Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye Kraịst ò kwesịrị izere ihe ọṅụṅụ na nri ndị nwere caffeine?

Bible akagbughị Onye Kraịst ịṅụ kọfị, tii, mmanya ọtọ bịrịbịrị, na ịra swiiti ndị nwere caffeine. Ma, Akwụkwọ Nsọ nwere ụkpụrụ ndị ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe mere ụfọdụ ji ezere ihe ọṅụṅụ na ihe oriri ndị nwere caffeine.

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ kpatara ya bụ na e nwere ike ile caffeine anya dị ka ọgwụ na-emetụta uche, nke na-eme ka mmadụ na-enwe mkpali. O nwekwara ike iri mmadụ ahụ́. Otu akwụkwọ a tụkwasịrị obi ndị na-emepụta ọgwụ na-eji eme ihe kwuru, sị: “Mmadụ ịṅụ caffeine ebe o buru ibu ruo ogologo oge nwere ike ime ka ọ mara onye ahụ ahụ́, riekwa onye ahụ ahụ́. Ọ bụrụ na mmadụ akwụsị ịṅụ ya n’ike, o nwere ike ịkpatara onye ahụ isi ọwụwa, ahụ́ mgbakasị, ahụ́ ịma jijiji, nchekasị, na anya ajụ.” A chọwala idebanye ihe ndị ahụ na-eme mmadụ mgbe ọ kwụsịrị ịṅụ caffeine na ihe ndị ọzọ na-eme mmadụ mgbe ọ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ọjọọ n’akwụkwọ na-egosi ihe ndị e ji amata ndị nwere ọrịa uche. N’ihi ya, anyị pụrụ ịghọta ihe mere ụfọdụ Ndị Kraịst ji na-eche na o nwere ike ịbụ na o kwesịghị ekwesị n’ihi na ha achọghị ka ihe ọ bụla rie ha ahụ́, ha chọkwara inwe njide onwe onye.—Ndị Galeshia 5:23.

Ụfọdụ kweere na caffeine nwere ike imetụta ahụ́ ike mmadụ ma ọ bụ nke nwa e bu n’afọ. Ndị Kraịst aghaghị iji ‘mkpụrụ obi ha dum’ hụ Chineke n’anya, n’ihi ya, ha anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla ga-eme ka ha nwụọ ọnwụ ike. Ebe ọ bụkwa na e nyere ha iwu ka ha hụ onye agbata obi ha n’anya, ha na-ezere ihe ọ bụla nwere ike imerụ nwa e bu n’afọ ahụ́.—Luk 10:25-27.

Ọ̀ dị mkpa mmadụ ichegbu onwe ya banyere ihe ndị dị otú ahụ metụtara ahụ́ ike? A na-arụrịta ụka ma ò nwere ihe jikọtara ịṅụ caffeine na ọrịa ụfọdụ ka ọ bụ na o nweghị. Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha na-ekwudị na ịṅụ kọfị na-adị mma n’ahụ́. N’afọ 2006, magazin Time kọrọ, sị: “Ihe ọmụmụ ndị mbụ e mere yiri ka hà gosiri [na caffeine] nwere ike ịkpata ọrịa cancer akpa mamịrị, ọbara mgbali elu na ọrịa ndị ọzọ. Ọ bụghị nanị na ihe ọmụmụ ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya kagburu ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị ahụ e kwuru, kama ha egosiwokwa na e nwere ezi ihe ụfọdụ caffeine na-arụ n’ahụ́. O yiri ka caffeine ọ̀ na-echebe imeju, na-eme ka mmadụ ghara inweta ọrịa Parkinson, ọrịa shuga, ọrịa Alzheimer, ọrịa gallstone, ịda mbà n’obi nakwa ma eleghị anya ụdị ọrịa cancer ụfọdụ.” Otu magazin kwuru banyere ịṅụ caffeine, sị: “O doro anya na ihe dị mkpa bụ ịghara ịṅụbiga ya ókè.”

Onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme dabere n’otú o si ghọta ihe ndị a chọpụtara banyere caffeine na ụkpụrụ Bible ndị yiri ka hà metụtara ịṅụ caffeine. Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst dị ime nwere ike ikpebi ịhapụ ịṅụ caffeine ma ọ bụrụ na o kwubie na o nwere ike imetụta nwa o bu n’afọ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst achọpụta na ahụ́ na-agbakasị ya mgbe ọ bụla ọ na-aṅụghị caffeine ma ọ bụ na aṅụghị ya na-eme ya ọrịa, e nwere ike ịgba ya ume izere ya, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ruo oge ụfọdụ. (2 Pita 1:5, 6) Ndị Kraịst ndị ọzọ ekwesịghị ịkatọ mkpebi dị otú ahụ, chọwa ka onye ahụ nabata echiche nke ha.

N’agbanyeghị ihe i kpebiri ime banyere ihe ọṅụṅụ na ihe oriri ndị nwere caffeine, buru ndụmọdụ a Pọl nyere n’obi: “Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31.