Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ozi—Otú Ha Si Emetụta Ụmụ Mmadụ

Ndị Mmụọ Ozi—Otú Ha Si Emetụta Ụmụ Mmadụ

Ndị Mmụọ Ozi—Otú Ha Si Emetụta Ụmụ Mmadụ

“Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si n’eluigwe na-agbadata, na-enwe ikike dị ukwuu . . . O wee tie mkpu n’olu dị ike, na-asị: ‘Ọ dawo! Babilọn Ukwu ahụ adawo!’”—MKPUGHE 18:1, 2.

1, 2. Gịnị na-egosi na Jehova na-eji ndị mmụọ ozi emezu uche ya?

MGBE Jọn onyeozi merela agadi nọ mkpọrọ n’obodo Patmọs mmiri gbara gburugburu, e mere ka ọ hụ ọhụụ amụma dị iche iche. Mgbe e si “n’ike mmụọ nsọ” mee ka ọ nọrọ “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” ọ hụrụ ihe ndị na-akpali akpali ga-eme n’ọdịnihu. Ụbọchị ahụ malitere mgbe e chiri Jizọs Kraịst eze n’afọ 1914, ọ ga-abịakwa ná njedebe n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ya.—Mkpughe 1:10.

2 Jehova Chineke ejighị aka ya kpugheere Jọn ihe ndị a. O si n’aka ndị ọzọ kpugheere ya Jọn. Mkpughe 1:1 na-ekwu, sị: “Mkpughe sitere n’aka Jizọs Kraịst, nke Chineke kpugheere ya, igosi ndị ohu ya ihe ndị na-aghaghị iwere ọnọdụ n’isi nso. O wee ziga mmụọ ozi ya ma site n’aka ya gosi ya ohu ya bụ́ Jọn n’ụzọ ihe atụ.” Jehova si n’aka Jizọs kpugheere ya mmụọ ozi ka o mee ka Jọn mata ihe ndị dị ebube ga-eme “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” N’otu oge, Jọn ‘hụkwara mmụọ ozi ọzọ ka o si n’eluigwe na-agbadata, na-enwe ikike dị ukwuu.’ Olee ọrụ e nyere mmụọ ozi a? “O wee tie mkpu n’olu dị ike, na-asị: ‘Ọ dawo! Babilọn Ukwu ahụ adawo!’” (Mkpughe 18:1, 2) E nyere mmụọ ozi a dị ike ihe ùgwù nke ịkpọsa ọdịda Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. N’ihi ya, o doro anya na Jehova na-eji ndị mmụọ ozi arụ ọrụ dị mkpa iji mezuo uche ya. Tupu anyị atụlekwuo ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ n’imezu nzube Chineke na otú nke ahụ si emetụta anyị, ka anyị tụlee otú ndị mmụọ a si malite.

Olee Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Malite?

3. Olee echiche hiere ụzọ ọtụtụ ndị nwere banyere ndị mmụọ ozi?

3 Ọtụtụ nde mmadụ taa kweere na ndị mmụọ ozi dị. Ma ọtụtụ nwere echiche hiere ụzọ banyere ha na otú ha si malite. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị okpukpe na-eche na mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụrụ, na Chineke kpọrọ onye ahụ ka ya na ya wee biri n’eluigwe dị ka mmụọ ozi. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe Okwu Chineke na-akụzi banyere okike ndị mmụọ ozi, na nzube e ji kee ha?

4. Olee ihe Akwụkwọ Nsọ gwara anyị banyere otú ndị mmụọ ozi si malite?

4 Aha mmụọ ozi kasị ike ma nọrọ n’ọkwá kasị elu—onye ndú nke ndị mmụọ ozi—bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi. (Jud 9) Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị Jizọs Kraịst. (1 Ndị Tesalonaịka 4:16) Ogologo oge gara aga mgbe Jehova kpebiri ike ihe, ihe mbụ o kere bụ nnọọ Ọkpara ya bụ́ mmụọ ozi. (Mkpughe 3:14) Ka oge na-aga, Jehova kere ndị mmụọ nile ọzọ site n’aka Ọkpara a. (Ndị Kọlọsi 1:15-17) Mgbe Jehova na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi a e kere eke dị ka ụmụ ya, ọ jụrụ nna ochie bụ́ Job, sị: “Olee ebe ị nọ mgbe M tọrọ ntọala ụwa? Gosi m, ma ọ bụrụ na ị maara nghọta. . . . Ònye tọgbọrọ nkume nkuku ya, mgbe kpakpando ụtụtụ na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike?” (Job 38:4, 6, 7) O doro anya na ọ bụ Chineke kere ndị mmụọ ozi, o kekwara ha ogologo oge dị anya tupu ya ekee ụmụ mmadụ.

