Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Amata Ezi Okpukpe

Otú E Si Amata Ezi Okpukpe

Otú E Si Amata Ezi Okpukpe

IHE ka ọtụtụ n’okpukpe ndị e nwere na-ekwu na ihe ha na-akụzi sitere na Chineke. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ige ntị n’ihe onyeozi Jizọs bụ́ Jọn dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ, kama nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abawo n’ime ụwa.” (1 Jọn 4:1) Olee otú anyị pụrụ isi nwalee ihe iji mara ma o sitere na Chineke?

Ihe ọ bụla sitere na Chineke ga-enwe àgwà ya, karịsịa àgwà ya nke kasịnụ bụ́ ịhụnanya. Dị ka ihe atụ, ikike anyị nwere ịnụ ísì, bụ́ nke na-eme ka anyị na-anụ ísì ahịhịa, ísì okooko osisi, ma ọ bụ ísì bred a ka si n’ọkụ gụpụta, so n’ihe ndị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ikike anyị nwere ịhụ anyanwụ ka ọ na-ada, ịhụ urukurubụba, ma ọ bụ obere nwa na-amụmụ ọnụ ọchị na-egosipụtakwa na Chineke hụrụ anyị n’anya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ikike anyị nwere ịnụ egwú dị ụtọ, ịnụ ube nnụnụ, ma ọ bụ olu onye anyị hụrụ n’anya. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, ọbụna otú Chineke si kee anyị na-egosi na ọ hụrụ anyị nnọọ n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji ekwetakarị na ihe ahụ Jizọs kwuru na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe” bụ eziokwu. (Ọrụ 20:35) Ihe mere o ji atọ anyị ụtọ igosipụta ịhụnanya bụ n’ihi na e kere anyị “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Ọ bụ ezie na Jehova nwere ọtụtụ àgwà ndị ọzọ, ịhụnanya bụ àgwà ya kasị pụta ìhè.

Akwụkwọ ndị sitere n’aka Chineke kwesịrị inwe ihe àmà ndị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. Okpukpe ndị e nwere n’ụwa a nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie ha ji eme ihe. Akwụkwọ ndị a hà nwere ihe àmà ndị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya?

Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị a enweghị nke na-akọwa otú Chineke si hụ anyị n’anya ma ọ bụ otú anyị pụrụ isi hụ Chineke n’anya. N’ihi ya, ọtụtụ nde mmadụ adịghị enweta azịza mgbe ha jụrụ ajụjụ bụ́, “Gịnị mere anyị ji ahụ ihe àmà na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya n’ihe ndị e kere eke ma ihe ọjọọ na nhụjuanya anọgide na-adị?” N’aka nke ọzọ, Bible bụ nanị akwụkwọ e dere n’oge ochie nke na-eme ka o doo anyị nnọọ anya na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị kwesịrị isi na-egosipụta ịhụnanya.

Akwụkwọ Na-akọ Banyere Ịhụnanya

Okwu Chineke bụ́ Bible, na-egosi na Jehova bụ “Chineke nke ịhụnanya.” (2 Ndị Kọrint 13:11) Bible na-akọ otú ịhụnanya si kpalie Jehova ike nwoke mbụ na nwanyị mbụ ahụ ka ha ghara ịrịa ọrịa ma ọ bụ nwụọ anwụọ. Ma isi ha nupụụrụ Chineke kpataara ụmụ mmadụ ahụhụ. (Deuterọnọmi 32:4, 5; Ndị Rom 5:12) Jehova mekwara ihe iji mee ka ọnọdụ dịghachi otú ọ dịbu. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Akwụkwọ Nsọ gosikwuru na Chineke hụrụ anyị n’anya mgbe ọ kọwara otú Chineke si guzobe ọchịchị zuru okè nke Jizọs ga-abụ onyeisi ya, bụ́ nke ga-eme ka ụmụ mmadụ na-erubere Chineke isi nweghachi udo.—Daniel 7:13, 14; 2 Pita 3:13.

Bible si otú a chịkọta ihe Chineke chọrọ n’aka mmadụ: “‘Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke a bụ ihe e nyere n’iwu nke kasịnụ, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, dị ka ya, bụ nke a, ‘Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ N’ihe abụọ a e nyere n’iwu ka Iwu ahụ dum, nakwa akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.” (Matiu 22:37-40) Bible na-ekwu na ya bụ akwụkwọ e dere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ebe ọ bụ na Bible na-akọwapụta nnọọ àgwà Chineke, anyị pụrụ ijide n’aka na o si n’aka “Chineke nke ịhụnanya.”—2 Timoti 3:16.

Anyị pụrụ iji ihe ndị a e kwuru n’elu mata akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie bụ́ ndị nke sitere n’aka Chineke n’ezie. Ịhụnanya ka e jikwa amata ezi ndị na-efe Chineke, n’ihi na ha na-egosipụta ịhụnanya dị ka Chineke.

Otú E Si Amata Ndị Hụrụ Chineke n’Anya

Ọ bụ ugbu a anyị bi n’oge Bible kpọrọ ‘ụbọchị ikpeazụ’ ka a kasị amata ndị hụrụ Chineke n’anya n’ezie. Ndị mmadụ na-aghọwanye “ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1-4.

