Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Ọgbakọ Too Jehova

Ka Ọgbakọ Too Jehova

Ka Ọgbakọ Too Jehova

“M ga-akpọsara ụmụnna m aha gị; n’etiti ọgbakọ ka m . . . ga-eto gị.” —NDỊ HIBRU 2:12.

1, 2. Gịnị mere ọgbakọ ji baa nnọọ uru, oleekwa ọrụ bụ́ isi ọ na-arụ?

KEMGBE ụwa, ndị mmadụ enwetawo ndị enyi na nchebe n’ezinụlọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible kwuru ebe ọzọ imerime mmadụ na-enweta ndị enyi na nchebe pụrụ iche gburugburu ụwa. Nke ahụ bụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma ị̀ nọ n’ezinụlọ ebe onye ọ bụla na-enyere ibe ya aka ma ọ bụ na ị nọghị, i nwere ike ma kwesị ikele Chineke n’ihi ihe ndị o nyeworo anyị site n’ọgbakọ. N’ezie, ọ bụrụ na ị nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, i nwere ike ikweta na i nwetala ezi ndị enyi na nchebe n’ebe ahụ.

2 Ọgbakọ abụghị òtù ọhaneze nkịtị. Ọ bụghị òtù nke ndị bi n’otu ógbè ma ọ bụ òtù nke ndị nọ n’otu ọnọdụ ná ndụ ma ọ bụ ndị nwere mmasị n’otu egwuregwu. Kama nke ahụ, ihe bụ́ isi mere e ji mee ndokwa maka ọgbakọ bụ iji na-eto Jehova Chineke. Ọ dịla anya ọgbakọ rụwara ọrụ dị otú ahụ, dị ka akwụkwọ Abụ Ọma gosiri ugboro ugboro. N’Abụ Ọma 35:18, anyị na-agụ, sị: “M ga-ekele Gị n’etiti mkpọkọta bara ụba: n’etiti otu ndị nwere ume ka m ga-eto Gị.” N’otu aka ahụkwa, Abụ Ọma 107:31, 32 na-agba anyị ume, sị: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere Ya, na oké ọrụ Ya nile nke Ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ! Ka ha meekwa Ya ka Ọ dị elu n’ime mkpọkọta ndị Ya.”

3. Dị ka Pọl si kwuo, olee ọrụ ọgbakọ na-arụ?

3 Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi gosiri ọrụ ọzọ dị mkpa ọgbakọ na-arụ mgbe o kwuru na ọ bụ ‘ezinụlọ nke Chineke, bụ́ ọgbakọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.’ (1 Timoti 3:15) Olee ọgbakọ Pọl na-ekwu okwu ya? Olee ụzọ dị iche iche Bible si eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe? Oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta ndụ anyị na ihe ndị anyị na-ele anya ha? Iji chọta azịza ha, ka anyị buru ụzọ tụlee otú e si jiri okwu ahụ́ bụ́ “ọgbakọ” mee ihe n’Okwu Chineke.

4. Olee otú e sikarị jiri okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?

4 Okwu Hibru a na-asụgharịkarị “ọgbakọ” sitere n’okwu pụtara “kpọkọta.” (Deuterọnọmi 4:10; 9:10) Ọbụ abụ kpọrọ ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe “mkpọkọta,” a pụkwara ịkpọ ìgwè ndị na-emebi iwu mkpọkọta. (Abụ Ọma 26:5; 89:5-7) Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ Hibru jikarịrị ya mee ihe maka ndị Izrel. Chineke kwuru na Jekọb ‘ga-aghọ mkpọkọta nke ndị dị iche iche,’ o mezukwara otú ahụ. (Jenesis 28:3; 35:11; 48:4) A kpọpụtara ụmụ Izrel iche, ma ọ bụ họpụta ha, ịbụ “mkpọkọta Jehova,” “mkpọkọta ndị Chineke.”—Ọnụ Ọgụgụ 20:4; Nehemaịa 13:1; Joshua 8:35; 1 Samuel 17:47; Maịka 2:5.

