Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Kraịst na Ohu Ya Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Kraịst na Ohu Ya Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Kraịst na Ohu Ya Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

“Nna ya ukwu . . . ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.”—MATIU 24:45-47.

1, 2. (a) Ònye ka Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ ya bụ Onye Ndú anyị? (b) Gịnị na-egosi na Kraịst na-eduzi nnọọ ọgbakọ Ndị Kraịst?

“KA A gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ.” (Matiu 23:10) Jizọs ji okwu ndị a mee ka o doo ụmụazụ ya anya na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nọ n’ụwa nke ga-abụ onye ndú ha. Nanị Onye Ndú ha ga-enwe ga-abụ onye nke nọ n’eluigwe—Jizọs Kraịst. Ọ bụ Chineke họpụtara Jizọs ịbụ onye ndú. Jehova “si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya . . . meekwa ya onyeisi nke ihe nile n’ebe ọgbakọ ahụ dị, nke bụ ahụ́ ya.”—Ndị Efesọs 1:20-23.

2 Ebe Kraịst bụ “onyeisi nke ihe nile” n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ na-eduzi ihe nile a na-eme n’ime ọgbakọ. Ọ dịghị ihe na-eme n’ọgbakọ nke ọ na-amaghị. Ọ na-enwe nnọọ mmasị ịma otú ọgbakọ Ndị Kraịst nke ọ bụla si eme mgbe a bịara n’ihe banyere mmekọrịta ha na Jehova. Nke a pụtara nnọọ ìhè ná mkpughe e kpugheere Jọn ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A. Mgbe Jizọs degaara ọgbakọ asaa akwụkwọ ozi, ọ gwara ha ugboro ise na ya maara ọrụ ha, marakwa ebe ndị ha na-eme nke ọma, na ebe ndị ha na-adịghị emezi emezi, ma nye ha ndụmọdụ na agbamume kwesịrị ekwesị. (Mkpughe 2:2, 9, 13, 19; 3:1, 8, 15) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na Kraịst maara ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ndị ọzọ dị n’Eshia Maịnọ, Palestine, Siria, Babilọn, Gris, Ịtali, na ebe ndị ọzọ. (Ọrụ 1:8) Gịnị banyere taa?

Ohu nke Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

3. Olee ihe mere o ji daba nnọọ adaba iji Kraịst tụnyere isi ma jiri ọgbakọ ya tụnyere ahụ́?

3 Mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, nakwa obere oge tupu ya alakwuru Nna ya n’eluigwe, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” O kwukwara, sị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:18-20) Ọ ga-anọgide bụrụ Onyeisi ha nke ga na-eduzi ha. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs na Kọlọsi, o ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere “ahụ́,” nke Kraịst bụ Isi ya. (Ndị Efesọs 1:22, 23; Ndị Kọlọsi 1:18) Akwụkwọ bụ́ The Cambridge Bible for Schools and Colleges kwuru na ihe a e ji tụnyere ọgbakọ Ndị Kraịst “na-egosi na ọ bụghị nanị na ahụ́ ahụ na Isi ya dị n’otu, kamakwa na Isi ahụ na-eduzi akụkụ ahụ́ ahụ nile. Ha bụ ngwá ọrụ ya.” Olee òtù Kraịst ji mere ngwá ọrụ kemgbe e chiri ya eze nke Alaeze ahụ na 1914?—Daniel 7:13, 14.

4. Dị ka amụma Malakaị si kwuo, gịnị ka Jehova na Kraịst Jizọs hụrụ mgbe ha bịara inyocha ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ?

