Inwe Obi Ụtọ Ichere Jehova
Inwe Obi Ụtọ Ichere Jehova
Ị̀ RATỤLA mkpụrụ osisi na-achaghị acha? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ gbakara gị ntì. Mkpụrụ osisi na-ewe oge iji chaa, icherekwa ka ọ chaa achaa kwesịrị nnọọ ekwesị. E nwere ihe ndị ọzọ dị mma nchere. Bible na-ekwu, sị: “Ọ dị mma ka mmadụ chere nzọpụta Jehova, derekwa duu n’ichere ya.” (Abụ Ákwá 3:26; Taịtọs 2:13) Olee otú ndị Kraịst ga-esi na-echere Jehova? Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ichere ya?
Gịnị Ka Ichere Chineke Gụnyere?
Dị ka Ndị Kraịst, anyị “na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.” Anyị na-atụ anya inwere onwe anyị mgbe Chineke ‘ga-ebibi ndị na-adịghị asọpụrụ ya.’ (2 Pita 3:7, 12) Jehova n’onwe ya dị njikere ịkwụsị ihe ọjọọ nile, ma ihe mere o ji na-eche bụ ka o nwee ike ịzọpụta Ndị Kraịst n’ụzọ ga-eme ka e too aha ya. Bible kwuru, sị: “Chineke, ọ bụ ezie na o nwere ọchịchọ igosipụta ọnụma ya na ime ka a mara ike ya, ji ogologo ntachi obi dị ukwuu hapụ arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị e mere ka ha kwesị mbibi, ka o wee mee ka a mara akụ̀ nke ebube ya n’ebe arịa ndị dịịrị ebere dị.” (Ndị Rom 9:22, 23) Dị nnọọ ka o mere n’ụbọchị Noa, Jehova maara oge ka mma iji zọpụta ndị ya taa. (1 Pita 3:20) N’ihi ya, ichere Chineke gụnyere ichere oge o zubere ime ihe.
Ka anyị nọ na-eche ụbọchị Jehova, o nwere ike ịdị na-ewute anyị mgbe ụfọdụ ka anyị na-ahụ ka omume nke ndị gbara anyị gburugburu na-aka njọ n’ike n’ike. N’oge ndị dị otú a, ọ ga-aka mma ịtụle okwu onye amụma Chineke bụ́ Maịka, bụ́ onye dere, sị: “Onye ebere alawo n’iyi pụọ n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti mmadụ.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ma mụ onwe m, n’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; m ga-echere Chineke nke nzọpụta m.” (Maịka 7:2, 7) Olee otú anyị kwesịrị isi na-echere Chineke? Ebe ọ bụ na ọ na-agwụkarị ike ichere ihe, olee otú anyị pụrụ isi nweta ọṅụ ka anyị nọ na-echere Chineke?
Inwe Obi Ụtọ Ka Anyị Nọ Na-echere
Ọ bụ Jehova pụrụ ịkụziri anyị ụdị àgwà anyị kwesịrị inwe. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ kwụsịrị ịbụ “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) O ji obi ụtọ na-eche n’ihi na ọ nọgidere na-arụ ọrụ iji hụ na o mezuru nzube ya nke bụ́ ime ka ndị hụrụ ya n’anya zuo okè, bụ́ ihe o zubere maka ụmụ mmadụ mgbe o kere ha. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Ọ na-ahụ ezi ihe ndị na-esi n’ọrụ ọ na-arụ apụta—ọtụtụ nde mmadụ nọ na-abata n’ezi ofufe. Jizọs kwuru, sị: “Nna m anọgidewo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọgidewokwa m na-arụ ọrụ.” (Jọn 5:17) Imere ndị ọzọ ihe dị mkpa iji nwee obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) N’otu aka ahụ, ezi Ndị Kraịst adịghị afanye aka n’ụkwụ ka ha nọ na-echere Jehova. Kama ịfanye aka n’ụkwụ, ha anọgidela na-arụ ọrụ iji nyere ndị ọzọ aka ịmata ihe Chineke zubeere mmadụ nile.
Ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na-anọgide na-eto Chineke ka ha na-eche ka oge ọ ga-eji mee ihe ruo. Were ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dị ka ihe atụ. Eze ya megidere ya, ezigbo enyi ya raara ya nye n’aka ndị iro ya, nwa ya gbalịkwara iweghara ọchịchị ya. Ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a pụrụ ime ka Devid nwee obi ụtọ ka ọ nọ na-eche ka oge Jehova ga-eji mee ka o nwere onwe ya ruo? Abụ ọma nke 71, bụ́ nke o yiri ka ọ bụ Devid dere ya kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, mgbe nile ka m ga na-eche Gị, wee tụkwasị otuto Abụ Ọma 71:14, 15) Kama Devid inwe nkụda mmụọ ka ọ na-eche Jehova, o nwere ọṅụ n’ihi na ọ nọ na-eto Jehova mgbe nile ma na-eme ka ndị ọzọ nọgide na-efe Jehova ofufe.—Abụ Ọma 71:23.
n’otuto Gị nile. Ọnụ m ga-akọ akụkọ banyere ezi omume Gị, Ogologo ụbọchị nile ka ọ ga-akọ akụkọ banyere nzọpụta Gị.” (Ichere Jehova abụghị ihe na-akpasu iwe, dị ka ichere bọs na-egbu oge ịbịa. Ọ dị ka ebe nne na nna ji ọṅụ na-ele nwa ha ka ọ na-etolite iji bụrụ dimkpa ha ga-eji na-eme ọnụ. Afọ ndị ahụ nwa ahụ ka na-eto eto jupụtara n’ọtụtụ ọrụ—inye ya ọzụzụ, inye ya ntụziaka, na ịdọ ya aka ná ntị—ihe a nile bụ iji mee ka nwa ahụ bụrụ dimkpa a ga-eji na-eme ọnụ. N’otu aka ahụ, anyị bụ́ ndị na-eche Jehova na-eji obi ụtọ enyere ndị ọzọ aka ịbịaru Chineke nso. Anyị onwe anyị chọkwara ka anyị na Chineke dịrị ná mma ma mesịa bụrụ ndị a zọpụtara.
Ya Adịla Mgbe Ị Ga-akwụsị Inwe Olileanya
Ichere Jehova pụtara ịnọgide na-ahụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi ma nọgide na-enwe olileanya. Nke a pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Taa, ọtụtụ ndị ohu Chineke bi n’ógbè ebe ndị mmadụ na-eme onye ọ bụla nke na-ebi ndụ n’ụzọ na-egosi na o nwere okwukwe ná nkwa ndị Chineke kwere akaje. Tụlee ihe atụ nke ndị Izrel ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nọgidere na-enwe olileanya n’ime afọ iri asaa ahụ nile ha nọrọ na Babilọn dị ka ndị a dọọrọ n’agha. Gịnị nyeere ha aka ịnọgide na-enwe olileanya? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịgụ akwụkwọ abụ ọma wusiri ha ike. Otu abụ ọma na-agba ume bụ́ nke ọ pụrụ ịbụ na e dere ya n’oge ahụ kwuru, sị: “Okwu Ya ka m chereworo. Mkpụrụ obi m na-echere Jehova, karịa ka ndị nche si echere ụtụtụ; ee, karịa ka ndị nche si echere ụtụtụ. Izrel, chere Jehova.”—Abụ Ọma 130:5-7.