5. Olee okwu Grik a na-asụgharịkarị “ọgbakọ,” oleekwa ụzọ a pụrụ isi jiri okwu a mee ihe?

5 Okwu ya na ya kwekọrọ na Grik bụ ek·kle·siʹa, bụ́ nke sitere n’okwu Grik abụọ pụtara “pụta” na “kpọọ.” Ọ pụrụ ịpụta ìgwè mmadụ nkịtị, dị ka “nzukọ ahụ” Dimitriọs kpaliri imegide Pọl n’Efesọs. (Ọrụ 19:32, 39, 41) Ma Bible na-eji ya eme ihe mgbe ọ na-ekwu banyere ọgbakọ Ndị Kraịst nile. Nsụgharị ụfọdụ na-asụgharị okwu a “chọọchị,” ma akwụkwọ bụ́ The Imperial Bible-Dictionary kọrọ na ọ “dịghị mgbe . . . ọ na-apụta ụlọ ebe Ndị Kraịst na-ezukọ maka ofufe.” Ma, ọ bụ ihe dị ịrịba ama na n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e ji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” mee ihe ọ dịkarịala ala n’ụzọ anọ dịgasị iche.

Ọgbakọ Chineke nke Ndị E Tere Mmanụ

6. Gịnị ka Devid na Jizọs mere n’ọgbakọ?

6 Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu na ihe ndị ahụ Devid kwuru n’Abụ Ọma 22:22 mezuru n’isi Jizọs, o dere, sị: “‘M ga-akpọsara ụmụnna m aha gị; n’etiti ọgbakọ ka m ga-eji abụ na-eto gị.’ N’ihi ya [Jizọs] ji ụgwọ ịdị ka ‘ụmụnna’ ya n’ụzọ nile, ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere nke na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’ihe ndị metụtara Chineke.” (Ndị Hibru 2:12, 17) Devid toro Chineke n’etiti mkpọkọta Izrel oge ochie. (Abụ Ọma 40:9) Otú ọ dị, gịnị ka Pọl na-ekwu banyere ya mgbe ọ sịrị na Jizọs toro Chineke “n’etiti ọgbakọ”? Olee ọgbakọ ọ bụ?

7. Olee ụzọ bụ́ isi Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst si eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe?

7 Ihe dị ná Ndị Hibru 2:12, 17 nwere ihe ọ na-akụziri anyị. O gosiri na a gụnyere Kraịst n’ọgbakọ bụ́ ebe ọ kpọsaara ụmụnna ya aha Chineke. Olee ndị bụ́ ụmụnna ya ndị ahụ? Ha bụ ndị mejupụtara “mkpụrụ Ebreham,” ụmụnna Kraịst e tere mmanụ, “ndị nketa nke ọkpụkpọ eluigwe ahụ.” (Ndị Hibru 2:16–3:1; Matiu 25:40) Ee, isi ihe “ọgbakọ” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ ìgwè ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ. Ọ bụ narị puku na iri puku anọ na anọ ndị a e tere mmanụ bụ “ọgbakọ nke ndị e buru ụzọ mụọ bụ́ ndị e debanyeworo aha ha n’eluigwe.”—Ndị Hibru 12:23.

8. Olee otú Jizọs si buo amụma banyere nhiwe a gaje ihiwe ọgbakọ Ndị Kraịst?

8 Jizọs kwuru na a gaje ihiwe “ọgbakọ” Ndị Kraịst a. Ihe dị ka otu afọ tupu ọnwụ ya, ọ gwara otu onyeozi ya, sị: “Ị bụ Pita, ọ bụkwa n’oké nkume a ka m ga-ewukwasị ọgbakọ m, ọnụ ụzọ ámá nke Hedis agaghịkwa aka ya ike.” (Matiu 16:18) Ma Pita ma Pọl ghọtara nke ọma na ọ bụ Jizọs bụ oké nkume ahụ e buru n’amụma. Pita dere na ndị e wuru dị ka “nkume dị ndụ” nke ụlọ ime mmụọ n’elu oké nkume ahụ, bụ́ Kraịst, bụ “otu ndị bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche [iji] kpọsaa n’ebe nile ịdị mma” nke Onye ahụ kpọrọ ha.—1 Pita 2:4-9; Abụ Ọma 118:22; Aịsaịa 8:14; 1 Ndị Kọrint 10:1-4.

