Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Wessel Gansfort “Onye Ndozi E Nwere Tupu Oge Ndozigharị Ahụ”

Wessel Gansfort “Onye Ndozi E Nwere Tupu Oge Ndozigharị Ahụ”

Wessel Gansfort “Onye Ndozi E Nwere Tupu Oge Ndozigharị Ahụ”

Ndị nile na-amụ banyere Ndozigharị ahụ malitere na 1517, bụ́ nke chọọchị Protestant mere maara Luther, Tyndale, na Calvin nke ọma. Ma, ọ bụ mmadụ ole na ole nụtụrụla aha ahụ bụ́ Wessel Gansfort. A kpọrọ ya “onye ndozi e nwere tupu oge Ndozigharị ahụ.” Ị̀ ga-achọ ịmakwu banyere nwoke a?

A MỤRỤ Wessel na 1419 n’obodo Groning-en nke dị na Netherlands. Na narị afọ nke iri na ise, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nwere ohere ịga akwụkwọ, ma Wessel so ná ndị gara akwụkwọ. N’agbanyeghị na o nwere isi akwụkwọ, ọ kwụsịrị ịga akwụkwọ mgbe ọ dị afọ itoolu n’ihi na ndị mụrụ ya bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. Ma ọ dabaara ya na mgbe otu nwanyị di ya nwụrụ bara ọgaranya nụrụ na o nwere isi akwụkwọ, o kwetara ịzụ ya n’ụlọ akwụkwọ. Nke a meziri ka ọ maliteghachi ịga akwụkwọ. Ka oge na-aga, o nwetara akara ugo mmụta dị elu ndị Bekee na-akpọ Masters bụ́ nke a na-enweta na mahadum. O yikwara ka o mechara nweta akara ugo mmụta ọzọ karịrị Masters nke a na-akpọ Doctorate, n’ihe ọmụmụ banyere okpukpe.

Ọ gụsiri nnọọ Wessel agụụ ike ịmụta ihe. Ma n’oge ya, e nwere nanị ọ́bá akwụkwọ ole na ole. N’agbanyeghị na e mepụtara ígwè obibi akwụkwọ ndị a na-edogharị mkpụrụ akwụkwọ ha edogharị n’oge ọ nọ ndụ, ọ bụ aka ka e ji dee ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị e nwere n’oge ahụ, ha dịkwa oké ọnụ. Wessel so n’ìgwè ndị mmụta na-aga n’ọ́bá akwụkwọ dị iche iche nakwa n’ebe ndị mọnk bi ịchọ ma hà ga-ahụ ihe ndị e dere n’oge ochie ma ọ bụ akwụkwọ ndị e chefurula echefu. Ha chọta akwụkwọ ndị a gụọ ha, ha na-akọziri ndị ọzọ ihe ha gụtara. Wessel mụtara ọtụtụ ihe ma detuo ha n’otu akwụkwọ o ji edetu aha ndị mmadụ na ihe ndị ha kwuru. O detukwara ihe ndị o si n’akwụkwọ Latin na Grik nweta. Ndị ọkà mmụta ndị ọzọ na-enyokarị Wessel enyo n’ihi na ọ maara ọtụtụ ihe ndị ha na-anụtụbeghịdị. Ha kpọrọ Wessel Magister Contradictionis, ma ọ bụ Onye dị mgbagwoju anya.

“Gịnị Mere Ị Gwaghị M Gakwuru Kraịst?”

Ihe dị ka afọ iri ise tupu Ndozigharị ahụ, Wessel zutere Thomas à Kempis (nke a bụ n’ihe dị ka n’agbata afọ 1379-1471), bụ́ onye e weere na ọ bụ ya dere akwụkwọ ahụ a ma ama bụ́ De Imitatione Christi (Kraịst Adịgboroja). Thomas à Kempis so n’òtù ndị kpọrọ onwe ha ndị Brethren of the Common Life, bụ́ òtù kwenyesiri ike na ọ dị mkpa ka mmadụ nyefee Chineke onwe ya. Otu onye dere akụkọ ndụ Wessel kwuru na Thomas à Kempis gwara Wessel ọtụtụ mgbe ka o kpegara Meri ekpere maka enyemaka. Wessel jụrụ ya, sị: “Gịnị mere ị gwaghị m gakwuru Kraịst, bụ́ onye ji obiọma gwa ndị nile e boro ibu dị arụ ka ha bịakwute ya?”

