Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bie Ndụ Obi Ụtọ Site n’Ịtụ Egwu Jehova

Bie Ndụ Obi Ụtọ Site n’Ịtụ Egwu Jehova

Bie Ndụ Obi Ụtọ Site n’Ịtụ Egwu Jehova

“Tụọnụ egwu Jehova, unu ndị nsọ Ya: n’ihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị na-atụ egwu Ya.”—ABỤ ỌMA 34:9.

1, 2. (a) Olee ụzọ dịgasị iche iche Krisendọm siworo lee ịtụ egwu Chineke anya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

NDỊ ụkọchukwu Krisendọm na-akụziri ndị mmadụ ịtụ egwu Chineke site n’ịkụziri ha ozizi na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ ebeghị ebi n’ọkụ ala mmụọ. Ozizi dị otú a megidere ihe Bible na-akụzi nke bụ́ na Jehova bụ Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya na onye na-ekpe ikpe ziri ezi. (Jenesis 3:19; Deuterọnọmi 32:4; Ndị Rom 6:23; 1 Jọn 4:8) Ndị ụkọchukwu Krisendọm ndị ọzọ na-akụzi ihe dịwaga nnọọ iche. Ha adịghị akụzi ihe ọ bụla banyere ịtụ egwu Chineke. Kama nke ahụ, ha na-akụzi na Chineke na-anabata onye ọ bụla n’agbanyeghị ụdị ndụ onye ahụ na-ebi. Nke ahụ abụghịkwa ihe Bible na-akụzi.—Ndị Galeshia 5:19-21.

2 N’ezie, Bible na-agba anyị ume ka anyị na-atụ egwu Chineke. (Mkpughe 14:7) Nke a na-ewelite ajụjụ ụfọdụ. N’ihi gịnị ka Chineke nke na-ahụ n’anya ga-eji chọọ ka anyị na-atụ egwu ya? Ụdị egwu dị aṅaa ka Chineke chọrọ ka anyị na-atụ ya? Olee otú ịtụ egwu Chineke pụrụ isi baara anyị uru? Anyị ga-elebara ajụjụ ndị a anya ka anyị na-aga n’ihu n’ịtụle Abụ Ọma nke 34.

Ihe Mere A Ga-eji Na-atụ Egwu Chineke

3. (a) Olee otú i si ele iwu ahụ e nyere anyị ka anyị tụọ egwu Chineke anya? (b) N’ihi gịnị ka ndị na-atụ egwu Jehova ji enwe obi ụtọ?

3 Jehova kwesịrị ka a tụọ egwu ya n’ihi na ọ bụ ya bụ Onye kere ihe nile na Eze Na-achị Eluigwe na Ala. (1 Pita 2:17) Otú ọ dị, nke a abụghị oké ụjọ nke a na-atụ chi obi tara mmiri. Ọ bụ nsọpụrụ miri nnọọ emi anyị na-enye Jehova n’ihi ụdị onye ọ bụ. Ọ bụkwa ịtụ egwu ime ihe na-ewute ya. Ịtụ egwu Chineke na-eme ka ihe dịrị anyị mma, ọ dịghị akụda anyị mmụọ ma ọ bụ menye anyị ụjọ. Jehova, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ,” chọrọ ka ụmụ mmadụ o kere eke nwee obi ụtọ ná ndụ. (1 Timoti 1:11) Otú ọ dị, iji nwee obi ụtọ, anyị aghaghị ibi ndụ dị ka Chineke si chọọ. Nke a pụrụ ịchọ ka ọtụtụ ndị gbanwee otú ha si ebi ndụ. Ndị nile mere mgbalị dị otú ahụ na-achọpụta na ihe ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma: onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke na-agbaba n’ime Ya. Tụọnụ egwu Jehova, unu ndị nsọ Ya: n’ihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị na-atụ egwu Ya.” (Abụ Ọma 34:8, 9) Ọ dịghị ihe ọ bụla bara uru na-adịgide adịgide nke na-akọ ndị nile na-atụ egwu Jehova n’ihi na ha na Chineke dị n’ezigbo mma.

