Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka E Wulie Ọgbakọ Elu

Ka E Wulie Ọgbakọ Elu

Ka E Wulie Ọgbakọ Elu

“Ọgbakọ . . . banyere n’oge udo, bụrụ nke a na-ewuli elu.”—ỌRỤ 9:31.

1. Olee ajụjụ ndị e nwere ike ịjụ banyere “ọgbakọ Chineke”?

N’ỤBỌCHỊ Pentikọst 33 O.A., Jehova nabatara otu ìgwè nke ndị na-eso ụzọ Kraịst dị ka mba ọhụrụ, “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16) Ndị Kraịst a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ghọkwara ihe Bible kpọrọ “ọgbakọ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 11:22) Otú ọ dị, olee ihe nke ahụ gụnyere? Olee otú a ga-esi hazie “ọgbakọ Chineke”? Olee otú ọ ga-esi rụọ ọrụ n’ụwa n’agbanyeghị ebe ndị nọ na ya bi? Oleekwa otú o si emetụta ndụ anyị na obi ụtọ anyị?

2, 3. Olee otú Jizọs si gosi na a ga-ahazi ọgbakọ ahazi?

2 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, Jizọs buru amụma banyere mmalite nke ọgbakọ a nke ụmụazụ ya e tere mmanụ mejupụtara, na-agwa Pita onyeozi, sị: “N’oké nkume a [Jizọs Kraịst] ka m ga-ewukwasị ọgbakọ m, ọnụ ụzọ ámá nke Hedis agaghịkwa aka ya ike.” (Matiu 16:18) Ọzọkwa, mgbe Jizọs na ndịozi ya ka nọ, o kwuru ihe ndị gosiri ọrụ ọgbakọ ahụ a ga-ehiwe n’oge na-adịghị anya ga na-arụ na otú a ga-esi hazie ya.

3 Jizọs ji okwu ọnụ na omume ya kụzie na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ga na-eduzi ndị ọzọ. Ha ga na-eme otú ahụ site n’ijere ndị ọzọ nọ n’ìgwè ahụ ozi. Kraịst kwuru, sị: “Unu maara na ndị o yiri ka ọ bụ ha na-achị ndị mba ọzọ na-eme ka ha bụ ndị nwe ha, ndị ukwu ha na-achịkwa ha n’aka ike. Nke a abụghị otú ọ dị n’etiti unu; kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi, onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ ohu nke mmadụ nile.” (Mak 10:42-44) O doro anya na “ọgbakọ Chineke” agaghị abụ nnọọ ndị mmadụ nọ n’ebe dị iche iche, nke ga-abụ ọgbakọ a na-ahazighị ahazi. Kama nke ahụ, ọ ga-abụ nke a haziri nke ọma, bụ́ nke ndị nọ n’ime ya ga na-emekọrịta ihe.

4, 5. Olee otú anyị si mara na nduzi sitere na Bible ga-adị ọgbakọ mkpa?

4 Onyeisi nke “ọgbakọ Chineke” kwuru na ndịozi ya na ndị ọzọ o ziri ihe nwere ụdị ọrụ ndị ha ga-arụ n’ọgbakọ. Olee ọrụ ndị ha ga-arụ? Ọrụ dị mkpa ha ga na-arụ bụ ịkụziri ndị nọ n’ọgbakọ ihe banyere Chineke. Cheta na Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite nọ n’ihu ụfọdụ ndịozi ndị ọzọ gwa Pita, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” Pita zara, sị: “Ee, Onyenwe anyị, ị maara na m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ị nọ.” Jizọs sịrị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m. . . . Na-azụ obere ụmụ atụrụ m. . . . Na-azụ obere ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:15-17) Nke ahụ bụ nnọọ ọrụ dị mkpa!

5 Anyị pụrụ ịchọpụta n’okwu Jizọs na e ji ndị nọ n’ime ọgbakọ tụnyere atụrụ ndị nọ n’otu ìgwè. Ọ ga-adị atụrụ ndị a—Ndị Kraịst ndị nwoke, ndị nwanyị na ụmụaka—mkpa ka e jiri Akwụkwọ Nsọ na-azụ ha ma na-eduzi ha nke ọma. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Jizọs nyere ụmụazụ ya nile iwu ịkụziri ndị ọzọ ihe na ime ha ndị na-eso ụzọ, ọ ga-adị mkpa ka a zụọ ndị ọhụrụ ọ bụla na-aghọ atụrụ ya otú ha ga-esi rụọ ọrụ ahụ Chineke nyere anyị.—Matiu 28:19, 20.

