Azịza Ndị Na-enye Aka!
Azịza Ndị Na-enye Aka!
ỌTỤTỤ n’ime ndụmọdụ ndị e nyere n’akwụkwọ ndị na-akọwara ndị mmadụ otú ha ga-esi na-enyere onwe ha aka taa na-elekwasịkarị anya n’inyere ndị dabarala ná nsogbu aka. Ma Bible dị iche. Ọ bụ ezie na ndụmọdụ ndị dị na Bible nwere ike inyere ndị dabarala ná nsogbu aka, o nwere ihe ọzọ ka mkpa Bible na-enyere mmadụ aka na ya. Ndụmọdụ ndị dị na ya na-enyere mmadụ aka izere mmehie ndị pụrụ ime ka mmadụ kpatara onwe ya ihe isi ike.
Bible pụrụ “inye ndị na-enweghị uche ezi uche, inye nwa okorobịa ihe ọmụma na izuzu.” (Ilu 1:4) Ọ bụrụ na i tinye ndụmọdụ ndị dị na Bible n’ọrụ, “izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ.” (Ilu 2:11, 12) Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ bụ́ ndị na-egosi nnọọ na ige ntị na ndụmọdụ dị na Bible nwere ike ime ka mmadụ nwee ezi ahụ́ ike, mee ka mmadụ na-enwekwu obi ụtọ n’ezinụlọ ya, meekwa ka onye ahụ bụrụ onye ọrụ na-eme nke ọma ma ọ bụkwanụ ezigbo ọga.
Zere Ịṅụbiga Mmanya Ókè
Bible akatọghị mmadụ ịṅụru mmanya n’ókè kwesịrị ekwesị. Pọl onyeozi kwuru ihe gosiri na mmanya pụrụ ịgwọ ọrịa mgbe ọ gwara Timoti, sị: “Aṅụkwala mmiri ọzọ, kama na-eji obere mmanya eme ihe maka afọ gị na ọrịa nke ị na-arịakarị.” (1 Timoti 5:23) Akụkụ Bible ndị ọzọ na-egosi na Chineke ekeghị mmanya ka ọ bụrụ nanị ihe e ji agwọ ọrịa. A kọwara mmanya dị ka ihe “na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:15) Ma Bible dọrọ aka ná ntị megide mmadụ ịghọ “ohu nke oké mmanya.” (Taịtọs 2:3) Bible na-ekwu, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vine ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè: n’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè ka a ga-anapụ ihe nile.” (Ilu 23:20, 21) Gịnị na-eme mgbe e leghaara ndụmọdụ a bara uru anya? Tụlee ihe ndị na-eme ná mba ole na ole.
Otu akwụkwọ Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike wepụtara n’afọ 2004, bụ́ nke na-akọ banyere otú ihe si kwụrụ n’ụwa n’ihe banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya na-ekwu, sị: “Nsogbu ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata na-efu mba Ireland ihe dị ka ijeri dọla atọ kwa afọ.” Akụkọ ahụ kwuru na ihe ndị so ná nnukwu ego a na-efu kwa afọ bụ “ego a na-emefu iji lekọta ndị ịṅụ oké mmanya kpataara ọrịa (narị nde dọla atọ na iri ise), ego na-efu n’ihe mberede okporo ụzọ n’ihi ịṅụ oké mmanya (narị nde dọla atọ na iri), ego na-efu n’ihi mpụ ndị mmadụ na-eme mgbe ha ṅụbigara mmanya ókè (otu narị nde dọla na iri abụọ na
isii), ego na-efu mgbe ndị mmadụ hapụrụ ọrụ n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè (otu ijeri dọla na narị nde dọla atọ).”Nke ka njọ karịa ego ịṅụ mmanya na-efu bụ nsogbu ọ na-akpatara ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’Australia, n’ime otu afọ, ndị ṅụbigara mmanya ókè gburu ihe karịrị narị puku mmadụ ise ilu. Na France, a na-ekwu na ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè kpatara ihe dị ka pasent iri atọ nke ndị di gburu nwunye ha ilu ma ọ bụ ndị nwunye gburu di ha ilu. N’ihi ihe ndị a nile e kwuru, ì cheghị na ndụmọdụ ahụ e nyere na Bible banyere ịṅụbiga mmanye ókè bụ ihe ezi uche dị na ya?
