Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Obi Umeala Na-edo Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’Anya

Iji Obi Umeala Na-edo Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’Anya

Iji Obi Umeala Na-edo Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’Anya

“Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru.”—NDỊ HIBRU 13:17.

1, 2. Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na Jehova na Jizọs bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya?

JEHOVA CHINEKE na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ Ndị Ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya. Aịzaịa buru amụma, sị: “Lee, Onyenwe anyị Jehova ga-abịa dị ka onye di ike, ogwe aka Ya ga na-achịkwara Ya . . . Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.”—Aịsaịa 40:10, 11.

2 Amụma a e buru na a ga-eme ka ndị Juu lọghachi n’obodo ha mezuru nke mbụ ya mgbe ndị fọdụrụ n’ime ha laghachiri na Juda na 537 T.O.A. (2 Ihe E Mere 36:22, 23) O mezukwara ọzọ mgbe Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, napụtara ihe ahụ fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ na “Babilọn Ukwu ahụ” na 1919. (Mkpughe 18:2; Aịsaịa 44:28) Jizọs bụ “ogwe aka” Jehova ji na-achị, nke o ji achịkọta atụrụ ya ma na-elekọta ha n’ụzọ dị nro. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ, amakwaara m atụrụ m, atụrụ m makwaara m.”—Jọn 10:14.

3. Olee otú Jehova si gosi na otú e si emeso atụrụ ya ihe na-emetụ ya n’ahụ́?

3 Amụma ahụ dị n’Aịsaịa 40:10, 11 na-ekwu banyere ụzọ dị nro Jehova si azụ ndị ya dị ka atụrụ. (Abụ Ọma 23:1-6) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’elu ala, o mesokwara ndị na-eso ụzọ ya na ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị nro. (Matiu 11:28-30; Mak 6:34) Ma Jehova ma Jizọs kpọrọ omume obi ịta mmiri nke ndị ọzụzụ atụrụ, ma ọ bụ ndị ndú Izrel asị, bụ́ ndị ihere onwe ha na-adịghị eme ileghara atụrụ Jehova anya na irigbu ha. (Ezikiel 34:2-10; Matiu 23:3, 4, 15) Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-azọpụta ìgwè ewu na atụrụ nke m, ha agaghị aghọkwa ihe nlụta n’agha ọzọ; M ga-ekpekwa ikpe n’etiti anụ na anụ. M ga-emekwa ka otu onye ọzụzụ atụrụ biliere ha, ọ ga-azụkwa ha, ọbụna ohu m, bụ́ Devid; ya onwe ya ga-azụ ha, ya onwe ya ga-abụkwara ha onye ọzụzụ atụrụ.” (Ezikiel 34:22, 23) Ná mgbe ikpeazụ a, Jizọs Kraịst, bụ́ Devid ahụ Ka Ukwuu, bụ “otu onye ọzụzụ atụrụ” ahụ Jehova họpụtara ilekọta ndị ohu Ya nile nọ n’ụwa, ma Ndị Kraịst e tere mmanụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ.—Jọn 10:16.

Onyinye Chineke Nyere Ọgbakọ Ndị Kraịst

4, 5. (a) Olee onyinye dị oké ọnụ ahịa nke Jehova nyere ndị ya nọ n’ụwa? (b) Olee onyinye Jizọs nyere ọgbakọ ya?

4 Jehova nyere ọgbakọ Ndị Kraịst onyinye dị oké ọnụ ahịa mgbe o nyere ndị ohu ya nọ n’ụwa “otu onye ọzụzụ atụrụ,” bụ́ Jizọs Kraịst. E buru amụma banyere Onye Ndú a sitere n’eluigwe nke e nyere anyị dị ka onyinye n’Aịsaịa 55:4: “Lee, enyewo m ya ka ọ bụrụ onye àmà nye ndị nile dị iche iche, ka ọ bụrụ onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche.” E si ná mba nile, agbụrụ nile, ndị nile, na asụsụ nile na-achịkọta ma Ndị Kraịst e tere mmanụ ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ. (Mkpughe 5:9, 10; 7:9) Ọ bụ ha mejupụtara ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, bụ́ “otu ìgwè atụrụ,” nke nọ n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ,” bụ́ Kraịst Jizọs.

