Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu

Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu

Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu

“Sonụ m mee ka Jehova dị ukwuu, ka anyị buliekwa aha Ya elu n’otu.”—ABỤ ỌMA 34:3.

1. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụụrụ anyị mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa?

N’ABALỊ Naịsan 14 nke afọ 33 O.A, Jizọs na ndịozi ya bụkuru Jehova abụ otuto n’otu ọnụ ụlọ nke otu ụlọ elu dị na Jeruselem. (Matiu 26:30) Nke ahụ bụ nke ikpeazụ Jizọs so ndịozi ya mee otú ahụ. Otú ọ dị, o kwesịrị ekwesị na o si otú ahụ mechie nzukọ ahụ ya na ha nwere. Malite mgbe o bidoro ozi elu ala ya ruo ná ngwụsị, Jizọs nyere Nna ya otuto ma jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ka a mara aha Chineke. (Matiu 4:10; 6:9; 22:37, 38; Jọn 12:28; 17:6) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ na-akpọ ndị mmadụ ụdị oku ọbụ abụ ahụ kpọrọ ndị oge ya, sị: “Sonụ m mee ka Jehova dị ukwuu, ka anyị buliekwa aha Ya elu n’otu.” (Abụ Ọma 34:3) Nke a bụ nnọọ ezi ihe nlereanya nke anyị kwesịrị ịgbaso.

2, 3. (a) Olee otú anyị si mara na ihe e dere n’Abụ Ọma nke 34 bụ amụma? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a na nke na-eso ya?

2 Mgbe awa ole na ole gasịrị ka ha na Jizọs bụsịrị abụ ahụ, Jọn onyeozi hụrụ otu ihe ọzọ dị nnọọ iche nke merenụ. Ọ hụrụ ka e gburu Onyenwe ya na ndị omekome abụọ n’osisi ịta ahụhụ. Ndị agha Rom gbajiri ụkwụ ndị omekome abụọ ahụ ka ha wee nwee ike ịnwụ ngwa ngwa. Ma Jọn kwuru na ha agbajighị ụkwụ Jizọs. Mgbe ndị agha ahụ ruru n’ebe Jizọs nọ, ọ nwụọlarị. Mgbe Jọn na-ede Oziọma ya, ọ kọwara na ihe ahụ merenụ mezuru ihe ọzọ e kwuru n’Abụ Ọma nke 34, bụ́ nke na-ekwu sị: “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọ bụla nke a ga-anyaji anyaji.”—Jọn 19:32-36; Abụ Ọma 34:20, Nsụgharị nke Septuagint.

3 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị n’Abụ Ọma nke 34 bụ́ ndị na-adọrọ mmasị Ndị Kraịst. N’ihi ya, n’isiokwu a na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe ndị kpaliri Devid ide abụ ọma ahụ, tụleekwa ihe ndị na-agba ume e dere na ya.

Devid E Si n’Ebe Sọl Nọ Gbapụ

4. (a) Gịnị mere e ji họpụta Devid ịbụ eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu? (b) Gịnị mere Sọl ji ‘hụ Devid n’anya’ nke ukwuu?

4 Ọ bụ Sọl bụ eze Izrel mgbe Devid dị obere. Otú ọ dị, Sọl nupụụrụ Jehova isi, Jehova wee jụ ya. N’ihi nke a, Samuel onye amụma gwara ya, sị: “Jehova adọwapụwo alaeze Izrel n’ahụ́ gị taa, nye ya mmadụ ibe gị, nke dị mma karịa gị.” (1 Samuel 15:28) Ka e mesịrị, Jehova gwara Samuel ka ọ gaa tee ọdụdụ nwa Jesi bụ́ Devid mmanụ, ịghọ eze Izrel. Ka nke a na-eme, Eze Sọl nọ na-enwe nsogbu n’ihi na mmụọ Chineke ahapụla ya. A kpọtara Devid, onye bụ́ ọkà n’ịkpọ ụbọ, na Gibia ka o jewere eze ozi. Ụbọ Devid na-akpọrọ Sọl na-eme ka obi na-adịtụ Sọl mma, nke a mekwara ka Sọl “hụ ya n’anya nke ukwuu.”—1 Samuel 16:11, 13, 21, 23.