4. Olee okwu Devid na Jizọs ji mesie ndị mmadụ obi ike?

4 Rịba ama na dị ka ọ dị taa, Devid kwanyeere ndị ya na ha so ùgwù site n’ịkpọ ha “ndị nsọ.” Ha so ná mba dị nsọ nke Chineke. Ha tinyekwara ndụ ha n’ihe ize ndụ site n’iso Devid. Ọ bụ ezie na ha na-agba ọsọ ka Eze Sọl ghara igbu ha, obi siri Devid ike na Jehova ga-anọgide na-egboro ha mkpa ha. Devid dere, sị: “Mkpa akpawo ụmụ ọdụm, agụụ agụwokwa ha: ma ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ezi ihe ọ bụla ga-akọ ha.” (Abụ Ọma 34:10) Jizọs gwakwara ụmụazụ ya okwu yiri nke a na-emesi obi ike.—Matiu 6:33.

5. (a) Ụdị ndị dị aṅaa ka ọtụtụ n’ụmụazụ Jizọs bụ? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jizọs nyere n’ihe banyere ịtụ egwu?

5 Ọtụtụ ndị gere Jizọs ntị bụ ndị Juu na-enweghị ka ọ ha ha na ndị e ledara anya. N’ihi ya, Jizọs “nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ndị dị otú ahụ na-enweghị ka ọ ha ha, hà ga-akata obi sowe Jizọs? Iji mee otú ahụ, ha ga-amụta ịtụ egwu Jehova, ọ bụghị egwu mmadụ. Jizọs kwuru, sị: “Unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ́, e mesịakwa ha enweghị ike ime ihe ọ bụla ọzọ. Ma aga m egosi unu onye unu ga-atụ egwu: Tụọnụ onye ahụ egwu, bụ́ onye nwere ikike ịtụba mmadụ na Gehena ma o gbusịa ya. Ee, asị m unu, tụọnụ Onye a egwu. A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụta nanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke. Ma a gụwo ọbụna ntutu isi nile unu ọnụ. Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Luk 12:4-7.

6. (a) Olee ihe Jizọs kwuru nke na-ewusi okwukwe Ndị Kraịst ike? (b) Olee otú Jizọs si bụrụ onye nlereanya kasịnụ mgbe a bịara n’ịtụ egwu Chineke?

6 Mgbe ndị iro ndị Jehova na-agbalị ime ka ndị Chineke kwụsị ijere ya ozi, ha pụrụ icheta ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Onye ọ bụla nke na-ekwupụta na mụ na ya dị n’otu n’ihu ndị mmadụ, Nwa nke mmadụ ga-ekwupụtakwa na ya na ya dị n’otu n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke. Ma onye na-agọnarị m n’ihu ndị mmadụ ka a ga-agọnarị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.” (Luk 12:8, 9) Okwu ndị a ewusiela okwukwe Ndị Kraịst ike, karịsịa ndị nke nọ ná mba ebe a machibidoro ha iwu ife Jehova. Ndị Kraịst ndị a na-anọgide jiri akọ na-eto Jehova ná nzukọ Ndị Kraịst nakwa mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 5:29) Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma ma a bịa ‘n’ịtụ egwu Chineke.’ (Ndị Hibru 5:7) E buru amụma banyere ya, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ ya, bụ́ Mmụọ nke . . . egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” (Aịsaịa 11:2, 3) Ya mere, Jizọs ruru nnọọ eru ịgwa anyị uru ndị dị n’ịtụ egwu Chineke.

7. (a) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, olee otú Ndị Kraịst si eme ihe kwekọrọ n’ihe ahụ Devid gwara ndị òtù ya? (b) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gbasoo ezi ihe nlereanya Devid?

7 Ndị nile na-agbaso ihe nlereanya Jizọs ma na-eme ihe ọ kụziri na-aza oku yiri nke Devid kpọrọ ndị ya na ha so, sị: “Bịanụ, ụmụ m, gee m ntị: Egwu Jehova ka m ga-ezi unu.” (Abụ Ọma 34:11) O kwesịghị iju anyị anya na Devid kpọrọ ndị ikom ha na ya so “ụmụ m” n’ihi na ha weere ya dị ka onye ndú ha. Devid nyeere ndị ya na ha so aka ịtụ egwu Chineke, ka ha na Jehova wee dị ná mma. Nke a bụ nnọọ ezi ihe nlereanya nke ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi. Jehova enyewo ha ikike ka ha na-azụlite ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”(Ndị Efesọs 6:4) Ndị nne na nna na-enyere ụmụ ha aka inwe obi ụtọ site n’ịtụ egwu Jehova mgbe ha na-eso ụmụ ha na-atụle ihe ime mmụọ kwa ụbọchị nakwa mgbe ha na-amụrụ ha Bible mgbe nile.—Deuterọnọmi 6:6, 7.

