Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ụmụ anụmanụ ole dị ọcha ka Noa webara n’ụgbọ ahụ—ọ̀ bụ asaa n’ime anụ nke ọ bụla dị ọcha ka ọ bụ iri na anọ?

Mgbe Noa wusịrị ụgbọ ahụ, Jehova gwara ya, sị: “Baa n’ụgbọ ahụ, gị onwe gị na ụlọ gị nile; n’ihi na gị ka M hụworo bụ́ onye ezi omume n’ihu m n’ọgbọ a. N’ime anụ nile ọ bụla dị ọcha ị ga-achịpụtara onwe gị asaa asaa, oké na nwunye ya; chipụtakwa abụọ abụọ n’anụ na-adịghị ọcha, oké na nwunye ya.” (Jenesis 7:1, 2) Nsụgharị ụfọdụ, dị ka The New English Bible, The New Jerusalem Bible, na Tanakh—The Holy Scriptures, sụgharịrị okwu Hibru ahụ ịbụ “asaa ụzọ abụọ.”

N’asụsụ mbụ e ji dee Bible, a kpọkwara okwu ahụ “asaa asaa.” (Jenesis 7:2) Otú ọ dị, ide ọnụ ọgụgụ ugboro abụọ n’asụsụ Hibru, apụtachaghị na a ga-agbakọta ọnụ ọgụgụ ndị ahụ agbakọta. Dị ka ihe atụ, 2 Samuel 21:20 kọwara “otu nwoke toro ogologo” dị ka onye “mkpịsị aka ya abụọ dị isii isii, mkpịsị ụkwụ ya abụọ dịkwa isii isii.” N’asụsụ Hibru, e dere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ “isii” ugboro abụọ. Ma nke a apụtaghị na dike ahụ nwere mkpịsị aka iri na abụọ n’otu aka ma ọ bụ mkpịsị ụkwụ iri na abụọ n’otu ụkwụ. Ide ọnụ ọgụgụ ahụ ugboro abụọ na-eme ka a ghọta na mkpịsị aka ya dị isii n’otu aka, mkpịsị ụkwụ ya adịkwa isii n’otu ụkwụ.

Olee otú ụkpụrụ na-achịkwa asụsụ Hibru ga-esi nyere anyị aka n’ihe banyere ide ọnụ ọgụgụ ugboro abụọ? Mgbe akwụkwọ bụ́ Introductory Hebrew Method and Manual nke William R. Harper na-ekwu banyere Jenesis 7:2, 9, o kwuru, sị: “A na-ede otu okwu ugboro abụọ iji gosi na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ a na-ekwu banyere ya ha otú ahụ.” Akwụkwọ bụ́ Hebrew Grammar nke Gesenius dere (Mbipụta nke Abụọ nke Bekee ya) kwuru, sị: “A na-egosi na nke ọ bụla n’ihe ndị a na-ekwu banyere ha ha nhata . . . site n’ide ọnụ ọgụgụ ahụ ugboro abụọ.” O ji ihe e dere na Jenesis 7:9, 15 na 2 Samuel 21:20 mee ihe atụ, bụ́ ebe e dere ọnụ ọgụgụ ndị bụ́ “abụọ” na “isii” ugboro abụọ.

N’ihi ya, “asaa asaa” e dere na Jenesis 7:2 apụtaghị asaa ụzọ abụọ, ma ọ bụ 14, dịkwa ka “abụọ” e dere ugboro abụọ na Jenesis 7:9, 15 na-apụtaghị abụọ ụzọ abụọ, ma ọ bụ anọ. Ọnụ ọgụgụ ahụ e dere ugboro abụọ n’amaokwu nke ọ bụla na-egosi nanị na ihe ndị ahụ ha nhata—ọ bụghị na a ga-agbakọta ha agbakọta. N’ihi ya, ọ bụ ezie na e webara anụmanụ ndị dị ọcha “asaa asaa” n’ụgbọ ahụ, e webara ndị nke na-adịghị ọcha “abụọ abụọ”.

Otú ọ dị, gịnị banyere okwu ahụ bụ́, “oké na nwunye ya” bụ́ nke e dere ozugbo e desịrị okwu ahụ bụ́ “asaa asaa” na Jenesis 7:2? Nke ahụ emewo ka ụfọdụ chee na a gwara Noa ka o were ụdị anụmanụ ọ bụla dị ọcha asaa ụzọ abụọ. Otú ọ dị, ihe e ji chebe ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha abụchaghị nanị ka ha wee mụta ụmụ. Jenesis 8:20 gwara anyị na mgbe Noa na ezinụlọ ya pụtasịrị n’ụgbọ ahụ, “Noa wee wuoro Jehova ebe ịchụàjà, were ụfọdụ n’ime anụ ụlọ nile ọ bụla dị ọcha na n’ime anụ ufe nile ọ bụla dị ọcha, suree àjà nsure ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ.” Inwe anụmanụ nke mere ha asaa na nke ọ bụla n’ime anụmanụ ndị dị ọcha n’ụgbọ ahụ mere ka Noa nweta nke o ji chụọ àjà, ma hapụ oké atọ na nne atọ ka ha wee mụta ụmụ ndị yiri ha n’ụwa.