5. Gịnị mere Sọl ji kpọọ Devid asị, gịnịkwa ka nke a manyere Devid ime?

5 Ka oge na-aga, Jehova nọnyeere nnọọ Devid. Jehova nyeere Devid aka imeri dike ndị Filistia bụ́ Golaịat, nyekwara ya aka mgbe aha ya malitere ide ude n’Izrel n’ihi na ọ bụ aka ochie n’ibu agha. Otú ọ dị, ngọzi Jehova gọziri Devid mere ka Sọl na-ekwoso Devid ekworo ma kpọọ ya ezigbo asị. Sọl tụrụ Devid ube ugboro abụọ ka Devid na-akpọrọ ya ụbọ. Devid zechara ube ndị ahụ. Mgbe Sọl nwara nke ugbo atọ ya igbu ya ka Devid maara na ya aghaghị ịzọwa isi ya. Ka Sọl siri ọnwụ na-agbalị ịnwụde Devid iji gbuo ya, Devid kpebiziri isi n’Izrel gbaga n’obodo ọzọ maka ndụ ya.—1 Samuel 18:11; 19:9, 10.

6. Gịnị mere Sọl ji nye iwu ka e gbuo ndị bi na Nọb?

6 Ka Devid na-agbapụ n’Izrel, ọ kwụsịrị n’obodo Nọb, bụ́ ebe ụlọikwuu Jehova dị. Ihe ama na-egosi na e nwere ụmụ okorobịa ndị ha na Devid so mgbe ọ na-agbapụ, Devid rịọkwara onyeisi nchụàjà nọ n’ebe ahụ ka o nye ha ihe ha ga-eri. Sọl nụrụ na onyeisi nchụàjà nyere Devid na ndị ya na ha so nri na mma agha ahụ Devid napụtara Gọlaịat mgbe o gbusịrị ya. Sọl jizi iwe nye iwu ka e gbuo ndị nile bi n’obodo ahụ, gụnyere ndị nchụàjà iri asatọ na ise.—1 Samuel 21:1, 2; 22:12, 13, 18, 19; Matiu 12:3, 4.

Devid Agbanahụ Ọnwụ Ọzọ

7. Gịnị mere na Gat abụghị ebe Devid kwesịrị ịgbaga?

7 Devid sizi na Nọb gbaga n’obodo Gọlaịat bụ́ Gat. Gat dị n’ebe ọdịda anyanwụ Filistia nke dị kilomita iri anọ site na Nọb, bụ́ ebe Eze Ekish na-achị. Eleghị anya Devid chere na Sọl agaghị anwa anwa chọọ ya na Gat. Ma o teghị aka ndị ohu eze Gat amata onye Devid bụ. Mgbe Devid nụrụ na ha amatala onye ọ bụ, ‘ọ tụrụ egwu Ekish, bụ́ eze Gat nke ukwuu.’—1 Samuel 21:10-12.

8. (a) Gịnị ka Abụ Ọma nke 56 na-agwa anyị banyere ihe mere Devid na Gat? (b) Olee otú Devid si gbanahụ ọnwụ?

8 Ndị Filistịa jidere Devid. O nwere ike ịbụ n’oge a ka Devid rọrọ abụ ahụ na-emetụ n’ahụ́ nke ọ nọ na ya rịọ Jehova, sị: “Tinye anya mmiri m nile n’ime karama akpụkpọ Gị.” (Abụ Ọma 56:8 na ihe e dere n’elu ya) Ihe a o kwuru gosiri na obi siri ya ike na Jehova agaghị echefu iru uju ya, kama na ọ ga-eji ịhụnanya lekọta ya ma chebe ya. Devid chepụtakwara ihe ọ ga-eme iji megharịa eze Filistịa anya. O mewere ka onye ara. Mgbe Eze Ekish hụrụ Devid, ọ baara ndị ohu ya mba ihe mere ha ji kpọtara ya onye “na-awị ara.” O doro anya na Jehova mere ka atụmatụ Devid gaa nke ọma. A chụpụrụ Devid n’obodo ahụ, ya esi otú ahụ gbanahụ ọnwụ ọzọ.—1 Samuel 21:13-15.

9, 10. Gịnị mere Devid ji dee Abụ Ọma nke 34, oleekwa ndị Devid bu n’obi, ma eleghị anya, rọọ abụ ahụ?

