Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Hana Si Nweta Udo

Otú Hana Si Nweta Udo

Otú Hana Si Nweta Udo

O TU nwanyị na-ekwesị ntụkwasị obi ji olu dara ụda kpee ekpere iji too Jehova. O kwuru na Chineke emewo ka ya si n’ájá bilie, si ná mweda n’ala ya bulie ya elu.

Aha nwanyị ahụ bụ Hana. Olee ihe mere o ji chee na ọnọdụ ya agbanweela kpamkpam? Gịnị mere o ji na-aṅụrị nnọọ ọṅụ ugbu a? Olee otú anyị ga-esi rite uru n’akụkọ ya? Iji nweta azịza nke ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee akụkọ Hana.

Ezinụlọ Nọ ná Nsogbu

Hana bụ otu n’ime ndị nwunye abụọ Elkena, bụ́ onye Livaị nke bi n’ókèala Ifrem. (1 Samuel 1:1, 2a; 1 Ihe E Mere 6:33, 34) Ọ bụ ezie na Chineke ebughị n’obi ka ụmụ mmadụ na-alụ ihe karịrị otu nwanyị mgbe o kere ha, Iwu Mozis akagbughị ya, ọ chịkwakwara ya. Ezinụlọ Elkena na-efe Jehova, ma ndị lụrụ ihe karịrị otu nwanyị na-enwekarị esemokwu ezinụlọ, dị ka ọ dị na nke Elkena.

Hana bụ nwanyị aga, ebe nwunye di ya, bụ́ Penina, nwere ọtụtụ ụmụ. Penina nọ na-akpagbu Hana.—1 Samuel 1:2b.

Ụmụ nwanyị Izrel weere nwanyị aga dị ka onye a bụrụ ọnụ, ọbụnakwa were ya ka onye na-abaghị uru n’ihu Chineke. Ma ọ dịghị ihe na-egosi na ihe mere Hana amụtaghị nwa bụ na Chineke na-eweso ya iwe. Otú ọ dị, kama Penina ga-agbalị ịkasi Hana obi, o ji nwa ọ na-amụ na-eme Hana obi ọjọọ.

Ịga n’Ebe Nsọ Jehova

N’agbanyeghị esemokwu ndị a, ezinụlọ Elkena na-eme njem kwa afọ iji chụọ àjà n’ebe nsọ Jehova dị na Shaịlo. * O yiri ka hà ji ụkwụ mee njem a na-ewe kilomita 60, uje na ụla. Oge ndị a ha ji eme njem aghaghị ịbụworo Hana oge ihe mwute, n’ihi na a na-ekenye Penina na ụmụ ya ọtụtụ òkè àjà udo, ma Hana na-eketa nanị otu ụzọ. Penina na-eji ihe ndị ahụ na-akpasu Hana iwe, na-emekpa ya ahụ́ n’ihi na o yiri ka Jehova ò “mechiri akpa nwa ya.” Ọ na-enye ya nsogbu a kwa afọ, nke na Hana na-ebe ákwá ma ghara iri nri. Njem ndị kwesịrị iwetara ya ọṅụ na-akpataziri ya obi erughị ala. N’agbanyeghị nke ahụ, Hana na-eme njem ndị a gaa n’ebe nsọ Jehova.—1 Samuel 1:3-7.

Ị̀ hụrụ otú Hana si setịpụrụ anyị ezi ihe nlereanya? Mgbe i nwere nkụda obi, olee ihe ị na-eme? Ị̀ na-anọpụrụ onwe gị iche, ma kwụsị iso ndị kwere ekwe ibe gị na-akpakọrịta? Hana emeghị otú ahụ. O mere ka ọ mara ya ahụ́ iso ndị ya na ha na-efekọ Jehova na-akpakọrịta. N’agbanyeghị ọnọdụ anyị nọ na ya, anyị kwesịrị ime otu ihe ahụ.—Abụ Ọma 26:12; 122:1; Ilu 18:1; Ndị Hibru 10:24, 25.

Elkena gbalịrị ịkasị Hana obi ma gbaa ya ume ikwu otú obi dị ya. Ọ jụrụ ya, sị: “Hana, n’ihi gịnị ka ị na-akwa ákwá? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ị na-erighị ihe? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka obi gị jọrọ njọ? mụ onwe m ádịghị mma n’ebe ị nọ karịa ụmụ ndị ikom iri?” (1 Samuel 1:8) Eleghị anya Elkana amaghị na Penina na-akpaso Hana àgwà ọjọọ, Hana nwekwara ike ịhọrọ ịdị na-edi ahụhụ ọ na-ata kama ime mkpesa. Otú o sina dị, Hana gosipụtara na o nwere okwukwe na Chineke site n’ikpegara Jehova ekpere ka o nye ya udo nke obi.

