Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ime Ndị Ọzọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Nyeere m Aka Ikpebi Ihe M Ga-eme Ná Ndụ M

Ọrụ Ime Ndị Ọzọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Nyeere m Aka Ikpebi Ihe M Ga-eme Ná Ndụ M

Akụkọ Ndụ

Ọrụ Ime Ndị Ọzọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Nyeere m Aka Ikpebi Ihe M Ga-eme Ná Ndụ M

DỊ ka Lynette Peters si kọọ

Ndị agha bịara ịkpọpụ anyị. Otu onye n’ime ha na-adịghị agba égbè gbajọọ nọ n’elu ụlọ ahụ anyị nọ. Ndị agha ndị ọzọ jicha égbè ha n’aka makpuru n’ahịhịa ma dịrị njikere ịgba ya. Ka anyị ji ọsọ na-agbaba n’ime helikọpta nọ na-eche anyị n’ụtụtụ Sunday ahụ, mụ na ndị ozi ala ọzọ ibe m gbalịrị ijide onwe anyị. Helikọpta ahụ feliri ozugbo anyị banyere. N’ime minit iri ọzọ, anyị banyeziri n’otu ụgbọ mmiri ndị agha nke nọ n’ụsọ oké osimiri.

N’ỤTỤTỤ echi ya, anyị nụrụ na ndị nnupụisi ji bọmbụ gbarie họtel ahụ anyị gbabara na ya tupu a bịa kpọpụta anyị. Ọgba aghara e nwere na Sierra Leone kemgbe ọtụtụ afọ emesịala ghọọ agha kpụ ọkụ n’ọnụ. A manyere ndị nile bịara abịa ná mba ahụ, tinyekwara anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ, ịgbapụ n’enyeghịdị anyị ohere ibukọrọ ihe ndị anyị nwere. Iji kọwaara gị otú m si hụta onwe m n’ọnọdụ ahụ, ọ ga-adị mma ma m malite n’isi kọọrọ gị akụkọ ndụ m.

Etolitere m na British Guiana, bụ́ nke a maara dị ka Guyana kemgbe afọ1966. Mgbe m na-etolite n’afọ ndị 1950, ọ dịghị ihe na-echegbu m, ndụ dịkwa ụtọ mgbe ahụ. Ọtụtụ ndị nne na nna ji ịga akwụkwọ kpọrọ ihe nke ukwuu, ha na-atụkwa anya ka ụmụ ha mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Echetara m na ọ dị mgbe otu onye na-arụ n’ụlọ akụ̀ jụrụ papa m, sị, “N’ihi gịnị ka i ji akwụrụ ụmụ gị nnukwu ego a nile n’ụlọ akwụkwọ?” Papa m zara ya sị, “Ọ bụ nanị ma ha gụọ nnọọ akwụkwọ nke ọma ka ha ga-enwe ezigbo ọganihu ná ndụ ha.” N’oge ahụ, papa m chere na ọ bụ nanị n’ụlọ akwụkwọ ndị a ma ama ka mmadụ ga-enweta agụmakwụkwọ kasị mma. Ma n’oge na-adịghị anya, ọ gbanwere echiche a.

Mgbe m dị afọ iri na otu, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ mama m Bible. Ya na otu onye agbata obi anyị so gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe ha abụọ nụrụ n’ụbọchị ahụ mere ka ha kweta na ha achọtala eziokwu ahụ. Ka e mesịrị, mama m kọọrọ onye agbata obi anyị ọzọ ihe ahụ ọ nụrụ. Ọ dịghị anya, ndị ozi ala ọzọ bụ́ Daphne Harry (onye mesịrị zawa Baird) na Rose Cuffie malitere ịmụrụ ha atọ Bible. N’ime ihe na-erughị otu afọ, e mere mama m na ndị enyi ya abụọ ahụ baptizim. Afọ ise ka nke ahụ gasịrị, papa m si na chọọchị Seventh-Day Adventist pụta ma ghọọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim.

Mgbe anyị ka na-etolite etolite, mụ na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ—anyị atọ tọrọ mmadụ asaa ndị ọzọ—na-anọkarị n’ebe ndị ozi ala ọzọ ahụ bụ́ Daphne na Rose bi. N’oge ndị ahụ, ha na-akọrọ anyị ahụmahụ ndị mara mma ha nwetara n’ozi ọma. Ndị ozi ala ọzọ a na-enwe ọṅụ mgbe nile n’ihi na ike adịghị agwụ ha inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Chineke. Ọ bụ ihe nlereanya ha setịpụrụ mere ka m chọọ ịbụ onye ozi ala ọzọ.