4 Malakaị buru amụma na Jehova, bụ́ ‘Onyenwe anyị,’ na “Onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ Ọkpara ya e chiri eze ọhụrụ, bụ́ Kraịst Jizọs, ga-abịa ikpe “ụlọ nsọ,” ma ọ bụ ebe a na-anọ efe ya ofufe, ikpe na inyocha ya. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ na 1918 ka “oge a kara aka” maka ‘ikpe ụlọ Chineke ikpe’ ruru. * (Malakaị 3:1; 1 Pita 4:17) E nyochara nnọọ ndị sị na ha na-anọchite anya Chineke n’ụwa nakwa na ha na-efe ya ofufe. A jụrụ chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị nọworo kemgbe ọtụtụ narị afọ na-akụzi ozizi ndị na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ, ndị tinyewokwara nnọọ aka n’igbusịsị ụmụ mmadụ n’Agha Ụwa nke Mbụ. E lere ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ule, nụchaa ha dị ka e si eji ọkụ anụcha ihe, ma nabata ha dị ka ndị “na-eweta nso Jehova onyinye ịnata ihu ọma n’ezi omume.”—Malakaị 3:3.

5. N’ikwekọ n’amụma Jizọs buru banyere oge “ọnụnọ” ya, ònye ghọrọ “ohu” ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi?

5 N’ụzọ kwekọrọ n’amụma Malakaị, ihe ịrịba ama ndị ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara, bụ́ nke Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iji nyere ha aka ịmata oge “ọnụnọ [ya] nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a,” gụnyekwara ihe ha ga-eji amata “ohu” nke ọtụtụ ndị mejupụtara. Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, bụ́ onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, inye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie asị m unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.” (Matiu 24:3, 45-47) Mgbe Kraịst ‘bịarutere’ inyocha “ohu” ahụ na 1918, ọ hụrụ ihe fọdụrụnụ ná ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ bụ́ ndị nọworo na-eji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ‘na-enye nri n’oge kwesịrị ekwesị’ kemgbe 1879. Ọ nakweere ha dị ka ngwá ọrụ, ma ọ bụ “ohu,” nke ọtụtụ ndị mejupụtara, na 1919 kwa, o nyere ha ọrụ nke ilekọta ihe nile o nwere n’ụwa.

Ilekọta Ihe Ndị Kraịst Nwere n’Ụwa

6, 7. (a) Olee okwu ọzọ Jizọs ji kọwaa “ohu” ya nke na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Ọrụ ndị dịkwa aṅaa ka e nyere ‘onye ahụ na-elekọta ụlọ’?

6 Ọnwa ole na ole tupu Jizọs ebuo amụma banyere ihe àmà nke ọnụnọ ya, nakwa banyere otu “ohu” nke ga-anọchite anya ya n’ụwa, o jiri okwu dịtụ iche nke na-egosi ụdị ọrụ “ohu” ahụ ga-arụ kọwaa ohu ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ezie bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ onye nwere uche, onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ìgwè ndị na-ejere ya ozi, ịnọgide na-enye ha ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe oriri ha n’oge kwesịrị ekwesị? N’eziokwu asị m unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.”—Luk 12:42, 44.

7 Onye ahụ na-elekọta ụlọ, bụ́ onye ọtụtụ ndị mejupụtara, agaghị abụ nnọọ òtù ndị gụrụ oké akwụkwọ ndị ọrụ ha bụ́ isi bụ ịkọwa isi ihe ụfọdụ na-akpali mmasị dị na Bible. Tụkwasị n’inye nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ “n’oge kwesịrị ekwesị,” a ga-enyekwa “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” ọrụ nke ilekọta Ndị Kraịst nile na ihe nile gbasara Kraịst n’ụwa, ya bụ, “ihe nile o nwere.” Gịnị ka ihe ndị a gụnyere?

8, 9. Olee ‘ihe ndị Kraịst nwere’ bụ́ ndị e ji maka ha họpụta ohu ahụ ka ọ na-elekọta?

8 Ọrụ ohu ahụ gụnyere ilekọta ihe owuwu ndị Ndị Kraịst ji eme ihe n’ụwa iji rụzuo ọrụ e nyere ha, ndị dị ka, isi ụlọ ọrụ na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova nakwa ebe ndị a na-anọ efe ofufe n’ụwa nile, ya bụ, Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ. Nke ka mkpa bụ na ohu ahụ na-ahụkwa maka ọmụmụ Bible ndị na-ewusi okwukwe ike a na-enwe ná nzukọ ndị a na-enwe kwa izu, na mgbakọ ukwu na mgbakọ nta ndị a na-enwe site n’oge ruo n’oge. Ná nnọkọ ndị a, a na-akụzi otú amụma Bible si na-emezu, na-enyekwa ntụziaka banyere otú a pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ.