Hana Ekwee Nkwa

A na-eri àjà udo n’ebe nsọ Jehova. Mgbe Hana hapụrụ ebe a na-eri nri, o kpegaara Chineke ekpere. (1 Samuel 1:9, 10) Ọ rịọrọ, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ọ bụrụ na I lekwasị anya n’ezie ná mweda n’ala nke ohu Gị nwanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwanyị, wee nye ohu Gị nwanyị nwa nwoke, m ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile, agụba agaghị agakwa n’elu isi ya.”—1 Samuel 1:11.

Hana kpọrọ okwu aha n’ekpere ya. Ọ rịọrọ maka nwa nwoke ma kwe nkwa na ya ga-arara ya nye Jehova ogologo ndụ ya nile dị ka onye Nazịraịt. (Ọnụ Ọgụgụ 6:1-5) Nkwa ahụ ga-adị irè nanị ma ọ bụrụ na di ya akwado ya, ihe ndị Elkena mekwara ka e mesịrị gosiri na ọ kwadoro nkwa ahụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya kwere.—Ọnụ Ọgụgụ 30:6-8.

Otú Hana si kpee ekpere mere ka Ilaị Nnukwu Onye Nchụàjà chee na mmanya na-egbu ya. Egbugbere ọnụ ya nọ na-emegharị emegharị, ma ọ nụghị okwu ọ bụla, n’ihi na Hana na-ekwu ya n’obi ya. Ekpere ahụ si ya nnọọ n’obi. (1 Samuel 1:12-14) Cheedị otú obi ga-adị Hana mgbe Ilaị baara ya mba ma gwa ya na ọ ṅụbigara mmanya ókè! N’agbanyeghị nke ahụ, o ji nkwanye ùgwù zaghachi nnukwu onye nchụàjà okwu. Mgbe Ilaị matara na Hana nọ na-ekpe ekpere “n’ọtụtụ ntụgharị uche [ya] na mkpasu iwe [ya],” ọ sịrị: “Chineke Izrel nyekwa gị arịrịọ gị.” (1 Samuel 1:15-17) Mgbe nke ahụ gasịrị, Hana gara rie ihe, “ihu ya agbarụghịkwa n’ihi ya ọzọ.”—1 Samuel 1:18.

Olee ihe anyị pụrụ ịmụta n’ihe a nile? Mgbe anyị na-ekpegara Jehova ekpere maka nsogbu ndị anyị nwere, anyị pụrụ ime ka ọ mara otú ọ dị anyị n’obi, ma jiri obi anyị nile rịọ ya ka o nyere anyị aka. Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọzọ anyị pụrụ ime iji kwụsị nsogbu ahụ, anyị kwesịrị ịhapụrụ ya nsogbu ahụ. Ọ bụ ihe kasị mma ime.—Ilu 3:5, 6.

Mgbe ndị ohu Jehova jisịrị obi ha nile kpee ekpere, o yikarịrị ka hà ga-enwe udo yiri nke ahụ Hana nwere. Pọl onyeozi dere banyere ekpere, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Mgbe anyị tụkwasịrị Jehova ibu anyị, anyị aghaghị ịhapụrụ ya ibu ahụ. Mgbe ahụ, dị ka Hana, ọ gakwaghị adị anyị mkpa ịdị na-agbarụ ihu.—Abụ Ọma 55:22.

Nwa A Rịọtaara Jehova

Ugbu a, Chineke bịara lebara Hana anya; ya adịrị ime ma mụọ nwa nwoke. (1 Samuel 1:19, 20) Nke a bụ otu n’ime ugboro ole na ole Chineke kwuru na Bible na ọ bụ ya mere ka a mụọ onye gaje ịbụ ohu ya. Samuel nwa Elkena na Hana gaje ịbụ onye amụma Jehova, onye gaje ịrụ ọrụ dị mkpa n’ihiwe ọchịchị Izrel.

O doro anya na Hana malitere izi Samuel ihe banyere Jehova mgbe ọ ka dị obere. Ò chefuru nkwa o kwere? Mbanụ! O kwuru, sị: “Ruo mgbe a ga-eme ka nwata hapụ ara, m ga-emekwa ka ọ bịa, ka e wee hụ ya anya n’ihu Jehova, o wee biri n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe a napụrụ Samuel ara, eleghị anya mgbe ọ dị afọ atọ ma ọ bụ jiri obere ihe karịa otú ahụ, Hana kpọgara ya ka o biri n’ebe nsọ Jehova, dị ka o kwere ná nkwa.—1 Samuel 1:21-24; 2 Ihe E Mere 31:16.