9 Bible ekwughị ma ndị ha na Devid so hà so ya banye na Gat ma ọ bụ ma hà nọ n’obodo Izrel ndị dị nso na Gat na-eche mgbe o suru ka ha bịa napụta ya. Nke ọ sọrọ ya ya bụrụ, ọ ghaghị ịbụ na ha nile nwere obi ụtọ mgbe Devid kọọrọ ha otú Jehova si napụta ya ọzọ. Ọ bụ ihe ahụ merenụ mere e ji dee Abụ Ọma nke 34, dị ka ihe e dere n’elu abụ ahụ na-egosi. N’amaokwu asaa mbụ nke Abụ Ọma ahụ, Devid toro Chineke maka ịnapụta ya ma kpọọ ndị òtù ya ka ha soro ya too Jehova dị ka Onye ukwu nke na-anapụta ndị ya.—Abụ Ọma 34:3, 4, 7.

10 Devid na ndị ya na ha so gbabara n’ọgba dị na Adulam nke dị n’ebe bụ ugwu ugwu n’Izrel, nke dị kilomita iri na ise site na Gat. Ndị Izrel ọchịchị Eze Sọl na-adịghịzi mma n’obi bịara sonyere ha n’ebe ahụ. (1 Samuel 22:1, 2) Ọ ga-abụ ndị a ka Devid bu n’obi rọọ Abụ Ọma 34:8-22. Ihe ndị e chetaara ha n’amaokwu ndị ahụ dịkwa anyị mkpa taa, ịtụle ọmarịcha abụ a ga-abakwara anyị uru n’ezie.

Ọ̀ Bụ Ụdị Ihe Ndị Devid Butere Ụzọ ná Ndụ Ka Ị Na-ebute Ụzọ?

11, 12. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji nọgide na-eto Jehova?

11 “M ga-agọzi Jehova na mgbe nile: mgbe nile ka otuto Ya ga-adị n’ọnụ m.” (Abụ Ọma 34:1) Mgbe Devid na-awagharị dị ka onye a jụrụ ajụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere ọtụtụ mkpa, ma dị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gosiri, o kweghị ka mkpa ya ndị a gbochie ya ịnọgide na-eto Jehova. Nke a bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya mgbe ihe na-esiri anyị ike! Ma anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ, mgbe anyị na Onye Kraịst ibe anyị nwere nghọtahie, ma ọ bụ mgbe anyị na-enwe ihe isi ike n’ozi ubi, ihe mbụ anyị kwesịrị ibute ụzọ bụ ito Jehova. Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha Jehova kere bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị nwee obi ụtọ ma anyị mata banyere ha. Chegodị nnọọ ihe o jiworo ndị ohu ya nọ n’ụwa rụzuo! Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ezughị okè, Jehova ejiwo ha rụọ ọrụ dị egwu n’oge anyị a. Ọ̀ dị otú ọ bụla a pụrụ isi jiri ihe ndị Chineke rụzuworo tụnyere nke ụmụ mmadụ ndị a na-efe ka chi n’ụwa? Ì kweghị na Devid kwuru eziokwu mgbe o dere, sị: “Ọ dịghị onye dị ka Gị n’etiti chi nile, Onyenwe anyị; ọ dịghịkwa ọrụ dị ka ọrụ Gị nile”?—Abụ Ọma 86:8.

12 Dị ka Devid, a na-akpali anyị ito Jehova mgbe nile n’ihi aka ọrụ ya ndị na-enweghị atụ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ na-eme anyị obi ụtọ ịmara na ọ bụ Jizọs Kraịst, bụ́ eze na-agaghị anwụ anwụ nke sitere n’agbụrụ Devid, na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke. (Mkpughe 11:15) Nke a pụtara na ụwa ochie a abịawala ná njedebe. Ma a maghị ihe e mere, ijeri mmadụ isii bi n’ụwa agaghị enwe ohere ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ dị nnọọ mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke na ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ n’isi nso ma nyere ha aka ịbịa soro anyị na-eto Jehova. N’ezie, ihe anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ bụ otú anyị pụrụ isi jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa ndị ọzọ ume ịṅa ntị ‘n’ozi ọma a’ tupu oge agaa.—Matiu 24:14.

13. (a) Ònye ka Devid ji nyaa isi, oleekwa ụdị ndị nke a dọtara mmasị ha? (b) Olee otú e si adọta ndị dị umeala n’obi n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa?

