Ubi ‘Chara Acha Maka Owuwe Ihe Ubi’
Ubi ‘Chara Acha Maka Owuwe Ihe Ubi’
Ógbè Guajira Mmiri Gbara Gburugburu dị n’ọnụ ọnụ ebe ugwu nke Ebe Ndịda America. Ọ dị n’ebe ugwu Colombia ma dịrị n’ebe ọdịda anyanwụ nke Venezuela. Oké anwụ na ụkọ mmiri ozuzo na-akpa ógbè a fọrọ obere ka ọ bụrụ ọzara aka ọjọọ, okpomọkụ dị na ya na-erukwa degree Celsius 43 mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị okpomọkụ dị ebe a, ndị obodo a na-arụsi ọrụ ubi ike ma na-arụpụta ihe. Ikuku na-adịghị akwụsị akwụsị na-esi n’oké osimiri na nke na-esi n’ebe ugwu nke ebe ọwụwa anyanwụ eku n’ebe ahụ na-eme ka okpomọkụ dị ebe ahụ ghara ịkarị akarị, bụ́ nke na-eme ka o kwe ndị ọbịa omume ikiri ebe ndị na-adọrọ mmasị na ụsọ osimiri ndị mara mma.
ANYỊ na-anabata gị n’ala ndị Wayuu Indian. E nwere ndị Wayuu narị puku atọ na ise, otu narị puku na iri puku atọ na ise n’ime ha bikwa na Colombia. Agbụrụ a ebiela ebe a ogologo oge tupu ndị Spen amalite ịchị ya.
Ọrụ ndị bụ́ isi ndị Wayuu na-arụ bụ ịkpa anụ ụlọ na ịrụ ọrụ ugbo. Ha na-akụkwa azụ ma na-eso ndị mba ha na ha gbara agbata obi azụkọrịta ahịa. Ụmụ nwanyị ha bụkwa aka ochie n’ikwe ákwà ndị tụrụ àgwà ndị mara mma, ndị ọbịa na-agbapụkwa ha nnọọ aka ahịa.
E ji ikwu eziokwu na ile ọbịa mara ndị Wayuu. Ma, ha onwe ha kwa bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Ịda ogbenye bụ otu n’ime nsogbu ndị kasị njọ ha nwere, bụ́kwanụ nke na-akpata nsogbu ndị ọzọ, dị ka agụghị akwụkwọ, enyeghị ụmụaka ezigbo nri, enweghị ezigbo ụlọ ọgwụ nakwa, n’ebe ụfọdụ, nnupụisi nke ndị na-eto eto.
Ruo ọtụtụ afọ, chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ezipụla ndị ozi ala ọzọ ha ịga biri n’etiti ndị Wayuu. N’ihi ya, ihe ka ọtụtụ n’ụlọ akwụkwọ ha ndị na-azụ ndị nkụzi na ụlọ akwụkwọ ndị nwere ụlọ obibi dị n’aka ndị chọọchị. Ọtụtụ ndị Wayuu anabatala ihe ndị a sịrị na ha bụ omenala Ndị Kraịst, dị ka ife ihe oyiyi ofufe na ime ụmụaka baptizim, ma ha ka nwere nkwenkwe ụgha dị iche iche ma na-eme omenala ndị dabeere na ha.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Wayuu na-atụ egwu Chineke ma na-anabata nnọọ eziokwu Bible Ndịàmà Jehova na-akụzi. N’ihe dị ka afọ 1980, e nwere nanị ndị Wayuu asaa bụ́ Ndịàmà na Guajira, atọ n’ime ha bikwa na Ríohacha, bụ́ isi obodo ahụ. Ndịàmà bụ́ ụmụ amaala na ndị nkwusa 20 ndị ọzọ kwusara ozi ọma Alaeze ebe ahụ n’asụsụ Spanish.