6. Ndokwa ndị dị aṅaa ka e mere ‘n’ọgbakọ Chineke’ ahụ e hiwere ọhụrụ?

6 Mgbe e hiwere “ọgbakọ Chineke,” ndị nile nọ na ya zukọrọ mgbe nile maka nduzi na iji gbaa ibe ha ume: “Ha nọgidesikwara ike n’ozizi nke ndịozi na n’iso ibe ha na-ekerịta ihe, n’iri nri na n’ikpe ekpere.” (Ọrụ 2:42, 46, 47) Ihe ọzọ dị mkpa a hụrụ n’akụkọ ahụ mere eme bụ na e wepụtara ndị ikom ruru eru ịrụ ọrụ ụfọdụ dị mkpa. A họọrọghị ha n’ihi afọ ole ha ji gaa akwụkwọ, ma ọ bụ n’ihi nkà ndị ha nwere. Ndị a bụ ndị ikom “jupụtara na mmụọ nsọ na amamihe.” Otu n’ime ha bụ Stivin, ihe ndekọ ahụ kwukwara na ọ bụ “nwoke jupụtara n’okwukwe na mmụọ nsọ.” Otu n’ime ihe ndị ọgbakọ ahụ e hiwere rụpụtara bụ na o mere ka ‘okwu Chineke nọgide na-eto eto, ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ na-eso ụzọ anọgidekwa na-amụba nke ukwuu na Jeruselem.’—Ọrụ 6:1-7.

Ndị Ikom Chineke Ji Na-arụ Ọrụ

7, 8. (a) Ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem jere ozi dị ka gịnị n’etiti Ndị Kraịst oge mbụ? (b) Mgbe e si n’ọgbakọ dị iche iche nye ntụziaka, olee ihe si na ya pụta?

7 Dị nnọọ ka o kwesịrị, ndịozi duziri ndokwa ndị e mere n’ọgbakọ n’oge mbụ, ma ọ bụghị nanị ha bụ ndị nduzi. N’otu oge, Pọl na ndị ha na ya so laghachiri n’Antiọk nke Siria. Ọrụ 14:27 na-akọ, sị: “Mgbe ha bịaruteworo ma mee ka ọgbakọ ahụ zukọta, ha wee kọọ ọtụtụ ihe Chineke meworo site n’aka ha.” Mgbe ha na ọgbakọ ahụ ka nọ, otu okwu bilitere banyere ma è kwesịrị ibi ndị Jentaịl kwere ekwe úgwù. Iji dozie okwu ahụ, e zigara Pọl na Banabas ka ha “gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem,” bụ́ ndị o doro anya na ha na-eje ozi dị ka òtù na-achị isi.—Ọrụ 15:1-3.

8 Ọ bụ Jems nke na-abụghị onyeozi, onye bụ́ okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst na onye nne ji ya na Jizọs, nọ n’isi oche mgbe ‘ndịozi na ndị okenye zukọtara iji hụ banyere okwu a.’ (Ọrụ 15:6) Mgbe ha jisịrị nlezianya na enyemaka nke mmụọ nsọ tụlee okwu ahụ, ha mere mkpebi kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Ha dere ya n’akwụkwọ ozi ma zigara ya ọgbakọ nile. (Ọrụ 15:22-32) Ndị natara ozi ahụ nakweere ihe e kpebiri ma mee ya. Olee ihe si na ya pụta? Nke a wuliri ụmụnna nwoke na nwanyị elu ma gbaa ha ume. Bible kwuru, sị: “Ya mere, n’ezie, ọgbakọ dị iche iche nọgidere bụrụ ndị a na-eme ka ha sie ike n’okwukwe ma na-aba ụba n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.”—Ọrụ 16:5.