9 Ọrụ onye ahụ na-elekọta ụlọ gụnyekwara ịhụ maka ọrụ dị oké mkpa nke bụ́ ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” na ime “ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” Nke a gụnyere ịkụziri ndị mmadụ idebe ihe nile Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ, nyere n’iwu ka e mee ná mgbe ikpeazụ a. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Mkpughe 12:17) Ọrụ nkwusa na nke izi ihe emewo ka e nwee “oké ìgwè mmadụ” ndị nọgidesiri ike na-esonyere ndị ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-agụnye ‘ihe ndị a a na-achọsi ike nke mba nile’ ‘n’ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nke Kraịst nwere’ bụ́ ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-elekọta.—Mkpughe 7:9; Hagaị 2:7.

Òtù Na-achị Isi nke Na-anọchite Anya Ohu Ahụ

10. Olee òtù na-eme mkpebi na narị afọ mbụ, oleekwa otú mkpebi ndị ha mere si metụta ọgbakọ ndị e nwere n’oge ahụ?

10 O doro anya na ọrụ dị ukwuu nke ohu ahụ nwere ga-agụnye ime ọtụtụ mkpebi. N’ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem nọchitere anya ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ma meere ọgbakọ Ndị Kraịst dum mkpebi. (Ọrụ 15:1, 2) A na-eji akwụkwọ ozi agwa ọgbakọ dị iche iche mkpebi òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ ahụ mere, ha na-esikwa n’aka ndị nnọchianya ha na-ejegharị ejegharị eme otú ahụ. Ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere obi ụtọ inweta ntụziaka a doro anya site n’aka òtù na-achị isi, otú ha sikwa jiri obi ha dum kwadoo ihe ọ bụla òtù na-achị isi kwuru mere ka udo dịrị n’etiti ha, meekwa ka ha dịrị n’otu.—Ọrụ 15:22-31; 16:4, 5; Ndị Filipaị 2:2.

11. Olee ndị ka Kraịst ji na-eduzi ọgbakọ ya taa, oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ìgwè Ndị Kraịst a e tere mmanụ anya?

11 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, e nwere obere ìgwè ndị nlekọta e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ́ ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi nke Ndị Kraịst n’ụwa taa. Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, ji ‘aka nri’ ya, bụ́ ike e nyere ya o ji na-arụ ọrụ, na-eduzi ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi ka ha na-ahụ maka ọrụ Alaeze ahụ. (Mkpughe 1:16, 20) N’akụkọ ndụ ya, Albert Schroeder, onye jetere ozi aka n’Òtù Na-achị Isi, nke jesịrị ozi elu ala ya n’oge na-adịbeghị anya, dere, sị: “Òtù Na-achị Isi na-enwe nzukọ na Wednesday ọ bụla. Ha na-eji ekpere amalite nzukọ ha ma na-arịọ Jehova ka o jiri mmụọ ya na-eduzi ha. Ha na-agbalịsikwa ike ịhụ na okwu ọ bụla e lebaara anya na mkpebi ọ bụla e mere kwekọrọ n’Okwu Chineke bụ́ Bible.” * Anyị pụrụ ịtụkwasị Ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi obi. Ọ bụ ha kpọmkwem ka Pọl onyeozi bu n’uche nye ndụmọdụ nke anyị kwesịrị ịṅa ntị na ya. Ọ sịrị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche.”—Ndị Hibru 13:17.

Ịkwanyere Ohu ahụ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Ùgwù Kwesịịrị Ya

12, 13. Olee ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị mere a ga-eji na-akwanyere òtù ohu ahụ ùgwù?

