Ihe Ọbịbịa Kraịst Ga-arụzu
Ihe Ọbịbịa Kraịst Ga-arụzu
“MKPAMKPA KPARA NA SÃO PAULO.” Nke ahụ bụ otú magazin a na-akpọ Veja si kọwaa ihe mere na May 2006 mgbe ndị omempụ ji abalị anọ “mekpọọ” ndị bi n’obodo kasị buo ibu na nke kasị baa ọgaranya na Brazil “ọnụ.” E gburu ndị ọrụ ndebe iwu, ndị omekome, na ndị nkịtị dị ihe dị ka otu narị na iri ise n’obodo ahụ “na mpụ ahụ were ihe karịrị otu narị awa.”
Ime ihe ike bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile n’ụwa. O yighị ka ndị ndú bụ́ mmadụ hà ga-akwụsịli ya. Ụwa anyị na-aghọwanye ebe dị ize ndụ n’obibi. Eleghị anya ị na-enwe nkụda mmụọ n’ihi na ebe ọ bụla i chere ntị, ọ bụ akụkọ ọjọọ ka ị na-anụ. Ma, oge ihe ga-agbanwe adịla nso.
Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka uche Chineke mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Alaeze a bụ ọchịchị nke Kraịst Jizọs bụ Eze Chineke họpụtara ga-achị na ya. Alaeze ahụ ga-edozi nsogbu nile ụmụ mmadụ nwere. Otú ọ dị, tupu Alaeze Chineke ana-eweta mgbanwe n’ụwa, ọchịchị Kraịst ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. Nke a bụ nnọọ ihe ọbịbịa Kraịst ga-arụzu.
À Ga-enwe Mgbanwe ahụ n’Udo?
Mba nile hà ga-anabata ọchịchị Kraịst n’udo? E gosiri Jọn onyeozi ọhụụ zara ajụjụ ahụ. Jọn kọrọ, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ahụ [ndị ọchịchị ụwa] na ndị eze nke ụwa na usuu ndị agha ha ka ha zukọtara ọnụ ibu agha megide onye ahụ [Jizọs] nke na-anọkwasị n’ịnyịnya ahụ na usuu ndị agha ya.” (Mkpughe 19:19) Gịnị ga-eme ndị eze ụwa n’agha a? Bible kwuru na Eze Jehova tere mmanụ “ga-eji mkpanaka ígwè tijisie ha; dị ka ihe ọkpụite kpụrụ ka [ọ] ga-atụpịa ha.” (Abụ Ọma 2:9) A ga-ebibi ndị ọchịchị ahụ kpamkpam. Alaeze Chineke “ga-etipịa alaeze [ụmụ mmadụ] nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Gịnị banyere ndị na-emegide Alaeze Chineke? “Ná mkpughe nke Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu,” a kọwara Jizọs dị ka onye “na-eweta ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị 2 Ndị Tesalonaịka 1:7, 8) Ilu 2:22 kwuru, sị: “Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”
Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” (Bible kwuru banyere ọbịbịa Kraịst, sị: “Lee! Ọ na-abịa n’ígwé ojii, anya nile ga-ahụkwa ya.” (Mkpughe 1:7) Ndị mmadụ agaghị eji anya nkịtị ahụ ya. Kemgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, ọ bụ mmụọ “onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso, onye ọ na-adịghị otu onye n’ime ụmụ mmadụ hụworo ma ọ bụ pụrụ ịhụ.”—1 Timoti 6:16.
Ọ gaghị adị Jizọs mkpa iyikwasị ahụ́ mmadụ ka ndị bi n’ụwa wee ‘hụ’ ya otú ahụ ọ na-adịghị Jehova mkpa ime otú ahụ iji wee weta Ihe Otiti Iri ahụ n’ahụ́ ndị Ijipt n’oge Mozis. Ndị bi n’oge ahụ enweghị obi abụọ na ọ bụ Jehova na-eweta ihe otiti ndị ahụ, a manyekwara ha ikweta na ike ya karịrị nke ha. (Ọpụpụ 12:31) Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ ga-adị mgbe Kraịst ga-akpa ike dị ka Onye mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe, a ga-amanye ndị ajọ omume “ịhụ,” ma ọ bụ ịghọta, na Chineke ji Jizọs na-ekpe ha ikpe. Ha ga-ama nke a n’ihi na e burula ụzọ dọọ mmadụ nile aka ná ntị. N’ezie, “anya nile ga-ahụkwa [Jizọs], ebo nile nke ụwa ga-etikwa onwe ha aka n’obi n’iru újú n’ihi ya.”—Mkpughe 1:7.
Mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume na mwepụ a ga-ewepụ ọchịchị ọjọọ dị nnọọ mkpa tupu e nwee ike iweghachi ezi udo na ndụ obi ụtọ n’ụwa. Kraịst ga-emezu nke ahụ. Mgbe ahụ, ọ ga na-achịkwa ihe nile a na-eme n’ụwa, a ga-enwezi mgbanwe ndị dị mkpa.
Mweghachi Ga-aba Uru
Pita onyeozi kwuru banyere “mweghachi nke ihe nile bụ́ nke Chineke kwuru banyere ya site n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ nke oge gboo.” (Ọrụ 3:21) Mweghachi a gụnyere mgbanwe ndị a ga-enwe n’ụwa n’oge ọchịchị Kraịst. Otu n’ime ndị amụma Chineke si n’ọnụ ha kwuo ihe banyere “mweghachi nke ihe nile” n’elu ala bụ Aịzaịa onye amụma, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ T.O.A. O buru amụma na Jizọs Kraịst, bụ́ “Onyeisi Udo,” ga-eweghachi udo n’ụwa. Amụma Aịzaịa banyere ọchịchị Kraịst kwuru, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7) Jizọs ga-akụziri ụmụ mmadụ ga-ebi n’ụwa otú ha ga-esi biri n’udo. “Ịba ụba nke udo ga-atọkwa [ndị bi n’ụwa] ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.
Gịnị ga-eme ịda ogbenye na agụụ n’ọchịchị Kraịst? Aịzaịa kwuru, sị: “N’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vaịn doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vaịn doro edo a zara nke ọma.” (Aịsaịa 25:6) Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) Ọzọkwa, anyị na-agụ banyere ndị ga-ebi n’ụwa, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Aịzaịa bukwara amụma na ọrịa na ọnwụ ga-akwụsị. Chineke sitere n’ọnụ Aịzaịa kwuo, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) Mgbe ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Chineke ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.’—Aịsaịa 25:8.
Gịnị banyere ndị nwụrụ anwụ nile “nọ n’ili ncheta”? (Jọn 5:28, 29) Aịzaịa bụrụ amụma, sị: “Ndị Gị ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ; [ha] nile ga-ebili.” (Aịsaịa 26:19) Ee, a ga-akpọlite ndị nọ n’ụra ọnwụ!
“Chineke Bụ Ocheeze Gị Ruo Mgbe Nile Ebighị Ebi”
Ọbịbịa Kraịst ga-eme nnọọ ka a gbanwee mbara Ụwa kpamkpam. A ga-agbanwe ụwa ịghọ paradaịs dị ebube, ụmụ mmadụ ga-adịkwa n’otu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ. Ànyị ji n’aka na Jizọs Kraịst ga-enwe ike iwepụ ajọ omume n’ụwa ma mee ka ezi omume dịrị na ya?
Chee echiche banyere onye nyere Jizọs ike na ọchịchị ahụ. Bible kwuru banyere Ọkpara ahụ, sị: “Chineke bụ ocheeze gị ruo mgbe nile ebighị ebi, mkpanaka alaeze gị bụkwa mkpanaka nke izi ezi. Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị.” (Ndị Hibru 1:8, 9) Ọ bụ Jehova nyere Jizọs ocheeze ya, ya bụ, ọkwá ma ọ bụ ikike ya. Ọ bụ Chineke guzobere ocheeze a, ọ bụkwa Ya nyere ya Jizọs. Ọ dịghị nsogbu ga-akarị Jizọs akarị.
Mgbe Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18) Pita nke Mbụ 3:22 kwuru na “e mekwara ka ndị mmụọ ozi na ikike na ike nọrọ n’okpuru ya.” Ọ dịghị ike ma ọ bụ ọchịchị ga-enwe ike imegide Jizọs. Ọ dịghị ihe ga-egbochi ya imere ụmụ mmadụ ihe ndị ga-abara ha uru ruo mgbe ebighị ebi.