9. Olee ọrụ ndị Bible kwuru na ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst ruru eru ga-arụ?

9 Ma olee otú ọgbakọ dị n’ebe dị iche iche ga-esi na-arụ ọrụ kwa ụbọchị? Were ọgbakọ ndị dị n’obodo Krit nke mmiri gbara gburugburu dị ka ihe atụ. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ nwere àgwà ọjọọ, ụfọdụ gbanwere ma ghọọ ezi Ndị Kraịst. (Taịtọs 1:10-12; 2:2, 3) Ha bi n’obodo dị iche iche, ebe ndị ahụ ha bi dịchakwa nnọọ anya na Jeruselem, bụ́ ebe òtù na-achị isi nọ. Otú ọ dị, nke ahụ abụchaghị nsogbu, n’ihi na a họpụtara “ndị okenye” nwerela ahụmahụ n’ozi ha na-ejere Jehova n’ime ọgbakọ nke ọ bụla dị na Krit, dịkwa ka e si họpụta n’ebe ndị ọzọ. Ndị ikom dị otú ahụ ruru ihe ndị Bible chọrọ ha n’aka. A họpụtara ha ịbụ ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, bụ́ ndị pụrụ “ịdụsi ọdụ ike site n’ozizi na-enye ezi ndụ na ịdọ ndị na-ekwugide ekwugide aka ná ntị.” (Taịtọs 1:5-9; 1 Timoti 3:1-7) Ndị ikom ndị ọzọ ruru eru ijere ọgbakọ dị iche iche ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi.—1 Timoti 3:8-10, 12, 13.

10. Dị ka Matiu 18:15-17 si kwuo, olee otú e kwesịrị isi dozie nsogbu ndị siri ike?

10 Jizọs kwuru na a ga-enwe ụdị ndokwa ahụ. Cheta ihe dị na Matiu 18:15-17, ebe o kwuru na nsogbu nwere ike ibilite n’etiti ndị Chineke abụọ mgbe ụfọdụ, mgbe otu mejọrọ ibe ya n’ụzọ ụfọdụ. Onye e mejọrọ ga-agakwuru onye nke ọzọ ma “kpugheere ya mmejọ ya” n’ebe ndị ọzọ na-agaghị ama, n’etiti ha abụọ nanị. Ọ bụrụ na nanị ha abụọ edozilighị nsogbu ahụ, e nwere ike ịkpọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ maara ihe merenụ ka ha bịa nye aka. Ọ bụrụkwanụ na ha edozilighị nsogbu ahụ? Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na o geghị ọbụna ọgbakọ ntị, ka ọ dịrị gị nnọọ ka onye mba ọzọ nakwa dị ka onye ọnaụtụ.” Mgbe Jizọs kwuru okwu ahụ, ndị Juu ka bụ “ọgbakọ Chineke,” n’ihi ya, ọ bụ ha bụ ndị mbụ okwu ahụ metụtara. * Otú ọ dị, ozugbo e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst, ntụziaka ahụ Jizọs nyere ga-abụzi maka ha. Nke a bụ ihe ọzọ gosiri na ndị Chineke ga-enwe ọgbakọ a haziri ahazi iji wulie Onye Kraịst nke ọ bụla elu ma duzie ya.

11. Olee ọrụ ndị okenye na-arụ n’idozi nsogbu ndị e nwere n’ọgbakọ?

11 O kwesịrị nnọọ ekwesị na ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, ga-anọchi anya ọgbakọ ha n’ileba anya ná nsogbu ndị e nwere ma ọ bụ n’idozi ha ma ọ bụ n’ikpe ndị mere mmehie ikpe. Nke ahụ kwekọrọ n’ihe ndị a chọrọ n’aka ndị okenye bụ́ ndị e dekọrọ na Taịtọs 1:9. N’eziokwu, ndị okenye nọ n’ọgbakọ bụ ndị ikom na-ezughị okè, dị ka Taịtọs, bụ́ onye Pọl zigara n’ọgbakọ dị iche iche ịga ‘dozie ihe ndị gahiere agahie.’ (Taịtọs 1:4, 5) Taa, ndị a họpụtara ịbụ okenye aghaghị ịbụ ndị gosipụtarala okwukwe ha ma jiri obi ha nile jeere Chineke ozi ruo ogologo oge tupu a họpụta ha. N’ihi ya, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwere ihe mere ha ga-eji tụkwasị ntụziaka na nduzi ndị okenye na-enye ha obi.

12. Olee ibu ọrụ ndị okenye nwere n’ọgbakọ?

12 Pọl gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, bụ́ nke mmụọ nsọ họpụtaworo unu ịbụ ndị nlekọta n’etiti ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Ọ bụ eziokwu na ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ taa bụ ndị a họpụtara ka ha “na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.” Ha kwesịrị iji ịhụnanya na-eme nke a, ọ bụghị ime ka a ga-asị na ọ bụ ha nwe ìgwè atụrụ ahụ. (1 Pita 5:2, 3) Ndị nlekọta kwesịrị ịgbalị ịdị na-ewuli “ìgwè atụrụ ahụ dum” elu ma na-enyere ha aka.

