Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe Ndụ

Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe Ndụ

Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe Ndụ

Ọ BỤ na nke ikpeazụ Jizọs si n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem na-apụ ka otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya, sị: “Onye Ozizi, lee! ụdị nkume na ụdị ihe owuwu ndị a bụ!” Ụlọ nsọ ahụ bụ ihe ndị Juu ji eme ọnụ, ha jikwa ya kpọrọ nnọọ ihe. Ma Jizọs zara ya, sị: “Ị̀ na-ahụ nnukwu ihe owuwu ndị a? A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya ma ọlị n’ebe a, ma ghara ịkwatu ya.”—Mak 13:1, 2.

Ihe a Jizọs kwuru na-awụ nnọọ akpata oyi n’ahụ́! Ụfọdụ okwute ndị e ji wuo ụlọ nsọ ahụ buru nnọọ ibu. Tụkwasị na nke a, ihe a Jizọs kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ gosiri na a ga-ebibi Jeruselem nakwa ma eleghị anya mba ndị Juu n’ozuzu ya, bụ́ ndị na-anọ n’ụlọ nsọ ahụ efe Chineke ofufe. N’ihi ya ndị na-eso ụzọ Jizọs gara n’ihu ịjụ ya, sị: “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama mgbe a kara aka na ihe ndị a nile ga-abịa ná njedebe?”—Mak 13:3, 4.

Jizọs gwara ha na “ọgwụgwụ erubeghị.” Ndị ahụ na-eso ụzọ ga-ebu ụzọ nụ akụkọ banyere agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri na ọrịa na-efe efe site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Mgbe ahụzi, ihe omume ndị dị egwu bụ́ ndị ga-eduga n’ọdachi a na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ ná mba ndị Juu ga-amalite ime. Nke ahụ ga-abụ “oké mkpagbu” n’ezie. Ma, Chineke ga-abata n’okwu ahụ iji zọpụta “ndị a họọrọ,” ya bụ́, Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Olee otú ọ ga-esi mee nke a?—Mak 13:7; Matiu 24:7, 21, 22; Luk 21:10, 11.

Judia Enupụrụ Rom Isi

Ndị Kraịst nọ na Jeruselem ka nọ na-atụ anya ọgwụgwụ ahụ ka afọ iri abụọ na asatọ e ji buo amụma banyere ya gasịrị. Agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa na-efe efe kpara Alaeze Ukwu Rom aka ọjọọ. (Lee igbe dị na peeji nke 9.) Agbụrụ dị iche iche e nwere na Judia nọ na-ebusorịta ibe ha agha. Ma, udo dịtụ n’ime Jeruselem. Ndị mmadụ nọ n’oge ahụ na-eri ihe, na-arụ ọrụ dịịrị ha, na-alụ di na nwunye, na-amụ ụmụ, na-emekwa ihe ndị ọzọ dịịrị ha n’ụbọchị. Nnukwu ụlọ nsọ ahụ mere ka ndị mmadụ chee na ọ dịghị ihe ga-eme Jeruselem.

N’ihe dị ka n’afọ 61 O.A., Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Jeruselem akwụkwọ. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ jara ha mma maka ntachi obi ha, ma ihe na-enye ya nsogbu n’obi bụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Jeruselem na-ebi ndụ ka a ga-asị na ha amaghị ihe na-aga ime. Ụfọdụ n’ime ha adịghị ejizi ihe ndị metụtara ofufe Chineke akpọrọ ihe ma ọ bụkwanụ ha adịghị akpacha àgwà ka Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 2:1; 5:11, 12) Pọl gbara ha ume, sị: “Ya mere, unu atụfula nkwuwa okwu unu . . . N’ihi na ọ fọdụrụ ‘nnọọ nwa oge,’ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarutekwa, ọ gaghịkwa egbu oge.’ ‘Ma onye ezi omume m ga-adị ndụ n’ihi okwukwe,’ ‘ọ bụrụkwa na ọ sụlaa azụ, mkpụrụ obi m enweghị obi ụtọ n’ebe ọ nọ.’” (Ndị Hibru 10:35-38) Ndụmọdụ a bịara nnọọ n’oge ya! Ma Ndị Kraịst ahụ, hà ga-egosipụta okwukwe ma ghọta otú amụma Jizọs si na-emezu? Mbibi Jeruselem ọ̀ dị nso n’ezie?

Ruo ihe dị ka afọ ise ọzọ, ihe nọgidere na-aka njọ na Jeruselem. N’ikpeazụ, n’afọ 66 O.A., otu Gọvanọ bụ́ onye Rom nke na-arụrụ aka, onye aha ya bụ́ Florus, weere talent iri na asaa n’ebe a na-edebe ego n’ụlọ nsọ ahụ, na-ekwu na ọ bụ “ụtụ isi ndị Juu ji ndị Rom n’ụgwọ.” Nke a were nnọọ ndị Juu iwe, ma mee ka ha nupụrụ ọchịchị Rom isi. Ndị Juu nupụrụ isi kwooro gaa Jeruselem ma gbuo ndị agha ndị Rom nọ n’ebe ahụ. Ha kwuziri n’atụghị egwu na Judia anọghịkwa n’okpuru ọchịchị ndị Rom. Nke a meziri ka ndị Judia na ndị Rom malite ịlụ agha!

