Ichere Alaeze nke “Na-abụghị Akụkụ nke Ụwa A”
Akụkọ Ndụ
Ichere Alaeze nke “Na-abụghị Akụkụ nke Ụwa A”
Dị ka Nikolai Gutsulyak si kọọ
Ruo abalị iri anọ na otu, achọtara m onwe m n’etiti ọgba aghara e nwere n’ụlọ mkpọrọ. Otu ụbọchị, ụda egbe kpọtere m n’ụra ná mberede. Ndị agha ji ụgbọ agha ha nubata n’ụlọ mkpọrọ ma malite igbusịsị ndị mkpọrọ. Ndụ m nọ n’ihe ize ndụ.
OLEE otú m si banye n’ọnọdụ a? Ka m kọọrọ gị. Ihe a mere n’afọ 1954. N’oge ahụ adị m afọ iri atọ. Dị nnọọ ka e mere ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’oge ndị Soviet na-achị, a tụrụ m mkpọrọ n’ihi na ekweghị m etinye aka n’okwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’ihi na m na-akọrọ ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Anyị dị ụmụnna nwoke iri anọ na isii na ụmụnna nwanyị iri atọ na anọ a tụkọrọ mkpọrọ. A kpọchiri anyị n’ogige ebe a na-amanye ndị mmadụ ịrụ ọrụ ike bụ́ nke dị obodo Kengir nso n’etiti obodo Kazakhstan. N’ebe ahụ, a tụkọrọ anyị na ọtụtụ puku ndị mkpọrọ ndị ọzọ mkpọrọ.
Onye ndú ndị Soviet Union bụ́ Joseph Stalin nwụrụ n’afọ 1953. Ọtụtụ ndị mkpọrọ na-atụzi anya na ọchịchị ọhụrụ a dị n’aka ndị Moscow nwere ike ige ntị ná mkpesa ndị ha na-eme banyere ọnọdụ ndị tara akpụ ha nọ na ya n’ụlọ mkpọrọ. Ndị mkpọrọ malitere inupụ isi n’ihi na ọnọdụ a ha nọ na ya adịghị ha obi mma. Ka ndị mkpọrọ na ndị ọchịchị na-abarịta mba, anyị bụ́ Ndịàmà mere ka o doo ndị nnupụisi ahụ anya na aka anyị adịghị ya, anyị kọwakwaara ndị agha na-eche ndị mkpọrọ nche otu ihe ahụ. Ọ dị anyị mkpa inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ iji nwee ike ịkwụsi ike.
Ọgba Aghara Ebiri Ọkụ!
Nnupụisi ahụ e nwere n’ụlọ mkpọrọ malitere na May 16. Mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ihe karịrị puku ndị mkpọrọ atọ na narị abụọ jụrụ ịga ọrụ, na-ekwu ka e mee ka ihe dịkwuoro ndị mkpọrọ mfe nakwa ka e menyere ndị a kpọchiri n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’oge na-adịghị anya, ihe bịara kakwuo njọ. Ihe mbụ ndị ahụ na-enupụisi mere bụ ịchụpụ ndị nche na-eche ụlọ mkpọrọ ahụ. Ha kupusịziri ihe e ji gbaa ụlọ mkpọrọ ahụ gburugburu. Ihe ọzọ ha mere bụ ikụtusị mgbidi ndị e ji rụbichie ụlọ mkpọrọ ebe ndị nwoke na ndị nwanyị bi, bụ́ nke meziri ka ndị mkpọrọ ndị nwoke na ndị nwanyị bikọta ọnụ. Ndị mkpọrọ nwere obi ụtọ n’ụbọchị ndị sochirinụ, ọbụna ụfọdụ n’ime ha lụwara onwe ha, ọ bụkwa ndị ụkọchukwu a tụkwara mkpọrọ kwuuru ha okwu agbamakwụkwọ. N’ogige atọ dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ bụ́ ebe ndị e nwere ọgba aghara, ihe ka ọtụtụ n’ime puku ndị mkpọrọ iri na anọ so nupụ isi.