Olee otú ị ga-esi mata ndị hụrụ Chineke n’anya? Bible na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) Ọ bụ ịhụnanya ndị mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali ha irube isi n’iwu ndị dị na Bible banyere omume ọma. Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke nwere iwu ndị metụtara mmekọahụ nakwa alụmdi na nwunye. Ọ bụ nanị ndị bụ́ di na nwunye ka e nyere ikike inwe mmekọahụ, a chọkwara ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe na-adịgide adịgide. (Matiu 19:9; Ndị Hibru 13:4) Mgbe otu nwanyị nọ na Spen, bụ́ onye mụrụ banyere okpukpe gara ebe Ndịàmà Jehova na-amụ nnọọ ihe ndị Bible kwuru banyere omume ndị ziri ezi, o kwuru, sị: “Mgbe a gbasara ọmụmụ ihe ahụ, ihe nyere m ume ọhụrụ abụghị nanị ihe ndị a kụziri site n’Akwụkwọ Nsọ kamakwa otú Ndịàmà Jehova si dịrị n’otu, ụkpụrụ omume ha dị elu, na àgwà ọma ha.”

Ihe ọzọ pụtara ìhè e ji ama ezi Ndị Kraịst e wezụga na ha hụrụ Chineke n’anya, bụ otú ha si egosipụta na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. Ọrụ kasị mkpa ha na-arụ bụ ịkọrọ ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ nanị olileanya ụmụ mmadụ nwere. (Matiu 24:14) Ọ dịghị ihe ga-abara ndị agbata obi ha uru ga-adịgide adịgide karịa inyere ha aka inweta ihe ọmụma banyere Chineke. (Jọn 17:3) E nwekwara ụzọ ndị ọzọ ezi Ndị Kraịst si egosipụta na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ha na-enyere ndị nọ ná nsogbu aka. Dị ka ihe atụ, mgbe e nwere ala ọma jijiji n’Ịtali, otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’obodo ahụ kwuru na Ndịàmà Jehova “na-enyere ndị mmadụ aka n’ụzọ a na-ahụ anya, na-enyere ndị nọ n’ahụhụ aka n’agbanyeghị okpukpe ha na-ekpe.”

E wezụga ịhụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya, ezi Ndị Kraịst hụkwara ibe ha n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.

È nwere ihe àmà na-egosi nnọọ na ezi Ndị Kraịst nwere ịhụnanya pụrụ iche n’etiti onwe ha? Otu nwanyị na-agbara mmadụ odibo aha ya bụ́ Ema chere otú ahụ. Ọ na-arụ ọrụ na La Paz, Bolivia, bụ́ ebe ịkpa ókè agbụrụ na-akpatakarị nkewa n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye. O kwuru, sị: “Ụbọchị mbụ m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ahụrụ m otu nwoke jikere nnọọ nke ọma ka ya na otu nwanyị India nọ ọdụ na-akparị nnọọ ụka. Ahụtụbeghị m ihe dị otú ahụ mbụ. Ozugbo ahụ ka obi m gwara m na ndị a ga-abụrịrị ndị Chineke.” Otu nwa agbọghọ onye Brazil aha ya bụ́ Miriam kwukwara ihe yiri nke ahụ mgbe ọ sịrị: “Anaghị m enwe obi ụtọ, ọbụna n’ime ezinụlọ m. Ebe mbụ m hụrụ ka a na-egosipụta ihe bụ́ ịhụnanya bụ n’etiti Ndịàmà Jehova.” Na United States, otu onye nta akụkọ nke otu ụlọ ọrụ televishọn dere, sị: “A sị na e nwekwuru ndị na-eme ka ndị chọọchị unu, obodo anyị a agaraghị edebe ihu otú a o debere ihu. Abụ m otu n’ime ndị nta akụkọ maara na nzukọ unu nwere ịhụnanya na okwukwe siri ike n’ebe Onye Okike nọ.”

Chọọ Ebe A Na-efe Chineke Ezi Ofufe

Ịhụnanya bụ ihe na-eme ka ndị na-efe Chineke ezi ofufe dịrị nnọọ iche. Jizọs ji ịchọta ezi ofufe tụnyere ịchọta ezi ụzọ na ịhọrọ ije ije na ya. Ọ bụ ya bụ nanị ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Jizọs kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) Ọ bụ nanị otu ìgwè ndị bụ́ ezi Ndị Kraịst na-efe Chineke ofufe n’ụzọ ọ na-anara. N’ihi ya, ọ dị mkpa ilezi okpukpe ị na-ahọrọ anya. Ọ bụrụ na ị chọta ụzọ ahụ ma họrọ ije ije na ya, ọ pụtara na ị chọtala ụzọ kasị mma isi bie ndụ n’ihi na ọ bụ ụzọ nke ịhụnanya.—Ndị Efesọs 4:1-4.

Chetụgodị ụdị ọṅụ ị ga-enwe ka ị na-efe Chineke ezi ofufe! Ọ dị ka gị na Chineke iso na-eje ije. Ị pụrụ isi n’aka Chineke nweta amamihe, ị pụkwara isi n’aka ya mụta ịhụ ndị ọzọ n’anya bụ́ nke ga-eme ka gị na ha na-adị nnọọ ná mma. Ị pụrụ isi n’aka ya mụta ihe bụ́ nzube nke ndụ, i nwekwara ike isi n’aka ya ghọta nkwa ndị o kwere ma si otú a nwee olileanya maka ọdịnihu. Ọ dịghị ihe ga-eme ka ị kwaa ụta n’ihi ịhọrọ ife Chineke ezi ofufe.

[Foto dị na peeji nke 5]

N’ime akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie okpukpe ji eme ihe, ọ bụ nanị Bible mere ka anyị mata na Chineke hụrụ anyị n’anya

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe e ji amata ezi Ndị Kraịst bụ ịhụnanya ha na-egosipụta