Zere Àgwà Ndị Na-emebi Ihe n’Ahụ́
N’ihe dị ka afọ 1942, bụ́ mgbe a ka weere ise siga dị ka ihe e ji akpa nganga, Ụlọ Nche nyeere ndị na-agụ ya aka ịghọta na ise siga megidere ụkpụrụ ndị dị na Bible nakwa na anyị kwesịrị izere ya. Otu isiokwu e bipụtara n’afọ ahụ kọwara na ndị chọrọ ime ihe Chineke na-achọ aghaghị ịgbaso iwu ahụ dị na Bible nke gwara anyị ka anyị “sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Ihe dị ka afọ iri isii na ise agafeela kemgbe e dere ihe a n’Ụlọ Nche, ma ndụmọdụ ahụ Bible nyere ọ̀ ka bụghị ihe amamihe dị na ya?
N’afọ 2006, Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ise siga bụ “ihe nke abụọ kasị egbu ndị mmadụ n’ụwa.” Kwa afọ, ihe dị ka nde mmadụ ise na-anwụ n’ihi ise siga. Nke a karịrị nnọọ ndị ọrịa AIDS na-egbu kwa afọ nke bụ́ nde mmadụ atọ. N’agbata afọ 1900 na 1999, otu narị nde mmadụ nwụrụ n’ihi ise siga, nke bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’agha nile a lụrụ n’afọ ndị ahụ. N’ezie, ọtụtụ ndị achọpụtala ugbu a na amamihe dị n’izere ise siga.
“Gbanahụnụ Ịkwa Iko”
Ọtụtụ mmadụ anaghị eji ike ekwere ihe Bible kwuru banyere mmekọahụ. Ọ bụ ezie na e meela ka ọtụtụ mmadụ kwere na Bible katọrọ inwe mmekọahụ, ma nke bụ́ eziokwu bụ na Bible akatọghị mmekọahụ nile. Ma o nyere ndụmọdụ ndị bara uru banyere otú ụmụ mmadụ kwesịrị isi na-egbo agụụ mmekọahụ ha na-enwe. Bible na-ekwu na ọ bụ nanị nwoke na nwanyị bụ́ di na nwunye ka Chineke nyere ikike inwe mmekọahụ. (Jenesis 2:24; Matiu 19:4-6; Ndị Hibru 13:4) Mmekọahụ bụ otu ụzọ di na nwunye si egosi ịhụnanya miri emi n’ebe ibe ha nọ. (1 Ndị Kọrint 7:1-5) Ụmụ ọ bụla ha ga-amụta ga-enwe nne na nna hụrụ onwe ha n’anya.—Ndị Kọlọsi 3:18-21.
A bịa n’ihe banyere inwe mmekọahụ aghara aghara, Bible nyere iwu, sị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) N’ihi gịnị ka e ji nye iwu a? Amaokwu Bible ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Mmehie ọ bụla ọzọ nke mmadụ pụrụ ime dị n’elu ahụ́ ya, ma onye nọgidere na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” Gịnị ka ileghara ndụmọdụ a Bible na-enye banyere mmekọahụ anya na-akpata?
Tụlee ihe na-eme na United States. Ugbu a, n’ime mba ndị mepere emepe e nwere n’ụwa, ọ bụ mba ahụ kasị nwee ụmụ agbọghọ ka dị afọ iri na ụma tụụrụ ime ọkwà, nke bụ́ ihe dị ka narị
puku ụmụ agbọghọ asatọ na iri puku ise kwa afọ. Ọtụtụ n’ime ụmụ agbọghọ ndị a na-esipụ ụmụ ha, ebe ndị nke na-esipụghị nke ha na-aghọ ndị nne na-enweghị di. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ n’ime ụmụ agbọghọ ndị a na-agbalị ike ha iji ịhụnanya zụọ ụmụ ha ma kụziere ha irube isi, ụfọdụ enwekwaala ihe ịga nke ọma n’ime nke a. Ma ebe ọ nọ jọgbuo onwe ya bụ na o yikarịrị ka ụmụ nwoke ụmụ agbọghọ ndị a na-alụbeghị di na-amụ hà na-emesị mete ihe a ga-eji tụọ ha mkpọrọ, ebe ụmụ ha ndị nwanyị na-amụkwa nwa nke ha mgbe ha ka dị afọ iri na ụma. Ka otu onye na-eme nnyocha bụ́ Robert Lerman tụlechara ihe ndị e dekọrọ merela n’ọtụtụ afọ ndị gara aga, o dere, sị: “O yiri ka ọ bụ n’ihi na enwekarịziri ọtụtụ ezinụlọ ọ bụ nanị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ mere e ji nwee ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ na-akpa ọhaneze aka ọjọọ taa. Ihe ndị so ná nsogbu ndị a bụ na ọtụtụ ụmụaka na-akwụsị ịga akwụkwọ, ọtụtụ na-aṅụbiga mmanya ókè na-aṅụkwa ọgwụ ike, ndị ọzọ na-atụrụ ime ọkwà ma mụọ nwa a na-achọghị, tinyekwara na a na-enwe ọtụtụ ụmụaka isi ike.”Ndị na-enwe mmekọahụ aghara aghara na-ebutekarị ajọ ọrịa dị iche iche, ọtụtụ na-enwekarịkwa uche mgbasasị. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Pediatrics na-ekwu, sị: “Ihe ndekọ e nwere na-egosi na ndị na-eto eto maliterela inwe mmekọahụ na-adakarị mbà n’obi, ọtụtụ n’ime ha na-achọkarịkwa igbu onwe ha.” Òtù America Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru ọrịa ndị ọzọ ndị a na-ebute site n’inwe mmekọahụ, sị: “Ihe karịrị ọkara ndị nile bi na [United States] ga-arịa otu ọrịa a na-ebute site n’inwe mmekọahụ n’otu oge ma ọ bụ ọzọ ná ndụ ha.” Chegodị obi mgbawa na ahụhụ ụmụ mmadụ gaara ezerewo ma ọ bụrụ na ha erube isi na ndụmọdụ ndị Bible nyere banyere inwe mmekọahụ!