5. Olee otú e si hazie ndị mmụọ ozi?

5 Ndị Kọrint nke Mbụ 14:33 na-ekwu, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” N’ihi ya, Jehova kere ụmụ ya ndị mmụọ ụzọ atọ: (1) ndị seraf, bụ́ ndị na-eje ozi n’ocheeze Chineke, na-akpọsa ịdị nsọ ya, ma na-edebe ndị ya ọcha n’ihe metụtara ofufe ha na-efe Chineke; (2) ndị cherub, bụ́ ndị na-akpọsa ịdị ebube Jehova; na (3) ndị mmụọ ozi ndị ọzọ na-eme uche ya. (Abụ Ọma 103:20; Aịsaịa 6:1-3; Ezikiel 10:3-5; Daniel 7:10) Olee ụzọ ụfọdụ ọrụ ìgwè ndị mmụọ a si emetụta ụmụ mmadụ?—Mkpughe 5:11.

Olee Ọrụ Ndị Mmụọ Ozi Na-arụ?

6. Olee otú Jehova si jiri ndị cherub mee ihe n’ogige Iden?

6 Ebe mbụ a kpọtụrụ ndị mmụọ e kere eke aha bụ na Jenesis 3:24, ebe anyị na-agụ, sị: “[Jehova] wee chụpụ mmadụ ahụ, mee ka Cherubim nọdụ n’akụkụ Ihu anyanwụ nke ubi Iden a gbara ogige, ha na ire ọkụ nke mma agha nke na-echigharị onwe ya, idebe ụzọ osisi ahụ nke ndụ.” Ndị cherub ahụ mere ka ọ ghara ikwe Adam na Iv omume ịlaghachi n’ebe obibi mbụ ha. Nke ahụ bụ ná mmalite nke ndụ mmadụ. Olee ọrụ ndị mmụọ ozi rụworo kemgbe ahụ?

7. Olee ihe ma okwu Hibru ma okwu Grik pụtara “mmụọ ozi” na-egosi banyere otu n’ime ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ?

7 A kpọrọ ndị mmụọ ozi aha ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị ugboro anọ na Bible. A pụrụ ịsụgharị ma okwu Hibru ma okwu Grik pụtara “mmụọ ozi” dị ka “onye ozi.” N’ihi ya, Chineke ejiriwo ndị mmụọ ozi zie ụmụ mmadụ ozi. Dị ka anyị hụrụ na paragraf abụọ mbụ nke isiokwu a, Jehova ji otu mmụọ ozi zie Jọn onyeozi ozi.

8, 9. (a) Olee otú nleta mmụọ ozi letara Manoa na nwunye ya si metụta ha? (b) Oleekwa ihe ndị nne na nna pụrụ ịmụta ná nleta ahụ mmụọ ozi Chineke letara Manoa?

8 Chineke na-ejikwa ndị mmụọ ozi eme ihe n’ịkwado na n’ịgba ndị ohu ya nọ n’ụwa ume. Dị ka ihe atụ, laa azụ n’oge Ndị Ikpe Izrel, Manoa na nwunye ya bụ́ nwanyị aga chọsiri nwa ike. Jehova zitere mmụọ ozi ya ka o zie nwunye Manoa ozi na ọ ga-amụ nwa. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Lee, ị gaje ịtụ ime, mụọ nwa nwoke: agụba agaghị aga n’elu isi ya: n’ihi na onye Naziraịt nke Chineke ka nwata ahụ ga-abụ site n’afọ: ya onwe ya ga-amalitekwa ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.”—Ndị Ikpe 13:1-5.