5 Jizọs nyekwara ọgbakọ ya nọ n’ụwa onyinye dị oké ọnụ ahịa. O nyewo anyị ndị nlekọta na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-azụ atụrụ Jehova n’ụzọ dị nro dị ka Jehova na Jizọs na-eme. Pọl onyeozi kwuru okwu banyere onyinye a e ji ịhụnanya nye anyị n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs. O dere, sị: “‘Mgbe ọ rịgooro n’elu o bupụrụ ndị a dọọrọ n’agha; o nyere onyinye n’ụdị mmadụ.’ O nyekwara ụfọdụ dị ka ndịozi, ụfọdụ dị ka ndị amụma, ụfọdụ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma, ụfọdụ dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi, iji wee gbazigharịa ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst ahụ elu.”—Ndị Efesọs 4:8, 11, 12.

6. Ná Mkpughe 1:16, 20, gịnị ka e ji nọchie anya ndị nlekọta e tere mmanụ bụ́ ndị so n’òtù ndị okenye, gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere ndị okenye a họpụtara ahọpụta bụ́ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ?

6 ‘Onyinye ndị a dị n’ụdị mmadụ’ bụ ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, ndị Jehova na Ọkpara ya ji mmụọ nsọ họpụta ka ha na-azụ atụrụ ha n’ụzọ dị nro. (Ọrụ 20:28, 29) Ná mmalite, ndị nlekọta a nile bụcha Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ná Mkpughe 1:16, 20, e ji “kpakpando” ma ọ bụ “ndị mmụọ ozi” nọ n’aka nri Kraịst mee ihe nnọchianya nke ndị so n’òtù ndị okenye nke ọgbakọ ndị e tere mmanụ mejupụtara. Otú ọ dị, ná mgbe ikpeazụ a, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bụzi ndị okenye ọgbakọ bụ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ n’ihi na ọnụ ọgụgụ nke ndị nlekọta e tere mmanụ na-agbada agbada. Ebe ọ bụ ndị na-anọchite anya Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị a site ná nduzi nke mmụọ nsọ, a pụkwara ikwu na ha onwe ha nọ n’okpuru aka nri (ma ọ bụ nduzi) nke Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst. (Aịsaịa 61:5, 6) Ebe ọ bụ na ndị okenye nọ n’ọgbakọ anyị dị iche iche na-edo onwe ha n’okpuru Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ, ha kwesịrị nnọọ ka anyị na-akwado ha nke ọma.—Ndị Kọlọsi 1:18.

Irube Isi na Ido Onwe Anyị n’Okpuru

7. Olee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere banyere otú anyị kwesịrị isi na-akpaso ndị nlekọta e nwere n’ọgbakọ àgwà?

7 Ndị Ọzụzụ Atụrụ anyị nọ n’eluigwe, bụ́ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, na-atụ anya ka anyị na-erubere ndị okenye, bụ́ ndị e nyere ọrụ ha ga na-arụ n’ọgbakọ, isi ma na-edo onwe anyị n’okpuru ha. (1 Pita 5:5) Mmụọ nsọ kpaliri Pọl onyeozi ide, sị: “Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu, bụ́ ndị gwaworo unu okwu Chineke, ka unu na-ahụkwa ihe na-esi n’omume ha apụta, na-eṅominụ okwukwe ha. Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.”—Ndị Hibru 13:7, 17.