Mee Ka Ezinụlọ Gị Kwụsie Ike
Ihe ndị e dekọrọ na Bible abụghị nanị ndụmọdụ banyere ihe ndị ga-emerụ anyị ahụ́. Bible nwekwara ndụmọdụ ndị a pụrụ itinye n’ọrụ banyere otú mmadụ ga-esi mee ka ndụ ezinụlọ ya ka mma.
Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” (Ndị Efesọs 5:28) Kama iwere ndị nwunye ha ka ndị na-enweghị ihe ha bụ, a gbara ndị bụ́ di ume ka ha soro ha “na-ebi n’otu ụzọ ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike, ihe bụ́ nwanyị.” (1 Pita 3:7) Ọ bụrụ na e nwee esemokwu, a gwara ndị bụ́ di, sị: “Nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, unu adịkwala na-eweso ha iwe n’ụzọ dị ilu.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Ọ̀ bụ na i kweghị na ọ bụrụ na di etinye ndụmọdụ a n’ọrụ, nwunye ya ga-ahụ ya n’anya ma sọpụrụkwa ya?
Bible na-agwakwa ndị bụ́ nwunye, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ . . . Onye bụ́ nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” (Ndị Efesọs 5:22, 23, 33) Ì cheghị na nwunye nke na-agbaso ndụmọdụ a mgbe ọ na-agwa di ya okwu ma ọ bụ mgbe ọ na-ekwu banyere di ya ga-abụ onye di ya hụrụ nnọọ anya?
A bịa n’ihe banyere ịzụ ụmụaka, ndụmọdụ Bible na-enye unu bụ́ ndị nne na nna bụ ka unu na ụmụ unu na-ekwurịta okwu ‘mgbe unu na-anọdụ n’ụlọ unu, na mgbe unu na-eje ije n’ụzọ, na mgbe unu na-edina ala, na mgbe unu na-ebili ọtọ.’ (Deuterọnọmi 6:7) E nyere ndị bụ́ nna ndụmọdụ karịsịa ka ha na-enye ụmụ ha ọzụzụ ma jiri ịhụnanya na-adọ ha aka ná ntị. Okwu Chineke na-asị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Ọ gwakwara ụmụ, sị: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi,” gwakwa ha ka ha “sọpụrụ nna [ha] na nne [ha].” *—Ndị Efesọs 6:1, 2.