Ma gịnị nyeere m aka ime ozi oge nile ihe mgbaru ọsọ m n’agbanyeghị na ndị ikwu m na ụmụ akwụkwọ ibe m bụ ndị ji ịgụ oké akwụkwọ na inweta ọrụ na-enye ezigbo ego kpọrọ oké ihe? E nwere ọtụtụ ihe m gaara eme—a pụrụ m ịgụ akwụkwọ iji ghọọ ọkàiwu, ma ọ bụ mụọ ihe banyere egwú, ma ọ bụ ghọọ onye dọkịta, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ihe nlereanya nne na nna m setịpụrụ nyeere m aka ịma ihe m ga-eme. Ha tinyere ihe ndị ha na-amụta n’ọrụ, ha mụchikwara Bible anya ma tinye mgbalị dị ukwuu n’inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova. * Tụkwasị na nke ahụ, ha na-akpọkarị ndị ozi oge nile ka ha bịa n’ụlọ anyị. Ọṅụ na afọ ojuju ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a na-enwe mere ka m chọsikwuo ike inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Mgbe m dị afọ iri na ise ka e mere m baptizim. Ozugbo m gụsịrị akwụkwọ kọleji, amalitere m ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Philomena, bụ́ onye na-arụ n’ụlọ ọgwụ, bụ onye mbụ m nyeere aka inwe ọganihu ruo n’ịrara onwe ya nye Jehova ma mee baptizim. Ọṅụ m nwere mgbe m hụrụ otú o si hụ Jehova n’anya mere ka m kpebie ịnọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Obere oge ka e mesịrị, e nyere m ọrụ ka mma n’ụlọ ọrụ gọọmenti ebe m na-arụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ. Ajụrụ m ọrụ ahụ n’ihi na a chọrọ m ịnọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ.

Aka bi m n’ụlọ nne na nna m, ndị ozi ala ọzọ ka na-abịakwa na nke anyị. Ọ na-atọ m nnọọ ụtọ ige ntị mgbe ha na-akọ ahụmahụ ndị ha na-enweta n’ozi ọma. Ihe a nile mere m ji kpebisie ike ịbụ onye ozi ala ọzọ, n’agbanyeghị na o yiri ihe na-agaghị ekwe omume. N’oge ahụ, a na-ezite ndị ozi ala ọzọ n’obodo Guyana, a ka na-ezitekwa ha ruo taa. Otu ụbọchị n’afọ 1969, ọ tụrụ m n’anya ịnata akwụkwọ ozi e ji gwa m ka m bịa ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead nke dị na Brooklyn, New York, nke a mekwara m obi ụtọ.

Ebe M Na-atụghị Anya Ya E Kenyere M Ije Ozi

E nwere ụmụ akwụkwọ iri ise na anọ si mba iri abụọ na otu na klas nke iri anọ na asatọ nke Gilead ahụ. Mmadụ iri na asaa n’ime anyị bụ ụmụ nwanyị na-alụbeghị di. Ọ bụ ezie na ọ bụ afọ iri atọ na asaa gara aga ka m gara ụlọ akwụkwọ a, m ka na-echeta ihe ndị anyị mere n’ime n’ọnwa ise ahụ anyị nọrọ. E nwere ọtụtụ ihe a kụziiri anyị. Ọ bụghị nanị eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ ka a kuziiri anyị, kamakwa a tụụrụ anyị aro ndị a pụrụ itinye n’ọrụ ma nye anyị ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru mgbe anyị ga-amalite ozi n’ala ọzọ. Dị ka ihe atụ, amụtara m ịgbaso ntụziaka ọ bụla e nyere, mụta otú m kwesịrị isi na-ele uwe na ejiji ndị na-ewu ewu anya, nakwa uru ọ bara ịnọgidesi ike n’ebe e kenyere anyị ije ozi n’agbanyeghị ọnọdụ ụfọdụ ndị na-adịghị mma.