Ndị nnupụisi ahụ hiwere òtù ha na ndị agha ga na-ekwurịta ihe ha chọrọ ka e meere ha. Otú ọ dị, ọ dịghị anya esemokwu adapụta n’etiti ndị so n’òtù ahụ, nke a meziri ka ọ bụrụ ndị na-adịghị anụ anụ nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-ekwuzi ihe ndị a ga na-eme. Ihe bịara kakwuo njọ. Iji hụ na ihe na-aga nke ọma, ndị ndú ndị nnupụisi ahụ hiwere ngalaba ndị nche, ngalaba ndị agha, na ngalaba mgbasa ozi. Ndị ndú ahụ jiri ígwè okwu ndị a kwụnyejuru na poolu ndị dị gburugburu ụlọ mkpọrọ ahụ na-aba mba ihe ndị ha ga-eme, nke a mekwara ka obi na-afụ ndị nnupụisi ibe ha. Ndị nnupụisi ahụ ekweghị ka ndị ọzọ pụọ, ha na-ata onye ọ bụla na-achọghị ime ihe ha kwuru ahụhụ, ha kwupụtakwara na ha dị njikere igbu onye ọ bụla nupụụrụ ha isi. A nụwakwara kepu kepu na e nweela ụfọdụ ndị mkpọrọ e gburu.
Ebe ọ bụ na ndị nnupụisi ahụ tụrụ anya na ndị agha ga-abịa ọgụ, ha kwadoro nnọọ nke ọma iji chebe onwe ha. Iji hụ na ọnụ ọgụgụ kanụ ná ndị mkpọrọ nwere ngwá ọgụ ha ga-eji chebe ogige ahụ, ndị ndú gwara onye ọ bụla ka o nwee ngwá ọgụ nke ya. Iji nweta ngwá ọgụ, ndị mkpọrọ kụjisịrị ígwè ndị e ji rụọ windo ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ma were ha kwaa mma na ngwa ọgụ ndị ọzọ. Ha jisikwara ike nweta egbe na bọmbụ.
Ha Amanye Anyị Isonyere Ha
N’oge ahụ ihe a nọ na-eme, mmadụ abụọ n’ime ndị nnupụisi ahụ bịakwutere m. Otu ji mma a mụrụ nnọọ nke ọma. Ọ gwara m, sị: “Were mma a! I ga-eji ya echebe onwe gị.” Ekpere m ekpere n’obi m ka Jehova nyere m aka ịnọ jụụ. Azaziri m ya, sị: “Abụ m Onye Kraịst, otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ihe mere mụ na Ndịàmà ndị ọzọ ji nọrọ n’ebe a abụghị n’ihi na anyị lụsoro mmadụ ọgụ, kama ọ bụ n’ihi na anyị na-alụso ndị mmụọ dị ike a na-adịghị ahụ anya ọgụ. Ngwá ọgụ anyị ji na-alụso ha ọgụ bụ okwukwe anyị na olileanya anyị nwere n’Alaeze Chineke.”—Ndị Efesọs 6:12.
N’ụzọ tụrụ m nnọọ n’anya, nwoke ahụ kwere n’isi na ya ghọtara ihe m na-ekwu. Ma onye nnupụisi nke ọzọ ahụ ya na ya so tiri m ezigbo ihe. Mgbe ahụzi ha pụwara. Ndị nnupụisi ahụ si n’otu ụlọ mkpọrọ gaa n’ọzọ, na-agbalị ịmanye Ndịàmà isonyere ha. Ma ọ dịghị nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ọ bụla kwetara isonyere ha.
Ná nnọkọ kọmitii na-ahụ maka nnupụisi ahụ nwere, ha kwurịtara banyere otú Ndịàmà Jehova si jụ isonyere ha. Ha kwuru na “ndị okpukpe ndị ọzọ nile—ndị Pentikọstal, ndị Adventist, ndị Baptist na ndị ọzọ—socha ná nnupụisi ahụ. Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova jụrụ na ha agaghị etinye aka.” Ha jụziri: “Gịnị ka anyị ga-eme ha?” Otu onye tụrụ aro ka a tụba otu Onyeàmà n’ovun nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ iji menye anyị ụjọ. Ma otu onye bubu onye agha, onye bụ́ onye mkpọrọ nke ndị ọzọ na-akwanyere ùgwù, biliri ma kwuo, sị: “Ezi uche adịghị na nke a. Ka anyị tinye ha nile n’otu ọnụ ụlọ nke dị n’akụkụ ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ mkpọrọ a. Nke na ọ bụrụ na ndị agha eji ụgbọ agha ha bịa ịlụso anyị ọgụ, ọ bụ Ndịàmà ka a ga-ebu ụzọ gbuo. A gaghịzi asị na ọ bụ anyị gburu ha.” Ndị ọzọ nabatara aro a ọ tụrụ.