Otú Anyị Ga-esi Gosi na Anyị Na-atụ Egwu Chineke

8, 9. (a) Olee ihe mere ịtụ egwu Chineke ji enye nnọọ obi ụtọ? (b) Gịnị ka iche ire anyị nche gụnyere?

8 Dị ka e kwuru ná mmalite, ịtụ egwu Jehova adịghị egbochi anyị inwe ọṅụ. Devid jụrụ, sị: “Ònye bụ nwoke ahụ nke ndụ na-atọ ya ụtọ, nke na-ahụ ụbọchị nile nke ndụ n’anya, ka o wee hụ ọdịmma?” (Abụ Ọma 34:12) O doro anya na ịtụ egwu Jehova bụ isi ihe na-eme ka mmadụ bie ogologo ndụ obi ụtọ ma hụ ezi ihe. Otú ọ dị, ọ dị mfe mmadụ ịsị na ya na-atụ egwu Chineke. Ma ebe okwu dị bụ n’ibi ndụ dị ka onye na-atụ egwu Chineke. N’ihi ya, Devid gara n’ihu ịkọwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-atụ egwu Chineke.

9 “Chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, cheziekwa egbugbere ọnụ gị ka ha ghara ikwu okwu aghụghọ.” (Abụ Ọma 34:13) E nyere Pita onyeozi ike mmụọ nsọ ihota Abụ Ọma 34:13 mgbe o nyesịrị Ndị Kraịst ndụmọdụ ka ha jiri ịhụnanya na-emeso ụmụnna ha ihe. (1 Pita 3:8-12) Iche ire anyị nche ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ pụtara na anyị ga-ezere ịgba asịrị. Kama ịgba asịrị, anyị ga na-agbalịsi ike ikwu ihe na-ewuli ndị ọzọ elu mgbe anyị na-agwa ha okwu. Tụkwasị na nke ahụ, anyị ga-agbalịsi ike ịkata obi na-ekwu eziokwu.—Ndị Efesọs 4:25, 29, 31; Jems 5:16.

10. (a) Kọwaa ihe mmadụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya pụtara. (b) Gịnị ka ime ezi ihe gụnyere?

10 “Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ezi ihe; na-achọsi udo ike, gbasookwa ya.” (Abụ Ọma 34:14) Anyị agaghị na-etinye aka n’ihe ndị Chineke sị na ha ezighị ezi, dị ka ịkwa iko, ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, izu ohi, ime mgbaasị, ime ihe ike, ịṅụbiga mmanya okè, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Anyị kwesịkwara ịjụ ihe ntụrụndụ ọ bụla a na-egosi ihe ndị a na-asọ oyi na ha. (Ndị Efesọs 5:10-12) Kama itinye aka n’ihe ndị a, anyị kwesịrị iji oge anyị mee ihe ndị dị mma. Ihe kasị mma anyị nwere ike ime bụ iso mgbe nile na-aga ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-eme ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, si otú a na-enyere ha aka ime ihe a ga-eji zọpụta ha. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ime ezi ihe gụnyekwara ịkwadebe na ịga ọmụmụ ihe, inye onyinye maka ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, na inyere Ndị Kraịst nọ ná mkpa aka.

11. (a) Olee otú Devid si mee ihe ọ kụziiri banyere udo? (b) Gịnị ka ị pụrụ ime iji ‘gbasoo udo’ n’ọgbakọ?

11 Devid setịpụrụ ezi ihe nlereanya mgbe a bịara n’ime udo. O nwere ohere ugboro abụọ igbu Sọl. Ma n’oge ndị a nile, ọ dịghị mgbe o mesoro Sọl ihe ike, o mesịkwara jiri nkwanye ùgwù gwa eze okwu, na-atụ anya ime ka ya na eze dịghachi n’udo. (1 Samuel 24:8-11; 26:17-20) Gịnị ka anyị pụrụ ime taa mgbe e nwere nsogbu nke na-achọ itisa udo nke ọgbakọ? Anyị kwesịrị ịdị “na-achọsi udo ike, gbasookwa ya.” Ya mere, ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị na onye kwere ekwe ibe anyị nwere nghọtahie, anyị kwesịrị ịgbaso ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo.” Anyị mesịa nke a, anyị nweziri ike gaa n’ihu n’ozi anyị na-ejere Jehova.—Matiu 5:23, 24; Ndị Efesọs 4:26.