Mgbe a chụchaara Jehova àjà, Hana na di ya kpọnyere Ilaị Samuel. O nwere nnọọ ike ịbụ na Hana jidere obere nwa ya nwoke n’aka ka ọ na-agwa Ilaị, sị: “Biko, onyenwe m, mkpụrụ obi gị na-adị ndụ, onyenwe m, Mụ onwe m bụ nwanyị ahụ nke guzoro onwe ya nso gị n’ebe a, ikpere Jehova. Ekpere banyere nwata nke a ka m kpere; Jehova wee nye m arịrịọ m nke m rịọrọ n’aka Ya: ọzọkwa, mụ onwe m emewo ka a rịọtara ya Jehova; ụbọchị nile ọ na-adị ndụ ya onwe ya bụ onye a rịọtaworo nye Jehova.” Ọ bụ otú a ka Samuel si malite ijere Chineke ozi pụrụ iche ogologo ndụ ya nile.—1 Samuel 1:25-28; 2:11.

Ka oge na-aga, ọ dịghị mgbe Hana chefuru Samuel. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Nne ya wee meere ya uwe nwụda nta, chigooro ya kwa afọ, mgbe o sooro di ya rịgoo ịchụ àjà afọ.” (1 Samuel 2:19) N’ezie, Hana nọgidere na-ekpe ekpere maka Samuel. O doro anya na mgbe ọ na-aga ileta ya kwa afọ, ọ na-agba ya ume ka ọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ozi ọ na-ejere Chineke.

N’otu oge ha gara ebe ahụ, Ilaị gọziri nne na nna Samuel ma gwa Elkena, sị: “Jehova dooro gị mkpụrụ site na nwanyị a n’ọnọdụ ihe nrịọta a rịọtaara Jehova.” N’ikwekọ n’okwu ahụ, e ji ụmụ nwoke atọ ndị ọzọ na ụmụ nwanyị abụọ gọzie Hana na Elkena.—1 Samuel 2:20, 21.

Lee ezi ihe nlereanya Elkena na Hana bụụrụ nne na nna bụ́ Ndị Kraịst! A pụrụ ikwu na ọtụtụ ndị nne na nna arịọtaworo Jehova ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị site n’ịgba ha ume ka ha hapụ ụlọ iji banye n’ụdị dị iche iche nke ozi oge nile. Ụdị ndị nne na nna ahụ na-ahụ n’anya kwesịrị ka a jaa ha mma n’ihi àjà ndị ahụ ha chụrụ. Jehova ga-akwụghachikwa ha ụgwọ.

Ekpere Hana Ji Ọṅụ Kpee

Lee ka Hana bụ́bu nwanyị aga si nwee obi ụtọ! Ọ bụ nanị ụmụ nwanyị ole na ole ka e dekọrọ ekpere ha n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, e dekọrọ abụọ nke Hana. Nke mbụ bụ banyere ihe o kwuru mgbe a kpasuru ya iwe na mgbe ọ nọ ná mkpa, nke abụọ abụrụ ekpere o ji ọṅụ kpee iji nye Chineke ekele. Hana malitere site n’ikwu, sị: “Ọ na-atọ obi m ụtọ n’ime Jehova.” Ọ ṅụrịrị ọṅụ “ebe nwanyị aga mụworo ụmụ,” o toro Jehova dị ka ‘Onye na-eme ka a dị elu, Onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie.’ N’ezie, “Ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa welie ogbenye elu.”—1 Samuel 2:1-10.

Ihe ndekọ a sitere n’ike mmụọ nsọ banyere Hana na-egosi na ndị ọzọ nwere ike ịkpasu anyị iwe n’ihi ezughị okè ma ọ bụ obi ọjọọ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị agatụghị ekwe ka ule ndị dị otú ahụ napụ anyị ọṅụ anyị na-enweta n’ozi anyị na-ejere Jehova. Ọ bụ Onye ukwu na-anụ ekpere, onye na-aza ntiku nke ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi na-etiku ya, na-anapụta ha ná nsogbu ma na-enye ha udo bara ụba na ngọzi ndị ọzọ.—Abụ Ọma 22:23-26; 34:6-8; 65:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Bible kpọrọ ebe a a na-anọ efe ezi ofufe “ụlọukwu” Jehova. Ma, n’oge a n’Izrel, igbe ọgbụgba ndụ ahụ ka dị n’ụlọ ntu, ma ọ bụ ụlọikwuu. A gaje iwuru Jehova ụlọ nsọ mbụ na-adịgide adịgide n’oge ọchịchị Eze Solomọn.—1 Samuel 1:9; 2 Samuel 7:2, 6; 1 Ndị Eze 7:51; 8:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 17]

Hana rịọtaara Jehova Samuel