Ozi Ọma n’Asụsụ nke Ha
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Wayuu bi na Ríohacha na-asụ obere Spanish na asụsụ ala nna ha, bụ́ Wayuunaiki. Na mbụ, ọ dịchaghị ihe nkwusa nke
ozi Alaeze rụpụtara ebe ahụ. O yiri ka ndị obodo ahụ hà na-eze ndị arijunas, bụ́ ihe ha na-akpọ ndị na-abụghị ndị Wayuu, eze. Ihe ka ọtụtụ ná ndị Wayuu na-abụ Ndịàmà bịa na nke ha, ha asụwa asụsụ obodo ha kama ịsụ Spanish. Nanị ihe Ndịàmà ahụ ga-eme bụ ịgafe n’ụlọ ọzọ.Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ afọ 1994, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ezigawo otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụ ndị na-akụzi Bible oge nile, ịga jee ozi n’Ọgbakọ Ríohacha. Ndị ọsụ ụzọ ahụ gwara otu Onyeàmà bụ́ onye Wayuu ka ọ kụziere ha asụsụ Wayuunaiki. Mgbe ndị ọsụ ụzọ ahụ butatụrụ ihe ole na ole ha nwere ike ikwu ma ha gaa ozi ọma n’isi, ha gawara ozi ọma n’ókèala ahụ ma hụ na àgwà ndị nwe ụlọ agbanweela nnọọ. N’agbanyeghị na ndị nkụzi Bible ahụ na-egbuja asụsụ Wayuunaiki egbuja, o juru ndị ha gara na nke ha anya na ha na-asụ asụsụ ha, ha gekwara ha ntị, mgbe ụfọdụ ndị nwe ụlọ ewerezie obere Spanish ha ma soro ha kwurịta nnọọ okwu mgbe ha hụrụ na asụsụ Wayuunaiki agbagidela ndị ahụ bịara izi ha ozi ọma!
‘Ubi Chara Acha Maka Owuwe Ihe Ubi’
Pọl onyeozi ji ọrụ ime ndị na-eso ụzọ Ndị Kraịst na-arụ tụnyere ịkụ ihe n’ubi, bụ́kwanụ ihe atụ ndị Wayuu bụ́ ndị ọrụ ugbo na-aghọta nke ọma. (1 Ndị Kọrint 3:5-9) N’ụzọ ihe atụ, ubi ndị Wayuu “achawo [nnọọ] maka owuwe ihe ubi.”—Jọn 4:35.
Neil, bụ́ onye Wayuu Indian nke bi na Manaure, nwere otu ọrịa kemgbe a mụrụ ya. Ebe ọ bụ na Neil na-ata Chineke ụta maka ọrịa ya, o nwere nkụda mmụọ nke na ọ chọrọ igbu onwe ya. Otu Onyeàmà nke kpebiri ikwusakwa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ka ọ na-aga n’obodo dị iche iche maka ọrụ ego ya gwara Neil okwu banyere Alaeze Jehova. Neil dị nanị afọ 14 mgbe ahụ. Mgbe Onyeàmà ahụ hụrụ mmasị Neil, ọ malitere ịmụrụ ya Bible. Obi tọrọ Neil ụtọ ịmata àgwà ọma ndị Jehova nwere, bụ́ nke mere ka o kweta na ọ bụghị Chineke kpatara ahụhụ ọ na-ata. O metụrụ ya nnọọ n’ahụ́ mgbe ọ gụrụ banyere nkwa Chineke kwere iweta paradaịs n’ụwa, bụ́ ebe ọrịa na-agaghị adị!—Aịsaịa 33:24; Matiu 6:9, 10.
N’oge ahụ, ezinụlọ Neil na ezinụlọ ọzọ nọ n’iro. Ndị ezinụlọ Neil mere otu omenala ndị ọgọ mmụọ a na-eme n’obodo ha iji chebe onwe ha. Neil chetara, sị: “Na mbụ, ụjọ ekweghị m ịgwa ndị ezinụlọ anyị banyere okpukpe ọhụrụ m chọtara, karịsịa ndị nke okenye n’ezinụlọ anyị, bụ́ ndị a na-akwanyere nnọọ ùgwù.” Iwe were nne na nna Neil mgbe ha nụrụ na o kwekwaghị na nkwenkwe ndị na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ nakwa na ọ gaghị eso eme omenala ndị ọgọ mmụọ. Neil kwagaziri Ríohacha ma malite iso ọgbakọ dị ebe ahụ amụ ihe. E mesịrị mee ya baptizim. N’afọ 1993, a họpụtara ya ịbụ ohu na-eje ozi, afọ atọ ka nke ahụ gasịkwara, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge nile. Mgbe o ruziri na 1997, a họpụtara ya ịbụ okenye ọgbakọ. N’afọ 2000, ọ mụbara ozi ya ma ghọọ ọsụ ụzọ pụrụ iche.
Tụleekwa akụkọ Teresa, bụ́ onye Wayuu Ndịàmà malitere ịmụrụ Bible. Daniel, bụ́ nwoke ya na ya bi, kwara ya emo ma tie ya na ụmụ ha atọ ihe. N’agbanyeghị na o mesịrị kweta iso Teresa na-amụ Bible, ya na ndị enyi ya na-aṅụrọ anya ọtụtụ mgbe, mgbe ụfọdụ ṅụọ mmanya
ruo ụbọchị anọ ma ọ bụ ise. Iri nri ọnụ rara ezinụlọ ya ahụ́. Teresa nọgidere na-amụ ihe ma na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Nke a nyeere Daniel aka ịhụ mkpa ọ dị ịmụ Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị, otu n’ime ụmụ ha dabara ná mmiri ọkụ ma nwụọ n’ihi otú mmiri ọkụ ahụ si gbụsịa ya ahụ́. E wezụga oké iru újú Teresa nọ na ya n’ihi nwa ya nwụrụnụ, ndị ikwu na ibe ya nọkwa na-enye ya nsogbu ka o mee ememe olili ozu ndị megidere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ.N’oge ọjọọ ahụ, ọgbakọ dị nso n’ebe ahụ gbara mmadụ abụọ a ume site n’inyere ha aka na ịkasi ha obi. Mgbe e lisịrị nwa ha, ndị nọ n’ọgbakọ na-asụ Wayuu n’ógbè ahụ nọgidere na-eleta ha iji kasie ha obi. Mgbe Daniel hụrụ otú e si na-egosipụta ịhụnanya Ndị Kraịst, ọ gara n’ihu n’ọmụmụ ihe ya. Ọ kwụsịrị ịṅụbiga mmanya ókè na imegbu Teresa. Daniel na Teresa lụrụ, Daniel amalitekwa ilekọta ezinụlọ ya nke ọma. Ha nwere ọganihu n’ọgbakọ, e meekwa ha baptizim n’afọ 2003. Ha abụọ na-eduziri ọtụtụ ndị ọmụmụ Bible. N’ihi ezi àmà Teresa gbaara ndị ezinụlọ ya, ha na-egezi Ndịàmà ntị ma ha bịa na nke ha. Otu n’ime ụmụ nwanne Daniel aghọọla onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, abụọ ndị ọzọ na-amụ Bible ma na-aga ọmụmụ ihe ọgbakọ. Nwanne di Teresa nke nwanyị, bụ́ onye nwa ya nwụkwara n’ihe ọghọm, na ndị ezinụlọ ya egosiwo mmasị n’ịmụ Bible.
Ibipụta Akwụkwọ Ndị E Ji Amụ Bible n’Asụsụ Wayuunaiki
N’afọ 1998, e wepụtara broshuọ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! * n’asụsụ Wayuunaiki. Akwụkwọ a ghọrọ ngwá ọrụ bara uru n’inyere ndị Wayuu aka nakwa n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. N’afọ 2003, e mere ndokwa ịzụ ụmụnna ụfọdụ ịsụgharị akwụkwọ Ndịàmà Jehova gaa n’asụsụ Wayuunaiki. N’ihi nrụsi ọrụ ike nke otu ìgwè ndị nsụgharị nọ na Ríohacha, e bipụtakwuola broshuọ n’asụsụ ahụ, bụ́ nke merela ka ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ na-asụ Wayuunaiki rịa elu.
Kemgbe afọ 2001, a na-atụgharị ihe omume ụfọdụ ná mgbakọ distrikti gaa n’asụsụ Wayuunaiki. A na-ewuli okwukwe nke ndị a na-amụrụ Bible elu mgbe ha nụrụ ihe omume ndị ahụ n’asụsụ nke ha. Ha na-atụ anya mgbe a ga na-emekwa ihe nkiri ndị dabeere na Bible n’asụsụ Wayuunaiki.
Ubi Na-eme nke Ọma
Uribia bụ obodo dị ihe dị ka otu narị kilomita site n’ebe ugwu Ríohacha. Ọgbakọ Uribia Wayuu nwere ndị nkwusa Alaeze 16, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-agba mbọ ikwusakwuru ndị India bi n’ime ime obodo ozi ọma. Otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ahụ kwuru banyere otu njem ha mere ịga gbaa àmà n’ebe dị otú ahụ, sị: “Anyị gara n’otu ebe a na-azụ anụ ụlọ bụ́ nke nwere ihe dị ka ụlọ iri na abụọ bụ́ ndị nwere obere windo, uko ha adịkwa ala. E ji yotojolo, bụ́ okporo osisi a na-enweta n’osisi a na-akpọ cactus, tụọ ndo n’ihu ụlọ nke ọ bụla. Ndị bi ebe ahụ na ndị ọbịa ha na-anọ na ya ezere oké anwụ na-acha n’ebe ahụ. Obi dị anyị ụtọ ịhụ na ọtụtụ nwere nnọọ mmasị, n’ihi ya, anyị mere ndokwa ịlaghachi ma malite iduziri ha ọmụmụ Bible. Mgbe anyị laghachiri, anyị chọpụtara na ọtụtụ n’ime ha amaghị ka e si agụ na ka e si ede. Ha gwara anyị banyere otu ụlọ akwụkwọ e mechirila n’ihi ụkọ ego. Onye na-elekọta ụlọ akwụkwọ ahụ ji obiọma nye anyị ikike iji otu n’ime klas ndị dị na ya na-akụzi ka e si agụ na ka e si ede, na-ejikwa ya eduzi ọmụmụ Bible. Ndị Wayuu isii amụtawo ka e si ede na ka e si agụ ma na-aga n’ihu n’ọmụmụ Bible ha. Mmasị ha nwere na-eme anyị obi ụtọ, n’ihi ya, anyị na-eme ndokwa inwe ọmụmụ ihe n’ebe ahụ a na-azụ anụ.”
Ọtụtụ Ndịàmà na-abụghị ndị obodo ahụ amụtala asụsụ Wayuunaiki, e jikwa nnọọ enyemaka ha kpọrọ ihe. N’Ógbè Guajira Mmiri Gbara Gburugburu, e nwere ọgbakọ asatọ na ìgwè abụọ na-eji asụsụ a amụ ihe ugbu a.
A na-ahụ nnọọ ihe ndị na-egosi na Jehova na-agọzi mgbalị ndị a. O doro anya na ọ ka dị ọtụtụ ihe a ga-arụpụta site n’ikwusara ndị Wayuu ozi ọma. Ka ndị agụụ nke Okwu Chineke na-agụ na-aghọ Ndị Kraịst, obi na-esi anyị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Ka Jehova zipụkwuo ndị ọrụ n’ubi a nke ‘chaworo maka owuwe ihe ubi.’—Matiu 9:37, 38.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Map ndị dị na peeji 16]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
VENEZUELA
COLOMBIA
LA GUAJIRA
Manaure
Ríohacha
Uribia
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]
Ebe obibi ndị Wayuu nke dị n’okpuru: Victor Englebert