Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ihe Ndị A Tụrụ Anya Ha Na-emezughị

Mgbe Ihe Ndị A Tụrụ Anya Ha Na-emezughị

Mgbe Ihe Ndị A Tụrụ Anya Ha Na-emezughị

OBI ỌJỌỌ nwere ike ibilite n’alụmdi na nwunye ọ bụla, ma ọ bụrụgodị na nwoke na nwanyị ahụ bụ nnu na mmanụ mgbe ha ka na-akpa akpa. Ma olee otú ndị bụ́ nnu na mmanụ tupu ha alụọ ga-esi ghọọ nnọọ ókè na nwamba?

Bible na-ekwu na ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Isi ihe na-akpatakarị mkpagbu dị otú ahụ bụ ezughị okè mmadụ. (Ndị Rom 3:23) Ọzọkwa, o nwere ike ịbụ na di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ ha abụọ adịghị etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. (Aịsaịa 48:17, 18) Ma mgbe ụfọdụ, nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere ike ibu ihe ndị na-agaghị ekwe omume n’obi banye n’alụmdi na nwunye. Mgbe nke a mere, obere esemokwu pụrụ iduga ná nnukwu nsogbu.

Ihe Ndị Na-agaghị Ekwe Omume

O nwere nnọọ ike ịbụ na gị na di ma ọ bụ nwunye gị bu ọtụtụ ihe n’obi banye n’alụmdi na nwunye; ọtụtụ ndị na-ebu ihe ndị dị otú ahụ n’obi abanye n’alụmdi na nwunye. Jiri obere oge chee echiche banyere ụdị ndụ ị tụrụ anya ya. Ì so ná ndị na-enwetaghị ihe ha tụrụ anya ya n’alụmdi na nwunye ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ekwubila na nsogbu ahụ agaghị ekwe unu ndozi. Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ nwere ike inyere gị aka ime ka ihe guzozie. * (2 Timoti 3:16) Ka ọ dịgodị, ọ dị mma ka ị tụleghachi ihe ndị i bu n’uche banye n’alụmdi na nwunye.

Dị ka ihe atụ, ụfọdụ chere na ha na di ma ọ bụ nwunye ha ga na-egwuri egwú mgbe nile, dị ka a na-akọ n’akụkọ ifo. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i chere na gị na di ma ọ bụ nwunye gị ga na-anọkọ ọnụ ọtụtụ ugboro ma ọ bụ na unu ga na-eji nwayọọ edozi esemokwu unu mgbe nile dị ka ndị tozuru okè. Ọtụtụ chere na ha lụọ di ma ọ bụ nwunye, ọ gakwaghị adị ha mkpa inwe njide onwe onye n’ihe banyere mmekọahụ. Ebe ọ bụ na ihe ndị a nile nwere ike ịbụ ihe na-agaghị ekwe omume, ha ga-emerịrị ka ụfọdụ ndị nwee nkụda mmụọ.—Jenesis 3:16.

Ihe ọzọ a na-eche bụ́ nke na-agaghị ekwe omume bụ na alụmdi na nwunye ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. N’ezie, ịlụ di ma ọ bụ nwunye pụrụ iweta ọṅụ dị ukwuu. (Ilu 18:22; 31:10; Eklisiastis 4:9) Ma mmadụ ò kwesịrị ịtụ anya ka alụmdi na nwunye nanị dozie nsogbu nile? Ndị chere otú ahụ na-ahụ ihe ha na-atụtụghị anya ya mgbe ha lụchara!