Otú Ọbịbịa Kraịst Si Emetụta Ndị Mmadụ
N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Tesalonaịka, o dere, sị: “Anyị na-eburu n’uche mgbe nile ọrụ ikwesị ntụkwasị obi unu na ndọgbu unu ji ịhụnanya na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ntachi obi unu n’ihi olileanya unu nwere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ihu Chineke na Nna anyị.” (1 Ndị Tesalonaịka 1:3) Pọl kwuru na ọ bụ inwe olileanya na Jizọs Kraịst na-eme ka mmadụ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, tachie obi ma rite uru na ya. Olileanya ahụ na-agụnye inwe okwukwe n’ọbịbịa Kraịst na ná mbilite n’ọnwụ, bụ́ nke ọbịbịa ya ga-eme ka o kwe omume. Olileanya dị otú ahụ pụrụ ịgba ezi Ndị Kraịst ume, ma ọ bụ mee ka ha nọgide na-atachi obi, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị tara nnọọ akpụ ha nọ na ha.
Were Carlos dị ka ihe atụ, bụ́ onye bi na São Paulo, Brazil. N’August 2003, Carlos matara na ya nwere ọrịa cancer. Kemgbe ahụ, a waala ya ahụ́ ugboro asatọ, bụ́ ndị kpatawooro ya ahụ́ ụfụ na ike ọgwụgwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidewo na-agba ndị ọzọ ume. Dị ka ihe atụ, ka ọ na-ekwusa ozi ọma n’okporo ámá n’ihu otu nnukwu ụlọ ọgwụ, ọ hụrụ Onyeàmà Jehova ọzọ nke a na-agwọ di ya agwọ. Dị ka onye maara nnọọ otú ọrịa cancer si dị njọ, Carlos gbara di na nwunye ahụ ume ma kasie ha obi. Ka e mesịrị, ha kwuru na mkparịta ụka ahụ gbara ha nnọọ ume. N’ihi ya, Carlos ahụwo eziokwu dị n’okwu ndị a Pọl kwuru, nke bụ́ na “[Chineke] na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị, ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi ahụ nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.”—2 Ndị Kọrint 1:4.
Gịnị na-enyere Carlos aka inweta ume iji nọgide na-agba ndị ọzọ ume n’agbanyeghị ọrịa ya? Olileanya Carlos nwere n’ọbịbịa Kraịst na ihe nile ọ ga-arụzu na-akwali ya ịnọgide “n’ime ihe dị mma.”—Ndị Galeshịa 6:9.
Tụleekwa ọnọdụ Samuel, bụ́ onye e gburu nwanne ya nwoke n’ebe dị nanị mita iri ise site n’ụlọ nna ha. A gbanyere nwanne ya nwoke mgbọ égbè iri n’ahụ́. Ozu ya tọgbọrọ n’akụkụ ụzọ ruo awa asatọ ka ndị uwe ojii nọ na-achọ onye gburu ya. Samuel agaghị echefu ihe ahụ mere n’ụbọchị ahụ. Ma, olileanya o nwere na Kraịst ga-ewepụ ajọ omume nile n’ụwa nakwa na ọchịchị ezi omume nke ga-esochinụ ga-ewetara ụmụ mmadụ ngọzi, na-agba ya ume. Samuel na-ejikarị anya nke uche ya ahụ onwe ya ebe ọ na-amakụ nwanne ya a kpọlitere n’ọnwụ n’ụwa Paradaịs.—Ọrụ 24:15.
Gịnị Ka Ị Na-aghaghị Ime?
Olileanya banyere ọbịbịa Kraịst na ihe ọ ga-arụzu ga-akasi gị nnọọ obi. Jizọs Kraịst ga-ewepụ nnọọ ihe nile na-akpata nsogbu ụmụ mmadụ na ihe ọjọọ ndị na-adakwasị anyị.
Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji nweta ngọzi ndị ọchịchị Kraịst ga-ewetara ụmụ mmadụ? Jiri nlezianya mụọ Okwu Chineke, bụ́ Bible. N’ekpere Jizọs kpegaara Nna ya, ọ sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Gbalịa inyocha ihe Bible na-akụzi. Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka na nke a. Anyị ji obi ụtọ na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ ha ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ọbịbịa Kraịst ga-eme nnọọ ka a gbanwee mbara ụwa kpamkpam
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto dị n’ime, nanị azụ foto nke nnukwu: Ogige Anụmanụ Rhino and Lion, Gauteng, South Africa