E Tinye Anyị n’Ebe Dị Ize Ndụ
Obere oge ka ha kwurịtasịrị nke a, ndị mkpọrọ gbara ogige ụlọ mkpọrọ ahụ gburugburu na-eti mkpu, sị, “Ndịàmà Jehova, pụtanụ!” Ha kpọbara anyị nile dị mmadụ iri asatọ n’ọnụ ụlọ mkpọrọ dị ná mpụga ogige ụlọ mkpọrọ ahụ. Ha bupụtasịrị àkwà ndị dị n’ime otu ụlọ ebe ndị nche bibu ma gwa anyị ka anyị banye ebe ahụ. Otú ahụ ka e si tụọ anyị mkpọrọ ọzọ n’ụlọ mkpọrọ.
Iji hụ na ndị nwoke na ndị nwanyị ebikọghị ọnụ, ụmụnna nwanyị dụkọtara ákwà, anyị ejirizie ya kebie ụlọ mkpọrọ ahụ abụọ—otu maka ndị nwoke nke ọzọ maka ndị nwanyị. (Otu Onyeàmà na Russia mechara see ụlọ mkpọrọ a, bụ́ nke e gosiri n’okpuru ebe a.) N’oge ndị ahụ anyị bi n’ụlọ mkpọrọ ahụ kpara akpa, anyị na-ekpekọkarị ekpere ọnụ, na-arịọsi Jehova arịrịọ ike ka o nye anyị amamihe na “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Ndị Kọrịnt 4:7.
N’oge ahụ nile, anyị nọ n’ebe dị ize ndụ
n’agbata ndị nnupụisi ahụ na ndị agha ndị Soviet. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ma ihe ndị nke ọ bụla na-akwadebe ime. Otu Onyeàmà na-ekwesị ntụkwasị obi merela agadi gwara anyị, sị: “Unu anọla na-echegbu onwe unu ihe ga-emenụ. Jehova agaghị agbahapụ anyị.”Ezigbo ụmụnna anyị ndị nwanyị—ma ndị na-emebeghị agadi ma ndị merela agadi—diri nnọọ ọnọdụ ahụ. Otu n’ime ha dị ihe dị ka iri afọ asatọ ma chọọkwa nlekọta pụrụ iche. Ndị ọzọ ejighị ahụ́, ha kwesịkwara ịga nara ọgwụ. N’oge ahụ nile, a na-eghewe ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ anyị nọ na ya oghe ka ndị nnupụisi ahụ nwee ike ịdị na-ele ihe ndị anyị na-eme. N’abalị, ndị mkpọrọ ji ngwá ọgụ na-abata n’ụlọ ahụ anyị nọ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ ka ha na-ekwu na, “Alaeze Chineke nọ n’ụra.” N’ehihie, bụ́ mgbe ha na-ekwe ka anyị gaa n’ụlọ anyị na-anọ eri nri n’ogige ahụ, anyị na-anọkọkarị ọnụ ma na-ekpe ekpere ka Jehova chebe anyị n’aka ndị na-eme ihe ike.
N’ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị gbalịrị inyere ibe anyị aka ịkwụsi ike n’okwukwe. Dị ka ihe atụ, otu nwanna na-ejikarị olu dara ụda akọ ihe ndị dị na Bible otú anyị ga-enwe ike ịnụ ya. Mgbe ahụzi ọ na-akọwa otú o si kwekọọ n’ọnọdụ anyị. Otu nwanna nwoke merela agadi na-enwekarị mmasị ikwu karịsịa banyere ndị agha Gidiọn. O chetaara anyị, sị: “Ọ bụ nanị narị ndị ikom atọ ji ngwá egwú n’aka ji aha Jehova lụsoo narị puku ndị agha na iri atọ na ise jicha ngwá ọgụ, agha. Narị mmadụ atọ ahụ lọtara n’enweghị ọkọ ọ bụla kọrọ ha.” (Ndị Ikpe 7:16, 22; 8:10) Ihe atụ a na ihe atụ ndị ọzọ dị na Bible wusiri okwukwe anyị ike. N’oge ahụ, a ka batara m ọhụrụ n’ọgbakọ, ma ịhụ okwukwe siri ike nke ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị nwerela ahụmahụ n’ọgbakọ a gbara m nnọọ ume. Nke a mere ka m mara n’ezie na Jehova nọnyeere anyị.
