole na ole gara aga, ndị mmadụ na-agafe agafe hụrụ akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’okporo ụzọ. Ha wegaara ya otu onyeisi ha na chọọchị Protestant. O weturu nnọọ obi ala gụọ akwụkwọ ahụ, ma chọwa Ndịàmà Jehova ka ọ gụsịrị ya. Ha malitere ịmụrụ ya Bible. Ọ bịara mụta nnọọ ọtụtụ ihe na Bible. Nke a mekwara ka ọ kwụsị ịga chọọchị Protestant ma mee baptizim. Ka a na-amụrụ ya ihe, o ji ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị chọọchị ya mbụ ahụ eziokwu ndị ọ na-amụta na Bible. Nke a mekwara ka mmadụ iri abụọ na ise hapụ chọọchị ahụ ma ghọọ Ndịàmà Jehova. Ndịàmà mụwakwaara onye nọchiri ya dị ka onyeisi na chọọchị ahụ Bible. O mesịkwara si na chọọchị ahụ pụọ. Ọ na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ugbu a, o kwukwaala na ya chọrọ ịghọ onye nkwusa. E mere nwunye ya baptizim ná mgbakọ pụrụ iche e nwere n’oge na-adịbeghị anya. Ọ bụ nnọọ ihe ịtụnanya na ihe kpatara ihe a nile bụ otu akwụkwọ a hụrụ n’okporo ụzọ!

Côte d’Ivoire Ka otu Onyeàmà na-eto eto aha ya bụ́ Berenger na-aga isi obodo Côte d’Ivoire bụ́ Abidjan iji soro gaa ozi ọma, ọ gafere otu nwanyị na-ere bred. Nwanyị ahụ amaghị mgbe otu akwụkwọ ego puku-francs ise (nke bụ́ dọla iri n’ego ndị United States) ji dapụnahụ ya. Ozugbo Berenger tụtụlitere ego ahụ ka o wegara ya nwanyị ahụ, otu nwanyị si ebe ọzọ gbọjara ya, sị, “Nye m ego ahụ, ọ bụ nke m!” Ma mgbe Berenger jụrụ nwanyị ahụ ego ole dapụnahụrụ ya, nwanyị ahụ were iwe ma pụwa. Berenger chụrụziiri nwanyị ahụ ego ya dapụrụ gawa. Ma ọ tụrụ Berenger n’anya mgbe nwanyị ahụ kwuru na ọ dịghị ego dapụnahụrụ ya na ọ bụ ụzọ aghụghọ Berenger chọọrọ isi zuo ya ohi. Ma mgbe nwanyị ahụ hụrụ na Berenger ka nọgidere na-ekwu na ọ bụ ya nwe ego ahụ, o lere anya n’ebe o tinyere ego ya ma chọpụta na puku francs ise, nke bụ́ ego ogbe bred iri ise, na-efu n’ego ya.

Berenger kwuru, sị: “Enyere m ya ego ahụ ma gwa ya na ihe mere m ji nyeghachi ya ego a bụ n’ihi na Chineke m bụ́ Jehova na-akụziri ndị ohu ya ka ha na-eme ihe n’eziokwu. O kelere m ma kwuo, sị: ‘A sị na mmadụ nile na-akpa àgwà ka Ndịàmà Jehova, o nweghị onye ya na ibe ya ga-adị n’iro. Nke a bụ mbụ m na-ahụ ebe onye na-eto eto kpara àgwà otú a.’ Enyere m ya traktị, ya ekwekwa m nkwa na ya ga na-ege Ndịàmà Jehova ntị site n’oge ahụ gaa n’ihu. N’ụbọchị ahụ, nanị ihe dị m n’akpa bụ francs iri ise. Ma obi dị m ụtọ na emere m ihe m kwesịrị ime.”

