Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?

Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?

Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?

“Ndị mmụọ ozi na-edebeghịkwa ebe mbụ ha kama gbahapụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị ka [Chineke] jiworo agbụ ebighị ebi debe n’okpuru oké ọchịchịrị maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.”—JUD 6.

1, 2. Olee ajụjụ ndị a na-ajụ banyere Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ?

PITA ONYEOZI dọrọ aka ná ntị, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Pọl onyeozi kwuru banyere ndị mmụọ ọjọọ, sị: “Achọghịkwa m ka unu bụrụ ndị ha na ndị mmụọ ọjọọ na-ekerịta òkè. Unu apụghị ịdị na-aṅụ iko Jehova na iko ndị mmụọ ọjọọ; unu apụghị ịdị na-eri na ‘tebụl Jehova’ nakwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.”—1 Ndị Kọrint 10:20, 21.

2 Ma, ònye bụdị Setan bụ́ Ekwensu, oleekwa ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ? Oleekwa otú ha si malite? Ọ̀ bụ Chineke kere ha? Olee otú ike ha nwere n’ahụ́ ụmụ mmadụ hà? Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ime iji zere ha, ya bụrụ na ọ dị, gịnị ka ọ bụ?

Olee Otú Setan na Ndị Mmụọ Ọjọọ Si Malite?

3. Olee otú otu mmụọ ozi Chineke si ghọọ Setan bụ́ Ekwensu?

3 Obere oge ka e kesịrị mmadụ n’ogige Iden, otu mmụọ ozi Chineke ghọrọ onye nnupụisi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọrụ Jehova nyere ya n’eluigwe ejughị ya afọ. Site n’okike e kere Adam na Iv, ọ hụrụ ohere ọ ga-eji mee ka ha gbakụta Chineke azụ ma malite irubere ya onwe ya isi ma na-efe ya. Site na mmụọ ozi a inupụrụ Chineke isi na ịraba di na nwunye mbụ ahụ ná mmehie, o mere onwe ya Setan bụ́ Ekwensu. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị mmụọ ozi sonyeere ya ná nnupụisi ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?—Jenesis 3:1-6; Ndị Rom 5:12; Mkpughe 12:9.

4. Gịnị ka ụfọdụ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi mere tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa?

4 Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ gwara anyị na tupu oké Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, ụfọdụ ndị mmụọ ozi malitere inwe mmasị na-ezighị ezi n’ebe ụmụ nwanyị nọ n’ụwa nọ. Bible kwuru na n’ihi nzube na-ezighị ezi “ụmụ ndị ikom nke Chineke [bi n’eluigwe] hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara.” Alụmdi na nwunye ndị a ekwekọghị n’okike, ụmụ ha mụtakwara bụ ọkara mmụọ ọkara mmadụ, bụ́ ndị a na-akpọ ndị Nefilim. (Jenesis 6:2-4) Ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Chineke isi si otú ahụ sonyere Setan n’isi ọ na-enupụrụ Jehova.

5. Olee ihe mere ndị nnupụisi ahụ mgbe Jehova ji Iju Mmiri bibie ụwa?

5 Mgbe Jehova ji Iju Mmiri bibie ụmụ mmadụ, ndị Nefilim ahụ na nne ha lara n’iyi. Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi amaghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị iyipụ ahụ́ mmadụ ha ma laghachi n’ógbè ndị mmụọ. Ma, ha enweghịzi ike ịlaghachi ‘n’ebe mbụ ha’ nọ n’anya Chineke. Kama nke ahụ, a tụbara ha “n’olulu nke oké ọchịchịrị [ihe atụ],” bụ́ nke a maara dị ka Tatarọs.—Jud 6; 2 Pita 2:4.

6. Olee otú ndị mmụọ ọjọọ si eduhie ụmụ mmadụ?

6 Kemgbe ajọ ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ “ebe mbụ ha,” ha aghọwo ndị mmụọ ọjọọ na-arụrụ Setan ọrụ, ha na-emezukwara ya ọchịchọ ọjọọ ya. Kemgbe ahụ, ndị mmụọ ọjọọ ahụ enweghịzi ike inwoghara ahụ́ mmadụ. Ma, ha pụrụ ịkpali ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị itinye aka n’omume mmekọahụ dị iche iche rụrụ arụ. Ndị mmụọ ọjọọ na-eduhiekwa ụmụ mmadụ site ná mgbaasị, nke pụrụ ịgụnye ihe ndị dị ka ịkọ ọgwụ, voodoo, na ịjụ ndị mmụọ ase. (Deuterọnọmi 18:10-13; 2 Ihe E Mere 33:6) Ihe na-eche Ekwensu ihu na-echekwa ajọ ndị mmụọ ozi ahụ ihu—ya bụ mbibi ebighị ebi. (Matiu 25:41; Mkpughe 20:10) Ka ọ dịgodị, ọ dị anyị mkpa iguzosi ike ma guzogide ha. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịtụle otú ike Setan nwere hà na otú anyị pụrụ isi guzogide ya na ndị mmụọ ọjọọ ya.