Mgbe m nọ n’ụlọ anyị, ndị mụrụ m mere ka anyị mara mkpa ọ dị ịdị na-agachi ọmụmụ ihe anya. Iji mee ka anyị mata mkpa ịga ọmụmụ ihe dị, ndị mụrụ m anaghị ekwe ka onye ọ bụla sị na ahụ́ adịghị ya nke na ọ gaghị agali ọmụmụ ihe na Sunday gaa ebe anyị na-aga amụ otú e si akpọ piano ma ọ bụ ebe anyị na-aga ekiri ndị na-akụ egwú n’abalị Monday. Ma mgbe m gara Ụlọ Akwụkwọ Gilead, o nwere mgbe m na-agachighị ọmụmụ ihe anya. N’uhuruchi otu ụbọchị Friday, mgbe Don na Dolores Adams, bụ́ di na nwunye na-eje ozi na Betel, ndị m na-esonyere n’ụgbọala ha aga ọmụmụ ihe jụrụ m ihe mere m na-ejighị abịachi ọmụmụ ihe anya, agbalịrị ịzọrọ isi m. Agwara m ha na ọ bụ n’ihi nnukwu ihe omume ndị a na-enye anyị mee na ọtụtụ ihe ndị ọzọ a chọrọ ka anyị na-ede mere m ji agha ọmụmụ ihe. Ekwuru m na ọ bụ ihe ndị a na-eme ka o siere m ike ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi. Mgbe mụ na Nwanna Adams tụgharịtụchara uche, o kwuru, sị: “Mee ihe ọ bụla akọnuche gị gwara gị.” Egere m ya ntị, esokwa m ha gaa ọmụmụ ihe n’uhuruchi ahụ, ọ dịghịzi mgbe m hapụrụ ịga ọmụmụ ihe ọzọ. N’afọ ndị sochirinụ, enweghịzi mgbe m kwere ka ihe ọ bụla mee ka m kwụsị ịga ọmụmụ ihe ma e wezụgakwa mgbe e nwere ihe m na-agaghị egbochili.

Ka anyị nọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa atọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, a malitere ikwu okwu banyere ebe a ga-eziga anyị. N’ime obi m, echere m na a ga-eziga m Guyana, bụ́ ebe e nwere mkpa dị ukwuu n’ọrụ nkwusa. Ọ tụrụ m nnọọ n’anya mgbe m matara na e zigaghị m Guyana. Kama e zigara m Sierra Leone nke dị n’ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Ekelere m nnọọ Jehova n’ihi na e mezuola ọchịchọ m ịbụ onye ozi ala ọzọ!

E Nwere Ọtụtụ Ihe A Ga-amụta

“Ebe a magburu onwe ya.” Nke ahụ bụ ihe mbụ m kwuru mgbe m rutere Sierra Leone, nke bụ́ mba nwere ọtụtụ ugwu nta na ugwu ukwu, ọnụ mmiri na ụsọ mmiri dị iche iche. Ma ọ bụ ndị mmadụ bụ ihe kasị mma nọ ná mba a dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, n’ihi na ha na-egosi ndị bịara abịa ịhụnanya na obiọma nke na-eme ka ahụ́ ruo ha ala. Ọ bụ omume a na-enyere ndị ozi ala ọzọ ka bịara ọhụrụ aka ka agụụ ịlaghachi n’obodo ha ghara ịdị na-agụ ha. Ọ na-atọkarị ndị Sierra Leone ụtọ ịkọ akụkọ banyere omenala ha na ọdịnala ha, karịsịakwa ọ na-atọ ha ụtọ inyere ndị bịara ọhụrụ aka ịmụta asụsụ ha bụ́ Krio, nke bụ́ asụsụ bụ́ isi e ji eme ihe ná mba ahụ.

E nwere ọtụtụ ilu ndị mara mma e nwere n’asụsụ Krio. Dị ka ihe atụ, Enwe na-arụ arụ, adaka ana-eri eri, nke pụtara na ọ naghị abụkarị onye rụrụ ọrụ na-eri uru ihe ọ rụrụ. Nke a na-akọwa nnọọ ikpe na-ezighị ezi jupụtara n’ụwa taa.—Aịsaịa 65:22.

Ikwusa ozi ọma na ime ndị mmadụ ka bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-atọ m ụtọ. Ọ na-ahịa ahụ́ ịhụ onye na-enweghị mmasị na Bible. N’ime ọtụtụ afọ, ndị ozi ala ọzọ na ndị nọ na-ejere Jehova ozi kemgbe ọtụtụ afọ enyerela ọtụtụ ndị aka—ma ndị na-eto eto ma ndị agadi—ndị si n’ebe dị iche iche ma ndị bara ọgaranya ma ndị ogbenye, ịmata eziokwu ahụ.