9. Olee mgbe a malitere ihiwe ọgbakọ Chineke?

9 Olee mgbe a malitere ịhazi ‘otu ndị a bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche’ ịghọ ọgbakọ Ndị Kraịst? Ọ bụ na Pentikọst 33 O.A. bụ́ mgbe Chineke wụsara ndị na-eso ụzọ ahụ gbakọrọ na Jeruselem mmụọ nsọ. Ka e mesịrị n’ụbọchị ahụ, Pita gwara otu ìgwè ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu okwu magburu onwe ya. Ọnwụ Jizọs wutere ọtụtụ ndị; ha chegharịrị, e meekwa ha baptizim. N’ihe ndekọ kwuru banyere ihe mere n’ụbọchị ahụ, a gwara anyị na puku mmadụ atọ chegharịrị, e meekwa ha baptizim, ozugbo nke ahụ gasịkwara, ha sonyere n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ Chineke hiwere nke na-eto eto. (Ọrụ 2:1-4, 14, 37-47) Ọ na-eto eto n’ihi na ọtụtụ ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu kwetara na mba Izrel abụghịkwa ọgbakọ Chineke. Kama nke ahụ, ndị mejupụtara Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ “Izrel [ihe atụ] nke Chineke” ghọrọ ezigbo ọgbakọ Chineke.—Ndị Galeshia 6:16; Ọrụ 20:28.

10. Olee mmekọrịta dị n’etiti Jizọs na ọgbakọ Chineke?

10 Bible na-egosikarị na e nwere ọdịiche dị n’etiti Jizọs na ndị e tere mmanụ, dị ka anyị na-ahụ n’okwu bụ́ “banyere Kraịst na ọgbakọ.” Jizọs bụ Onyeisi nke ọgbakọ a Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mejupụtara. Pọl dere na Chineke ‘mere [Jizọs] onyeisi nke ihe nile n’ebe ọgbakọ ahụ dị, nke bụ ahụ́ ya.’ (Ndị Efesọs 1:22, 23; 5:23, 32; Ndị Kọlọsi 1:18, 24) Taa, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole e tere mmadụ ka nọ n’ụwa. Ma, anyị ji nnọọ n’aka na Onyeisi ha, bụ́ Jizọs Kraịst, hụrụ ha n’anya. A kọwara otú o si hụ ndị a n’anya ná Ndị Efesọs 5:25, bụ́ ebe kwuru, sị: “Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” Ọ hụrụ ha n’anya n’ihi na ha na-arụsi ọrụ ike n’ịchụrụ Chineke “àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha,” dị nnọọ ka Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa.—Ndị Hibru 13:15.

Ihe Ndị Ọzọ “Ọgbakọ” Pụtara

11. Olee ụzọ nke abụọ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst si jiri okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” mee ihe?

11 Mgbe ụfọdụ, Bible na-eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe n’ụzọ na-asarughị mbara ka nke e kwuru n’elu ma ọ bụ n’ụzọ a kapịrị ọnụ karị, bụ́ mgbe ọ na-anaghị apụta ndị nile so na narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ e tere mmanụ mejupụtara “ọgbakọ Chineke.” Dị ka ihe atụ, Pọl degaara otu ìgwè Ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Unu abụrụla ndị Juu na ndị Grik nakwa ọgbakọ Chineke ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ.” (1 Ndị Kọrint 10:32) O doro anya na ọ bụrụ na Onye Kraịst nọ na Kọrint oge ochie emee ihe ọjọọ, ihe ahụ o mere nwere ike ime ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ. Otú ọ dị, ihe ọjọọ ahụ ò nwere ike ime ka ndị Grik nile, ndị Juu nile, ma ọ bụ ndị nile e tere mmanụ site n’oge ahụ ruo n’oge anyị a sụọ ngọngọ? Mbanụ. N’ihi ya, ọ pụtara na n’amaokwu a, “ọgbakọ Chineke” a na-ekwu okwu ya bụ Ndị Kraịst dị ndụ n’otu oge. N’ihi ya, mmadụ nwere ike ikwu banyere Chineke ichebe, ịkwado ma ọ bụ ịgọzi ọgbakọ, nke pụtara Ndị Kraịst nile e nwere n’otu oge, n’agbanyeghị ebe ha nọ. Ma ọ bụ anyị nwere ike ikwu banyere obi ụtọ na udo e nwere n’ọgbakọ Chineke taa, nke bụ́ obi ụtọ na udo dị n’etiti òtù ụmụnna Ndị Kraịst.