Ì chere na ndụmọdụ a ga-abara ezinụlọ ndị na-etinye ha n’ọrụ uru? I nwere ike ịsị, ‘Ee, ikwu ya n’ọnụ dị mfe, isiokwu bụ ma ọ̀ ga-ekwe omume?’ Anyị na-agba gị ume ka ị gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ọtụtụ ezinụlọ ndị na-agbalị itinye ndụmọdụ ndị a mara mma Bible na-enye n’ọrụ. Gị na ha kparịta ụka. Jiri anya gị kirie otú ndị nọ n’ezinụlọ ndị ahụ si emeso ibe ha ihe. Ị ga-eji anya gị hụ na itinye
ihe Bible na-ekwu n’ọrụ na-eme n’ezie ka ezinụlọ nwee obi ụtọ!Onye Ọrụ nke Na-arụsi Ọrụ Ike na Ọga Na-akwụwa Aka Ọtọ
Gịnị ka Bible nwere ikwu ma a bịa n’ihe banyere mmadụ ịgbalị ike ya ka a ghara ịchụ ya n’ọrụ? Bible na-ekwu na o yikarịrị ka a na-eji onye ọrụ ọ bụla maara ọrụ ya nke ọma kpọrọ ihe ma na-akwụ ya ụgwọ ọrụ ya. Eze Solomọn maara ihe jụrụ, sị: “Ị̀ hụwo mmadụ nke na-eme ngwa n’ije ozi ya? n’ihu ndị eze ka ọ ga-eguzo onwe ya; ọ gaghị eguzo onwe ya n’ihu ndị a na-amaghị aha ha.” (Ilu 22:29) Ma, “onye umengwụ” na-adị onye were ya n’ọrụ ka “anwụrụ ọkụ si adị n’ebe anya dị.” (Ilu 10:26) Bible na-agba ndị e were n’ọrụ ume ka ha na-akwụwa aka ha ọtọ ma na-arụsi ọrụ ha ike. “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, na-eji aka ya arụ ọrụ ọma.” (Ndị Efesọs 4:28) Ndụmọdụ a dịkwa mkpa ọbụna mgbe onye were anyị n’ọrụ na-anọghị nso. “Unu ndị bụ́ ohu, na-eruberenụ ndị bụ́ nna ukwu unu n’echiche anụ ahụ́ isi n’ihe ọ bụla, ọ bụghị n’omume ije ozi ka e wee hụ unu, dị ka ndị na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, kama n’izi ezi nke obi, n’ịtụ egwu Jehova.” (Ndị Kọlọsi 3:22) Ọ̀ bụrụ na ị bụ ọga, ị̀ gaghị ahụ onye ọrụ gị na-etinye ndụmọdụ a n’ọrụ n’anya?
Bible na-enyekwanụ ndị bụ́ ọga ndụmọdụ a, sị: “Onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.” (1 Timoti 5:18) N’Iwu ahụ Chineke nyere ndị Izrel, ọ gwara ndị ọga ka ha na-akwụ ndị ha were n’ọrụ ụgwọ n’oge ma na-akwụ ha ihe e kwesịrị ịkwụ ha. Mozis dere, sị: “Emegbula mmadụ ibe gị, anapụkwala ya ihe n’ike: ụgwọ ọrụ nke onye e goro ọrụ agaghị adịgide n’aka gị ogologo abalị ruo ụtụtụ.” (Levitikọs 19:13) Ọ̀ bụ na obi agaghị adị gị ụtọ ịrụrụ ọga na-agbaso ntụziaka a dị na Bible ma na-akwụ gị ụgwọ mgbe kwesịrị ekwesị na otú kwesịrị ekwesị ọrụ?
Ebe A Pụrụ Isi Nweta Amamihe Ka Elu
Ò juru gị anya na Bible, bụ́ akwụkwọ merela ochie, nwere ndụmọdụ ndị na-abara anyị uru taa? Ihe mere ndụmọdụ dị na Bible ji kara baa uru taa mgbe ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ na-abaghịzi uru bụ n’ihi na ihe e dere n’ime ya abụghị okwu mmadụ kama ọ bụ “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Anyị na-agba gị ume iwepụta ohere iji mụkwuo Okwu Chineke. Ọ bụrụ na i mee ya, ị ga-amalite ịhụ Jehova Chineke bụ́ Onye chepụtara ihe e dere na Bible n’anya. Tinye ndụmọdụ ndị Jehova na-enye n’ọrụ ma hụ ka ọ ga-esi chebe gị pụọ n’ihe ndị ga-etinye gị ná nsogbu ma nyere gị aka ibi ndụ ka mma. Ọ bụrụ na i mee nke a, ị ‘ga-abịaru Chineke nso, ọ ga-abịarukwa gị nso.’ (Jems 4:8) Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ nwere ike inyere gị aka n’ụzọ dị otú ahụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 20 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ebe a kọwakwuru ụkpụrụ Bible ndị ga-enyere ezinụlọ gị aka, gụọ akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ì chere na ezi uche dị n’ihe Bible na-ekwu banyere ịṅụbiga mmanya ókè?
[Foto dị na peeji nke 5]
Ị̀ kweere na ndụmọdụ Bible nyere banyere izere ise siga?
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ịgbaso ndụmọdụ Bible na-eme ka ndụ ezinụlọ mmadụ na-enyekwu obi ụtọ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]
Ụwa: Foto si n’aka òtù NASA