Ịnọgidesi Ike n’Ọgbakọ

13. Olee ihe nwere ike ime mgbe ụfọdụ n’ọgbakọ, n’ihi gịnịkwa?

13 Ndị okenye na ndị nile ọzọ n’ọgbakọ bụ ndị na-ezughị okè, n’ihi ya, site n’oge ruo n’oge, a ga na-enwe nghọtahie ma ọ bụ nsogbu, dị ka e nwere na narị afọ mbụ mgbe ndịozi ụfọdụ ka dị ndụ. (Ndị Filipaị 4:2, 3) Onye nlekọta ma ọ bụ onye ọzọ nwere ike ịgwa anyị okwu mkparị, ma ọ bụ okwu ọjọọ, ma ọ bụ kwuo ihe na-abụchaghị eziokwu. Ma ọ bụkwanụ anyị pụrụ iche na e nwere ihe megidere Akwụkwọ Nsọ na-emenụ, ma ya eyie ka n’agbanyeghị na ndị okenye maara banyere ya, ha achọghị ime ihe ọ bụla. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na e doziela nsogbu ahụ ma ọ bụ ya abụrụ na a na-edozi ya n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, ma anyị amaghị otú e si na-edozi ya. Ma ọ bụrụgodị na ihe ahụ na-emenụ megidere Akwụkwọ Nsọ, tụlee ihe a: Ruo oge ụfọdụ, otu oké ihe ọjọọ nọ na-eme n’ọgbakọ dị na Kọrint, bụ́ ọgbakọ Jehova ji kpọrọ ihe. Ka oge na-aga, Jehova mere ka e dozie ihe ọjọọ ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (1 Ndị Kọrint 5:1, 5, 9-11) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘A sị na m bi na Kọrint n’oge ahụ, olee ihe m gaara eme mgbe ahụ ihe ahụ mere?’

14, 15. Gịnị mere ụfọdụ ji kwụsị iso Jizọs, oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị?

14 Tụlee ihe ọzọ pụrụ ime eme n’ọgbakọ. Ka e were ya na mmadụ aghọtaghị otu ihe e ziri site n’Akwụkwọ Nsọ, ya esiekwara onye ahụ ike ikwere ihe ahụ. O nwere ike ịbụ na onye ahụ emeela nnyocha na Bible na n’akwụkwọ ndị ọgbakọ bipụtara, gakwurukwa Ndị Kraịst ibe ya tozuru okè ka ha nyere ya aka, ọbụna ndị okenye. N’agbanyeghị nke ahụ, ya aka siere ya ike ịghọta ma ọ bụ ikwere ihe ahụ. Olee ihe onye ahụ nwere ike ime? Ụdị ihe ahụ mere n’ihe dị ka otu afọ tupu Jizọs anwụọ. Ọ sịrị na ya bụ “achịcha nke ndụ” na ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịdị ndụ ebighị ebi na o kwesịrị ‘iri anụ ahụ́ nke Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya.’ Okwu ahụ wụrụ ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya akpata oyi n’ahụ́. Kama ha ịchọwa ka a kọwaara ha ihe ọ pụtara ma ọ bụ jiri okwukwe nwee ndidi, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya ‘kwụsịrị iso [Jizọs] na-ejegharị.’ (Jọn 6:35, 41-66) Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị nọ n’ebe ahụ, gịnị ka anyị gaara eme?

15 N’oge anyị, ụfọdụ apụọla n’ọgbakọ, chee na ha ga-efe Chineke n’onwe ha. Ha nwere ike ikwu na ọ bụ n’ihi na e mejọrọ ha, na ha chere na ọ dị ihe ọjọọ a na-emezighị, ma ọ bụ na ọ dị ozizi ha na-anabataghị. Ihe ha mere ò ziri ezi? Ọ bụ ezie na Onye Kraịst ọ bụla na Chineke nwere ike ịdị ná mma, anyị kwesịkwara ịmata na ọ na-eji ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ eme ihe, dị ka o si jiri ya mee ihe n’oge ndịozi. Ọzọkwa, Jehova ji ọgbakọ ndị dị na narị afọ mbụ mee ihe ma gọzie ha, mee ka e nwee ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru ihe a chọrọ iji nyere ọgbakọ dị iche iche aka. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa.

16. Ọ bụrụ na a nwaa mmadụ ọnwụnwa ịhapụ ọgbakọ, olee ihe ndị o kwesịrị ichebara echiche?

