Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchụ Àjà Ndị Na-amasị Chineke

Ịchụ Àjà Ndị Na-amasị Chineke

Ịchụ Àjà Ndị Na-amasị Chineke

AKWỤKWỌ bụ́ The Mighty Aztecs kwuru, sị: “Ndị Aztecs, bụ́ ndị jiri mmadụ chụọ àjà n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ n’Ebe Etiti Kọntinent America, kweere na ndụ sitere n’ọnwụ.” Akwụkwọ ahụ gakwara n’ihu ikwu, sị: “Ka alaeze ukwu ahụ na-ebukwu ibu, e jikwuru ndị mmadụ chụọ àjà iji mee ka ọ kwụsie ike.” Dị ka akwụkwọ ọzọ si kwuo, n’afọ ọ bụla, ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị Aztecs na-eji achụ àjà na-eru iri puku mmadụ abụọ.

Kemgbe ụwa, ihe mere ndị mmadụ ji achụrụ chị ha ụdị àjà dị iche iche bụ n’ihi ụjọ nakwa n’ihi amaghị ihe echi ga-abọta ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na obi ha na-ama ha ikpe n’ihi ihe ha metara. Ma Bible gosiri na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile bụ́ Jehova kwuru ka a na-achụ àjà ụfọdụ. N’ihi ya, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka a jụọ, sị: Olee ụdị àjà ndị na-amasị Chineke? Onyinye na ịchụ àjà hà kwesịrị iso n’ofufe anyị taa?

Onyinye na Àjà Ndị A Na-achụ Iji Fee Chineke Ezi Ofufe

Mgbe Jehova hiwere mba Izrel, o nyere ha iwu dị iche iche n’otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya, inye onyinye na ịchụ àjà sokwa n’iwu ndị ahụ o nyere ha. (Ọnụ ọgụgụ, isi nke 28 na 29) Ụfọdụ onyinye ndị ahụ ha nyere sitere n’ihe ọkụkụ ndị a na-akụ n’ala; onyinye ndị ọzọ gụnyere àjà ndị e ji anụmanụ ndị dị ka oké ehi, atụrụ, ewu, kpalakwukwu na nduru achụ. (Levitikọs 1:3, 5, 10, 14; 23:10-18; Ọnụ Ọgụgụ 15:1-7; 28:7) E nwere àjà nsure ọkụ bụ́ nke chọrọ ka e suree ihe ahụ nile e ji chụọ àjà n’ọkụ. (Ọpụpụ 29:38-42) E nwekwara àjà udo, bụ́ nke ndị wetara ya na-eso eri ihe ahụ a chụụrụ Chineke n’àjà.—Levitikọs 19:5-8.

Onyinye na àjà ahụ nile a chụụrụ Chineke n’okpuru Iwu Mozis bụ otu ụzọ isi fee Chineke nakwa ụzọ isi kweta na ọ bụ ya bụ Eze eluigwe na ala. Ụmụ Izrel sitere n’àjà ndị a ha chụrụ gosi na ha nwere ekele maka otú Jehova si na-agọzi ma na-echebe ha, àjà ndị ahụ mekwara ka a na-agbaghara ha mmehie ha. Jehova na-agọzi ha n’ụba ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-efe ya otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya.—Ilu 3:9, 10.

Ihe ka Jehova mkpa bụ omume nke ndị ahụ na-achụrụ ya àjà ndị ahụ. Jehova sitere n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Hosea kwuo, sị: “Ebere atọwo m ụtọ, ọ bụghị àjà; ọmụma Chineke atọwokwa m ụtọ karịa àjà nsure ọkụ nile.” (Hosea 6:6) N’ihi ya, àjà ụmụ Izrel na-achụrụ Jehova n’elu ebe ịchụàjà ya adịghị aba uru mgbe ha kwụsịrị ife Chineke ezi ofufe ma mewe omume rụrụ arụ, nakwa mgbe ha na-egbu ndị aka ha dị ọcha. Ọ bụ ya mere Jehova ji site n’ọnụ Aịzaịa gwa mba Izrel, sị: “N’ihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ àjà unu? . . . Afọ ejuwo m n’àjà nsure ọkụ nile eji ebulu chụọ, na abụba ụmụ ehi emere ka ha maa abụba; ọzọ, ọbara okè ehi na nke ụmụ atụrụ na nke mkpi atọghị m ụtọ”—Aịsaịa 1:11.