12 Otu isi ihe mere anyị ji kwesị ịkwanyere nnọọ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ùgwù bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ bụ Nna ha ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, ka anyị na-akwanyere ùgwù. Pọl dere banyere ndị ahụ e tere mmanụ, sị: “Onye a kpọrọ mgbe ọ bụ onye nweere onwe ya bụ ohu nke Kraịst. E nwere ọnụ ahịa a zụtara unu.” (1 Ndị Kọrịnt 7:22, 23; Ndị Efesọs 6:6) Ya mere, mgbe anyị ji obi anyị na-anakwere nduzi nke ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya, ọ bụ Kraịst, bụ́ Nna ha ukwu, ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ya. Anyị ịkwanyere ndị Kraịst ji elekọta ihe ndị o nwere n’ụwa ùgwù kwesịịrị ha bụ otu ụzọ anyị si ‘ekwupụta na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.’—Ndị Filipaị 2:11.

13 Ihe ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke mere anyị ji kwesị ịkwanyere ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ùgwù bụ n’ihi na e kwuru na Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa bụ “ụlọ nsọ” ihe atụ nke Jehova “ga-ebi ná mmụọ.” N’ihi ya, ha dị “nsọ.” (1 Ndị Kọrịnt 3:16, 17; Ndị Efesọs 2:19-22) Ọ bụ ìgwè a a kọwara dị ka ụlọ nsọ ka Jizọs nyefere ihe nile o nwere n’aka, nke pụtara na ọ bụ nanị ohu a nke ọtụtụ ndị mejupụtara ka ikike na ọrụ ụfọdụ e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị n’aka. N’ihi ya, ndị nile nọ n’ọgbakọ na-ele ịgbaso na ịkwado ntụziaka sitere n’aka ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya anya dị ka ihe so n’ozi ha na-ejere Jehova. N’ezie, “atụrụ ọzọ” ahụ na-ewere ya dị ka ihe ùgwù inyere òtù ohu ahụ aka ilekọta ihe onwunwe nke Nna ha Ukwu.—Jọn 10:16.

Ịkwadosi Òtù Ohu ahụ Ike

14. Dị ka Aịzaịa buru n’amụma, olee otú atụrụ ọzọ ahụ si eso òtù ohu ahụ e tere mmanụ n’azụ ma na-eje ozi dị ka ndị ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ’?

14 Aịzaịa buru amụma na atụrụ ọzọ ahụ ga-eji obi umeala na-edo onwe ha n’okpuru ndị e tere mmanụ so n’Izrel ime mmụọ. O dere, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Ihe pụtara ná ndọgbu Ijipt na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na ọzụzụ ahịa nke Etiopia, na ndị Saba, ndị toro ogologo, ga-agabigakwute gị, ndị i nwere ka ha ga-abụkwa; gị ka ha ga-eso n’azụ; na mkpọrọ ka ha ga-agabiga: ọ bụkwa gị ka ha ga-akpọ isiala nye, gị ka ha ga-ekpere, sị, N’ezie n’ime gị ka Chineke nọ; ọ dịghịkwa onye ọzọ dị, ọ dịghị otu Chineke efu dị ma ọlị.” (Aịsaịa 45:14) N’ụzọ ihe atụ, taa, atụrụ ọzọ ahụ na-eso òtù ohu ahụ e tere mmanụ na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya n’azụ site n’ịgbaso nduzi ha. Dị ka ‘ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ,’ atụrụ ọzọ ahụ ji obi ha dum na-etinye ume ha na ihe onwunwe iji na-akwado ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ nke Kraịst nyere ụmụazụ ya e tere mmanụ nọ n’ụwa.—Ọrụ 1:8; Mkpughe 12:17.

15. Olee otú amụma dị n’Aịsaịa 61:5, 6 si kọwaa mmekọrịta dị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ na Izrel ime mmụọ?