Democratic Republic of Congo Eugene, bụ́ okenye ọgbakọ, na-arụ ọrụ idebe ihe ọcha na iche nche n’ebe a na-ere daịamọnd. O kwuru, sị: “N’otu uhuruchi, otu nwoke ji daịamọnd ọnụ ego ha ruru ihe dị ka iri puku dọla abụọ na abụọ (n’ego ndị United States) bịa iresị ndị ụlọ ahịa anyị. Ma ọ maghị na ihe e ji tinye daịamọnd ndị ahụ esila n’akpa uwe ya dapụ. O ji anya ọnwụ chọgharịa ya ebe nile ma ọ hụghị ya. N’echi ya, ọga ya na onye ọrụ ibe ya chọgharịrị daịamọnd ndị ahụ n’okporo ámá nile ma ha ahụghị ha. Ka m nọzi na-aza èzí, lekwa daịamọnd ndị ahụ n’ihu ụlọ ahịa anyị! Atụtụlitere m ha ma gbara gaa nye ya ọga m bụ́ onye Belgium. Ihe a m mere tụrụ ya nnọọ n’anya. Agwara m ya na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa na m na-atụ egwu Chineke m. Mgbe onye nwe daịamọnd ndị ahụ bịara, ihe a merenụ metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu nke na o kwuru sị: ‘Apụghị m ikweta na nke a nwere ike ime eme!’

“Otu onye ọrụ ibe m gwara m, sị, ‘Eugene, i meela ka aha anyị ghara isi ísì!’

“Azara m ya, sị: ‘Ndewo! Ma otuto nile ga-agara Jehova, n’ihi na ọ bụ ya kụziiri m ịdị na-eme ihe n’eziokwu.’”

Angola Ka João, bụ́ onye nlekọta sekit na-eje ozi n’ala ọzọ na-eleta otu ime ime obodo, ọ chọrọ igosi ụmụnna ndị bi ebe ahụ nakwa ndị nwere mmasị DVD ahụ bụ́ Noah Walked With God—David Trusted in God. O bu kọmputa a na-ebu n’apata ụkwụ, obere ígwè na-enye ọkụ, ígwè abụọ na-ewepụta ụda, na mmanụ ụgbọala gaa ebe ahụ. Mgbe o rutere n’obodo nke mbụ, o nwetara otu obere ụlọ ájá ebe ọ ga-ebi, ma mee ndokwa igosi ndị mmadụ vidio ahụ n’ime abalị. O kwuru, si: “Ọ tụrụ m nnọọ n’anya na ihe dị ka mmadụ iri atọ na asatọ bịara. Ụfọdụ bu oche ha ga-eji nọdụ ala, ndị ọzọ bu bench, nnukwu okwute, kom kom na ihe ndị ọzọ ha ga-eji anọdụ ala. Anyị nọzi n’èzí kirie vidio ahụ n’ihi na ụlọ ahụ enweghị ohere ga-aba ọbụna ọkara ndị bịaranụ. Ebe ọ bụ na ọnwa na-agba, adọtara m kọmputa ahụ n’elu aja akpụrụ akpụ, ọtụtụ n’ime ndị bịaranụ tụrụ ọmarịcha akwa n’ala ma nọdụ na-ekiri vidio ahụ.” Akụkọ banyere ya gbasara ebe nile ngwa ngwa nke na ọtụtụ ndị gara n’obodo ndị ọzọ João letara iji kirie vidio ahụ. Nwanna João kwuru, sị: “Ọ na-abụ ha kirichaa vidio ahụ, ọ dịghị onye n’ime ha na-achọkwa ịla ala. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na abalị ahụ bụ abalị kasị mma ha hụtụrụla ná ndụ ha ma kelee nnọọ Jehova n’ihi vidio ahụ.” N’ime izu atọ ahụ nwanna João jiri leta ndị bi n’ime ime obodo ahụ, otu puku mmadụ na narị ise na iri isii na asatọ kiriri vidio ahụ!

