Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Azịza Ndị Ziri Ezi
Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Azịza Ndị Ziri Ezi
Olee ihe m ga-eme iji nọgide na-enwe ezi ahụ́ ike?
Gịnị ka m nwere ike ime ka ndị ezinụlọ m na-enwekwu obi ụtọ?
Olee ihe m ga-eme ka a ghara ịchụ m n’ọrụ?
Ọ̀ DỊTỤLA mgbe ị jụrụ otu n’ime ajụjụ ndị a? Ì nwetara azịza baara gị uru n’ezie? Kwa afọ, a na-ebipụta ihe dị ka puku akwụkwọ abụọ, bụ́ ndị na-aza ajụjụ ndị a nakwa ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa. Na Britain nanị, ndị na-agụ akwụkwọ na-emefu ihe dị ka nde pound iri asatọ (nke bụ́ ihe dị ka otu narị nde dọla na iri ise, n’ego ndị United States) n’otu afọ n’akwụkwọ ndị na-akụziri ndị mmadụ otú e si anagide ihe isi ike ndị a na-enwe ná ndụ. Kwa afọ na United States, a na-erete ihe dị ka narị nde dọla isii n’akwụkwọ ndị na-akọwara ndị mmadụ otú ha ga-esi na-enyere onwe ha aka. N’eziokwu, ọ bụghị nanị gị chọrọ ndụmọdụ dị mma banyere otú ị ga-esi na-anagide nsogbu ndị ị na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị.
Mgbe otu onye na-ede akwụkwọ na-ekwu banyere aro ndị a tụrụ n’imirikiti akwụkwọ ndị a, ọ sịrị: “N’ọtụtụ n’ime akwụkwọ ndị ọhụrụ a a na-ebipụta, ihe a na-eme bụ ideghachi ihe ndị e derela ede.” N’eziokwu, ihe a na-eme n’ime akwụkwọ ndị a bụ ikwughachi ihe dị n’otu akwụkwọ kasị ochie e nwere n’ụwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na akwụkwọ a bụ akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa nile. A sụgharịala ya n’ozuzu ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ n’ihe dị ka puku asụsụ abụọ na narị anọ. A gụkọta ha nile, e bipụtala akwụkwọ a ihe karịrị ijeri anọ n’ụwa nile. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ a na-ekwu okwu ya ma ọ bụghị Bible.
Bible kwuru hoo haa, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) N’eziokwu, e deghị Bible ka ọ bụrụ akwụkwọ mmadụ ji amụta otú ọ ga-esi na-enyere onwe ya aka. Nzube bụ́ isi e ji dee ya bụ iji kọwaa ihe Chineke zubere maka ụmụ mmadụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible kwukwara ọtụtụ ihe banyere otú anyị ga-esi nagide nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndụ, ọ na-ekwekwa nkwa na ndị gbasoro ndụmọdụ e dere na ya ga-erite uru. (Aịsaịa 48:17, 18) Ọ bụrụ na mmadụ etinye ndụmọdụ ndị dị na Bible n’ọrụ, ihe ga-adịrị ya mma n’agbanyeghị agbụrụ onye ahụ si, otú e si zụlite ya, ma ọ bụ otú ọ gụruru akwụkwọ. Ọ ga-adị mma ma ị tụlee isiokwu na-esonụ ma kpebiere onwe gị ma ihe Bible na-ekwu n’ihe ndị metụtara ahụ́ ike, ezinụlọ na ọrụ hà nwere ike ịbara mmadụ uru.