Ihe Ndị E Bu n’Obi A Na-ekwupụtaghị Ekwupụta

Ọ bụghị ihe nile e bu n’obi banye n’alụmdi na nwunye bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Kama nke ahụ, ụfọdụ na-abụ ọchịchọ ndị bara uru. Ma ihe ụfọdụ a tụrụ anya ha nwere ike ịkpata nsogbu. Otu onye ndụmọdụ alụmdi na nwunye kwuru, sị: “M na-ahụ ebe di na nwunye na-eweso ibe ha iwe n’ihi na otu onye n’ime ha na-eche ka ibe ya meere ya otu ihe na-agụ ya agụụ, ebe ọ na-adịkwanụghị mgbe onye nke ọzọ maara na ihe dị otú ahụ na-agụ ya agụụ.” Iji ghọta otú nke a nwere ike isi mee, tụlee ihe atụ na-esonụ.

Ngọzi lụrụ Chukwuma, bụ́ onye bi n’ebe dị ọtụtụ narị kilomita site n’obodo Ngọzi ha. Tupu ha alụọ, Ngọzi maara na ịkwaga ebe ọzọ ga-enyetụ ya nsogbu—karịsịa ebe ọ bụ onye ihere. Ma, obi siri ya ike na Chukwuma ga-enyere ya aka ime ka ebe ahụ mara ya ahụ́. Dị ka ihe atụ, Ngọzi chere na Chukwuma ga-anọdebe ya ma kọwaara ya ndị ndị enyi ya bụ. Ma, nke a abụghị ihe ọ na-ahụ. Chukwuma na ọtụtụ ndị enyi ya nọ na-akọrị ma na-achị—hapụkwanụ Ngọzi, bụ́ onye bịara ọhụrụ. Ngọzi nọ na-eche na ọ dịghị onye na-eche banyere ya, ọbụna na a jụrụ ya ajụ. Ọ na-ajụ onwe ya, sị: ‘Olee otú obi ga-esi fee Chukwuma azụ otú a?’

Ihe Ngọzi tụrụ anya ya ọ̀ bụ ihe na-agaghị ekwe omume? Anyị ekwesịchaghị ikwu otú ahụ. Nanị ihe ọ chọrọ bụ ka di ya nyere ya aka ime ka ebe ọhụrụ ahụ mara ya ahụ́. Ngọzi bụ onye ihere, ọ na-esikwara ya ike ịnọ n’etiti ọtụtụ ndị ọ na-amabughị. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịtụghị mgbe Ngọzi gwara Chukwuma ihe ọ na-eche. N’ihi ya, Chukwuma amaghị ihe na-enye Ngọzi nsogbu n’obi. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ adịgide? Iwe Ngọzi nwere ike ịrị elu, ka oge na-agakwa, o nwere ike iche na di ya anatụghị echebara ya echiche.

Ikekwe i nwewo nkụda mmụọ ma ọ bụ wee iwe mgbe o yiri ka di gị ma ọ bụ nwunye gị achọghị imere gị ihe na-agụ gị agụụ. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, olee ihe i nwere ike ime?

Kwupụta Ya Ekwupụta

Enwetaghị ihe ndị a tụrụ anya ha nwere ike inye nnọọ mmadụ nsogbu n’obi. (Ilu 13:12) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị ihe i nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ. Otu ilu Bible kwuru, sị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta.” (Ilu 16:23) N’ihi ya, ọ bụrụ na i nwere ezi ihe i chere na di gị ma ọ bụ nwunye gị emezubeghị, gị na ya kwurịta ya.

Gbalịa ịchọta oge kwesịrị ekwesị, ebe kwesịrị ekwesị, na okwu ndị kwesịrị ekwesị iji kwuo ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi. (Ilu 25:11) Jiri nwayọọ na nkwanye ùgwù gwa ya di gị ma ọ bụ nwunye gị. Cheta ihe bụ́ ebumnobi gị—ọ bụghị ịta di ma ọ bụ nwunye gị ụta kama ọ bụ ịgwa ya ihe ndị ị na-atụ anya ya na ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi.—Ilu 15:1.