8. Gịnị ka Pọl na-agwa anyị ka anyị ‘na-ahụ,’ oleekwa otú anyị kwesịrị isi ‘na-erube isi’?

8 Rịba ama na Pọl gwara anyị ka anyị ‘na-ahụ,’ ma ọ bụ ka anyị na-eleru anya iji chọpụta, ihe si n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị okenye apụta ma na-eṅomi okwukwe ha. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-erube isi ma na-anakwere nduzi nke ndị ikom ndị a a họpụtara ahọpụta. Ọkà mmụta Bible bụ́ R. T. France na-akọwa na n’asụsụ Grik mbụ e ji dee Bible, okwu a sụgharịrị ebe a ịbụ ‘na-erube isi’ abụghị “ụdị nke a na-ejikarị eme ihe mgbe a na-ekwu okwu banyere nrubeisi, kama ọ pụtara n’ụzọ nkịtị ‘ịbụ onye e mere ka o kwere ime ihe,’ nke na-egosi mmadụ iji obi ya nakwere nduzi nke onye na-edu ndú.” Ihe mere anyị ji erubere ndị okenye isi abụghị nanị n’ihi na a gwara anyị n’Okwu Chineke ka anyị mee otú ahụ kamakwa ọ bụ n’ihi na e mere ka anyị kwenye na ha bu ma ọdịmma Alaeze ahụ ma ọdịmma anyị n’obi. Anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị na-anakwere nduzi ha.

9. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ‘na-edo onwe anyị n’okpuru’ ma na-erubekwa isi?

9 Ma gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ya adị anyị ka ntụziaka ndị okenye nyere banyere otu ihe abụghị ụzọ kasị mma isi mee ihe ahụ? Ọ bụ n’ebe a ka a chọrọ ka anyị gosipụta na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru. Ọ dị mfe irube isi mgbe ihe a gwara anyị mee doro nnọọ anya ma kwekọọ n’echiche anyị, ma anyị ga-egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru n’ezie mgbe anyị kwenyeere ihe a gwara anyị mee ọbụna ma a sị na anyị aghọtaghị ntụziaka ahụ e nyere anyị. Pita, bụ́ onye mesịrị ghọọ onyeozi, doro onwe ya n’okpuru n’ụzọ dị otú a.—Luk 5:4, 5.

Ihe Anọ Mere Anyị Ji Kwesị Iji Obi Anyị Dum Na-akwado Ndị Okenye Ọgbakọ

10, 11. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị nlekọta siworo ‘gwa Ndị Kraịst ibe ha okwu Chineke’ na narị afọ mbụ nakwa taa?

10 Ndị Hibru 13:7, 17, bụ́ nke e hotara na paragraf nke asaa, Pọl onyeozi gwara anyị ihe anọ mere anyị ji kwesị irubere ndị okenye ọgbakọ isi ma na-edo onwe anyị n’okpuru ha. Nke mbụ bụ na ha ‘gwara anyị okwu Chineke.’ Cheta na ‘onyinye ndị ahụ Jizọs nyere ọgbakọ n’ụdị mmadụ’ bụ iji “gbazigharịa ndị nsọ.” (Ndị Efesọs 4:11, 12) Ọ gbazigharịrị echiche na àgwà nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ site n’aka ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị mmụọ nsọ kpaliri ụfọdụ n’ime ha idegara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi. O ji ndị nlekọta dị otú ahụ e ji mmụọ nsọ họpụta duzie ma wulie Ndị Kraịst elu na narị afọ mbụ.—1 Ndị Kọrịnt 16:15-18; 2 Timoti 2:2; Taịtọs 1:5.

11 Taa, Jizọs na-eduzi anyị site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bụ́ nke Òtù Na-achị Isi na ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-anọchite anya ha. (Matiu 24:45) Iji gosi na anyị na-akwanyere “onyeisi ọzụzụ atụrụ” ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst ùgwù, anyị ga-agbaso ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka unu na-akwanyere ndị ahụ ùgwù, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ma na-elekọta unu n’Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ.”—1 Pita 5:4; 1 Ndị Tesalonaịka 5:12; 1 Timoti 5:17.

12. Olee otú ndị nlekọta si “na-eche mkpụrụ obi [anyị] nche”?

12 Ihe nke abụọ mere anyị ga-eji na-erubere ndị okenye ọgbakọ isi bụ n’ihi na “ha na-eche mkpụrụ obi [anyị] nche.” Ọ bụrụ na ha achọpụta àgwà ọ bụla pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke, ha na-enye anyị ndụmọdụ ngwa ngwa iji gbazie anyị. (Ndị Galeshia 6:1) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘na-eche nche’ pụtara n’ụzọ nkịtị, “ịghara ihi ụra.” Dị ka otu ọkà mmụta Bible kwuru, ọ “na-ezo aka n’otú ndị ọzụzụ atụrụ si anọgide nnọọ na nche.” E wezụga na ndị okenye na-anọ na nche n’ụzọ ime mmụọ, ha nwere ike ọbụna ịmụ anya n’ụzọ nkịtị iji hụ na anyị na-eme nke ọma n’ozi Jehova. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji obi anyị dum na-akwanyere ndị okenye dị otú a na-ahụ n’anya ùgwù, bụ́ ndị na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji ṅomie otú Jizọs Kraịst, bụ́ “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ,” si elekọta atụrụ Jehova n’ụzọ dị nro?—Ndị Hibru 13:20.

13. Ònye ka ndị nlekọta na Ndị Kraịst nile ga-aza ajụjụ, oleekwa otú ha ga-esi mee nke a?

13 Ihe nke atọ mere anyị ga-eji jiri obi anyị dum na-akwado ndị nlekọta bụ n’ihi na ha na-eche anyị nche “dị ka ndị ga-aza ajụjụ.” Ndị nlekọta na-echeta na ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru Ndị Ọzụzụ Atụrụ ahụ nọ n’eluigwe, bụ́ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst. (Ezikiel 34:22-24) Ọ bụ Jehova nwe atụrụ ahụ, bụ́ ndị “o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta,” ọ ga-ajụkwa ndị nlekọta a ọ họpụtara ajụjụ maka otú ha si mesoo atụrụ ya ihe, nke kwesịrị ịbụ “n’ụzọ dị nro.” (Ọrụ 20:28, 29) N’ihi ya, anyị nile ga-aza Jehova ajụjụ banyere otú anyị si na-anakwere nduzi ya. (Ndị Rom 14:10-12) Irubere ndị okenye a họpụtara ahọpụta isi na-egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ndị Kọlọsi 2:19.

14. Gịnị pụrụ ime ka ndị nlekọta ọgbakọ jiri ‘ịsụ ude’ na-aza ajụjụ, gịnịkwa ka nke a ga-arụpụta?

14 Pọl kwuru ihe nke anọ mere anyị ji kwesị iji obi umeala na-edo onwe anyị n’okpuru ndị nlekọta ọgbakọ. O dere, sị: “Ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.” (Ndị Hibru 13:17) Ndị okenye ọgbakọ na-ebu ibu dị arụ n’ihi ọrụ dị ukwuu ha nwere nke gụnyere izi ihe, ịzụ atụrụ Jehova, ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, ịzụlite ezinụlọ ha, na ịhụ maka nsogbu ndị na-ebilite n’ọgbakọ. (2 Ndị Kọrịnt 11:28, 29) Ọ bụrụ na anyị adịghị akwado ha, ihe anyị na-eme bụ ịtụkwasịkwu ihe n’ibu ndị ha bu ebu. Nke a ga-eme ka ha ‘na-asụ ude’ n’ihi ike ọgwụgwụ. Ọ na-ewute Jehova ma anyị na-enupụrụ ndị okenye isi, nke ahụ pụkwara ibibiri anyị ihe. Ma, ọ bụrụ na anyị akwanyere ha ùgwù kwesịịrị ha ma na-akwado ha, ha pụrụ iji ọṅụ na-arụ ọrụ ha, nke a ga-emekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu meekwa ka e jiri ọṅụ na-ekwusa oziọma Alaeze ahụ.—Ndị Rom 15:5, 6.

Otú Anyị Si Egosipụta na Anyị Na-edo Onwe Anyị n’Okpuru

15. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-erube isi nakwa na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru?