Olee Otú Ike Setan Hà?

7. Olee otú ikike Setan nwere n’ụwa hà?

7 Setan anọwo na-akatọ Jehova kemgbe ụwa. (Ilu 27:11) O duhiewokwa ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ. Jọn nke Mbụ 5:19 na-ekwu, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” Ọ bụ ya mere Ekwensu ji nwee ike ịnwa Jizọs site n’inye ya ikike na ebube “alaeze nile nke elu ụwa mmadụ bi.” (Luk 4:5-7) Pọl onyeozi kwuru banyere Setan, sị: “Ọ bụrụ na ozi ọma nke anyị na-akpọsa bụ nke e kpuchiri ákwà n’ezie, e kpuchiri ya ákwà n’etiti ndị na-ala n’iyi, n’etiti ndị chi nke usoro ihe a meworo ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst ahụ, onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara inwupụta.” (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Setan bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha,” ma ọ na-eme onwe ya ka o yie “mmụọ ozi nke ìhè.” (Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 11:14) O nwere ikike ime ka uche ndị ọchịchị ụwa na ndị ha na-achị kpuo ìsì, ọ makwaara otú ọ ga-esi mee ya. O jiriwo ozi nduhie na ozizi ụgha ndị a na-ezi n’okpukpe duhie ụmụ mmadụ.

8. Gịnị ka Bible kwuru banyere otú ikike Setan nwere hà?

8 Setan gosiri otú ikike ya hà n’oge onye amụma bụ́ Daniel, ihe dị ka narị afọ ise Tupu Oge Anyị. Mgbe Jehova zipụrụ otu mmụọ ozi ka ọ gaa gbaa Daniel ume, “[mmụọ nke bụ́] onyeisi alaeze Peshia” guzogidere mmụọ ozi ahụ. O jichiri mmụọ ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ụbọchị 21 ruo mgbe “Maịkel, bụ́ otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi,” bịara nyere ya aka. Otu ihe ndekọ ahụ kwukwara banyere “[mmụọ ọjọọ bụ́] onyeisi Jevan [Gris].” (Daniel 10:12, 13, 20) Ná Mkpughe 13:1, 2, a kọwara Setan dị ka “dragọn ahụ” bụ́ onye nyere ndị ọchịchị ma ọ bụ anụ ọhịa ahụ “ike ya na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.”

9. Olee ndị ha na Ndị Kraịst na-alụ ọgụ?

9 Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji dee, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ọbụna taa, ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya bụ́ ndị Setan bụ́ Ekwensu na-eduzi na-achịkwa ndị ndú bụ́ mmadụ na ụmụ mmadụ n’ozuzu, na-akpali ha ikpochapụ agbụrụ dị iche iche, iyi ọhaneze egwu, na igbu ọchụ. Ka anyị tụlezie otú anyị pụrụ isi guzogide ndị mmụọ a dị ike.

Olee Ihe Ga-echebe Anyị Pụọ n’Aka Ha?

10, 11. Olee otú anyị pụrụ isi guzogide Setan na ajọ ndị mmụọ ozi ya?

10 Ma ikike ọkpụkpụ aka anyị ma amamihe anyị adịghị nke ga-echebe anyị pụọ n’aka Setan na ajọ ndị mmụọ ozi ya. Pọl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Nọgidenụ na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya.” Ọ dị anyị mkpa ịgakwuru Chineke maka nchebe. Pọl kwukwara, sị: “Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu . . . Chịrịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke, ka unu wee nwee ike iguzogide n’ajọ ụbọchị ahụ nakwa, mgbe unu mezuchaworo ihe nile, iguzosi ike.”—Ndị Efesọs 6:10, 11, 13.

11 Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ugboro abụọ ka ha yikwasị “ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke.” Okwu ahụ bụ́ “zuru ezu” na-egosi na mgbalị mmadụ ji obi abụọ mee agaghị azọ ya n’aka ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi ya, olee ihe ndị dị mkpa so n’ekike agha ahụ nke sitere n’aka Chineke, bụ́ ndị dị Ndị Kraịst oké mkpa taa iji guzogide ndị mmụọ ọjọọ?

“Guzosienụ Ike” —N’ụzọ Dị Aṅaa?

12. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi jiri eziokwu kee n’úkwù ha?

12 Pọl kọwara, sị: “Guzosienụ ike, n’ịbụ ndị ji eziokwu kee gburugburu úkwù unu, na-eyikwasịkwa ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume.” (Ndị Efesọs 6:14) Ekike agha abụọ a kpọtụrụ aha ebe a bụ ájị̀ na ihe mgbochi obi. Onye agha aghaghị ikesi ájị̀ ya ike n’úkwù ya ka o wee nwee ike ijigide mma agha ya. N’otu aka ahụ, ọ dị anyị mkpa ikesi eziokwu Bible ike n’úkwù anyị n’ụzọ ihe atụ ka anyị wee bie ndụ kwekọrọ na ya. Ànyị nwere oge anyị ji agụ Bible kwa ụbọchị? Ndị ezinụlọ anyị hà na-eso anyị agụ ya? Ànyị na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị dị ka ezinụlọ? E wezụga nke ahụ, ànyị na-agụ akwụkwọ nile “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta? (Matiu 24:45) Ọ bụrụ otú ahụ, anyị na-agbalị itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ. Anyị nwekwara vidio dị iche iche na DVD ndị nwere ike inye anyị nduzi sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Ijidesi eziokwu ahụ ike pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha ma chebe anyị pụọ n’ịgbaso ụzọ ọjọọ.

13. Olee otú anyị pụrụ isi chebe obi ihe atụ anyị?

13 Ihe mgbochi obi nkịtị na-echebe obi onye agha na akụkụ ahụ́ ya ndị ọzọ dị mkpa. Onye Kraịst pụrụ ichebe obi ihe atụ ya—ụdị mmadụ ọ bụ n’ime—site n’ịzụlite ịhụnanya maka ezi omume Chineke na ịgbaso ụkpụrụ ezi omume Jehova. Ihe mgbochi obi ihe atụ ahụ na-enyere anyị aka ịghara ileda Okwu Chineke anya. Ka anyị ‘na-akpọ ihe ọjọọ asị ma na-ahụ ezi ihe n’anya,’ anyị na-egbochi ụkwụ anyị “ka ha ghara ịba n’ụzọ ọjọọ ọ bụla.”—Emọs 5:15; Abụ Ọma 119:101.

14. Gịnị ka iyikwasị “akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ” anyị pụtara?

14 Ndị agha Rom na-eyikarị ezigbo akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ iji nyere ha aka na njem ha na-eji ụkwụ aga ọtụtụ narị kilomita n’ọtụtụ okporo ụzọ ndị jikọtara alaeze ukwu Rom. Olee ihe okwu ahụ bụ́ iyikwasị “akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ” anyị pụtara nye Ndị Kraịst? (Ndị Efesọs 6:15) Ọ pụtara na anyị dị njikere ime ihe. Anyị dị njikere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị. (Ndị Rom 10:13-15) Ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ozi Ndị Kraịst na-echebe anyị ka “nzupụta ọjọọ dị iche iche” nke Setan ghara iru anyị ahụ́.—Ndị Efesọs 6:11.

15. (a) Olee ihe na-egosi na ọta ukwu bụ́ okwukwe dị ezigbo mkpa? (b) Olee “akụ́ ụta nile na-ere ọkụ” ndị pụrụ imebi okwukwe anyị?

15 Pọl gara n’ihu kwuo, sị: “Karịsịa ihe nile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, bụ́ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Ndị Efesọs 6:16) E kwuru okwu ndị bụ́ “karịsịa ihe nile” tupu e nye ndụmọdụ ka e buru ọta ukwu bụ́ okwukwe, bụ́ nke na-egosi na ekike agha a dị ezigbo mkpa. Okwukwe anyị aghaghị isi ike. Dị ka ọta ukwu na-echebe onye agha, okwukwe anyị na-echebe anyị pụọ ‘n’akụ́ ụta nile na-ere ọkụ’ nke Setan. Olee ihe ihe ndị a nwere ike ịnọchi anya ha taa? Ha nwere ike ịbụ mkparị na-agba agba n’ahụ́, ụgha, na okwu ndị na-abụchaghị eziokwu ndị iro anyị na ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu iji gbalịa ime ka okwukwe anyị jụọ oyi. “Akụ́ ụta” ndị a nwekwara ike ịbụ ọnwụnwa ịhụ ihe onwunwe n’anya, nke ga-eme ka anyị tinye ikike anyị nile n’ịzụta ọtụtụ ihe onwunwe na ọbụna ịmalite ịma ndị na-ebi ndụ ka a hụ ha aka. Ma eleghị anya, ha etinyela oge ha nile n’inweta ụlọ na ụgbọala ndị ka mma ma ọ bụ n’iyi ihe ịchọ mma ndị dị oké ọnụ na uwe ndị na-ewu ewu. N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme, anyị aghaghị inwe okwukwe siri ike bụ́ nke ga-emenyụli “akụ́ ụta nile na-ere ọkụ” ndị ahụ. Olee otú anyị ga-esi zụlite okwukwe siri ike ma nọgide na ya?—1 Pita 3:3-5; 1 Jọn 2:15-17.