Ịtụ Egwu Chineke Na-akwụghachi Ụgwọ Ọrụ n’Ụba

12, 13. (a) Olee uru ndị ndị na-atụ egwu Chineke na-erite ugbu a? (b) Olee ụgwọ ọrụ dị ebube nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe ga-enweta n’oge na-adịghị anya?

12 “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya.” (Abụ Ọma 34:15) Akụkọ banyere otú Chineke si mesoo Devid ihe gosiri na okwu ndị a bụ eziokwu. Taa, anyị na-enwe ọṅụ dị ukwuu na ahụ́ iru ala n’ihi na anyị maara na Jehova na-eche anyị nche. Obi siri anyị ike na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị mgbe nile, ọbụna mgbe ihe na-esiri anyị nnọọ ike. Anyị maara na n’oge na-adịghị anya, Gọg nke Megọg ga-ebuso ndị nile na-efe Jehova ofufe agha, marakwa na “ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu,” eruwela. (Joel 2:11, 31; Ezikiel 38:14-18, 21-23) N’agbanyeghị ụdị ọnọdụ ọ bụla anyị ga-anọ na ya n’oge ahụ, okwu Devid ga-emezu n’ahụ́ anyị: “Ndị ezi omume tiri mkpu, Jehova wee nụrụ, wee si ná mkpagbu ha nile napụta ha.”Abụ Ọma 34:17.

13 Ọ ga-abụ nnọọ ihe obi ụtọ n’oge ahụ ịhụ ka Jehova ga-eme ka aha ukwu ya dị elu. Anyị ga-enwe nnọọ ọchịchọ siri ike ịsọpụkwuru Chineke karịa ka anyị na-eme ugbu a, ndị nile na-emegide anyị ga-anwụkwa ọnwụ ihere. “Ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ibipụ ncheta ha n’ụwa.” (Abụ Ọma 34:16) Ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọ bụla ga-akarị ịbụ onye a napụtara mgbe ahụ banye n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.

Nkwa Ndị Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

14. Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị pụrụ ịdakwasị anyị?

14 Ka ọ dịgodị, ọ chọrọ ntachi obi iji nọgide na-erubere Jehova isi n’ụwa a rụrụ arụ nke jupụtakwara n’ime ihe ike. Ịtụ egwu Chineke na-enyere anyị nnọọ aka irube isi. N’ihi otú oge anyị a si sie ike obibi, ụfọdụ ndị ohu Jehova ezutewo ọtụtụ ihe isi ike ndị tara akpụ bụ́ ndị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-etiwa ha obi ma na-azọpịa mmụọ ha. Otú ọ dị, obi kwesịrị isi ha ike na ọ bụrụ na ha adabere na Jehova, ọ ga-enyere ha aka ịtachi obi. Ihe Devid kwuru na-akasi obi n’ezie: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ọ bụ ihe na-agba ume na Devid gara n’ihu ikwu, sị: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:19) N’agbanyeghị otú ihe isi ike ndị na-adakwasị anyị dịruru ọtụtụ, Jehova dị ike ịnapụta anyị.

15, 16. (a) Olee ọdachi Devid nụrụ banyere ya ozugbo ọ rọsịrị Abụ Ọma nke 34? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ule?

15 Ngwa ngwa ọ rọsịrị Abụ Ọma nke 34, Devid nụrụ ihe mere ndị Nọb, mgbe Sọl gburu ha na ọtụtụ ndị nchụàjà. Ọ ga-ewute ya nke ukwuu ma o cheta na ọ bụ ọgịga ọ gara ebe ahụ kpasuru Sọl iwe. (1 Samuel 22:13, 18-21) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Devid gakwuuru Jehova maka enyemaka, olileanya mbilite n’ọnwụ nke “ndị ezi omume” kasikwara ya obi.—Ọrụ 24:15.