N’ime ọnwa atọ, onye ọchịchị Rom nke na-achị Siria bụ́ Cestius Gallus, kpọọrọ iri puku ndị agha atọ gawa ebe ndịda iji kwụsị nnupụisi ndị Juu ahụ. Ndị agha ya rutere Jeruselem mgbe a na-eme Ememe Ụlọ Ntu ma banye n’ime ime obodo ndị dị na Jeruselem n’egbughị oge. Ndị nnupụisi ahụ gbabara n’ụlọ nsọ ịga zere isi ha mgbe ha hụrụ na ndị agha Rom akarịala ha. N’oge na-adịghị anya, ndị agha Rom malitere imebisị mgbidi ụlọ nsọ ahụ. Ụjọ bịara jide ndị Juu. Legodị, ndị agha na-ekpere arụsị amalitela imerụ ebe ndị Juu weere dị ka ebe kasị nsọ! Mgbe ahụ ka Ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ chetara okwu Jizọs, bụ́: ‘Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ, mgbe ahụ ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.’ (Matiu 24:15, 16) Hà ga-ekwere n’amụma Jizọs buru ma mee ihe ọ sịrị ha mee? Ihe ndị mesịrị mee gosiri na ndụ ha dabeere n’ịṅa ntị n’ihe Jizọs kwuru. Ma olee otú ha ga-esi gbapụ?

Ná mberede, n’enweghịkwa ihe e ji n’aka kpatara ya, Cestius Gallus kpọọrọ ndị agha ya si na Jeruselem pụọ ma ndị Juu ahụ na-enupụ isi siri ọnwụ chụrụ ha gawa. N’ụzọ dị ịtụnanya, oké mkpagbu ahụ e nwere n’obodo ahụ adịteghị aka. Ndị Kraịst gosiri na ha kweere n’okwu amụma ahụ Jizọs gwara ha ma si Jeruselem gbaga Pela bụ́ obodo nọ n’elu ugwu ma a gafee Osimiri Jọdan, nke na-esoghịkwa n’agha ahụ. Ha gbapụrụ nnọọ n’ezi oge. N’oge na-adịghị anya ndị nnupụisi ahụ lọghachiri Jeruselem ma manye ndị fọdụrụ n’obodo ahụ isonyere ha ná nnupụisi ha. * Ndị Kraịst ahụ gbagara Pela nọzi n’ebe ahụ dị nchebe na-eche ihe ọzọ ga-emenụ.

Ọnọdụ Aka Njọ Ruo n’Ókè nke na Onye Ọ Bụla Na-emezi Otú Masịrị Ya

Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ndị agha Rom ndị ọzọ zọọrọ njem na-abịa Jeruselem. N’afọ 67 O.A., Ọchịagha bụ́ Vespasian na nwa ya nwoke bụ́ Titus chịkọtara iri puku ndị agha isii. N’afọ abụọ sochirinụ, ndị agha a na-ebibisị ihe zọọrọ njem gawa Jeruselem, na-ebibisị ihe ọ bụla nọchiiri ha ụzọ. Ka nke a na-eme, ndị Juu nọ na-egburịta onwe ha n’ime Jeruselem! Ha bibisịrị ebe ndị a na-echekwa ọka n’obodo ahụ, kụrisịa ụlọ ndị nọ gburugburu ụlọ nsọ ahụ, ma gbuo ihe karịrị ndị Juu iri puku abụọ. Vespasian kwuru ihe mere o ji gbuo oge n’ibibi Jeruselem, sị: ‘Chineke na-edu ndị Rom n’agha karịa otú mụ onwe m si edu ha; ndị iro anyị ji aka ha na-egburịta onwe ha.’

Mgbe Eze Ukwu Rom bụ́ Nero nwụrụ, Vespasian laghachiri Rom iji weghara ọchịchị ma hapụ Titus ka ọ lụtọpụ agha ahụ ha na-alụso Judia. Titus rutere Jeruselem mgbe a na-akwadebe Ememe Ngabiga nke afọ 70 O.A., ma nọchibido ndị bi na Jeruselem na ndị bịara maka ememe ahụ. Ndị agha ya gbutusịrị osisi nile ha hụrụ n’obodo ndị dị na Judia ma jiri ha pịa osisi ha ji wuo mgbidi dị kilomita asaa n’ogologo gburugburu isi obodo ahụ nke ndị nọ n’ime ya tọrọ atọ. Nke a bụ nnọọ dị ka Jizọs si kwuo ya: “Ndị iro gị ga-eji osisi a pịrị ọnụ wuo ihe e wusiri ike gburugburu gị, ha ga-agbakwa gị gburugburu ma site n’akụkụ ọ bụla kpagbuo gị.”—Luk 19:43.