12. Ole ụzọ nke atọ e si jiri okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” mee ihe na Bible?

12 Ụzọ nke atọ Bible si eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe bụ mgbe ọ na-ekwu banyere Ndị Kraịst nile nọ n’otu ógbè. Anyị na-agụ, sị: “Ọgbakọ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo.” (Ọrụ 9:31) E nwere ihe karịrị otu ìgwè Ndị Kraịst n’ógbè ahụ buru ibu, ma a kpọrọ ha nile nọ na Judia, Galili, nakwa na Sameria “ọgbakọ.” N’ihi ọnụ ọgụgụ e mere baptizim na Pentikọst 33 O.A. nakwa n’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, o nwedịrị ike ịbụ na e nwere ihe karịrị otu ìgwè nke na-enwechi nzukọ anya n’ógbè Jeruselem. (Ọrụ 2:41, 46, 47; 4:4; 6:1, 7) Herọd Agripa nke Mbụ chịrị Judia ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 44 O.A., ihe e kwukwara ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:14 mere ka o doo anya na ma ọ dịghị ihe ọzọ ka ọ na-erule afọ 50 O.A. e nwere ọtụtụ ọgbakọ na Judia. N’ihi ya, mgbe anyị gụtara na Herọd ‘mesoro ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ mmeso ọjọọ,’ nke a nwere ike ịpụta ihe karịrị otu ọgbakọ nke dị na Jeruselem.—Ọrụ 12:1.

13. Olee ụzọ nke anọ Bible na-esikarị eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe?

13 Nke anọ, ụzọ a kadị kpaara ókè a na-esikarị eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe bụ mgbe a na-ekwu banyere Ndị Kraịst nọ n’otu ọgbakọ, dị ka ndị na-amụ ihe n’ụlọ mmadụ. Pọl kwuru banyere “ọgbakọ ndị dị na Galeshia.” E nwere ihe karịrị otu ọgbakọ n’ógbè Rom ahụ buru ibu. Pọl kwuru banyere ihe karịrị otu “ọgbakọ” mgbe ọ na-ekwu banyere Galeshia, bụ́ nke ga-agụnye ndị dị n’Antiọk, Dabe, Listra, na Aịkoniọm. A họpụtara ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta ruru eru n’ime ọgbakọ ndị ahụ. (1 Ndị Kọrịnt 16:1; Ndị Galeshia 1:2; Ọrụ 14:19-23) Akwụkwọ Nsọ na-akpọ ha nile “ọgbakọ Chineke.”—1 Ndị Kọrint 11:16; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:4.

14. Olee ihe anyị pụrụ ikwubi banyere otú e si jiri okwu bụ́ “ọgbakọ” mee ihe n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ole na ole?

14 Mgbe ụfọdụ, ìgwè ndị na-anọ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst aghaghị ịdị obere, iji nwee ike ịba n’ụlọ mmadụ. N’agbanyeghị nke ahụ, a kpọrọ obere ìgwè ndị dị otú ahụ “ọgbakọ.” Ndị nke anyị maara dị otú ahụ bụ ọgbakọ ndị dị n’ụlọ Akwịla na Priska, Nimfa, na Faịlimọn. (Ndị Rom 16:3-5; Ndị Kọlọsi 4:15; Faịlimọn 2) Nke a kwesịrị ịgba ọgbakọ ndị dị obere taa ume na ọbụnadị ndị nke na-amụ ihe n’ụlọ mmadụ. Jehova nabatara obere ọgbakọ ndị dị otú ahụ e nwere na narị afọ mbụ, ọ na-anabatakwa nnọọ ndị nke e nwere taa ma na-agọzi ha site na mmụọ nsọ ya.

Ọgbakọ Dị Iche Iche Na-eto Jehova

15. Olee ọrụ mmụọ nsọ rụrụ n’ahụ́ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị e nwere n’oge mbụ?

15 Anyị kwuru ná mmalite na Jizọs toro Chineke n’etiti ọgbakọ iji mezuo ihe dị n’Abụ Ọma 22:22. (Ndị Hibru 2:12) Ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-emekwa otu ihe ahụ. Na narị afọ mbụ mgbe e ji mmụọ nsọ tee ezi Ndị Kraịst mmanụ ịghọ ụmụ Chineke, ha esikwa otú ahụ ghọọ ụmụnna Kraịst, mmụọ nsọ rụkwara ọrụ n’ụzọ pụrụ iche n’ime ụfọdụ n’ime ha. Ha natara onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ n’ụzọ ọrụ ebube. Ụzọ ụfọdụ ha si gosipụta onyinye ndị dị otú ahụ bụ site n’ikwu okwu pụrụ iche nke na-enye amamihe ma ọ bụ ihe ọmụma, ha inwe ikike nke ịgwọ ọrịa ma ọ bụ ibu amụma, ma ọ bụ ọbụna inwe ike ịsụ asụsụ ndị ha na-amaghị na mbụ.—1 Ndị Kọrint 12:4-11.

16. Olee otu nzube e ji nye onyinye ọrụ ebube dị iche iche nke mmụọ nsọ?

16 Pọl kwuru banyere ikwu okwu n’asụsụ ọzọ, sị: “M ga-eji onyinye nke mmụọ nsọ na-abụ abụ otuto, ma m ga-ejikwa obi m na-abụ abụ otuto.” (1 Ndị Kọrint 14:15) Ọ ghọtara na ọ dị mkpa ka ndị ọzọ ghọta ihe ọ na-ekwu iji nwee ike ịmụta ihe na ya. Ihe dị Pọl mkpa bụ ito Jehova n’ọgbakọ. Ọ gbara ndị ọzọ nwetara onyinye mmụọ nsọ ume, sị: “Na-achọnụ ijupụta na ha maka iwuli ọgbakọ elu,” ya bụ ọgbakọ ha nọ na ya na-egosipụta onyinye ahụ. (1 Ndị Kọrint 14:4, 5, 12, 23) O doro anya na Pọl nwere mmasị n’ọgbakọ dị iche iche, mara na n’ọgbakọ nke ọ bụla, Ndị Kraịst ga-enwe ohere ito Chineke.

17. Olee ihe anyị pụrụ ijide n’aka banyere ọgbakọ ndị anyị nwere taa?

17 Jehova ka ji ọgbakọ ya na-arụ ọrụ ma na-akwado ya. Ọ na-agọzi ìgwè Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa taa. A pụrụ ịhụ nke a site ná nri bara ụba sitere na Bible nke ndị Chineke na-enweta. (Luk 12:42) Ọ na-agọzi òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ n’ozuzu. Ọ na-agọzikwa ọgbakọ anyị dị iche iche, bụ́ ebe anyị na-anọ eto Onye Okike anyị site n’omume anyị na azịza anyị ndị na-ewuli okwukwe ndị ọzọ elu. Anyị na-amụta ihe ma na-anata ọzụzụ n’ebe ahụ ka anyị wee nwee ike ito Chineke n’oge ndị ọzọ, mgbe anyị na-anọghị n’ọmụmụ ihe.

18, 19. Gịnị ka ezi Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ ọ bụla na-achọ ime?

18 Cheta na Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ dị na Filipaị, Masedonia ume, sị: ‘Nke a bụkwa ihe m nọgidere na-ekpe n’ekpere, ka [unu] jupụta ná mkpụrụ ezi omume, bụ́ nke sitere na Jizọs Kraịst, iji wetara Chineke otuto na ịja mma.’ Nke ahụ ga-agụnye ha ịgwa ndị ọzọ, ndị nọ n’èzí, banyere okwukwe ha nwere n’ebe Jizọs nọ na olileanya magburu onwe ya ha nwere. (Ndị Filipaị 1:9-11; 3:8-11) N’ihi ya, Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka anyị site na [Jizọs] chụọrọ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.”—Ndị Hibru 13:15.

19 Ị̀ na-enwe mmasị ito Chineke “n’etiti ọgbakọ,” dị ka Jizọs nwere, ma na-eji egbugbere ọnụ gị na-eto Jehova n’ebe ndị na-amatabeghị ya ma na-eto ya nọ? (Ndị Hibru 2:12; Ndị Rom 15:9-11) Ruo n’ókè ụfọdụ, azịza anyị nwere ike ịdabere n’otú anyị si ghọta ọrụ ọgbakọ anyị na-arụ n’imezu nzube Chineke. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú Jehova si eduzi ọgbakọ anyị ma na-eji ya eme ihe, na otú ọrụ ndị ọgbakọ na-arụ kwesịrị isi metụta ndụ anyị taa.

Ì Chetara?

• Olee otú “ọgbakọ Chineke,” bụ́ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ mejupụtara, si malite?

• Olee ụzọ atọ ọzọ Bible si eji okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” eme ihe?

• Olee ihe dị Devid, Jizọs, na Ndị Kraịst narị afọ mbụ mkpa ime n’ọgbakọ, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Olee ọgbakọ nke Jizọs hiwere?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ìgwè Ndị Kraịst nọ otu ebe na-ezukọta ọnụ dị ka “ọgbakọ Chineke”

[Foto dị na peeji nke 24]

Dị ka Ndị Kraịst nọ ná mba Benin, anyị pụrụ ito Jehova n’etiti ọgbakọ