E kwuru na Wessel ekweghị ka e chie ya ụkọchukwu. Mgbe a jụrụ ya ihe mere na o kweghị ka e chie ya ụkọchukwu ma kpụọ ya ụdị isi e ji ama ndị ụkọchukwu, o kwuru na ụjọ ọnwụ adịghị atụ ya, na ihe ka ya mkpa bụ ịhụ na echiche ya nile zuru ezu mgbe ya na-anwụ. O yiri ka ihe ọ na-ekwu banyere ya ọ̀ bụ eziokwu ahụ bụ́ na adịghị ama ndị ụkọchukwu ikpe, o yikwara ka ụdị isi ahụ ha na-akpụ ọ̀ napụtara ọtụtụ n’ime ha n’aka ọnwụ n’ezie. E nwekwara ụfọdụ ihe ndị a na-eme n’okpukpe bụ́ ndị Wessel na-anabataghị. Dị ka ihe atụ, a katọrọ ya n’ihi na o kwetaghị n’ọrụ ebube ndị a kọrọ n’otu akwụkwọ a ma ama n’oge ya a na-akpọ Dialogus Miraculorum. Kama ikweta n’ihe ndị ahụ a kọrọ, o kwuru, sị: “Ọ kaara m mma ịgụ ndị nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ.”

“Nanị Ihe Anyị Na-ama Bụ Ihe Ndị Anyị Jụrụ Ajụjụ Banyere Ha”

Wessel mụrụ asụsụ Hibru na Grik ma mụta ihe dị ukwuu site n’ihe odide nke Ndị Nna Chọọchị nke oge ochie. Ihe mechara ka mmasị Wessel nwere n’ịgụ asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible dị ịrịba ama bụ na o biri ndụ tupu Erasmus na Reuchlin. * Tupu a malite Ndozigharị ahụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole maara asụsụ Grik. Na Germany, ọ bụ nanị ndị ọkà mmụta ole na ole maara asụsụ Grik nke ọma, e nweghịkwa ihe ndị na-enye aka n’ịmụta asụsụ a n’oge ahụ. Eleghị anya, ọ bụ mgbe Constantinople dasịrị na 1453, ka Wessel zutere ndị mọnk Grik bụ́ ndị gbagara n’ebe Ọdịda Anyanwụ, ọ mụtara okwu ndị bụ́ isi n’asụsụ Grik n’aka ha. N’oge ahụ, ọ bụ ndị Juu nanị na-asụkarị asụsụ Hibru, o yikwara ka ọ bụ ndị Juu e mere ka ha hapụ okpukpe ha kụziiri Wessel mkpụrụ okwu ndị bụ́ isi n’asụsụ Hibru.

Wessel adịghị eji Bible egwuri egwu. O weere ya ka akwụkwọ sitere n’aka Chineke, o kwekwara na ọ dịghị akwụkwọ Bible nke ya na ibe ya na-ekwekọrịtaghị. Wessel kweere na nkọwa nke amaokwu Bible ọ bụla ga-ekwekọ n’ihe ndị gbara ya gburugburu, na e kwesịghịkwa ịgbagọ ya agbagọ. O kwuru na e kwesịrị ile nkọwa ọ bụla gbagọrọ agbagọ anya dị ka ozizi na-eduhie eduhie. Otu n’ime amaokwu Bible ndị kasị amasị ya bụ Matiu 7:7, bụ́ nke kwuru, sị: “Nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa.” N’ihi ihe a amaokwu a kwuru, Wessel kwenyesiri ike na ịjụ ajụjụ bara uru, na-ekwu na “nanị ihe anyị na-ama bụ ihe ndị anyị jụrụ ajụjụ banyere ha.”

Arịrịọ Dị Ịrịba Ama

Wessel gara Rom na 1473. N’ebe ahụ, e kwere ka ọ hụ Popu Sixtus nke anọ, bụ́ onye mbụ n’ime ndị popu isii àgwà ọjọọ ha mere ka e nwee Ndozigharị sitere n’aka chọọchị Protestant. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Barbara W. Tuchman kwuru na ọ bụ Sixtus nke anọ malitere “àgwà nke popu iji ike dị ya n’aka eme ihe otú masịrị ya maka abamuru nke onwe ya, na-achọghị ịma ma ihe ọ na-eme ọ dị mma ma ọ bụ na ọ dịghị.” O mere ihe wụrụ ndị chọọchị ya akpata oyi n’ahụ́ site n’imelara nanị ndị ikwu ya na ndị enyi ya ihe. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme dere na o nwere ike ịbụ na Sixtus chọrọ ka ọ bụrụ nanị ndị ezinụlọ ya ga na-anọ n’ọkwá popu. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole kara anya katọọ ihe ndị a Sixtus na-eme.