N’oge na-adịghị anya, ụkọ nri bịara kpawa obodo ahụ aka ọjọọ. Ndị ji ngwá ọgụ nọ na-ebukọrọ ihe ọ bụla ha hụrụ n’ụlọ ndị nwụrụ anwụ na ndị nọ n’ọnụ ọnwụ. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu nwanyị na-amaghị otú ọ ga-esi nweta nri gburu nwa ya rie, na-emezu amụma ahụ na-ekwu, sị: “Ị ga-erikwa mkpụrụ nke afọ gị, bụ́ anụ ahụ́ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom . . . n’ime nnọchigide n’agha na n’ime mkpagbu, nke ndị iro gị na-akpagbu gị.”—Deuterọnọmi 28:53-57.

E mechara merie Jeruselem mgbe ndị Rom nọchibidosịrị ya ruo ọnwa ise. A kwakọọrọ ihe ndị dị n’obodo ahụ na ihe ndị dị n’ime ụlọ nsọ ya e ji eme ọnụ ma suo obodo ahụ na ụlọ nsọ ya ọkụ, okwute ndị ahụ e ji wuo ya dakasịkwara. (Daniel 9:26) Otu nde mmadụ na otu narị puku nwụrụ; a kpụụrụ puku iri itoolu na asaa ndị ọzọ ịga gbaa ohu. * (Deuterọnọmi 28:68) Ọnụ ọgụgụ ndị Juu bizi na Judia ebughịkwa ibu. N’ezie, nke a bụ ọdachi a na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ na Judia, bụ́ nke kpaghasịrị ọchịchị, okpukpe, na ọdịnala ndị Juu. *

Ka ọ dịgodị, Ndị Kraịst ahụ nọ na Pela kelere nnọọ Chineke n’otú o si napụta ha. Ihe mere e ji chebe ha bụ n’ihi na ha kweere na amụma Bible ga-emezu.

Taa, ka anyị na-echeta ihe ndị ahụ merenụ, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Enwere m okwukwe nke pụrụ ime ka e chebe m n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ? Àbụ m onye ‘na-enwe okwukwe gaa n’ichebe mkpụrụ obi ndụ.’?’—Ndị Hibru 10:39; Mkpughe 7:14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kọrọ na ndị nnupụisi ahụ chụgidere ndị agha Rom ọsọ ruo abalị asaa tupu ha alọghachi Jeruselem.

^ par. 15 Dị ka otu ihe ndekọ e nwetara si kwuo, e kee ndị Juu nile nọ n’Alaeze Ukwu Rom ụzọ asaa, e gburu ihe karịrị otu ụzọ n’ime ha.

^ par. 15 Onye Juu bụ́ ọkà mmụta Bible bụ́ Alfred Edersheim dere, si: “N’ime nsogbu nile e nwetụrụla n’Izrel, ọ dịbeghị nke dị ka ọdachi a, ọ dịkwaghị nke a pụrụ iji tụnyere ya n’ime ọdachi ndị ọzọ e nwere mgbe ọ gasịrị.”

[Chaatị dị na peeji nke 9]

Akụkụ Dị Iche Iche nke Amụma Ndị Mezuru na Narị Afọ Mbụ

AGHA:

Gaul (39-40 O.A.)

Ebe Ugwu Africa (41 O.A.)

Britain (43, 60 O.A.)

Armenia (58-62 O.A.)

Agha ndị Judia lụrịtara n’etiti onwe ha (50-66 O.A.)

ALA ỌMA JIJIJI:

Rom (54 O.A.)

Pompeii (62 O.A.)

Eshia Maịnọ (53, 62 O.A.)

Krit (62 O.A.)

ỤNWỤ NRI:

Rom, Gris, Ijipt (c. 42 O.A.)

Judia (c. 46 O.A.)

ỌRỊA NA-EFE EFE:

Babilọnia (40 O.A.)

Rom (60, 65 O.A.)

NDỊ AMỤMA ỤGHA:

Judia (c. 56 O.A.)

[Map/Foto dị na peeji nke 10]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Agha Ndị Rom Lụrụ na Palestaịn Site n’afọ 67 O.A. ruo afọ 70 O.A.

Tọlemeas

Oké Osimiri Galili

Pela

PERIA

SAMERIA

Jeruselem

Oké Osimiri Nnu

JUDIA

Sesaria

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nanị map: Site na map e nwetara n’aka Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. and Survey of Israel

[Foto dị na peeji nke 11]

‘Ndị iro anyị ji aka ha na-egburịta onwe ha.’—Vespasian

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ndị agha Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70 O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 11]

Ihe ndị a kpụrụ n’ahụ́ ájá: Soprintendenza Archeologica di Roma; Vespasian: Bildarchiv Preussischer Kulturbesitz/Art Resource, NY