16. Olee ihe pụrụ inyere anyị aka ịzụlite okwukwe siri ike?

16 Anyị pụrụ ịbịaru Chineke nso site n’ịmụchi Bible anya na ikpesi ekpere ike. Anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka o wusie okwukwe anyị ike ma tinye ihe ndị ahụ anyị na-ekpe n’ekpere n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, ànyị na-eji nlezianya akwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwa izu iji zaa ajụjụ? Okwukwe anyị ga-esi ike ma anyị na-amụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible.—Ndị Hibru 10:38, 39; 11:6.

17. Olee otú anyị pụrụ isi ‘nara okpu ígwè bụ́ nzọpụta’?

17 Pọl ji ndụmọdụ bụ́: “Naranụ okpu ígwè bụ́ nzọpụta, na mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke” mechie nkọwa ọ kọwara ekike agha sitere na Chineke. (Ndị Efesọs 6:17) Okpu ígwè ahụ chebere isi nke onye agha na ụbụrụ ya, bụ́ ihe ọ na-eji eme mkpebi. N’otu aka ahụ, olileanya anyị nwere dị ka Ndị Kraịst na-echebe ikike iche echiche anyị. (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Kama ikwe ka ihe mgbaru ọsọ ụwa na ọchịchọ inweta ihe onwunwe jụpụta anyị obi, anyị kwesịrị ilegide anya n’olileanya ahụ Chineke nyere anyị, ọbụna dị ka Jizọs mere.—Ndị Hibru 12:2.

18. Olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji leghara ịmụchi Bible anya anya?

18 Ihe ikpeazụ ga-echebe anyị pụọ n’ikike Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ Okwu Chineke ma ọ bụ ozi ya e dekọrọ na Bible. Nke a bụkwa ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji na-agụchi Bible anya. Ịma Okwu Chineke nke ọma na-eme ka ụgha Setan na ozizi nduhie nke ndị mmụọ ọjọọ ya nakwa okwu ọjọọ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ ghara imetụta anyị.

“Na-anọgide n’Ekpere n’Oge Nile”

19, 20. (a) Olee ihe ga-eme Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya? (b) Oleekwa ihe ga-ewusi mmekọrịta anyị na Chineke ike?

19 A ga-ewepụ Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya na ụwa ajọ omume a n’isi nso. Setan maara na ya nwere “oge dị mkpirikpi.” Ọ na-ewe oké iwe ma na-ebuso “ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs,” agha. (Mkpughe 12:12, 17) Ọ dị mkpa ka anyị na-eguzogide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.

20 Anyị kwesịrị nnọọ ikele Chineke maka ndụmọdụ ahụ e nyere anyị ka anyị yikwasị ekike agha zuru ezu nke sitere n’aka Ya! Pọl mechiri okwu ya banyere ekike agha anyị sitere na Chineke site ná ndụmọdụ, bụ́: ‘Jirinụ ụdị ọ bụla nke ikpe ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na-anọgide n’ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ. Iji meekwa nke ahụ, jirinụ ịnọgidesi ike nile na ịrịọsi arịrịọ ike na-amụ anya n’ihi ndị nsọ nile.’ (Ndị Efesọs 6:18) Ekpere pụrụ iwusi mmekọrịta anyị na Chineke ike ma nyere anyị aka ịmụrụ anya. Ka anyị buru okwu Pọl n’uche ma na-anọgide n’ekpere, n’ihi na nke a ga-enyere anyị aka iguzogide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee otú Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya si malite?

• Olee otú ikike Ekwensu nwere hà?

• Olee ihe ndị anyị pụrụ iji chebe onwe anyị pụọ n’aka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?

• Olee otú anyị pụrụ isi yikwasị ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

“Ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ”

[Foto dị na peeji nke 28]

Ì nwere ike ịkọwa ihe isii mejupụtara ekike agha anyị sitere n’aka Chineke?

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Olee otú ime ihe ndị a e gosiri ebe a ga-esi chebe anyị pụọ n’aka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?