Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọbịbịa Kraịst Ò Kwesịrị Ịtụ Anyị Ụjọ?

Ọbịbịa Kraịst Ò Kwesịrị Ịtụ Anyị Ụjọ?

Ọbịbịa Kraịst Ò Kwesịrị Ịtụ Anyị Ụjọ?

MGBE ọ bụla ị nụrụ ọbịbịa Jizọs Kraịst, olee ihe na-agbata gị n’obi? Ị̀ na-ele ya anya dị ka ihe ga-ewetara ụmụ mmadụ ọdachi, mbibi, na ahụhụ? Ka ị̀ na-atụ anya na ọ ga-eme ka nsogbu anyị nile kwụsị? Ọbịbịa Kraịst ò kwesịrị ịtụ anyị ụjọ? Ka ànyị kwesịrị ịdị na-atụ anya ya?

Bible kwuru banyere ọbịbịa Kraịst, sị: “Lee! Ọ na-abịa n’ígwé ojii, anya nile ga-ahụkwa ya, . . . ebo nile nke ụwa ga-etikwa onwe ha aka n’obi n’iru újú n’ihi ya.” (Mkpughe 1:7) Ọbịbịa a bụ ọbịbịa Jizọs ga-abịa n’ọdịnihu iji kwụọ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha ma bibie ndị ajọ omume.

Kama Jọn onyeozi ịtụ ọbịbịa Kraịst ụjọ, ọ tụsiri anya ya ike. Mgbe e kpughesịịrị ya otú ọbịbịa a ga-adị na ihe ọ ga-apụtara ụwa, Jọn kpesiri ekpere ike, sị: “Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.” (Mkpughe 22:20) Gịnị mere ‘ebo nile nke ụwa ji na-eti onwe ha aka n’obi n’iru újú n’ihi ya’? Olee otú “anya nile” ga-esi ahụ ya? Olee ihe ọbịbịa Kraịst ga-arụzu? Olee otú anyị inwe okwukwe na ya ga-esi baara anyị uru ugbu a? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.