Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Omume nke E Kwesịrị Icheta!

Ihe Omume nke E Kwesịrị Icheta!

Ihe Omume nke E Kwesịrị Icheta!

Monday, April 2

Na Naịsan 14 nke afọ 33 O.A., Jizọs nyere ndịozi ya mmanya na achịcha na-ekoghị eko. Gịnịzi ka ọ gwara ha? Ọ sịrị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.”—Luk 22:19.

N’ihi nke a, otu ugboro n’afọ, Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-ezukọta iji cheta ọnwụ Jizọs n’otu ụzọ ahụ o nyere ntụziaka ka e siri na-eme ya n’abalị ahụ o kwuru ihe ahụ dị n’akwụkwọ Luk. N’afọ a, Naịsan 14 ga-amalite mgbe anyanwụ dasịrị na Monday, April 2. E ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa sonyere anyị ná nzukọ a anyị ga-enwe n’uhuruchi nke ụbọchị ahụ iji cheta ọnwụ Jizọs. Biko jụọ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị iji mara kpọmkwem oge na ebe a ga-anọ eme ya.