Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Nwere Nkwarụ Ma Ọ Gụrụ Ya Agụụ Ịrụ Ọrụ

O Nwere Nkwarụ Ma Ọ Gụrụ Ya Agụụ Ịrụ Ọrụ

O Nwere Nkwarụ Ma Ọ Gụrụ Ya Agụụ Ịrụ Ọrụ

MGBE mbụ ị hụrụ Leonardo, i nweghị ike ile ya anya dị ka onye na-ewu ihe owuwu. O nweghị aka abụọ, n’ihi na ihe ọghọm o nwere n’oge gara aga gbubiri ya aka abụọ. Ma n’agbanyeghị na Leonardo nwere nkwarụ, ọ rụsiri ọrụ ike n’ebe e wuru ihe owuwu n’Acajutla, nke dị n’El Salvador, dị ka i nwere ike ịhụ na foto a.

Iji soro n’iwu ihe owuwu ahụ, Leonardo mepụtara ngwá ọrụ nke ya. Ọ na-ewonye ógwè aka ya n’ihe ọ rụnyere na shọvel ya ma jiri ya na-ekunye ájá na baro. Ebe ọ bụ na o nweghị mkpụrụ aka ọ ga-eji jigide ihe, ọ rụnyere ihe dị gburugburu a na-ewonye aka na ya n’aka baro ahụ ka o wee nwee ike ịkwa ya n’onwe ya. Gịnị kpaliri ya iso wuo ihe owuwu a?

Leonardo chọrọ iso wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ ebe ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’obodo ya na-anọ efe ofufe. O nwere ọtụtụ ihe ọ ga-akụnye aka iji ghara iso rụọ ọrụ ahụ. Ọ na-arụ ọrụ ego na-anaghị enye ya ohere, nwee nkwarụ ma na-eje ozi n’ọgbakọ ya dị ka ohu na-eje ozi. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, ọ chọrọ ime ihe nile o nwere ike ime iji jeekwara Chineke ozi n’ebe ahụ a na-ewu ihe owuwu.

Ì nwere ụdị mmụọ Leonardo nwere n’ijere Chineke ozi? Kama ịkụnye aka ná nkwarụ ya iji ghara ịrụ ọrụ, Leonardo ji ọgụgụ isi ya mepụta ihe ndị ọ ga-eji rụọ ọrụ ndị ọ na-agaraghị enwe ike ịrụ. O ji ‘uche ya dum’ na-ejere Chineke ozi. (Matiu 22:37) Ma hà nwere nkwarụ ma ọ bụ na ha enweghị, ndị na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa nwere mmụọ nke inye onwe ha n’afọ ofufo. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa nzukọ ha, anyị na-akpọkwa gị ịbịa.