Ọgụ ahụ Ebiri Ọkụ
Ọtụtụ izu agafeela ugbu a, ụjọ jikwa onye ọ bụla nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Mkparịta ụka ndị nnupụisi ahụ na ndị ọchịchị na-adazi ike ikẹ. Ndị ndú ndị nnupụisi ahụ gbara isi akwara na gọọmenti Russia ga-eziterịrị onye nnọchianya ka ha na ya soro kwurịta mkpa ha. Ndị ọchịchị gwara ndị nnupụisi ahụ ka ha chịlie aka elu, chịsa ngwá ọgụ ha, ma laghachi n’ọrụ. Ọ dịghị ndị nke ọ bụla chọrọ ime ihe ibe ya kwuru. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ndị agha gbara ụlọ mkpọrọ ahụ gburugburu ma dị njikere ịgbarisi ụlọ mkpọrọ ahụ ozugbo e nyere ha iwu. Ndị nnupụisi ahụ dịkwa njikere ịlụ ọgụ, ha rụrụ ihe ndị ga-egbochi ndị agha ahụ ịbata, ha kwakọjukwara ngwá ọgụ. Onye ọ bụla na-atụ anya na ọgụ ga-esu n’etiti ndị mkpọrọ na ndị agha n’oge ọ bụla.
Na June 26, égbè malitere ịda aghara aghara kpọtere anyị n’ụra. Ụgbọ ndị agha ji akwa mgbọ kwatusiri ihe ndị e ji gbachie ụlọ mkpọrọ ahụ ogige ma bata n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ha malitere ịkwa mgbọ aghara aghara. Ndị mkpọrọ ahụ—ma ndị nwoke ma ndị nwanyị—tiiri mkpu gbagawa ebe ụgbọ agha ahụ si na-abịa
ma na-atụ ha nkume na bọmbụ ndị ha mere n’onwe ha na ihe ọ bụla aka ha ruru. Ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ dara, anyị bụ́ Ndịàmà nọkwa n’agbata ndị agha na ndị nnupụisi ahụ. Olee otú Jehova ga-esi zaa ekpere anyị maka enyemaka?Na mberede, ndị agha wụbatara n’ụlọ mkpọrọ ahụ e tinyere anyị. Ha tiri mkpu, sị: “Pụtanụ, unu ndị dị nsọ! Sinụ n’ogige ụlọ mkpọrọ a pụọ ngwa ngwa!” Onyeisi ndị agha ahụ gwara ndị agha ahụ ka ha ghara ịgba anyị égbè kama ka ha nọnyere anyị ma chebe anyị. Ka ọgụ a nọ na-akpọtụ, anyị nọdụrụ ọdụ n’ahịhịa ndị dị ná mpụga ụlọ mkpọrọ ahụ. Ruo awa anọ anyị nọ na-anụ ụda égbè, mkpu ákwá, ịsụ udè na-akpọtụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ka e mesịrị ebe nile bịara daa jụụ. Ka e mechara n’ụtụtụ, anyị hụrụ ka ndị agha si n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-ebupụtasị ozu ndị mmadụ. Anyị nụrụ na e merụrụ ọtụtụ narị n’ime ha ahụ́ ma ọ bụ gbuo ha egbuo.
Ka e mechara n’ụbọchị ahụ, otu onyeisi ndị agha m maara bịakwutere anyị. O jiri nganga jụọ m sị: “Nikolai, ònye napụtara unu? Ọ̀ bụ anyị ka ọ̀ bụ Jehova?” Anyị kelere ya nnọọ n’otú o si chebe ndụ anyị, gwakwa ya na “anyị maara na ọ bụ Chineke anyị pụrụ ime ihe nile bụ́ Jehova, kpaliri ya ichebe anyị, dị nnọọ ka o si kpalie ndị ọzọ ịnapụta ndị ohu ya n’oge Bible.”—Ezra 1:1, 2.