“Ihe Nke M Na-enyeghị n’Iwu”

N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe ndị Izrel nọ, ndị Kenan na-eji ụmụ ha achụrụ chi ha àjà, tinyere chi ndị Amọn a na-akpọ Molek, bụ́kwa nke a maara dị ka Milkọm ma ọ bu Molọk. (1 Ndị Eze 11:5, 7, 33; Ọrụ 7:43) Akwụkwọ bụ́ Halley’s Bible Handbook kwuru, sị: “Ndị Kenan na-efe chi ha site n’ịnọ n’ihu ha na-enwe mmekọahụ, ha na-ejikwa nwa mbụ ha achụrụ chi ndị a àjà.”

Omume ndị dị otú a hà na-amasị Jehova Chineke? Ọ dịghị ma ọlị. Ka ụmụ Izrel na-achọ ịbanye n’ala Kenan, Jehova nyere ha iwu a e dekọrọ na Levitikọs 20:2, 3, sị: “Ị ga-asịkwa ụmụ Izrel, Nwoke ọ bụla n’etiti ụmụ Izrel, ma ọ bụ n’etiti ndị ọbịa ndị nọ dị ka ọbịa n’Izrel, nke na-enye Molek otu nwa n’ime mkpụrụ ya: aghaghị ime ka ọ nwụọ: ndị ala unu ga-ewere nkume tugbuo ya. Mụ onwe m ga-echekwa ihu m megide nwoke ahụ, bipụ ya n’etiti ndị ya; n’ihi na ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya ka o nyeworo Molek, ka o wee merụọ ebe nsọ m, na ime ka aha nsọ m ghara ịdị nsọ.”

Ọ bụ ezie na o yiri ihe na-apụghị ikwe omume, ụfọdụ ndị Izrel dapụrụ n’ezi ofufe malitere iji ụmụ ha achụrụ chi ụgha àjà, nke bụ́ omume ndị mmụọ ọjọọ. Abụ Ọma 106:35-38 kwuru banyere ụdị omume a, sị: “Ha gwakọtara onwe ha ná mba nile nke ala ahụ, wee mụta ọrụ nile ha: ha wee fee arụsị nile ha ofufe; arụsị ahụ wee ghọọrọ ha ọnyà: ọzọ, ha weere ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọrọ ndị mmụọ ọjọọ àjà, wee wụsịa ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ, bụ́ ọbara nke ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, ndị ha were chụọrọ arụsị nile nke Kenean àjà; ewee were ọbara merụọ ala ahụ.”

N’igosi otú ụdị omume a si eri ya izizi, Jehova sitere n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa kwuo banyere ndị Juda, sị: “Ha edowo ihe arụ nile ha n’ụlọ ahụ nke a kpọkwasịrị aha m, imerụ ya. Ha ewuwokwa ebe nile dị elu nke Tofet, nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm, isure ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ; bụ́ ihe nke M na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa n’obi m.”—Jeremaịa 7:30, 31.

Omume a na-asọ oyi ụmụ Izrel tinyere aka mechara mee ka ha na Chineke gharakwa ịdị ná mma. E mechara bibie isi obodo ha bụ́ Jeruselem, ma dọrọ ndị bi na ya n’agha laa Babilọn. (Jeremaịa 7:32-34) O doro nnọọ anya na ọ bụghị ezi Chineke ahụ nyere iwu ka e jiri mmadụ na-achụ àjà, iji mmadụ achụ àjà esoghịkwa n’ụzọ e si efe Chineke ofufe. Ụdị ọ bụla nke iji mmadụ achụ àjà sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ndị na-efekwa Chineke ezi ofufe ekwesịghị itinye aka ọ bụla n’ụdị omume a.

Àjà Mgbapụta Nke Kraịst Jizọs

Ma, ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnịkwanụ mere iwu ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel ji kwuo ka ha jiri anụmanụ na-achụ àjà?’ Pọl onyeozi lebaara ajụjụ a anya ma nye azịza ya. Ọ sịrị: “N’ihi gịnịzi ka e ji nwee Iwu ahụ? A tụkwasịrị ya iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè, ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịarute, bụ́ onye e kweworo nkwa ahụ . . . N’ihi ya, Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduga na Kraịst.” (Ndị Galeshia 3:19-24) Àjà ụmụ anụmanụ ahụ a chụrụ n’Iwu Mozis sere onyinyo àjà ka ukwuu Jehova Chineke ga-achụ n’ihi ụmụ mmadụ, ya bụ, nke ahụ o ji Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst chụọ. Ọ bụ ihe a Jehova mere nke na-egosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