9 Nwunye Manoa mechara mụọ nwa nwoke a na-akpọ Samsin, bụ́ onye a ma ama n’akụkọ Bible. (Ndị Ikpe 13:24) Tupu a mụọ nwa ahụ, Manoa rịọrọ Chineke ka mmụọ ozi ahụ o zitere bịakwute ha ọzọ iji kọọrọ ha ihe ha ga-eme nwata ahụ nke a ga-amụ. Manoa jụrụ, sị: “Gịnị ga-abụ ikpe banyere nwata ahụ, gịnị ga-abụkwa omume ya?” Mmụọ ozi Jehova wee kwughachi ihe ndị ahụ ọ gwara nwunye Manoa. (Ndị Ikpe 13:6-14) Lee nnọọ otú okwu ndị ahụ na-aghaghị isi gbaa Manoa ume! Ndị mmụọ ozi anaghị abịakwute ụmụ mmadụ taa otú ahụ ha si bịakwute Manoa, ma ndị nne na nna pụrụ ịchọ ntụziaka Jehova mgbe ha na-azụlite ụmụ ha dị ka Manoa chọrọ.—Ndị Efesọs 6:4.

10, 11. (a) Olee otú ọbịbịa ndị agha Siria bịara ijide Ịlaịsha si metụta ya na ohu ya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụgharị uche na ya?

10 E nwere ezigbo ọrụ ndị mmụọ ozi rụrụ n’oge Ịlaịsha onye amụma. Ịlaịsha bi n’obodo dị n’Izrel a na-akpọ Dotan. Otu ụbọchị mgbe ohu Ịlaịsha biliri ọtọ n’isi ụtụtụ ma lepụ anya n’èzí, ọ hụrụ na e jiriwo ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya gbaa obodo ahụ gburugburu. Eze ndị Siria zitere ụsụụ ndị agha dị ike ka ha jide Ịlaịsha. Olee ihe onye ahụ na-ejere Ịlaịsha ozi mere? O ji ụjọ tie mkpu, sị: “Ewo, onyenwe m! Ànyị ga-eme aṅaa?” N’ebe ohu ahụ nọ, o yighị ka è nwere olileanya. Ma Ịlaịsha zara ya, sị: “Atụla egwu: n’ihi na ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” Olee ihe okwu ya pụtara?—2 Ndị Eze 6:11-16.

11 Ịlaịsha maara na ìgwè ndị mmụọ ozi nọ ebe ahụ inyere ya aka. Ma onye ahụ na-ejere ya ozi anaghị ahụ ha. Ya mere, “Ịlaịsha wee kpee ekpere, sị, Jehova, biko, saghee anya ya abụọ, ka o wee hụ. Jehova wee saghee anya nwa okorobịa ahụ; o wee hụ: ma, lee, ugwu ahụ jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọala ọkụ gburugburu Ịlaịsha.” (2 Ndị Eze 6:17) Ọ bụzi mgbe ahụ ka ohu ahụ hụrụ ìgwè ndị mmụọ ozi ahụ. Anyị onwe anyị nwekwara ike iji anya nke uche anyị hụ na ndị mmụọ ozi, ndị Jehova na Kraịst na-eduzi, na-akwado ma na-echebe ndị Jehova.

Enyemaka Ndị Mmụọ Ozi n’Oge Kraịst

12. Olee agbamume Meri nwetara n’aka mmụọ ozi bụ́ Gebriel?

12 Tụlee agbamume nwa agbọghọ onye Juu na-amaghị nwoke bụ́ Meri nwetara mgbe e ziri ya ozi, sị: “Ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs.” Tupu e zie ya nnọọ ozi a dị mgbagwoju anya, mmụọ ozi Gebriel bụ́ onye Chineke zitere gwara ya, sị: “Atụla egwu, Meri, n’ihi na i nwetawo ihu ọma n’ebe Chineke nọ.” (Luk 1:26, 27, 30, 31) Lee otú okwu ndị a mesiri Meri obi ike na o nwetawo ihu ọma Chineke na-aghaghị isiwo gbaa ya ume ma wusie ya ike!