Ma Wessel Gansfort dị iche. Sixtus gwara ya otu ụbọchị, sị: “Nwa m, rịọ ihe ọ bụla ị chọrọ, anyị ga-enye gị ya.” Wessel zara ya ozugbo, sị: “Nna dị asọ, . . . ebe ọ bụ gị nọ n’ọkwá onye nchụàjà na onye ọzụzụ atụrụ kasịnụ n’ụwa, ana m arịọ . . . ka ị rụọ nnukwu ọrụ a i nwere otú ọ ga-abụ na mgbe Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ ga-abịa, o ga-enwe ike ịgwa gị, sị: ‘I mere nke ọma, ezi ohu na-ekwesị ntụkwasị obi, banye n’ọṅụ nke Nna gị Ukwu.’” Sixtus zara ya na nke a bụ ọrụ ya ma gwa Wessel ka o kwuo ihe ọ chọrọ ka e nye ya. Wessel zara ya, sị: “Ya bụrụ otú ahụ, achọrọ m ka i si n’ọ́bá akwụkwọ Vatican nye m Bible Grik na nke Hibru.” Popu ahụ kwetara inye ya ihe ndị ọ chọrọ ma gwa Wessel na ọ kpara àgwà iberibe, na ọ gaara arịọ ka a họpụta ya dị ka bishọp!

“Ụgha na Ihie Ụzọ”

Sixtus bụ onye bidoro ire ịndọlijensị, bụ́ nke ndị mmadụ na-azụ maka ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha. Ihe mere o ji bido nke a bụ n’ihi na ọ chọsiri ike inweta ego ọ ga-eji wuo ụlọ ụka ahụ na-ewu ewu ugbu a bụ́ Sistine Chapel. Ịndọlijensị ndị a na-ewu ewu. Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere ihe ndị na-ezighị ezi ndị popu mere n’oge ahụ kwuru, sị: “Ụmụ nwoke nwunye ha nwụrụ ma ọ bụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, na ndị nne na nna ụmụ ha nwụrụ na-emefu ego nile ha nwere iji mee ka ndị ha hụrụ n’anya si na Pọgatrị pụta.” Ndị na-amaghị nke a na-akọ, bụ́ ndị kwenyesiri nnọọ ike na popu nwere ikike nke ime ka ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ gaa eluigwe, nabatara nnọọ ịndọlijensị.

Ma Wessel ekwetụdịghị na Chọọchị Katọlik, gụnyere popu, nwere ike ịgbaghara mmehie. Wessel kwuru n’ihu ọha na ire ịndọlijensị bụ “ụgha na ihie ụzọ.” O kweghịkwa na ọ dị mkpa mmadụ ikwupụtara ndị ụkọchukwu mmehie ya tupu a gbaghara ya.

Wessel ekwetaghị na popu adịghị eme mmehie. O kwuru na chọọchị agaghị akwụsi ike ma ọ bụrụ na a chọọ ka ndị mmadụ kwere ihe nile popu kwuru ebe ọ bụkwanụ na ndị popu na-eme mmehie. Wessel dere sị: “Ọ bụrụ na ndị popu ahapụ iwu Chineke ma nye iwu nke ha. . . ihe ndị ha na-eme na ihe ndị ha na-ekwu ka e mee agaghị enwe isi.”

Wessel Egbupee Ụzọ Maka Ndozigharị

Wessel nwụrụ na 1489. Ọ bụ ezie na ọ katọrọ ụfọdụ ihe ọjọọ a na-eme na chọọchị Katọlik, ọ hapụghị Katọlik. N’agbanyeghị na ọ katọrọ ihe ụfọdụ a na-eme na chọọchị Katọlik, ọ dịghị mgbe chọọchị ahụ weere ya ka onye jụrụ okwukwe. Otú ọ dị, mgbe ọ nwụsịrị, ndị mọnk okpukpe Katọlik na-agba ara nwara ibibisị akwụkwọ ndị o dere n’ihi na ha weere na o kwekọghị n’ozizi chọọchị ha. Ka ọ na-erule n’oge Luther, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e chefuchaala aha Wessel, ọ dịghị ihe ọ bụla o dere nke e bipụtarala, ọ bụkwa nanị ole na ole n’ime ha fọdụrụ. Ọ bụ n’agbata afọ 1520 na 1522 bụ mgbe mbụ e bipụtara ihe ndị Wessel dere. E bipụtakọrọ ha na akwụkwọ ozi Luther dere bụ́ nke o ji too ihe ndị Wessel dere.

Ọ bụ ezie na Wessel abụghị onye Ndozigharị dị ka Luther, o kwuru okwu hoo haa megide ihe ụfọdụ na-adịghị mma bụ́ ndị dugara ná Ndozigharị ahụ. N’ezie, akwụkwọ nkà ihe ọmụma nke McClintock na Strong dere kọwara ya dị ka “onye kasị mkpa ná ndị Germany nyere aka gbupee ụzọ maka Ndozigharị ahụ.”

