Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ aghaghị ịbụ “nwunye nke otu di” iji ruo eruo inweta enyemaka site n’aka ọgbakọ Ndị Kraịst?—1 Timoti 5:9.

Ebe ọ bụ na Pọl na-ekwu okwu banyere nwanyị di ya nwụrụ, o doro anya na okwu ahụ bụ́ “nwunye nke otu di” na-ezo aka n’ihe nwanyị ahụ bụ tupu di ya anwụọ. Nke a ọ̀ pụtara na ọ ga-abụrịrị nanị otu ugboro ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ lụrụ di? Ka è nwere ihe ọzọ Pọl bu n’uche? *

Ụfọdụ ndị ekwuola na ndị Pọl na-ekwu okwu ha bụ ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị lụrụ di nanị otu ugboro. Ọ bụ eziokwu na n’ọtụtụ ebe, a na-ele nwanyị di ya nwụrụ nke na-alụgharịghị di anya dị ka onye nwere nnọọ àgwà ọma. Ma echiche dị otú ahụ ekwekọghị n’ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi ya ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrint na ọ bụ ezie na ya chere na nwanyị di ya nwụrụ ga-enwe obi ụtọ karị ma ọ bụrụ na ọ nọgide n’alụgharịghị di, ma “o nweere onwe ya ịlụ onye ọ chọrọ, nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 7:39, 40; Ndị Rom 7:2, 3) Pọl kwukwara n’akwụkwọ ozi o degaara Timoti, sị: “Ana m achọ ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́ lụọ di.” (1 Timoti 5:14) Ya mere, ọ bụghị arụ ma nwanyị di ya nwụrụ kpebie ịlụgharị di.

Gịnịzi ka okwu ahụ Pọl gwara Timoti pụtara? Ọ bụ nanị n’amaokwu a ka e ji okwu ahụ bụ́ “nwunye nke otu di” mee ihe? N’asụsụ mbụ e ji dee Bible, ihe ọ pụtara n’ụzọ nkịtị bụ “nwanyị nwere otu nwoke.” Ọ dị mma ịmara na okwu a yiri okwu Pọl ji mee ihe ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ozi ya, nke bụ́, “di nke otu nwunye,” ma ọ bụ “nwoke nwere otu nwanyị,” dị ka ọ dị n’asụsụ mbụ e ji dee Bible. (1 Timoti 3:2, 12; Taịtọs 1:6) Pọl ji okwu bụ́ “di nke otu nwunye” mee ihe mgbe ọ na-edepụta ihe a chọrọ n’aka ndị na-agbalị iru eru ije ozi dị ka ndị nlekọta ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi. N’ụzọ bụ́ isi, ihe ọ na-ekwu n’ebe a bụ na iji ruo eruo maka ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ, nwoke, ma ọ bụrụ na ọ lụrụ nwanyị, aghaghị ikwesị ntụkwasị obi nye nwunye ya ma kwụsie ike n’akụkụ ya, ọ gaghịkwa abụ onye a na-ebo ebubo na ọ na-eme omume rụrụ arụ. * Ọ bụrụ otú ahụ, okwu ahụ e ji mee ihe na 1 Timoti 5:9 yiri ka ọ na-ekwu banyere otu ihe ahụ: Ka nwanyị di ya nwụrụ wee nwee ike iru eru inweta enyemaka site n’aka ọgbakọ, ọ ghaghị ịbụ nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi na nke kwụsiri ike n’akụkụ di ya mgbe di ya ka nọ ndụ nakwa onye na-adịtụghị etinye aka n’omume rụrụ arụ. Ihe ndị ọzọ Pọl depụtara na-egosi n’ezie na ọ bụ ụdị nwanyị a di ya nwụrụ nke a kọwara n’ebe a ka ọ na-ekwu okwu ya.—1 Timoti 5:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’oge ndịozi, bụ́ mgbe ndị Gris na ndị Rom na-achị, a dịghị ekwe ka ụmụ nwanyị nwee ihe karịrị otu di n’otu oge. N’ihi ya, o yighị ka ọ bụ nke a ka Pọl degaara Timoti akwụkwọ banyere ya, o yighịkwa ka ọ nọ na-abara ndị na-akpa àgwà dị otú ahụ mba.

^ par. 5 Iji nweta ebe a tụlere okwu a, lee Ụlọ Nche nke October 15, 1996, peeji nke 17, na “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche nke June 1, 1981, peeji nke 30.