N’ihi na Jizọs hụrụ Chineke na ụmụ mmadụ n’anya, o jiri aka ya nye ndụ mmadụ ya zuru okè ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ụmụ Adam. (Ndị Rom 5:12, 15) Jizọs kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi nakwa ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nọ n’ụwa nwere ike ịgbapụta ụmụ mmadụ n’agbụ mmehie na ọnwụ, bụ́ nke Adam renyere ha na ya. (Abụ Ọma 49:7, 8) N’ihi ya, Pọl kọwara na Jizọs, “ejighị ọbara ewu na nke ụmụ oké ehi, kama o ji ọbara nke ya banye, nanị otu ugboro n’ime ebe nsọ ahụ wee nwetara anyị mgbapụta ebighị ebi.” (Ndị Hibru 9:12) Site n’ịnara àjà e ji ọbara Jizọs chụọ, Chineke ‘hichapụrụ ihe odide ahụ e ji aka dee nke gbara àmà megide anyị.’ Ya bụ, Jehova wepụrụ Ọgbụgba Ndụ Iwu ahụ na onyinye na àjà ndị a chọrọ n’Iwu ahụ, ma webata ‘onyinye nke ndụ ebighị ebi.’—Ndị Kọlọsi 2:14; Ndị Rom 6:23.

Àjà na Onyinye Ndị A Na-enye Chineke

Ebe ọ bụkwanụ na iji ụmụ anụmanụ enye onyinye na iji ha achụ àjà esoghịkwa n’ihe e ji efe Chineke ofufe taa, è nwere àjà a chọrọ ka anyị na-achụ? Ee, e nwere. Jizọs Kraịst chụrụ ihe ụfọdụ n’àjà iji jeere Chineke ozi ma mechaa jiri onwe ya chụọ àjà n’ihi mmadụ nile. N’ihi ya, o kwuru, si: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24) Nke a pụtara na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs ga-achụrịrị ihe ụfọdụ pụtara ìhè n’àjà. Gịnị bụ ihe ndị a ọ ga-achụ n’àjà?

Otu n’ime ha bụ na ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst agaghị ebi ndụ n’ụzọ na-egosi na ọ na-eme ihe ga-adịrị nanị onwe ya mma, kama ọ ga na-ebi n’ụzọ na-egosi na ọ na-eme uche Chineke. Ọ na-ebute ime uche Chineke ụzọ tupu ya elebawara ndị nke ya anya. Pọl onyeozi si otú a kwuo, ya: “Ụmụnna m, esitere m n’ọmịiko nke Chineke na-arịọsi unu ike ka unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu. Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.”—Ndị Rom 12:1, 2.

Bible gosikwara na a pụrụ ile otuto ndị anyị na-enye Jehova anya dị ka àjà ndị anyị na-achụrụ ya. Onye amụma bụ́ Hosea jiri okwu bụ́ “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị” mee ihe, na-egosi na Chineke na-ewere okwu otuto ndị anyị na-agwa ya dị ka otu n’ime àjà ndị kasị mma anyị na-achụrụ ya. (Hosea 14:2) Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ume, sị: “Chụọrọ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.” (Ndị Hibru 13:15) Taa, Ndịàmà Jehova na-eji nnọọ ọrụ n’aka n’ikwusa ozi ọma ahụ na ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha na-achụrụ Chineke àjà otuto ehihie na abalị n’ụwa nile.—Mkpughe 7:15.

E wezuga ikwusa ozi ọma, imere ndị ọzọ ihe ọma sokwa n’àjà ndị na-amasị Chineke. Pọl gbara anyị ume, sị: “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 13:16) N’ezie, ndị na-achụrụ Chineke àjà otuto ga-akparịrị ezi àgwà ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka àjà ha na-atọ Chineke ụtọ. Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma banyere Kraịst ahụ.”—Ndị Filipaị 1:27; Aịsaịa 52:11.

Dị ka ọ dị n’oge mbụ, àjà nile a na-achụ iji kwado ezi ofufe ga-ewetara ndị na-achụ ya obi ụtọ meekwa ka Jehova na-agọzi ha. N’ihi ya, ka anyị mee ike anyị nile iji chụọ àjà ndị na-amasị Chineke n’ezie!

[Foto dị na peeji nke 18]

“Ha weere ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom . . . chụọrọ arụsị nile nke Kenan àjà”

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ezi Ndị Kraịst na-achụ àjà na-amasị Chineke site n’ikwusa ozi ọma ahụ nakwa site n’inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ndị ọzọ