N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji mee nke a? Di ma ọ bụ nwunye gị nke na-echebara gị echiche ọ́ gaghị enwe ike ịghọta mkpa gị? N’ezie, di ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ịdị na-ele ihe anya n’ụzọ dị iche, ma ọ ga-eji obi ụtọ tụlee echiche gị ma ị kọwaara ya ya. Ịgwa di ma ọ bụ nwunye gị ihe bụ́ mkpa gị ma ọ bụ ihe ị chọrọ apụtaghị na alụmdi na nwunye unu esighị ike, nke o jikwanụ apụta na obi fere di ma ọ bụ nwunye gị azụ.

N’ihi ya, egbula oge iso di ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, n’ọnọdụ ahụ anyị kwuru banyere ya na mbụ, Ngọzi nwere ike ịgwa Chukwuma, sị: “Ka m gwa gị eziokwu, ịnọ n’etiti ọtụtụ ndị m na-amabughị na-esitụrụ m ike. Ì nwere ike inye aka na-akọwara m mmadụ nile ruo mgbe ebe a maara m ahụ́?”

“Ịdị Ngwa Ịnụ Ihe”

Ugbu a lee okwu ahụ anya n’ụzọ ọzọ. Ka e were ya na di ma ọ bụ nwunye gị bịakwutere gị ma gwa gị na obi adịghị ya mma n’ihi na i mereghị ya ihe bara uru na-agụ ya agụụ. Ọ bụrụ na ọ gwa gị ihe dị otú ahụ, gee ya ntị! Anwala ịzọ isi gị. Kama nke ahụ, ‘dịrị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu, ghara ịdị ngwa n’inwe ọnụma.’ (Jems 1:19; Ilu 18:13) Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 10:24.

I nwere ike ime nke a site n’ịghọta otú obi dị di ma ọ bụ nwunye gị. Bible na-ekwu, sị: “Unu ndị bụ́ di, nọgidenụ soro [ndị nwunye unu] na-ebi n’otu ụzọ ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, ma ọ bụ dị ka e si sụgharịa ya ná nsụgharị J. B. Phillips, “unu ndị bụ́ di kwesịrị ịgbalị ịghọta ndị nwunye unu unu na ha bi.” (1 Pita 3:7) N’eziokwu, ndị bụ́ nwunye kwesịkwara ịgbalị ịghọta ndị di ha otú ahụ.

Chetakwa, n’agbanyeghị otú ihe si na-adabara gị na di ma ọ bụ nwunye gị, unu agaghị na-ele ihe nile anya n’otu ụzọ ahụ. (Lee igbe bụ́ “Ndị Nọ Otu Ebe Ma Na-ele Ihe Anya n’Ụzọ Dị Iche.”) N’ezie, nke a bara uru, n’ihi na ọ na-adị mma ile ihe anya otú onye ọzọ si ele ya. Gị na di ma ọ bụ nwunye gị bu ihe ndị dịgasị iche n’obi banye n’alụmdi na nwunye unu dabere n’ihe ndị dị ka omenala na ezinụlọ unu si na ya. N’ihi ya, unu nwere ike ịhụ nnọọ onwe unu n’anya ma ihe unu tụrụ anya ya n’ihe ụfọdụ adịrịta iche.

Dị ka ihe atụ, ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst pụrụ ịma ụkpụrụ Bible metụtara idu ndú nke ọma. (Ndị Efesọs 5:22, 23) Ma olee kpọmkwem otú a ga-esi na-edu ndú n’ezinụlọ unu, oleekwa otú mmadụ ga-esi na-edo onwe ya n’okpuru onye na-edu ndú? Ụkpụrụ Bible a ọ̀ na-eduzi unu abụọ, ùnu na-etinyekwa ezi mgbalị ịgbaso ya?

Unu pụkwara inwe echiche dịgasị iche ma a bịa n’ihe ndị ọzọ a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. Ònye ga-arụ ọrụ ụfọdụ dị n’ụlọ? Olee mgbe unu ga-ewepụta oge iji soro ndị ikwu unu nọkọọ, oge hakwa aṅaa ka unu ga-ewepụta iji soro ha nọkọọ? Olee otú Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ga-esi gosi na ha na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ha? (Matiu 6:33) A bịa n’ihe metụtara ego, ọ dị mfe ịba n’ụgwọ, n’ihi ya, ọ bara uru izere ịzụ ihe ndị na-adịghị mkpa na ịchọpụta otú a ga-esi zere imefusị ego. Ma, olee kpọmkwem ihe izere ịzụ ihe ndị na-adịghị mkpa na ịchọpụta otú a ga-esi zere imefusị ego pụtara? Ọ dị mkpa ka unu jiri nkwanye ùgwù kwurịta ihe ndị a otú ọ dị unu n’obi, n’ihi na ikwurịta ha ga-abara unu uru.

Nkwurịta okwu ndị dị otú ahụ nwere ike inyere unu aka inweta udo ka ukwuu n’alụmdi na nwunye unu, n’agbanyeghị na ka ọ dị ugbu a, di gị ma ọ bụ nwunye gị emezubeghị ihe ụfọdụ ị tụrụ anya ha. N’ezie, ọ ga-eme ka unu nwekwuo ike itinye ndụmọdụ Pọl onyeozi n’ọrụ, nke bụ́: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, nwere ọtụtụ ndụmọdụ ga-abara ndị lụrụ di na nwunye uru.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

NDỊ NỌ OTU EBE MA NA-ELE ANYA N’EBE DỊGASỊ ICHE

“Cheedị echiche otu ìgwè ndị njem na-ekiri otu mbara ala mara mma. Ọ bụ ezie na ndị nọ n’ìgwè ahụ na-ahụ otu ihe nkiri ahụ, onye ọ bụla na-ahụ ya n’ụzọ dị iche. N’ihi gịnị? N’ihi na onye nke ọ bụla nwere ụzọ dị iche o si ele ihe anya. Ọ dịghị mmadụ abụọ na-eguzo kpọmkwem n’otu ebe. Ọzọkwa, ọ bụghị mmadụ nile na-elekwasị anya n’otu akụkụ nke ihe nkiri ahụ. Onye ọ bụla na-achọta akụkụ dị iche nke na-akpali akpali karịsịa. Nke ahụ bụkwa eziokwu n’ime alụmdi na nwunye. Ọbụna mgbe ha kwekọrọ onwe ha nke ukwuu, ọ dịghị mmadụ abụọ na-enwe kpọmkwem otu echiche n’ihe. . . . Nkwurịta okwu gụnyere mgbalị ịchịkọta ọdịiche ndị a n’ime mmekọrịta nke otu anụ ahụ. Nke a chọrọ iwepụta oge ikwurịta okwu.”—Ụlọ Nche, August 1, 1993, peeji nke 4.

[Igbe dị na peeji nke 11]

IHE I NWERE IKE IME UGBU A

• Tụleghachi ihe ndị i bu n’uche banye n’alụmdi na nwunye. Hà bụ ihe ndị ga-ekwe omume? Ị̀ na-achọ ihe karịrị akarị n’aka di ma ọ bụ nwunye gị?—Ndị Filipaị 2:4; 4:5.

• Gbalịa ka ị gbanwee ihe ndị ahụ ị tụrụ anya ha na-agaghị ekwe omume. Dị ka ihe atụ, kama ịsị, “Ọ dịghị ihe ga-eme ka anyị see okwu,” kpebie na ị ga-agba mbọ ịhụ na unu na-edozi esemokwu unu n’udo.—Ndị Efesọs 4:32.

• Gị na di ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe ndị ahụ ị tụrụ anya ha. Ikwurịta otú ihe dị unu n’obi bụ isi ihe dị mkpa n’ịmụta otú unu ga-esi na-ahụ onwe unu n’anya ma na-akwanyere onwe unu ùgwù.—Ndị Efesọs 5:33.

[Foto dị na peeji nke 9]

‘Dị ngwa n’ịnụ ihe’ na-enye di ma ọ bụ nwunye gị nsogbu n’obi