13. Olee otú ndị mmụọ ozi si nyere Jizọs aka?

13 Mgbe ọzọ mmụọ ozi nyeere mmadụ aka bụ mgbe Jizọs merisịrị ọnwụnwa atọ Setan nwara ya n’ọzara. Ihe ndekọ ahụ gwara anyị na mgbe a nwasịrị Jizọs ọnwụnwa ahụ, “Ekwensu hapụrụ ya, ma, lee! ndị mmụọ ozi bịara wee malite ijere ya ozi.” (Matiu 4:1-11) Ihe yiri ya mere n’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa tupu ya anwụọ. Ka Jizọs nọ n’oké nhụjuanya, o gburu ikpere n’ala ma malite ikpe ekpere, sị: “Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, wepụ iko a n’ebe m nọ. Ka o sina dị, ka uche gị mee, ọ bụghị nke m. Otu mmụọ ozi nke sitere n’eluigwe wee pụta n’ihu ya ma mee ka ọ dị ike.” (Luk 22:42, 43) Ma, olee ụdị enyemaka anyị na-enweta n’aka ndị mmụọ ozi taa?

Enyemaka Ndị Mmụọ n’Oge Anyị

14. Olee mkpagbu Ndịàmà Jehova diworo n’oge anyị a, oleekwa ihe siworo na ya pụta?

14 Mgbe anyị gụrụ akụkọ banyere ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova na-arụ n’oge anyị a, ọ̀ bụ na anyị anaghị ahụ ihe àmà ndị na-egosi enyemaka nke ndị mmụọ ozi? Dị ka ihe atụ, ndị Jehova diri mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge ọchịchị ndị Nazi na Germany nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe tupu na mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ (1939-1945). Mgbe ọchịchị Fascist nke ndị Katọlik na-achị Ịtali, Spen, na Portugal, a kpagbudịrị ha ruo ogologo oge karị. Ruokwa ọtụtụ iri afọ, ha diri mkpagbu n’ebe bụ́bu Soviet Union na mba ndị nọ n’okpuru ya. Anyị agaghị echefu mkpagbu Ndịàmà diri ná mba Africa ụfọdụ. * Na nso nso a karị, ndị ohu Jehova hụjuru anya ná mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a kpagburu ha ná mba Georgia. Setan emewo ihe nile o nwere ike ime iji kwụsị ọrụ Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ozuzu, ha agabigawo mmegide ahụ ma nwee ọganihu. Otu ihe kpatara ya bụ na ndị mmụọ ozi chebere ha.—Abụ Ọma 34:7; Daniel 3:28; 6:22.

15, 16. Olee enyemaka Ndịàmà Jehova na-enweta n’aka ndị mmụọ ozi n’ọrụ zuru ụwa ọnụ ha na-arụ?

15 Ndịàmà Jehova ji ọrụ e nyere ha ikwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke gburugburu ụwa na ime ndị na-eso ụzọ akpọrọ ihe site n’ịkụziri ndị nwere mmasị eziokwu Bible n’ebe nile. (Matiu 28:19, 20) Ma, ha maara nnọọ na ha enweghị ike ịrụzu ọrụ a n’enwetaghị enyemaka nke ndị mmụọ ozi. N’ihi ya, ihe e kwuru ná Mkpughe 14:6, 7 na-agba ha ume mgbe nile. Anyị na-agụ ebe ahụ, sị: “M [Jọn onyeozi] wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa dị ka ozi obi ụtọ nye ndị bi n’elu ụwa, nyekwa mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla, na-ekwu n’oké olu, sị: ‘Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo, n’ihi ya kwa, na-efenụ Onye ahụ nke mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri dị iche iche.’”

16 Okwu ndị ahụ mere ka o doo anya na ndị mmụọ ozi na-akwado ma na-eduzi nnukwu ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova na-arụ gburugburu ụwa. Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya eduru ndị nwere obi eziokwu agakwuru Ndịàmà ya. Ndị mmụọ ozi edugawokwa Ndịàmà na nke ndị nwere mmasị. Nke ahụ aghaghị ịbụ ihe mere na ọtụtụ ugboro Onyeàmà Jehova na-ezute mmadụ kpọmkwem mgbe ọ nọ ná nsogbu ma chọọ enyemaka Akwụkwọ Nsọ, nke a na-emekwa ugboro ugboro nke na anyị agaghị asị na ha mere ná ndaba.