13 “Jehova ka mkpụrụ obi m ga-eji nyaa isi: ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya, wee ṅụrịa ọṅụ.” (Abụ Ọma 34:2) Ọ bụghị ihe Devid rụzuru ka o ji na-anya isi n’ebe a. Dị ka ihe atụ, o jighị otú o si megharịa eze Gat anya nyaa isi. Ọ ghọtara na ọ bụ Jehova chebere ya mgbe ọ nọ na Gat, ma ọ́ bụghị ya, ọ gaara eri isi ya. (Ilu 21:1) N’ihi ya, Devid ji Jehova nyaa isi, ọ bụghị onwe ya. Otuto a Devid nyere Jehova dọtara ndị dị umeala n’obi n’ebe Jehova nọ. Jizọs tokwara aha Jehova, nke a mekwara ka ndị dị umeala n’obi a pụrụ ịkụziri ihe bịakwute Jehova. Taa, a na-adọta ndị dị umeala n’obi sitere ná mba dị iche iche n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị Jizọs bụ Onyeisi ha. (Ndị Kọlọsi 1:18) Ọ na-emetụ ndị dị otú a n’ahụ́ mgbe ha nụrụ ka ndị ohu Chineke dị umeala n’obi na-eto aha ya nakwa mgbe ha nụrụ ozi ndị dị na Bible bụ́ ndị mmụọ nsọ na-enyere ha aka ịghọta.—Jọn 6:44; Ọrụ 16:14.

Nzukọ Ndị Kraịst Na-ewusi Okwukwe Anyị Ike

14. (a) Afọ ò juru Devid ito Jehova nanị ya? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụrụ banyere izukọ ọnụ iji fee Jehova?

14 “Sonụ m mee ka Jehova dị ukwuu, ka anyị buliekwa aha Ya elu n’otu.” (Abụ Ọma 34:3) O jughị Devid afọ ito Jehova nanị ya. Ọ kpọrọ ndị ọzọ oku ka ha bịa sonyere ya n’ibuli aha Chineke elu. Jizọs Kraịst, bụ́ Devid ahụ Ka Ukwuu, nwekwara obi ụtọ ito Jehova n’ihu ọha—n’ụlọ nzukọ dị n’obodo ya, n’oge ememe a na-eme n’ụlọ nsọ Chineke dị na Jeruselem, nakwa mgbe ya na ụmụazụ ya nọ. (Luk 2:49; 4:16-19; 10:21; Jọn 18:20) N’ezie, ọ bụ ihe ùgwù na-enye ọṅụ ịgbaso ihe nlereanya Jizọs ito Jehova n’oge ọ bụla anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị nọ, karịsịa n’oge a, ka anyị “na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

15. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ahụmahụ Devid nwere n’ahụ́ ndị ya na ha so? (b) Olee otú anyị si erite uru site n’ịbịa ọmụmụ ihe anyị?

15 “Achọrọ m Jehova, Ọ zakwara m, wee napụta m n’ụjọ m nile.” (Abụ Ọma 34:4) Ahụmahụ a Devid nwere metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. N’ihi ya, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye a e wedara n’ala kpọrọ oku, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.” (Abụ Ọma 34:6) Mgbe anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị nọ, anyị nwere ọtụtụ ohere ịkọrọ ha ahụmahụ ndị na-ewuli elu banyere otú Jehova si nyere anyị aka ịnagide ihe isi ike ndị anyị nwere. Nke a na-eme ka okwukwe ndị kwere ekwe ibe anyị sie ike, dị nnọọ ka ihe ndị Devid kọọrọ ndị ya na ha so si mee ka okwukwe ha sie ike. Na nke Devid, ndị ya na ha so “legidere [Jehova] anya, wee nwuo enwuo: ka ihere ghara imekwa ha n’ihu.” (Abụ Ọma 34:5) Ọ bụ ezie na ha nọ na-agba ọsọ ndụ ka Eze Sọl ghara igbu ha, ihere emeghị ha. Obi siri ha ike na Chineke na-akwado Devid, nke a mekwara ka ihu ha nwuo enwuo. Dị ka Devid na ndị òtù ya, ndị nwere mmasị ọhụrụ na ndị bụworo ezi Ndị Kraịst ruo ogologo oge na-elegara Jehova anya maka enyemaka. Ebe ọ bụ na Jehova enyeworo ha onwe ha aka, ihu ha nke na-enwu enwu na-egosi na ha ekpebisiela ike ịnọgide na-efe Jehova.

Nwee Ekele Maka Enyemaka Sitere n’Aka Ndị Mmụọ Ozi

16. Olee otú Jehova siworo jiri ndị mmụọ ozi ya chebe ndị ya?

16 “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, O wee dọpụta ha.” (Abụ Ọma 34:7) Devid echeghị na ọ bụ nanị ya ka Jehova pụrụ ịnapụta. Ọ bụ eziokwu na Devid bụ onye Jehova tere mmanụ, ya bụ́, onye ga-achị Izrel n’ọdịnihu, ọ maara na Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya echebe ndị nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe, n’agbanyeghị ma hà bụ ndị a ma ama ma ọ bụ na ọ dịghị onye maara ha. N’oge anyị a, Jehova echebewokwa ndị na-efe ya ofufe. Na Nazi Germany—nakwa n’Angola, Malawi, Mozambique, na ọtụtụ mba ndị ọzọ—ndị ọchịchị agbalịwo ikpochapụ Ndịàmà Jehova. Mgbalị ha akụwo afọ n’ala. Kama ikpochapụ ndị Jehova, ndị Jehova nọ n’obodo ndị a nọgidere na-amụba ka ha na-ebuli aha Chineke elu n’otu. Gịnị mere nke a ji kwe omume? Ọ bụ n’ihi na Jehova ji ndị mmụọ ozi ya dị nsọ na-echebe ma na-eduzi ndị ya.—Ndị Hibru 1:14.

17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị mmụọ ozi Chineke si enyere anyị aka?

17 Ihe ọzọkwa ndị mmụọ ozi Jehova na-eme bụ na ha pụrụ ime ka e wepụ onye ọ bụla na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ n’etiti ndị Jehova. (Matiu 13:41; 18:6, 10) Ọ bụ ezie na o nwere ike anyị agaghị aghọtacha ihe mere n’oge ahụ, ndị mmụọ ozi na-ewepụ ihe ọ bụla pụrụ igbochi anyị ijere Chineke ozi, ha na-echebekwa anyị pụọ n’ihe ọ bụla pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Jehova. Nke kasị mkpa bụ na ha na-eduzi anyị ka anyị na-ekwusara ụmụ mmadụ “ozi ọma ebighị ebi,” gụnyere n’ebe ndị ọ dị ize ndụ ikwusa ozi ọma. (Mkpughe 14:6) A kọwo ọtụtụ ahụmahụ ndị na-egosi na ndị mmụọ ozi na-enyere ndị Jehova aka n’akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị Ndịàmà Jehova bipụtara. * Ahụmahụ ndị ahụ dị nnọọ ọtụtụ nke na o nweghị otú a ga-esi lee ha anya dị ka ihe ndị mere ná ndaba.

18. (a) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka mmụọ ozi na-enyere anyị aka? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isokwu na-esonụ?

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọgide na-eduzi ma na-echebe anyị, anyị ga-anọgide na-ebuli aha Jehova elu ọbụna mgbe a na-emegide anyị. Cheta na ọ bụ nanị “gburugburu ndị na-atụ egwu [Jehova]” ka mmụọ ozi Chineke na-ama ụlọikwuu. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Gịnị bụ ịtụ egwu Chineke, oleekwa otú anyị pụrụ isi malite ịtụ egwu Chineke? Gịnị mere Chineke na-ahụ n’anya ga-eji chọọ ka anyị na-atụ egwu ya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Lee akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 550; 2005 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 53-54; Ụlọ Nche nke March 1, 2000, peeji nke 5-6; January 1, 1991, peeji nke 27; na February 15, 1991, peeji nke 26.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ule ndị Devid diri mgbe ọ na-eto eto?

• Dị ka Devid, olee ihe ndị anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị?

• Olee otú anyị si ele nzukọ Ndị Kraịst anya?

• Olee otú Jehova si eji ndị mmụọ ozi ya enyere anyị aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map dị na peeji 21]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Rema

Gat

Ziklag

Gibia

Nọb

Jeruselem

Betlehem

Adọlam

Kaịla

Hibrọn

Zif

Horesh

Kamel

Meyọn

En-gidaị

Oké Osimiri Nnu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Map: Nke sitere na map anyị natara ikike ya n’aka Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. na Survey of Israel

[Foto dị na peeji nke 21]

Ọbụna mgbe Devid na-agba ọsọ ndụ, ọ nọgidere na-ebuli aha Jehova elu

[Foto dị na peeji nke 23]

Okwukwe anyị na-esi ike ka anyị na-ege ahụmahụ ndị a na-akọ ná mgbakọ Ndị Kraịst