Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Gụsiri Adryana Ike

Ihe Gụsiri Adryana Ike

Ihe Gụsiri Adryana Ike

Ọ DỊ otu ihe gụsiri Adryana, bụ́ nwata nwanyị dị afọ isii bi na Tulsa, Oklahoma, U.S.A., agụụ ike. O yiri nke gụrụ ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye bụrụ, sị: “Otu ihe ka m rịọworo n’aka Jehova, nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe n’ụlọukwu Ya.”—Abụ Ọma 27:4.

Mgbe Adryana dị nanị ọnwa isii, a chọpụtara na o nwere otu akpụ ọjọọ n’akwara gara ya n’ụbụrụ. Ọrịa ọjọọ a kpọnwụrụ ya ụkwụ abụọ. Ndị dọkịta wara ya ahụ́ ọtụtụ ugboro ma nyegide ya ọgwụ ruo otu afọ.

Nna Adryana, bụ́ onye nọ n’okpukpe dị iche na nke Adryana na nne ya, kpọtụụrụ otu ụlọ ọrụ na-enyere ndị nwere ajọ ọrịa aka ma rịọ ka ha nyere nwa ya nwanyị aka ịga leta otu ogige ntụrụndụ a ma ama n’ụwa nile. Tupu ụlọ ọrụ ahụ anabata arịọrọ ahụ, ha gbara Adryana ajụjụ ọnụ. O kelere ha maka ihe ahụ ha chọrọ imere ya ma gwa ha na ya ga-achọ ịga leta Betel, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na New York, kama ịga leta ogige ntụrụndụ. Mgbe Adryana chọpụtasịrị ihe nna ya rịọrọ ụlọ ọrụ ahụ, o kpegaara Jehova ekpere ka o nye ya ohere ịga leta Betel. Ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ ahụ nọ na-eche ná mmalite na Betel abụchaghị ebe ga-eme nwatakịrị obi ụtọ, ma ha mesịrị kwere ka ọ gaa mgbe nna ya na-agbaghị ọchịchọ nwa ya ụkwụ.

Nne Adryana, nwanne ya nwanyị, na otu enyi ya so Adryana gaa New York ịga leta Betel na nke mbụ ha. Adryana kwuru, sị: “Jehova zara ekpere m. Amaara m na ọ ga-anabata anyị na Betel. Ahụrụ m otú e si ebipụta akwụkwọ, magazin, na Bible. Ọ tọrọ m ụtọ karịa ogige ntụrụndụ.”

Adryana hụrụ “ịdị ụtọ Jehova” ma nwee obi ụtọ n’ọrụ ndị a na-arụ n’isi ụlọ ọrụ nke ndị Jehova nke oge a. Anyị na-akpọkwa gị oku ịbịa leta Betel. E wezụga isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na New York, e nwere ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ dị n’akụkụ ndị ọzọ dị iche iche nke ụwa.