16 Ọ bụrụ na Onye Kraịst echee na mmekọrịta ya na Chineke zuuru ya, ọ na-ajụ ndokwa Chineke mere—nke bụ́ ka ndị ya nwee ọgbakọ zuru ụwa ọnụ na ọgbakọ n’ógbè dị iche iche. Onye ahụ nwere ike fewezie Chineke otú o si chọọ ma ọ bụ soro mmadụ ole na ole na-efe ofufe, ma, oleekwanụ ebe ha ga-esi nweta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi? Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na mgbe Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi ma kwuo ka a gụọkwa akwụkwọ ozi ahụ na Leodisia, o kwuru banyere ịbụ ndị “gbanyere mkpọrọgwụ na ndị a na-ewuli elu n’ime [Kraịst].” Ndị ga-erite uru na nke a bụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ, ọ bụghị ndị hapụrụ ọgbakọ.—Ndị Kọlọsi 2:6, 7; 4:16.

Ogidi na Ihe Nkwado nke Eziokwu

17. Gịnị ka 1 Timoti 3:15 na-akụziri anyị banyere ọgbakọ?

17 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara Timoti bụ́ Onye Kraịst nke bụ́kwa okenye, o depụtara ihe ndị a chọrọ n’aka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ dị iche iche. Ozugbo Pọl desịrị nke ahụ, o kwuru banyere “ọgbakọ nke Chineke dị ndụ,” kwuokwa na ọ bụ “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Ọgbakọ nke Ndị Kraịst nile e tere mmanụ bụ n’ezie ogidi dị otú ahụ na narị afọ mbụ. O dokwara anya na ebe bụ́ isi Ndị Kraịst n’otu n’otu ga-esi nweta eziokwu dị otú ahụ bụ n’ọgbakọ ha dị iche iche. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha ga-anụ ka a na-akụzi eziokwu ma na-akọwa ya, ebe a ga-anọ ewuli ha elu.

18. Gịnị mere ọmụmụ ihe ji dị nnọọ mkpa?

18 N’otu aka ahụ, ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ bụ ezinụlọ Chineke, “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” Anyị ịgachi ọmụmụ ihe anya na isonye n’ihe ndị a na-eme n’ọmụmụ ihe n’ọgbakọ anyị bụ ụzọ bụ́ isi anyị si na-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke na-esi ike, ma na-akwadebe onwe anyị ime uche ya. Mgbe Pọl na-edegara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ ozi, o lekwasịrị anya n’ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe ndị dị otú ahụ. O dere na ya chọrọ ka ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe ha doo anya ma kwe nghọta, ka e wee ‘wulie ndị bịara ọmụmụ ihe elu.’ (1 Ndị Kọrint 14:12, 17-19) A pụrụ iwuli anyị elu taa ma ọ bụrụ na anyị aghọta na ọ bụ Jehova Chineke nyere iwu ka e nwee ọgbakọ dị iche iche, nakwa na ọ na-akwado ọgbakọ ndị ahụ.

19. Gịnị mere ị ga-eji kelee Chineke maka ọgbakọ gị?

19 Ee, ọ bụrụ na anyị chọrọ ito eto dị ka Ndị Kraịst, anyị aghaghị ịnọgide n’ọgbakọ. Ọgbakọ abụrụwo ihe nchebe pụọ n’ozizi ụgha dị iche iche, Chineke na-ejikwa ya eme ihe iji hụ na e kwusara ozi ọma banyere Alaeze Mezaịa ya n’ụwa nile. O doro anya na Chineke arụzuwo ọtụtụ ihe site n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 3:9, 10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọkà mmụta Bible bụ́ Albert Barnes ghọtara na ntụziaka ahụ Jizọs nyere ka a “gwa ọgbakọ” pụrụ ịpụta “ndị e nyere ikike ileba anya n’okwu ndị dị otú ahụ—ndị na-anọchi anya chọọchị. N’ụlọ nzukọ ndị Juu, e nwere ndị okenye na-ekpe ikpe, bụ́ ndị a na-ewegara ikpe ndị dị otú a.”

Ì Chetara?

• Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-atụ anya na Chineke ga na-eji ọgbakọ arụ ọrụ n’ụwa?

• Olee ọrụ ndị okenye na-arụrụ ọgbakọ n’agbanyeghị na ha bụ ndị na-ezughị okè?

• Olee otú ọgbakọ gị si ewuli gị elu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem jere ozi dị ka òtù na-achị isi

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-anata ntụziaka ka ha wee nwee ike ịrụ ọrụ ndị ha nwere n’ọgbakọ