Onyeisi ndị agha ahụ kọkwaara anyị otú ndị agha ahụ si mata ndị anyị bụ na ebe anyị bi. O kwuru na n’otu n’ime nkwurịta okwu ndị agha na ndị nnupụisi ahụ nwere, ndị agha boro ndị nnupụisi ahụ ebubo na ha na-egbusịsị ndị mkpọrọ na-esonyeghịrị ha. Iji gbachitere onwe ha, ndị nnupụisi ahụ kwuru na Ndịàmà Jehova ekweghị eso ha, na ọ dịghịkwanụ onye gburu ha. Kama, iji taa Ndịàmà Jehova ahụhụ, e tinyere ha nile n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ. Ndị isi ndị agha ahụ buuru ihe a n’uche.
Anyị Kwadosiri Alaeze ahụ Ike
Onye Russia a ma ama na-ede akwụkwọ bụ́ Aleksandr Solzhenitsyn, kwuru banyere nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’ụlọ mkpọrọ n’akwụkwọ ya bụ́ The Gulag Archipelago. Banyere ihe ahụ merenụ, o dere na ihe kpatara nnupụisi ahụ bụ́ n’ihi na “anyị [ndị mkpọrọ] chọrọ inwere onwe anyị n’ezie . . . ma ònyekwanụ ga-eme ka o nwee isi?” Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-atusịkwa anya ike inwere onwe anyị. Ma nnwere onwe nke anyị chọrọ abụghị nanị ka a kpọpụta anyị n’ụlọ mkpọrọ kama ọ bụ nke nanị Alaeze Chineke ga-eweta. Mgbe ahụ anyị ka nọ n’ụlọ mkpọrọ, anyị maara na ike si n’ebe Chineke nọ dị anyị mkpa iji nọgidesie ike na-akwado Alaeze ya. Jehova nyekwara anyị ihe nile dị anyị mkpa. O mere ka anyị nwee mmeri na-ejighị mma ma ọ bụ bọmbụ.—2 Ndị Kọrịnt 10:3.
Jizọs Kraịst gwara Paịlet, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ.” (Jọn 18:36) N’ihi ya, anyị, dị ka ụmụazụ Kraịst, ekereghị òkè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Obi dị anyị ụtọ na ndị ọzọ chọpụtara na anyị na-adịnyere Alaeze Chineke n’oge nile ahụ nsogbu a nọ na-aga n’ihu nakwa mgbe ọ gasịrị. Solzhenitsyn dere banyere omume anyị n’oge ahụ, sị: “Ndịàmà Jehova nọgidere na-agbasochi iwu okpukpe ha anya, ha jụkwara ịrụ ihe mgbochi ma ọ bụ soro chewe nche.”
Ọ karịala iri afọ ise kemgbe ihe a mere. Ma obi na-atọkarị m ụtọ ma m cheta oge ndị ahụ n’ihi na amụtara m ihe ndị m na-agaghị echefu echefu, ihe ndị dị ka ichere Jehova na ịtụkwasị obi kpam kpam n’ike ya. Dị nnọọ ka ọtụtụ ezigbo Ndịàmà ndị ọzọ nọ n’ebe bụbu Soviet Union, ahụwo m n’ezie na Jehova na-eme ka anyị nwere onwe anyị, ọ bụ ya na-echebe anyị ọ bụkwa ya na-anapụta ndị nile na-echere Alaeze nke “na-abụghị akụkụ nke ụwa a.”
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Ogige ebe a na-amanye ndị mmadụ ịrụ ọrụ ike bụ́ nke dị na Kazakhstan bụ́ ebe a tụrụ anyị mkpọrọ
[Foto dị na peeji nke 10]
Ihe osise nke ụlọ mkpọrọ ahụ e tinyere Ndịàmà, akụkụ nke ebe ụmụ nwanyị na-anọ
[Foto dị na peeji nke 11]
Mụ na ụmụnna anyị ndị nwoke n’oge a tọhapụsịrị anyị