Erla St. Hill, bụ́ onye mbụ mụ na ya jekọrọ ozi ala ọzọ, bụ onye na-arụsi ọrụ ike. Otú o si arụsi ọrụ ike n’ebe anyị nile bi chọkwara ịharu ka nke ọ na-arụ n’ozi ọma. O nyeere m aka ịghọta mkpa ọtụtụ ihe dị, dị ka imete ndị agbata obi anyị enyi, ileta ụmụnna ndị na-arịa ọrịa nakwa ndị nwere mmasị, inye aka mgbe a na-eme ndokwa maka olili ozu mgbe o kwere mee. Ọ kọwakwaara m na ọ dị mkpa ka m gaa leta ụmụnna ndị bi n’ógbè ebe anyị jere ozi ọma tupu m si n’ógbè ahụ pụọ, ọ sọkwa ya ya bụrụ na oge adịghị. Site n’ime ihe ndị a, n’oge na-adịghị anya enwetaziri m ọtụtụ nne, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị na ndị enyi, nke a mekwara ka ebe a e zitere m ije ozi dịzie m ka obodo m.—Mak 10:29, 30.

Mụ na ndị ozi ala ọzọ mụ na ha na-ejekọ ozi bịakwara ghọọ nnọọ ezigbo enyi. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị mụ na ha biri n’otu ụlọ, Adna Byrd, bụ́ onye jere ozi na Sierra Leone n’agbata afọ 1978 na afọ 1981, na Cheryl Ferguson, bụ́ onye mụ ya bi kemgbe afọ iri abụọ na anọ.

Agha Obodo Ewetara Anyị Ule

N’afọ 1997, ihe dị ka otu ọnwa ka a rarachara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị na Sierra Leone nye, agha mere ka anyị gbapụ ná mba ahụ dị ka m kọrọ ná mmalite. Afọ isii tupu oge ahụ, okwukwe Ndịàmà si Liberia gbata ọsọ ndụ na Sierra Leone n’ihi agha a na-alụ n’obodo ha, metụrụ anyị n’ahụ́. Ụfọdụ n’ime ha adịghị ihe ọ bụla ha ji gbapụ. N’agbanyeghị ihe isi ike ahụ, ha na-apụta ozi ọma kwa ụbọchị. Otú ha si hụ Jehova na ndị mmadụ n’anya metụrụ anyị n’ahụ́.

Ugbu a anyị onwe anyị bụzi ndị gbatara ọsọ ndụ ná mba Guinea, anyị gbasoro ihe nlereanya nke ụmụnna anyị ndị Liberia ahụ ma nọgide na-atụkwasị Jehova obi, na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị. Otu afọ ka e mesịrị, anyị laghachiri Sierra Leone, ma ka ọnwa asaa gasịrị, agha ahụ bidokwara ọzọ anyị agbagakwa Guinea.

N’oge na-adịghị anya, anyị nụrụ na otu n’ime òtù ndị ahụ na-alụrịta agha gara biri n’ụlọ anyị dị na Kissy, bụ́ ebe ndị ozi ala ọzọ na-ebi. Anyị nụkwara na ha ezuruchaala ihe ndị anyị hapụrụ ma mebie ndị ọzọ. Kama iwewa iwe, anyị nwere nnọọ obi ụtọ na anyị ka dị ndụ. Ọ bụzi nanị ihe onwunwe ole na ole ka anyị nwere, ma anyị weere ya otú ahụ.

Mgbe a kpọpụsịrị anyị nke ugbo abụọ ya, mụ na Cheryl, bụ́ onye mụ na ya bi n’otu ụlọ, nọwaziri na Guinea. Nke a mere ka anyị malite ịmụ asụsụ French. Ụfọdụ ndị ọzọ mụ na ha nọ ozi ala ọzọ malitere iji asụsụ French nke ha mụtara na-ezi ozi ọma, n’achọghị ịma ma ha sụtara asụsụ ahụ ma ọ bụ na ha asụtaghị ya. Ma ọ naghị ekwe m ịsụ ihe m na-amaghị, n’ihi ya, ọ bụ nanị mgbe ọ dị oké mkpa na m ga-asụ French ka m na-asụ ya. Ime nke a siiri m nnọọ ezigbo ike. N’ihi ya kwa, ana m echetara onwe m kwa ụbọchị na ihe mere m ji bịa mba Guinea bụ iji nyere ndị ọzọ aka ịmata onye Jehova bụ.