15 E nwere ọtụtụ ụzọ pụtara ìhè anyị pụrụ isi na-akwado ndị nlekọta a họpụtara ahọpụta. N’ihi mgbanwe ụfọdụ e nwere n’otú ihe si aga n’ókèala unu, ndị okenye hà emewo ndokwa ka a na-enwe nzukọ ije ozi ubi n’ụbọchị na n’oge chọrọ ka anyị gbanwee usoro ihe omume anyị? Ka anyị gbalịsie ike ịkwado ndokwa ọhụrụ ahụ. Anyị pụrụ inweta ngọzi anyị na-atụghị anya ya. Onye nlekọta ije ozi ọ̀ na-abịa ileta Ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ anyị? Ka anyị soro nnọọ kwusaa ozi ọma n’izu ahụ. È nyere anyị ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ka anyị gbalịsie ike nọrọ ya ma mee ihe omume ahụ. Onye na-elekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anyị ọ̀ mara ọkwa na ọ bụ ìgwè anyị ga-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha? Ka anyị kwadosie ya ike dị ka ahụ́ ike na ume anyị kwere anyị. Anyị na-esi n’ụzọ ndị dị otú a na n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ndị Jehova na Ọkpara ya họpụtara ilekọta atụrụ ha.

16. Ọ bụrụ na onye okenye adịghị eme ihe dị ka e nyere ntụziaka ka e mee, gịnị mere nke a agaghị eme ka o kwesị ekwesị inupụ isi?

16 Mgbe ụfọdụ, onye okenye pụrụ ime ihe na-ekwekọghị ná ntụziaka nke ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya. Ọ bụrụ na ọ nọgide na-akpa àgwà otú a, ọ ga-aza Jehova ajụjụ, bụ́ “onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi [anyị].” (1 Pita 2:25) Ma, na ụfọdụ ndị okenye emeghị ihe otú kwesịrịnụ agaghị eme ka o kwesị ekwesị inupụ isi. Jehova adịghị akwado nnupụisi na isi ike.—Ọnụ Ọgụgụ 12:1, 2, 9-11.

Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Na-akwado Ndị Nlekọta

17. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ ihe?

17 Jehova Chineke maara na ndị ọ họpụtara dị ka ndị nlekọta bụ ndị na-ezughị okè. Ma, ọ ka ji ha na-eme ihe, sitekwa ná mmụọ nsọ ya, ọ na-azụ ndị ya nọ n’ụwa. N’ezie, ma n’ebe ndị okenye nọ ma n’ebe anyị nile nọ, “ike karịrị ike nkịtị [bụ] nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrịnt 4:7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ikele Jehova maka ihe o ji ndị nlekọta na-ekwesị ntụkwasị obi na-arụzu, anyị kwesịkwara iji obi anyị dum na-akwado ha.

18. Gịnị n’ezie ka anyị na-egosipụta mgbe anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ndị nlekọta?

18 Ndị nlekọta na-agbalị ike ha nile ime ihe kwekọrọ n’ụdị ndị ọzụzụ atụrụ Jehova kwuru na ya ga-ahọpụta ka ha na-elekọta atụrụ ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, dị ka e dekọrọ ya na Jeremaịa 3:15: “M ga-enyekwa unu ndị ọzụzụ atụrụ dị ka obi m si dị, ndị ga-eji ihe ọmụma na inwe uche azụ unu.” N’ezie, ndị okenye nọ n’etiti anyị na-arụ ọrụ dị mma nke bụ́ izi atụrụ Jehova ihe na ichebe ha. Ka anyị nọgide na-egosi na anyị nwere ekele maka ọrụ ha na-arụ site n’iji obi anyị dum na-akwado ha, site n’irubere ha isi, nakwa site n’ido onwe anyị n’okpuru ha. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị na-egosi ekele anyị nwere nye Ndị Ọzụzụ Atụrụ anyị nọ n’eluigwe bụ́ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst.

Ntụleghachi

• Olee otú Jehova na Jizọs Kraịst si gosi na ha bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya?

• E wezụga irubere ndị okenye isi, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ha?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa pụtara ìhè ka anyị pụrụ isi gosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 27]

Ndị okenye ọgbakọ na-anakwere nduzi Kraịst

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ndị ọzụzụ atụrụ Jehova họpụtara