Ghana Obi esichaghị Vida, bụ́ onye na-azụ ahịa ihe oriri n’Accra, ike ibugara alaka ụlọ ọrụ dị na Ghana akwụkwọ nri. Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n’ihi na pastọ ya gwara ya na Ndịàmà adịghị emeso ndị na-abụghị Ndịàmà ibe ha omume ọma. N’ihi ya, mgbe mbụ Vida buteere alaka ụlọ ọrụ ngwá ahịa, ọ tụrụ ya n’anya mgbe ndị na-arụ na kichin jiri ihu ọchị na olu ọma kelee ya maka ihe o buteere ha. N’izu ndị sochirinụ, ọ bịara mata ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ nke ọma, ọ bịakwara chọpụta na onye nke ọ bụla n’ime ha na-emeso ya ihe n’obiọma, chọpụtakwa na ihe pastọ ya gwara ya banyere Ndịàmà abụghị eziokwu.

N’agbanyeghị na Vida amaghị akwụkwọ, ọ rịọrọ ka a malite ịmụrụ ya Bible n’ihi na ọ chọrọ ịmatakwu banyere Ndịàmà Jehova. N’ime ọnwa isii, Vida mụtara ịgụ Bible, e mekwara ya baptizim ná mgbakọ distrikti e nwere n’oge na-adịbeghị anya. N’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ya na ndị chọọchị ahụ ọ na-agabu na-akwa ya emo, Vida enyerela nwa nwanne mama ya aka ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

Etiopia Otu nwoke aha ya bụ Awoke enwechaghị nnọọ mmasị n’eziokwu Bible n’agbanyeghị na o ruola afọ iri nwunye ya bụ Onyeàmà. Ma mgbe ọ gara ọzụzụ ga-ewe ọnwa abụọ n’obodo ọzọ, o kpebiri ịchọ Ndịàmà. Mgbe o rutere ma jụọ ase, a kpọgara ya n’ọfịs ebe otu nwanna nwanyị na-arụ ọrụ. Nwanna nwanyị ahụ anọwo na-ekpe ekpere ka a kpọta nwanna nwoke ga-enyere ọgbakọ nọ n’ebe ahụ aka. Mgbe a gwara ya na e nwere otu nwoke na-ajụ ase Ndịàmà Jehova, o chetara ekpere ahụ o kpere. Mgbe ọ hụrụ Awoke, bụ́ onye jiri ejiji dị mma, o kwubiri na ọ bụ nwanna nwoke ahụ ya kpere ekpere ka a kpọta. O jiri ọṅụ gbakwuru Awoke ma kelee ya nke ọma. N’ihi ụdị ọṅụ nwanna nwanyị a nwere, obi ekweghị Awoke gwa ya na ya abụghị Onyeàmà, ọ chọghịkwa imenye nwanna nwanyị ahụ ihere mgbe ọ na-akọwara ụmụnna onye ọ bụ. Awoke gazuru ọmụmụ ihe nile n’oge ahụ ọ nọrọ ebe ahụ. Mgbe ọzụzụ ya ahụ gwụrụ ya achọọ ịla, ụmụnna nwanyị ụfọdụ kpọrọ ya oriri, ha gwakwara ya ka o duo ha n’ekpere. O chetara otú nwunye ya si ekpuchi isi ekpe ekpere site n’aha Jizọs ma ha chọọ iri nri n’ụlọ. O si otú ahụ kpee ekpere ha ji rie nri ahụ. Otú ụmụnna si gosi Awoke obiọma n’oge nile ahụ ọ nọ n’ebe ahụ metụrụ ya n’ahụ́, ya ekpebiekwa ịghọzi nwanna n’ezie. Mgbe ọ lọghachiri n’ụlọ ya, o kpebiri ịmụ Bible, e mekwara ya baptizim ná mgbakọ e nwere ná nso nso a. Nwunye ya na-aṅụrịzi nnọọ ọṅụ, Awoke na-atụkwa anya mgbe ohere ga-adapụta ka ọ kọọrọ ndị ọgbakọ ebe ahụ ọ gara otú ihe nile si mee.