16 Taa, olileanya mbilite n’ọnwụ na-ewusikwa anyị ike. Anyị maara na ọ dịghị ihe ọ bụla ndị iro anyị ga-eme anyị pụrụ ime ka anyị nwụọ ọnwụ ebighị ebi. (Matiu 10:28) Devid kwuru ihe gosiri na ya kwenyere nke a mgbe ọ sịrị: “Ọ na-edebe ọkpụkpụ [onye ezi omume] nile: ọ dịghị otu n’ime ha nyajiri anyaji.” (Abụ Ọma 34:20) Amaokwu ahụ mezuru n’ụzọ nkịtị n’ebe Jizọs nọ. Ọ bụ ezie na e gburu Jizọs n’ụzọ obi ọjọọ, ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọ bụla nke ‘e gwepịara.’ (Jọn 19:36) Abụ Ọma 34:20 na-emezukwa n’ụzọ ọzọ n’ụdị na ọ na-emesi Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” obi ike na n’agbanyeghị ule ọ bụla ha pụrụ izute, ọ dịghị ihe ọ bụla ndị iro ga-eme ha nke ga-akpatara ha ọnwụ ebighị ebi. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ dịghị ọkpụkpụ ha ọ bụla nke a ga-anyaji.—Jọn 10:16.

17. Ọdachi dị aṅaa na-echere ndị nọgidere na-akpọ ndị Jehova asị?

17 Ihe ga-adakwasị ndị mmebi iwu ga-adị iche na nke ndị ezi omume. N’oge na-adịghị anya, ha ga-aghọrọ mkpụrụ ọjọọ ha kụrụ. “Ihe ọjọọ ga-eme ka onye na-emebi iwu nwụọ: ọzọ, ndị na-akpọ onye ezi omume asị, a ga-ama ha ikpe.” (Abụ Ọma 34:21) Ndị nile nọgidere na-emegide ndị Chineke ga-ezute ọdachi a na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ. Mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst, ha “ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke mbibi ebighị ebi.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:9.

18. N’echiche dị aṅaa ka a gbapụtaworo “oké ìgwè mmadụ,” oleekwa ihe ha ga-enweta n’ọdịnihu?

18 Devid ji okwu ndị a na-emesi obi ike mechie abụ ọma ya: “Jehova na-agbapụta mkpụrụ obi ndị ohu Ya: a gaghị amakwa ha ikpe, bụ́ ndị nile na-agbaba n’ime Ya.” (Abụ Ọma 34:22) Ka ọchịchị ya nke were afọ iri anọ na-eru ná ngwụsị, Eze Devid kwuru, sị: ‘Chineke gbapụtara mkpụrụ obi m ná mkpagbu nile.’ (1 Ndị Eze 1:29) Dị ka Devid mere, n’oge na-adịghị anya, ndị na-atụ egwu Jehova ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ịbụ ndị a na-agaghị ama ikpe n’ihi mmehie nakwa n’ihi nnapụta a ga-anapụta ha n’ọnwụnwa ha nile. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ anatalarị ụgwọ ọrụ ha nke bụ́ ịga eluigwe. “Oké ìgwè mmadụ” si ná mba nile na-esonyeziri ndị fọdụrụ n’ụmụnna Jizọs na-ejere Chineke ozi, nke a mekwara ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ihe mere ha na Jehova ji dịrị ná mma bụ n’ihi na ha nwere okwukwe na ọbara Jizọs wụsịrị nwere ikike ịgbapụta ha. N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst nke na-abịanụ, ha ga-erite uru n’ụzọ zuru ezu n’àjà mgbapụta ahụ, bụ́ nke ga-eme ka ha zuo okè.—Mkpughe 7:9, 14, 17; 21:3-5.

19. Gịnị ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ kpebisiri ike ime?

19 Gịnị mere “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị na-efe Chineke ga-eji nweta ngọzi nile a? Ọ bụ n’ihi na ha kpebisiri ike ịnọgide na-atụ egwu Jehova, jiri nsọpụrụ miri emi na-ejere Ya ozi ma na-erubere ya isi. N’ezie, egwu Jehova na-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ ugbu a, ọ na-enyekwara anyị aka ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie’—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—1 Timoti 6:12, 18, 19; Mkpughe 15:3, 4.

Ì Chetara?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịtụ egwu Chineke, gịnịkwa ka ịtụ egwu Chineke pụtara?

• Olee otú ịtụ egwu Chineke kwesịrị isi metụta àgwà anyị?

• Olee uru ndị anyị na-erite site n’ịtụ egwu Chineke?

• Nkwa ndị dị aṅaa na-enyere anyị aka ịtachi obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndị na-atụ egwu Jehova na-eji akọ eme ihe mgbe a machibidoro ọrụ ha iwu

[Foto dị na peeji nke 28]

Ihe kasị mma anyị pụrụ imere ndị agbata obi anyị bụ izi ha ozi ọma nke Alaeze Chineke