Ọrụ Dị Egwu Ha Ga-arụ n’Ọdịnihu

17. Olee ihe mere ndị Asiria mgbe nanị otu mmụọ ozi lụsoro ha agha?

17 E wezụga izi ndị ohu Jehova ozi na iwusi ha ike, ndị mmụọ ozi nwekwara ọrụ ọzọ ha na-arụ. N’oge gara aga, ha mezuru ihe Chineke kpere n’ikpe. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke asatọ T.O.A., ìgwè ndị agha Asiria yiri Jeruselem egwu. Gịnị ka Jehova mere? O kwuru, sị: “M ga-egbochikwa obodo a ịzọpụta ya, n’ihi Onwe m, na n’ihi Devid, bụ́ ohu m.” Ihe ndekọ Bible ahụ gwara anyị ihe merenụ, sị: “O ruo, n’abalị ahụ, na mmụọ ozi nke Jehova pụrụ, tigbuo n’ọmụma ụlọikwuu Asiria [otu narị na iri puku ndị ikom asatọ na ise]: mmadụ wee bilie n’isi ụtụtụ, ma, lee, ha nile bụ ozu nwụrụ anwụ.” (2 Ndị Eze 19:34, 35) Lee ka ike otu mmụọ ozi si karịa nnọọ nke ìgwè ndị agha bụ́ ụmụ mmadụ!

18, 19. Olee ọrụ dị egwu ndị mmụọ ozi ga-arụ n’ọdịnihu, oleekwa otú nke ahụ ga-esi metụta ụmụ mmadụ?

18 Chineke ga-eji ndị mmụọ ozi mee ihe n’imezu ihe o kpere n’ikpe n’isi nso. N’isi nso, Jizọs ga-abịa “ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu.” Ihe mere ha ga-eji bịa bụ ‘iweta ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.’ (2 Ndị Tesalonaịka 1:7, 8) Lee nnọọ otú nke a ga-esi metụta ụmụ mmadụ! A ga-ebibi ndị na-anabataghị ozi ọma Alaeze Chineke bụ́ nke a na-ekwusa ugbu a n’ụwa nile. Nanị ndị chọrọ Jehova, ezi omume, na umeala n’obi ka ‘a ga-ezobe n’ụbọchị iwe Jehova.’—Zefanaịa 2:3.

19 Anyị pụrụ ikele Jehova na ọ na-eji ndị mmụọ ozi ya dị ike enyere ndị ohu ya nọ n’ụwa aka ma na-ewusi ha ike. Anyị ịmata ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ ná nzube Chineke na-akasi anyị nnọọ obi, ebe ọ bụ na e nwere ndị mmụọ ozi nupụụrụ Jehova isi ma nọrọzie n’okpuru Setan. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ezi Ndị Kraịst pụrụ ime iji chebe onwe ha pụọ n’ikike Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ị chọọ ịmatakwu banyere mkpagbu ndị ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ a kpagburu Ndịàmà Jehova, gụọ Yearbook of Jehovah’s Witnesses nke afọ 1983 (Angola), 1972 (Czechoslovakia), 2000 (Czech Republic), 1992 (Etiopia), 1974 na 1999 (Germany), 1982 (Ịtali), 1999 (Malawi), 2004 (Moldova), 1996 (Mozambique), 1994 (Poland), 1983 (Portugal), 1978 (Spen), 2002 (Ukraine), na nke afọ 2006 (Zambia).

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee otú ndị mmụọ ozi si malite?

• Olee otú e si jiri ndị mmụọ ozi mee ihe n’oge Bible?

• Olee ihe Mkpughe 14:6, 7 kwuru banyere ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ taa?

• Olee ọrụ dị egwu ndị mmụọ ozi ga-arụ n’ọdịnihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 22]

Mmụọ ozi gbara Manoa na nwunye ya ume

[Foto dị na peeji nke 23]

“Ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ”