Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Soro Pọl Gaa Biria

Soro Pọl Gaa Biria

Soro Pọl Gaa Biria

Ọrụ nke ndị ozi ala ọzọ abụọ gara nnọọ nke ọma, ọtụtụ ndị ghọkwara ndị kwere ekwe. Otu ìgwè na-eme ihe ike wakpoziri ha. N’ihi ya, e mere otu mkpebi. Maka ọdịmma nke ọgbakọ ahụ e hiwere ọhụrụ na nke ndị ozi ala ọzọ ahụ, ha abụọ ga-apụ ozugbo, n’etiti abalị. Ọ bụ otú ahụ ka Pọl na Saịlas si gbapụ n’obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Tesalonaịka nke dị na Masedonia n’ihe dị ka afọ 50 O.A. Ha gawara ebe ọzọ ha ga-ekwusa ozi ọma—nke bụ́ obodo Biria.

DỊ KA ọ dị n’oge ochie, ọ bụrụ na onye ọbịa anọrọ ebe dị anya lee Biria (Véroia) n’oge a, ọ ga-ahụ obodo ahụ ka ọ nọ n’ala ala Ugwu Bermios ahịhịa ndụ jupụtara, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ. Biria dị ihe dị ka kilomita 65 site n’ebe ndịda nke akụkụ ọdịda anyanwụ Tesalonaịka ma dịrị ihe dị ka kilomita 40 site n’Oké Osimiri Aegean. Ugwu Olympus, bụ́ ebe a na-akọ n’akụkọ ifo na ọ bụ ebe chi ndị bụ́ isi n’ime ọtụtụ chi nke ndị Gris oge ochie bi, dị n’ebe ndịda ya.

Ndị na-amụ Bible maara Biria dị ka ebe Pọl kwusara ozi ọma ma mee ka ọtụtụ ndị ghọọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 17:10-15) Ka anyị tụleghachi ọgịga Pọl gara ebe ahụ ma leba anya n’akụkọ oge ochie nke obodo ahụ.

Akụkọ Obodo ahụ n’Oge Ochie

Ọ dịghị onye ji n’aka mgbe obodo Biria malitere. Ndị Masedonia chụpụrụ ndị mbụ biri na ya, nke nwere ike ịbụ agbụrụ ndị Frijia, n’ihe dị ka na narị afọ nke asaa T.O.A. Narị afọ atọ ka nke ahụ gasịrị, Masedonia bara ọgaranya, n’ihi ebe ndị Alexander Onye Ukwu meriri. E wuru agadaga ụlọ na mgbidi dị iche iche, wuokwara chi ndị bụ́ Zus, Atemis, Apollo, Atena, na chi ndị ọzọ ndị Gris na-efe, ụlọ nsọ.

Otu akwụkwọ na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ruo ọtụtụ narị afọ, Biria “bụ obodo dị mkpa ma n’ógbè ebe ọ dị ma n’ebe ndị ọzọ n’ebe ugwu Gris.” Obodo ahụ wuru nnọọ ewu karịsịa n’oge ọchịchị nke usoro ndị eze ikpeazụ chịrị Masedonia, bụ́ ndị ezinụlọ Antigonus (306-168 T.O.A.), bụ́ ndị ndị Rom mesịrị kwatuo.

Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru na mgbe ndị Rom meriri Eze Philip nke Ise n’afọ 197 T.O.A., “a kwaturu ọchịchị dịbu ebe ahụ, Rom ghọkwara nanị ọchịchị e nwere n’ebe ọwụwa anyanwụ Mediterenian.” N’afọ 168 T.O.A., n’obodo Pydna, nke dị kilomita ole na ole site n’ebe ndịda Biria, otu ọchịagha Rom meriri onye ọchịchị ikpeazụ nke Masedonia oge ochie, bụ́ Perseus, ajọ mmeri. Ike ọchịchị ụwa bụ́ Rom nọchiri nke Gris, dị ka Bible buru n’amụma. (Daniel 7:6, 7, 23) Mgbe agha ahụ gasịrị, Biria so n’obodo ndị mbụ dị na Masedonia chịliiri Rom aka elu.

Na narị afọ nke mbụ T.O.A., Masedonia ghọrọ ọgbọ agha n’etiti Pompey na Julius Siza. N’ezie, Pompey wuru isi obodo ya na isi ụlọ ọrụ ndị agha ya n’ógbè Biria.

Otú Ha Mere n’Oge Ọchịchị Ndị Rom

N’oge Pax Romana, ma ọ bụ Udo Rom, ndị letara Biria hụrụ okporo ámá ndị e ji okwute rụọ, bụ́ ndị ogidi ndị a wụrụ awụ dịcha n’akụkụ. Obodo ahụ nwere ebe ọhaneze na-asa ahụ́, ebe ihe nkiri, ọ́bá akwụkwọ, na ebe ndị a na-anọ alụ ọgụ ọnwụ. Obodo ahụ nwere mmiri pọmpụ na ọwa mmiri ndị gara n’okpuru ala. Biria ghọrọ ebe na-ewu ewu dị ka ebe ndị na-achụ nta ego, ndị ọrụ nkà, na ndị na-eme egwuregwu na-abịa, ọhaneze na-abịakwa ebe ahụ ikiri egwuregwu na ihe ndị ọzọ. Ndị bịara abịa na-ahụ ebe ofufe ha ga-anọ mee ememe okpukpe ndị nke ha. N’ezie, obodo a nwere ụdị okpukpe nile e nwere n’ógbè nile Rom na-achị.

Ndị eze ukwu Rom e mere chi mgbe ha nwụrụ so na chi ndị a na-efe na Biria. O nwere ike nke ahụ abụghị ihe ijuanya nye ndị Biria n’ihi na ha efewela Alexander Onye Ukwu ofufe dị ka chi tupu e fewe ndị eze ukwu Rom ofufe. Otu akwụkwọ ndị Gris kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọ maala ndị Gris bi n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Alaeze Ukwu ahụ ahụ́ ife eze mgbe ọ ka dị ndụ, ha ji nnọọ obi ụtọ feekwa ndị eze ukwu Rom ofufe . . . Ná mkpụrụ ego ha, ha na-akpụnye eze ukwu dị ka chi, kpụọ ya ebe o kpu okpueze na-egbuke egbuke. Ha na-ekpegara ya ekpere otú ha si ekpegara chi ha, na-eji abụ efe ya ofufe.” E wuuru ya ebe ịchụàjà dị iche iche ma chụọrọ ya àjà na ha. Ndị eze ukwu na-abịadị ememe okpukpe ndị a na-eme n’obodo ahụ, bụ́ ndị na-agụnye asọmpi egwuregwu, nke ọrụ nkà, na nke edemede.

Olee ihe mere Biria ji bụrụ ebe ikpere arụsị hiwere isi? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka e nwere òtù Koinon nke ndị Masedonia. Nke ahụ bụ òtù nke nwere ndị nnọchiteanya nke obodo ndị dị na Masedonia. Ndị nnọchiteanya a na-ezukọ na Biria mgbe mgbe iji kwurịta ihe ndị metụtara obodo dị iche iche na ógbè ahụ ma dozie okwu ndị dị otú ahụ dabere ná ntụziaka nke Rom. Otu n’ime ọrụ ndị bụ́ isi òtù Koinon na-arụ bụ ilekọta ememe okpukpe ndị a na-eme n’alaeze ukwu ahụ.

Ọ bụ otú a ka obodo Pọl na Saịlas gara mgbe ha si na Tesalonaịka gbapụ dị. N’oge ahụ, ndị Rom ebichiela Biria ruo narị afọ abụọ.

Otú Ozi Ọma Si Ruo Biria

Ebe Pọl malitere ozi ya na Biria bụ n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’obodo ahụ. Hà nabatara ya? Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị Juu nọ n’ebe ahụ “nwere obi sara mbara karịa ndị nọ na Tesalonaịka, n’ihi na ha ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu ahụ, jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.” (Ọrụ 17:10, 11) Ebe ọ bụ na ha “nwere obi sara mbara,” ha akpọghị ekwe nkụ nọgide n’omenala ha. Ọ bụ ezie na a na-agwa ha ihe ndị ha na-anụtụbeghị, ha enyoweghị ha enyowe ma ọ bụ wewe iwe. Kama ịjụ ozi Pọl wetaara ha, ha gere ya ntị, jiri obi ọcha nụ ihe ọ na-ekwu.

Olee otú ndị Juu ahụ ga-esi mara na ihe Pọl na-akụziri ha bụ eziokwu? Ha nyochara ihe ndị ha nụrụ site n’inyocha ma ò kwekọkwara n’ihe dị n’akwụkwọ a kasị tụkwasị obi. Ha ji nlezianya na ịdị uchu nyochaa Akwụkwọ Nsọ. Ọkà mmụta Bible bụ́ Matthew Henry kwubiri, sị: “Ebe ọ bụ na ihe ndị Pọl gwara ha sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ya agwakwa ha na ihe ndị o kwuru sitere n’Agba Ochie, ha nyochara Bible ha, gụọ ebe ndị ọ kpọtụrụ uche, gụọ ihe ndị gbara ebe ndị ahụ gburugburu, tụlee ihe ndị ha pụtara, jiri ha tụnyere ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ, lee ma ezi uche ọ̀ dị n’ihe ndị Pọl kwubiri dabere na ha na arụmụka ndị o ji ha rụọ, ma kpebizie ma hà ga-ekwere ka ọ bụ na ha agaghị ekwe.”

Ha eleghị ihe ndị a anya otu ugboro ma nakwere ha. Ndị Biria nọgidere jiri ịdị uchu na-amụ ihe, ha amụghị ihe nanị n’Ụbọchị Izu Ike.

Cheekwa echiche banyere ihe si na ya pụta. Ọtụtụ ndị Juu bi na Biria nabatara ozi ya ma ghọọ ndị kwere ekwe. Ọtụtụ ndị Gris, nke nwere ike ịgụnye ndị nke na-eso ụzọ ndị Juu, ghọkwara ndị kwere ekwe. Ma nke a emeghị na nzuzo. Mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ ya, ha gbagara Biria “iji kpalie ma kpasuo ọha mmadụ.”—Ọrụ 17:4, 12, 13.

A manyere Pọl ịhapụ Biria, ma ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’ebe ọzọ. Nke ugbu a, ọ banyere ụgbọ mmiri na-aga Atens. (Ọrụ 17:14, 15) N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihi ọrụ ọ rụrụ na Biria, Iso Ụzọ Kraịst gbanyere mkpọrọgwụ n’ebe ahụ. Iso Ụzọ Kraịst ka na-amịkwa mkpụrụ n’ebe ahụ taa.

Ee, a ka nwere ndị bi na Biria (Véroia) bụ́ ndị ji nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ iji ‘nwapụta ihe nile’ ma ‘jisie aka ike’ n’ihe ziri ezi. (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ọgbakọ abụọ nke Ndịàmà Jehova dị n’obodo ahụ na-ekwusa ozi ọma, dị ka Pọl mere, na-ezi ndị ọzọ ozi ndị sitere na Bible. Ha na-achọta ndị obi ha ziri ezi ma soro ha tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ, na-ekwe ka Bible na-achịkwa ndị nile chọrọ ịmata Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ.—Ndị Hibru 4:12.

[Map dị na peeji 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ebe ụfọdụ Pọl gara na njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ

MISHIA

Troas

Neapọlis

Filipaị

MASEDONIA

Amfipọlis

Tesalonaịka

Biria

GRIS

Kọrint

Atens

AKEA

ESHIA

Efesọs

RODS

[Foto dị na peeji nke 13]

Mkpụrụ ego ọlaọcha ebe a kpụnyere Alexander Onye Ukwu dị ka chi ndị Gris

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mkpụrụ ego: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 14]

Ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’ógbè ndị Juu na Biria (Véroia)

[Foto dị na peeji nke 15]

Ụlọ nzukọ ochie nke ndị Juu na Biria (Véroia) nke oge a