Luther kwuru na echiche ya na Wessel kwekọrọ. Onye na-ede akwụkwọ ọgụgụ bụ́ Augustijn dere, sị: “Luther ji oge ya na ihe ndị mere n’oge ya tụnyere oge Ịlaịja. Dị nnọọ ka onye amụma ahụ chere na ọ bụ nanị ya fọdụrụ iburu Chineke agha, Luther chere na ọ bụ nanị ya nọ na-alụso chọọchị ọgụ. Ma mgbe ọ gụrụ ihe ndị Wessel dere, ọ bịara ghọta na Onyenwe anyị echebewo ‘ihe fọdụrụ n’Izrel.’” “Ọbụna Luther kwuru, sị: ‘Asị na m buru ụzọ gụọ akwụkwọ Wessel, ndị iro m gaara eche na ọ bụ ya kụziiri m ihe nile m na-eme, echiche mụ na ya kwekọrọ nnọọ.’” *

“Unu Ga-achọta”

Mgbe e mesịrị nwee Ndozigharị ahụ a na-atụ anya ya, o meghịzi na mberede. Ọ dịla anya e nwewere echiche ndị dugara ná Ndozigharị ahụ. Wessel chọpụtara na omume rụrụ arụ nke ndị popu ga-emesị mee ka ndị mmadụ chọwa ka e dozigharịa ihe. N’otu oge, ọ gwara otu nwata akwụkwọ na-agụsi akwụkwọ ike, sị: “Nwa m, ị ga-adị ndụ hụ mgbe ezigbo Ndị Kraịst nile chọrọ ịmụta Bible ga-ajụ ozizi . . . nke ndị ọkà mmụta okpukpe na-ebutekarị esemokwu.”

Ọ bụ ezie na Wessel chọpụtara ụfọdụ ihe ọjọọ na omume ndị na-adịghị mma a na-eme n’oge ya, o melighị ka a matachaa eziokwu Bible. N’agbanyeghị nke a, o lere Bible anya dị ka akwụkwọ e kwesịrị ịgụ agụ ma mụọ. Dị ka otu akwụkwọ na-akọ banyere otú iso ụzọ Kraịst si malite si kwuo, Wessel “kweere na ebe ọ bụ na e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee Bible, ọ bụ Bible kwesịrị ịbụ o kwuchaa o bie n’okwu ndị metụtara okpukpe.” N’oge anyị a, ezi Ndị Kraịst kweere na Bible bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16) Otú ọ dị, eziokwu ndị dị na Bible adịghịzi mgbagwoju anya ma ọ bụ sie ike nchọta. Taa, ihe ahụ e kwuru na Bible bụ́ “nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa” bụ eziokwu ọbụna karịa ka ọ bụ n’oge ndị gara aga.—Matiu 7:7; Ilu 2:1-6.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ụmụ nwoke abụọ nyere nnọọ aka mee ka ndị mmadụ mụta asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible. N’afọ 1506, Reuchlin bipụtara ụtọ asụsụ Hibru, bụ́ nke mere ka a mụwakwuo Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ụzọ sara mbara. Na 1516, Erasmus bipụtara akwụkwọ bụ́ isi e ji mee ihe n’ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

^ par. 21 Wessel Gansfort (1419-1489) na Northern Humanism, peeji nke 9, 15.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

IHE WESSEL CHERE BANYERE AHA CHINEKE

Aha a kpọrọ Chineke n’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ Wessel bụ “Johavah.” Ma Wessel jiri “Jehova” mee ihe ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ebe abụọ. Mgbe onye na-ede akwụkwọ bụ́ H. A. Oberma na-atụle ihe ndị Wessel dere, o kwubiri na Wessel chere na a sị na Thomas Aquinas na ndị ọzọ maara asụsụ Hibru, “ha gaara achọpụta na aha Chineke, bụ́ nke e kpugheere Mozis apụtaghị ‘Abụ m onye m bụ,’ kama ọ pụtara ‘m ga-abụ onye m ga-abụ.’” * New World Translation sụgharịtara ihe ọ pụtara site n’ịsị, “M ga-abụ ihe M chọrọ ịbụ.”—Ọpụpụ 3:13, 14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 30 Wessel Gansfort (1419-1489) na Northern Humanism, peeji nke 105.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe Odide: Universiteitsbibliotheek, Utrecht

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Wessel kwuru na ire ịndọlijensị, bụ́ nke Popu Sixtus nke anọ kwadoro ka a na-ere, ekwesịghị ekwesị