A kwụghachiri ndị Juu ahụ gbalịrị ịhụ na olileanya ha anyụghị ka ọkụ site n’ịgụ ihe ndị e kwuru banyere ya n’okwu Chineke na ịkọrọ ya ndị ọzọ ụgwọ mgbe e mechara merie Babilọn. Ọtụtụ puku ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi laghachiri Jeruselem na-egbughị oge ọ bụla. Banyere oge ahụ, e dere, sị: “Mgbe Jehova mere ka ndị na-alata na Zaịọn lata, . . . ọchị na-eju anyị ọnụ.” (Abụ Ọma 126:1, 2) Ndị Juu a adaghị mbà, kama ịda mbà ha nọgidere na-eme ka okwukwe ha sie ike site n’ịgụ okwu Chineke na ịkọrọ ndị ọzọ banyere ya. Ọ dịghịkwa mgbe ha kwụsịrị ịbụku Jehova abụ otuto.
Ọ bụ otú a ka ezi Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-echere Chineke ná “ngwụsị nke usoro ihe a,” si na-etinye mgbalị mgbe nile iji nọgide na-enwe okwukwe. Ha na-amụ Okwu Chineke, na-agba ibe ha ume, ma nọgide na-eto Jehova site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ya.—Matiu 24:3, 14.
Ichere Iji Rite Uru n’Ịdọ Aka ná Ntị Chineke
Onye amụma Chineke bụ́ Jeremaịa dere, sị: “Ọ dị mma ka mmadụ chere nzọpụta Jehova, derekwa duu n’ichere ya.” (Abụ Ákwá 3:26) Ihe Jeremaịa bu n’uche bụ na ọ ga-adị mma ka ndị Chineke ghara ime mkpesa banyere ụzọ Jehova siri dọọ ha aka ná ntị mgbe o kwere ka e bibie Jeruselem. Kama ime mkpesa, ha kwesịrị irite uru n’ihe ahụ mere ha site n’ịdị na-atụgharị uche n’ihe ha mere na ihe mere ha kwesịrị iji gbanwee àgwà ha.—Abụ Ákwá 3:40, 42.
A pụrụ iji uru anyị na-erite site n’ịdọ aka ná ntị na-esite n’aka Chineke tụnyere ụzọ mkpụrụ osisi si eji nke nta nke nta ebu ruo mgbe ọ chara. Bible kwuru banyere ịdọ aka ná ntị na-esite n’aka Chineke, sị: “Nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Dị nnọọ ka mkpụrụ osisi si ewe oge tupu ya achaa, anyị chọrọ oge iji gbanwee àgwà anyị, iji gosi na ọzụzụ Chineke na-enye anyị na-eru anyị n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a napụ anyị ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ anyị nwere n’ọgbakọ n’ihi àgwà ọjọọ anyị kpara, anyị ịdị njikere ichere Chineke ga-eme ka anyị ghara ịda mbà ma kwụsị ijere Jehova ozi. N’ọnọdụ ndị dị otú a, okwu Devid e dere n’ike mmụọ nsọ na-agba anyị ume: “Nanị otu ntabi anya na-agabiga n’iwe [Chineke]; ogologo ndụ nile na-agabiga na mgbe ihe anyị na-atọ Ya ụtọ: N’anyasị ịkwa ákwá ga-abịa ịnọ ọnọdụ abalị, ma n’ụtụtụ iti mkpu ọṅụ ga-adị.” (Abụ Ọma 30:5) Oge anyị ‘ga-eti mkpu ọṅụ’ na-abịa ma ọ bụrụ na anyị amụta ichere Jehova ma na-etinye ndụmọdụ ndị anyị na-enweta n’Okwu Chineke na nzukọ ya n’ọrụ.
Itozu Okè Na-ewe Oge
Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto ma ọ bụkwanụ na ị ka mere baptizim ọhụrụ, o nwere ike ịdị na-agụsi gị agụụ ike inweta ihe ùgwù ụfọdụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma ọ na-ewe oge iji ruo ihe ndị a chọrọ n’ụzọ ime mmụọ iji rụlie ọrụ ndị dị otú a. N’ihi ya, malite n’oge a ị ka na-eto eto jiri mmekọrịta gị na Jehova kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, oge ntorobịa bụ oge magburu onwe ya iji gụchapụ Bible, iji zụlite àgwà Ndị Kraịst na iji zụlite nkà n’ime ndị na-eso ụzọ. (Eklisiastis 12:1) Ọ bụrụ na i jiri obi umeala na-echere Jehova, oge Jehova chọrọ ka i nwekwuo ihe ùgwù ga-abịa.
Inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs chọkwara ndidi. Dị nnọọ ka onye ọrụ ugbo na-agaghị akwụsị ịnọgide na-agba ihe ndị ọ kụrụ mmiri ruo mgbe Chineke ga-eme ka ha too, otú ahụ ka ọ dị n’ọrụ inyere ndị ọzọ aka ka bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (1 Ndị Kọrịnt 3:7; Jems 5:7) Ọ na-ewe ọtụtụ ọnwa ma ọ bụkwanụ ọtụtụ afọ iji jiri ndidi mee ka ndị a na-amụrụ Bible kwere na Jehova ma gosi ekele ha nwere maka ihe ọ na-emere anyị. Ichere Jehova gụnyere ịnọgide na-aga amụrụ ndị mmadụ Bible, a sịgodị na ha adịghị etinye ihe ndị a na-akụziri ha n’ọrụ ná mmalite. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ bụrụ na ha egositụ na ha nwere ekele maka ihe ndị Jehova na-emere anyị, nke ahụ nwere ike ịbụ ihe àmà na-egosi na ha na-eme ihe mmụọ Jehova chọrọ. Ọ bụrụ na i nwee ndidi, i ga-enwe ọṅụ ịhụ ka Jehova na-eme ka onye ị na-amụrụ Bible nwee ọganihu ruo n’ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst.—Matiu 28:20.
Igosipụta Ịhụnanya Site n’Ichere Jehova
Iji gosi na mmadụ ichere Jehova pụrụ ịbụ ụzọ isi gosi na o nwere ịhụnanya na obi ike, tụlee ihe banyere otu agadi nwanyị bụ́ onyeàmà nke bi n’otu ọzara dị n’otu ugwu dị n’Ebe Ndịda America. Ọ bụ ya na otu nwanna nwanyị ọzọ bụ nanị Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Cheedị otú obi na-adị ha ka ha na-atụsi anya ike ịhụ Ndị Kraịst ibe ha na-abịa ileta ha. N’otu oge, otu onye nlekọta sekit furu ụzọ mgbe mbụ ọ gara ileta ha. Ọ laghachiri n’ụzọ o si bịa iji mata otú ọ ga-esi ruo ebe ọ na-aga, nke a mekwara ka o wee ya ọtụtụ awa iji rute. Ọ gafeelarị etiti abalị mgbe o lepụrụ anya hụ obodo ahụ n’ebe dị anya. Ka ọ na-erute nso, ọ tụrụ ya n’anya ịhụ otu ọkụ na-egbukenụ n’ihi na e nweghị ọkụ eletrik n’ebe ahụ. Obi tọrọ ya nnọọ ụtọ mgbe o mechara rute n’ama e si abanye n’obodo ahụ ma hụ na ọkụ ahụ ọ hụrụ na-enwunụ bụ ọkụ si na mpanaka nwanna nwanyị ahụ merela agadi ji bịa ichere ya! Nwanna nwanyị ahụ nọ na-eche ya n’ihi na ọ maara na onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị ga-abịarịrị.
Dị ka nwanna nwanyị a merela agadi, obi dị anyị ụtọ ka anyị ji ndidi na-eche Jehova. Anyị maara na ọ ga-emezu nkwa ndị o kwere anyị. Dị nnọọ ka onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị, anyị na-enwe ekele mgbe ndị ọzọ ji ịhụnanya na-echere anyị. N’ihi ya, ọ bụghị ihe iju anya na ọ na-atọ Chineke ụtọ ịhụ ndị nile na-echere ya. Bible kwuru, sị: “Ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ . . . ndị na-echere ebere Ya.”—Abụ Ọma 147:11.
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ na-atọ ndị na-eto Jehova mgbe nile ụtọ ichere ya