Eji m nwayọ nwayọ na-amụta asụsụ ahụ. Ihe nyeere m aka ịmụta asụsụ ahụ bụ ige ntị mgbe ndị maara asụsụ a nke ọma na-asụ ya, nakwa ịrịọ ụmụaka nọ n’ọgbakọ ka ha nyere m aka. Ihe mere m ji họrọ ụmụaka bụ na ụmụaka anaghị asọ anya ịgwa mmadụ mgbe ọ na-emetaghị nke ọma. Ka oge na-aga, anyị nwetara enyemaka anyị na-atụghị anya ya site ná nzukọ Jehova. Malite n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2001, e bipụtawara aro banyere otú anyị ga-esi na-enyefe magazin tinyere otú a pụrụ isi nyefee ndị si n’okpukpe dị iche iche akwụkwọ anyị na broshuọ anyị. Ugbu a obi na-esikwu m ike ma m nọrọ n’ozi ọma, a sịgodị na ekwutechaghị m ya otú m gaara esi ekwu ya n’asụsụ nke m.

Itolite n’ezinụlọ ebe e nwere ọtụtụ ụmụ mere ka ọ dịịrị m mfe mụ na ọtụtụ ndị ibikọ ọnụ. Ọ dị mgbe mụ na mmadụ iri na asaa bikọrọ n’otu ebe. N’ime afọ iri atọ na asaa m jerela ozi ala ọzọ, mụ na ihe karịrị narị ndị ozi ala ọzọ ebiela. Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù dị ukwuu isi otú ahụ mata ọtụtụ mmadụ, ha nile nwere àgwà nke ha n’otu n’otu, ma n’otu oge ahụ, ha nile na-arụ ọrụ iji mezuo otu ihe! Ọ bụkwa ihe na-enye ọṅụ iso Chineke na-arụkọ ọrụ na iso nyere ndị ọzọ aka ịbịa mara eziokwu Bible!—1 Ndị Kọrịnt 3:9.

N’ime afọ ndị a m na-eje ozi n’ala ọzọ, e nwere ọtụtụ nnukwu ihe ndị mere n’ezinụlọ anyị ndị m na-esoghị ndị ezinụlọ m mekọọ, ihe ndị dị ka agbamakwụkwọ nke ụmụnne m ndị m tọrọ. Ihe ọzọ bụ na anaghị m ahụ ụmụ ụmụnne m otú m gaara achọ ịdị na-ahụru ha. Ma mụ ma ndị ezinụlọ m chụrụ ihe dị ukwuu n’àjà, ha anọgidewokwa na-akwado m ka m nọgide n’ozi ala ọzọ n’agbanyeghị na ọ ga na-agụ ha agụụ ịdị na-ahụ m.

N’agbanyeghị nke ahụ, n’ozi ala ọzọ, e nwetala m ihe ndị ahụ m gaara enweta ma a sị na m nọ n’ụlọ. Ọ bụ ezie na m kpebiri na-agaghị m alụ di, e nwere m ọtụtụ ụmụ ime mmụọ. Ha abụghị nanị ndị m mụụrụ Bible, kamakwa ndị ọzọ mụ na ha bịara ghọọ enyi. Tụkwasị na nke ahụ, ahụla m ka ụmụ ha toro, lụọ di ma ọ bụ nwunye, zụọkwa ụmụ nke ha ịbụ Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ n’ime ha ekwewokwa ka ọrụ ime ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nyere ha aka ikpebi ihe ha ga-eme ná ndụ dị ka m mere.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Mama m rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na ise, mgbe papa m lakwara ezumike nkà, ọ malite ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

[Map ndị dị na peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E zigara m Sierra Leone nke dị Ọdịda Anyanwụ Africa

GUINEA

SIERRA LEONE

[Foto dị na peeji nke 13]

Ụmụnne m ndị nwanyị abụọ, bụ́ ndị mụ na ha so ndị ozi ala ọzọ nọrịa ọtụtụ awa bụ́ nke nyere anyị obi ụtọ n’afọ ndị sochiri 1950

[Foto dị na peeji nke 14]

Mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nke klas nke iri anọ na asatọ nke Gilead

[Foto dị na peeji nke 16]

Mgbe a na-arara alaka ụlọ dị na Sierra Leone nye Jehova