Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa bụ́ onye nọgidesiri ike n’arịrịọ ya? (Luk 11:5-10)

Ihe atụ a na-egosi ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-ekpe ekpere. Anyị kwesịrị ịdị na-arịọ arịrịọ n’esepụghị aka, ma ọ bụ nọgide na-arịọ arịrịọ, karịsịa maka mmụọ nsọ Chineke. (Luk 11:11-13)—12/15, peeji nke 20-22.

• Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe atụ Jizọs banyere otu nwanyị di ya nwụrụ na otu ọkàikpe? (Luk 18:1-8)

Ọ na-emesi ike mkpa ọ dị ikpe ekpere. N’adịghị ka ọkàikpe ahụ, Jehova bụ onye ezi omume ma na-achọ inyere anyị aka. Ọzọkwa, anyị kwesịrị inwe okwukwe ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’ihe atụ ahụ.—12/15, peeji nke 26-28.

• Gịnị mere Pọl onyeozi ji gwa Ndị Kraịst nọ na Kọrint ka ha ‘gbasapụ’? (2 Ndị Kọrint 6:11-13)

Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị bi na Kọrint ejighị ndị kwere ekwe ibe ha kpọrọ ihe, ha enweghị obi ịnabata mmadụ. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịdị na-enwe nnọọ mmasị n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ, ọbụna na-agbalị imetakwu ndị ọzọ enyi.—1/1, peeji nke 9-11.

• Gịnị bụ akara ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 7:3?

Mgbe Chineke ji mmụọ nsọ ya tee Ndị Kraịst mmanụ, a kaala ha akara nke mbụ. Ma Mkpughe 7:3 na-ekwu banyere ịka akara ikpeazụ, bụ́ mgbe o doro anya na ndị ahụ e tere mmanụ egosila nnọọ na ha na-ekwesị ntụkwasị obi.—1/1, peeji nke 30-31.

• Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta n’ihe e dekọrọ na Bible banyere Samuel?

Nke mbụ, ha kwesịrị ịkụziri ụmụ ha okwu Chineke, dị nnọọ ka nne na nna Samuel si kụziere ya. Ọzọkwa, ha kwesịrị ịgba ụmụ ha ume iji ozi Jehova mere aka ọrụ.—1/15, peeji nke 16.

• Ole otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-enwe obi ụtọ ka anyị na-echere Jehova?

Anyị “na-echere . . . ụbọchị Jehova,” na-atụ anya inwere onwe anyị mgbe ọ ga-ebibi ndị na-adịghị asọpụrụ ya. (2 Pita 3:7, 12) N’agbanyeghị na Jehova dị njikere ịkwụsị ihe ọjọọ nile, ọ na-eche ka o nwee ike ịzọpụta Ndị Kraịst n’ụzọ ga-eme ka e too aha ya. Anyị kwesịrị inwe obi ike na Jehova maara oge kasị mma ọ ga-eji mee ihe, ma ka ọ dịgodị, anyị kwesịrị ịdị na-eto ya mgbe nile. (Abụ Ọma 71:14, 15)—3/1, peeji nke 17-18.

• Noa ò webara ụmụ anụmanụ asaa n’ime anụmanụ ọ bụla dị ọcha n’ụgbọ ahụ ka ọ̀ bụ iri na anọ?

A gwara Noa ka ọ “chịpụtara onwe [ya] asaa asaa” n’ime anụmanụ nile ọ bụla dị ọcha. (Jenesis 7:1, 2) N’asụsụ Hibru, a kpọkwara okwu ahụ “asaa asaa.” Ikwu ya otú ahụ apụtaghị na ha dị iri na anọ, dị ka akụkụ Bible ndị ọzọ si gosi. O doro anya na Noa weere anụmanụ asaa n’ime nke ọ bụla dị ọcha, oké atọ, nne atọ na otu nke mere ha asaa bụ́ nke ọ ga-emesị jiri chụọ àjà. (Jenesis 8:20)—3/15, peeji nke 31.

• Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji “na-ahụ” ihe na-esi n’okwukwe ndị okenye, bụ́ ndị na-edu ndú, apụta?

Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị ‘na-ahụ,’ ma ọ bụ ka anyị na-eleru anya iji chọpụta, ihe si n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị okenye apụta ma na-eṅomi okwukwe ha. (Ndị Hibru 13:7) Anyị na-eme nke a n’ihi na a gwara anyị n’Okwu Chineke ka anyị mee otú ahụ. Anyị kwenyekwara na ndị okenye bu ma ọdịmma Alaeze ahụ ma ọdịmma nke anyị n’obi.—4/1, peeji nke 28.