15 Obi dị atụrụ ọzọ ahụ ụtọ ijere Jehova ozi n’okpuru nduzi nke òtù ohu ahụ na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya, ha nwekwara ekele maka ihe ùgwù a. Ha kweere na ndị ahụ e tere mmanụ so ‘n’Izrel nke Chineke.’ (Ndị Galeshia 6:16) Dị ka “ndị ala ọzọ” na “ụmụ ala ọzọ” bụ́ ndị na-esonyere Izrel ime mmụọ ahụ, ha ji ọṅụ na-eje ozi dị ka “ndị ọrụ ubi” na “ndị ọrụ ubi vaịn” n’okpuru nduzi nke ndị ahụ e tere mmanụ, ndị bụ́ “ndị nchụàjà nke Jehova” na ‘ndị na-ejere Chineke ozi.’ (Aịsaịa 61:5, 6) Ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-eme ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha ji obi ha nile na-enyere òtù ohu ahụ aka n’ịzụ atụrụ Jehova na ilekọta ndị yiri atụrụ a ka chọtara ọhụrụ.

16. Gịnị na-akpali atụrụ ọzọ ahụ ịkwadosi ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche ike?

16 Atụrụ ọzọ ahụ matara na ha eritewo uru dị ukwu site ná mgbalị siri ike ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-eme iji hụ na a na-enye ha nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. Ha kwetara nnọọ na ma ọ́ bụghị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche, ha agaraghị ama ihe ọ bụla banyere eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa dị na Bible, ndị dị ka ihe banyere ọbụbụeze Jehova, ido aha Jehova nsọ, Alaeze ahụ, eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, mkpụrụ obi, ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, na onye Jehova na Ọkpara ya bụ, nakwa ihe bụ mmụọ nsọ. Iji gosi ekele atụrụ ọzọ ahụ nwere maka ọrụ ụmụnna Kraịst e tere mmanụ na-arụ nakwa iji gosi na ha kpebiri nnọọ ịkwụsi ike n’akụkụ ụmụnna Kraịst, ha ji ịhụnanya na-akwado “ụmụnna” Kraịst nọ n’ụwa na mgbe ikpeazụ a.—Matiu 25:40.

17. Gịnị ka Òtù Na-achị Isi hụrụ na ọ dị mkpa ka ha mee, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 N’ihi ọnụ ọgụgụ ha nke na-agbada agbada, ndị ahụ e tere mmanụ agaghị anọ n’ọgbakọ nile iji hụ na a na-elekọta ihe ndị Kraịst nwere. N’ihi nke a, Òtù Na-achị Isi na-esi n’etiti atụrụ ọzọ ahụ ahọpụta ndị ikom ilekọta alaka ụlọ ọrụ, distrikti na sekit dị iche iche, nakwa ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Ò nwere ihe jikọrọ otú anyị si emeso ndị a ihe na ikwesị ntụkwasị obi anyị nye Kraịst na ohu ya nke na-ekwesị ntụkwasị obi? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Iji nweta ihe ọmụma zuru ezu banyere isiokwu a, lee Ụlọ Nche nke March 1, 2004, peeji nke 13-18, na nke December 1, 1992, peeji nke 13.

^ par. 11 E bipụtara ya n’Ụlọ Nche nke March 1, 1988, (Bekee), peeji nke 10-17.

Ntụleghachi

• Ònye bụ Onye Ndú anyị, gịnịkwa na-egosi na ọ maara otú ihe si na-aga n’ọgbakọ dị iche iche?

• Mgbe a bịara inyocha “ụlọ nsọ” ahụ, olee ndị ka a hụrụ ka ha na-arụ ọrụ dị ka ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, oleekwa ihe onwunwe ndị e nyefere ha n’aka?

• Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ́ ndị mere anyị ga-eji nọgide na-akwado ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

‘Ihe onwunwe’ ndị ‘onye ahụ na-elekọta ụlọ’ na-elekọta gụnyere ihe onwunwe nkịtị, ọmụmụ Bible ndị na-ewusi okwukwe ike, na ọrụ nkwusa

[Foto dị na peeji nke 25]

Atụrụ ọzọ ahụ na-akwado òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma