Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mgbe Omume Obi Ọjọọ Ga-akwụsị?

Ọ̀ Dị Mgbe Omume Obi Ọjọọ Ga-akwụsị?

Ọ̀ Dị Mgbe Omume Obi Ọjọọ Ga-akwụsị?

ỌTỤTỤ ndị ga-ekweta n’egbughị oge na mmadụ iche banyere nanị onwe ya bụ isi ihe na-akpata omume obi ọjọọ n’ụwa nke oge a. Ndụ mmadụ iche nanị banyere onwe ya ọtụtụ mmadụ na-ebi emeela ka ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ gharakwa ịdị na-eche banyere ndị ọzọ. Ọtụtụ ga-eme ihe ọ bụla a chọrọ iji hụ na ha nwetara ihe ha na-achọ, bụ́ nke na-akpatakarị omume obi ọjọọ. Ọ bụghị nanị ndị mmadụ n’otu n’otu na-eme nke a kamakwa mba dị iche iche na-emekwa ya.

Ndị mmadụ ejikwaghị ndụ ụmụ mmadụ ibe ha kpọrọ ihe. Ọ na-amasị ụfọdụ ndị ime omume obi ọjọọ. Ọ na-atọ ha ụtọ, dị nnọọ ka ụfọdụ ndị omekome bụ́ ndị na-ekwu na ọ na-atọ ha nnọọ ụtọ imerụ ndị ọzọ ahụ́. Oleekwanụ banyere ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị otú fim ndị a na-eme ihe ike na omume obi ọjọọ na ha si atọ ha ụtọ na-eme ka ụlọ ọrụ ndị na-eme ihe nkiri na-aba ọgaranya site n’imepụta fim ndị dị otú ahụ? Ikiri omume obi ọjọọ na fim na ịnụ ya n’akụkọ ụwa mgbe nile na-eme ka obi fee ọtụtụ mmadụ azụ.

Omume obi ọjọọ na-akpaghasịkarị ndị mmadụ uche ma na-eme ka ndị e mesoro ya kaa obi imekwa ya ndị ọzọ. Mgbe Noemí Díaz Marroquín, bụ́ onye na-akụzi na Mahadum Kwụụrụ Onwe Ya nke Mexico na-ekwu banyere ihe ike omume obi ọjọọ na-akpata, o kwuru, sị: “A na-amụta ime ihe ike amụta, ọ dị n’omenala anyị . . . Anyị na-amụta ime ihe ike mgbe obodo anyị na-anabata ya ma na-akwado ya.” N’ihi ya, ndị e mesoro omume obi ọjọọ nwere ike imekwa ya ndị ọzọ, ikekwe ọbụna meso ha ya otú ahụ e si mesoo ha ya.

Ọzọ, ndị na-aṅụ ọgwụ ike na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè nwere ike imesị mewe omume obi ọjọọ. Ndị ọzọkwa bụ ndị na-ewere gọọmenti ha iwe n’ihi egboghị mkpa ndị mmadụ. N’ihi mkpebi siri ike ụfọdụ n’ime ha mere ime ka a mara otú obi dị ha, ha na-eme ihe ike ma na-eme ka iyi ọha egwu na-amụba, bụ́ nke na-emetụtakarị ndị aka ha dị ọcha.

Ma ị pụrụ nnọọ ịjụ, sị: ‘Ụmụ mmadụ hà mụtara ime omume obi ọjọọ n’onwe ha? Olee ihe kpatara ọnọdụ a e nwere taa?’

Ònye n’Ezie Na-akpata Omume Obi Ọjọọ?

Bible na-agwa anyị na Setan bụ́ Ekwensu na-akpa ike dị ukwuu n’ụwa a, na-akpọ ya “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ bụ ya bụ onye kasị eche nanị banyere onwe ya na onye kasị eme omume obi ọjọọ n’eluigwe na ụwa dum. Jizọs kọwara ya nnọọ dị ka “ogbu mmadụ” na “nna nke ụgha.”—Jọn 8:44.

Kemgbe ahụ Adam na Iv nupụrụ isi, ụmụ mmadụ anọwo n’okpuru ikike Setan. (Jenesis 3:1-7, 16-19) Ihe dị ka narị afọ 15 ka di na nwunye mbụ ahụ gbakụtasịrị Jehova azụ, ndị mmụọ ozi nupụrụ isi yiiri ahụ́ mmadụ, dinaa ụmụ nwanyị, ma mụta ụmụ ndị bụ́ ọkara mmụọ ọkara mmadụ bụ́ ndị a kpọrọ ndị Nefilim. Olee ihe e ji mara ha? Aha ha zara ajụjụ ahụ. Aha ha pụtara “Ndị Nkwada.” O doro anya na ha bụ ndị na-eme ihe ike bụ́ ndị kpatara omume obi ọjọọ na omume rụrụ arụ nke nanị ihe kwụsịliri ya bụ Iju Mmiri nke Chineke wetara. (Jenesis 6:4, 5, 17) Ọ bụ ezie na a lara ndị Nefilim ahụ n’iyi n’Iju Mmiri ahụ, ndị nna ha laghachiri n’ógbè ndị bụ́ mmụọ dị ka ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya.—1 Pita 3:19, 20.

Ọnọdụ nke otu nwata nwoke mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu n’oge Jizọs gosiri otú ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi si dị obi ọjọọ. Mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ihe ọdụdọ na-adọ nwa ahụ mgbe mgbe, na-atụba ya n’ọkụ na n’ime mmiri iji bibie ya. (Mak 9:17-22) O doro anya na “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ” dị otú ahụ na-agbaso àgwà obi ọjọọ nke onye ndú ha, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu.—Ndị Efesọs 6:12.

Taa, ike ndị mmụọ ọjọọ na-akpa anọgidela na-eme ka omume obi ọjọọ ụmụ mmadụ na-eme na-arị ibe ya elu, dị ka Bible buru n’amụma, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya.”—2 Timoti 3:1-5.

Amụma Bible na-egosi na oge anyị bụ oge siri ike karịsịa, n’ihi na mgbe e hiwesịrị Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst Jizọs n’afọ 1914, a chụpụrụ Setan na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Bible kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa, dịkwara oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:5-9, 12.

Nke a ọ̀ pụtara na ọnọdụ ahụ agaghị agbanwe? Díaz Marroquín, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kwuru na “ndị mmadụ nwere ike ịkwụsị” àgwà ọjọọ. Ma, n’ihi otú Setan si na-akpa ike n’ụwa taa, mmadụ agaghị akwụsị ya ma ọ bụrụ na o kweghị ka ikike dị iche nke ka nke Setan ike na-eduzi otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà. Gịnị ka ikike a bụ?

Mmadụ Pụrụ Ịgbanwe Àgwà Ọjọọ—Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Mee Ya?

Ọ na-enye obi ụtọ ịmara na mmụọ nsọ Chineke bụ ike kasịnụ e nwere, ọ pụkwara imeri ike ọ bụla ndị mmụọ ọjọọ nwere. Ọ na-akwalite ịhụnanya na ọdịmma nke ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ ma chọọ ka mmụọ nsọ Chineke rụwa ọrụ n’ime ya aghaghị izere àgwà ndị yitụrụ omume obi ọjọọ. Nke a na-achọ mmadụ ịgbanwe àgwà ya ka o kwekọọ n’uche Chineke. Gịnịkwanụ bụ uche Chineke? Ọ bụ ka anyị na-agbaso ụzọ Chineke ruo n’ókè anyị nwere ike. Nke a na-agụnye ile ndị ọzọ anya otú Chineke si ele ha.—Ndị Efesọs 5:1, 2; Ndị Kọlọsi 3:7-10.

Ịmụ otú Chineke si eme ihe ga-eme ka o doo anyị anya na ọ dịbeghị mgbe Jehova leghaara ndị ọzọ anya. O mesotụbeghị mmadụ ọ bụla ma ọ bụkwanụ anụmanụ ọ bụla omume ọjọọ. * (Deuterọnọmi 22:10; Abụ Ọma 36:7; Ilu 12:10) Ọ kpọrọ omume obi ọjọọ na ndị na-eme ya asị. (Ilu 3:31, 32) Ụdị mmadụ ọhụrụ Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst zụlite na-enyere ha aka ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ha mma ma na-akwanyere ha ùgwù. (Ndị Filipaị 2:2-4) Ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ na-agụnye “mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.” Ihe ọzọkwa ọ gụnyere bụ ịhụnanya, “n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Í kweghị na ụwa ga-agbanwee nnọọ kpamkpam ma ọ bụrụ na àgwà ndị dị otú ahụ ejupụta na ya?

Otú ọ dị, ị pụrụ ịdị na-eche ma ọ ga-ekwe omume mmadụ ịgbanwe àgwà ọjọọ ya, n’alaghachighị na ha ọzọ. Ma, tụlee otu ihe atụ mere eme. Martín * na-anọbu n’ihu ụmụ ha abara nwunye ya mba ma na-eji obi ọjọọ akụ ya ihe. N’otu oge, o ruru n’ókè nke na ụmụ ha gbapụrụ gaa kpọọ ndị agbata obi ha maka enyemaka. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ezinụlọ ahụ Bible. Martín mụtara ụdị mmadụ o kwesịrị ịbụ na otú o kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ̀ gbanwere àgwà ya? Nwunye ya zara, sị: “Mgbe mbụ, di m na-aghọ ihe m na-amaghị ma iwe wee ya. N’ihi ya, anyị enweghị obi ụtọ ruo ogologo oge. Amaghị m otú m ga-esi kelee Jehova maka inyere Martín aka ịgbanwe. Ọ bụzi ezi nna na ezigbo di.”

Nke a bụ nanị otu n’ime ndị kwụsịrị ime omume obi ọjọọ. Gburugburu ụwa, ọtụtụ nde mmadụ Ndịàmà Jehova mụụrụ Bible akwụsịla omume obi ọjọọ. Ee, mmadụ nwere ike ịgbanwe àgwà ọjọọ.

Omume Obi Ọjọọ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso

N’isi nso, Alaeze Chineke—ọchịchị e hiwerela n’eluigwe nke nwere Eze dị ọmịiko, bụ́ Kraịst Jizọs—ga-achị ụwa n’ụzọ zuru ezu. O meela ka eluigwe dị ọcha site n’ịchụpụ Setan bụ́ onye na-akpata omume obi ọjọọ nile, na ndị mmụọ ọjọọ ya. N’isi nso, Alaeze Chineke ga-egbo mkpa nke ndị hụrụ udo n’anya bụ́ ndị ọ ga-achị n’ụwa. (Abụ Ọma 37:10, 11; Aịsaịa 11:2-5) Ọ bụ nanị ya bụ nnọọ ihe ga-ewepụ nsogbu ndị e nwere n’ụwa. Ma tupu Alaeze a abịa, gịnị ma e meso gị omume obi ọjọọ?

Imegwara ndị mesoro anyị omume obi ọjọọ agaghị arụpụta ezi ihe. Nanị ihe ọ ga-eme bụ ime ka omume obi ọjọọ rịa ibe ya elu. Bible na-agwa anyị ka anyị tụkwasị Jehova obi, bụ́ onye n’oge nke ya ‘ga-enye onye ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, dị ka mkpụrụ nke omume ya nile si dị.’ (Jeremaịa 17:10) (Lee igbe dị n’isiokwu a nke isiokwu ya bụ, “Ihe I Kwesịrị Ime Banyere Omume Obi Ọjọọ.”) Ee, i nwere ike ịhụju anya n’ihi omume obi ọjọọ e mesoro gị. (Eklisiastis 9:11) Ma, Chineke pụrụ iwepụ nsogbu ọ bụla omume obi ọjọọ kpatara, ọbụna ọnwụ. Dị ka nkwa ya si dị, ndị nile ọ na-echeta, bụ́ ndị nwụrụ n’ihi omume obi ọjọọ e mesoro ha, ga-adị ndụ ọzọ.—Jọn 5:28, 29.

Ọ bụ ezie na a ka pụrụ imeso anyị omume obi ọjọọ, anyị na Chineke ịdị nnọọ ná mma na anyị ikwenyesi ike ná nkwa ya pụrụ ịkasi anyị obi. Chee echiche banyere Sara, bụ́ onye zụlitere ụmụ ya nwoke abụọ n’enweghị di, ma hụ na ha gụrụ ezigbo akwụkwọ. Mgbe o mere agadi, ụmụ ya hapụrụ ya n’egboroghị ya mkpa ya ma ọ bụ lekọta ya ma ọ rịawa ọrịa. N’agbanyeghị nke ahụ, Sara, onye bụ́ Onye Kraịst ugbu a, kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ọ na-ewute m, Jehova ahapụbeghị m. Ọ na-esi n’aka ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị na-akwado m, bụ́ ndị na-elekọta m mgbe nile. Ekwenyesiri m ike na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-egboro m mkpa m na nke ndị nile tụkwasịrị ikike ya obi ma na-eme ihe o nyere n’iwu.”

Olee ndị bụ́ ụmụnna Sara ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị o kwuru banyere ha? Ha bụ Ndị Kraịst ibe ya, bụ́ Ndịàmà Jehova. Ha bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nwere ọmịiko n’ahụ́ ibe ha bụ́ ndị kwenyesiri ike na omume obi ọjọọ ga-akwụsị n’isi nso. (1 Pita 2:17) A ga-ebibi ma onye bụ́ isi kpatara omume obi ọjọọ, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, ma onye ọ bụla na-eme ihe otú o si eme. Oge a otu onye edemede kpọrọ “ọgbọ ime ihe ike” ga-abụ ihe gara aga. Gịnị ma ị mụtakwuo ihe banyere olileanya a site n’ịkpọtụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu àgwà Chineke, gụọ akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 17 A gbanwere aha ụfọdụ agbanwe.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ihe I Kwesịrị Ime Banyere Omume Obi Ọjọọ

Okwu Chineke na-enye anyị ndụmọdụ bara uru banyere ihe i kwesịrị ime banyere omume obi ọjọọ. Tụlee otú i nwere ike isi tinye okwu ndị na-esonụ amamihe dị na ha n’ọrụ:

“Asịla, M ga-akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ: lee anya Jehova, Ọ ga-azọpụtakwa gị.”—Ilu 20:22.

“Ọ bụrụ na ị hụ na a na-emegbu ogbenye, na a na-anapụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume n’ike . . . , ibobo anwụla gị n’ihe ahụ a na-eme: n’ihi na otu Onye Nke dị elu karịa onye dị elu na-arịba ama.”—Eklisiastis 5:8.

“Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5.

“Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.

“Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Na-emenụ ndokwa maka ihe ndị dị mma n’anya mmadụ nile. Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi, ka Jehova na-asị.’”—Ndị Rom 12:17-19.

“Ọbụna Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya. . . . Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, ọ nọghị na-eyi egwu, kama ọ nọgidere na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ na-ekpe ikpe n’ezi omume.”—1 Pita 2:21-23.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Jehova akụziworo ọtụtụ ndị ịkwụsị omume obi ọjọọ