Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Dị Ezigbo Mkpa Karịa Ịkọwa Otú Ihu Ígwé Ga-adị

Ihe Dị Ezigbo Mkpa Karịa Ịkọwa Otú Ihu Ígwé Ga-adị

Ihe Dị Ezigbo Mkpa Karịa Ịkọwa Otú Ihu Ígwé Ga-adị

ỌFỌRỌ obere ka ọ bụrụ mba nile nwere ilu ha na-atụ banyere ihu ígwé. N’ebe ụfọdụ, e nwere ilu na-ekwu na ọ bụrụ na ihu ígwé achawa ọbara ọbara n’abalị ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na ihu ígwé achawa ọbara ọbara n’ụtụtụ, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri achịrị obi n’aka. Taa, ndị ọkà mmụta na-akọ banyere ihu ígwé na-ekwu ihe ụfọdụ ndị ha chere na-eme ihu ígwé ji agbanwe dị ka ilu ahụ si kwuo.

Oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị mmadụ makwaara nnọọ otú e si enyocha ihu ígwé ma kọwaa otú ụbọchị ga-adị. Jizọs gwara ụfọdụ ndị Juu, sị: “Mgbe o ruru uhuruchi, unu na-asịkarị, ‘Ihu ígwé gaje ịdị mma, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara’; n’ụtụtụ unu na-asịkwa, ‘Taa mmiri ga-eruju n’ígwé, oyi ga-adịkwa, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara, ma gbaa ọchịchịrị.’ Unu maara otú e si akọwa ọdịdị nke ígwé.” Jizọs gaziri n’ihu ikwu otu ihe dị ịtụnanya, sị: “Ma unu apụghị ịkọwa ihe ịrịba ama nke oge ndị a.”—Matiu 16:2, 3.

Gịnị bụ ihe “ịrịba ama nke oge ndị a”? Ha bụ ihe ndị pụtara ìhè na-egosi na Jizọs bụ Mezaịa ahụ Chineke zitere. Ọrụ Jizọs na-arụ pụtara nnọọ ìhè dị ka ihu ígwé na-acha ọbara ọbara. Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu leghaara ihe ịrịba ama ndị ahụ na-egosi na Mezaịa ahụ abịala anya—nke bụkwanụ ihe dị ezigbo mkpa karịa ịkọwa otú ihu ígwé dị.

Taakwa, e nwere ihe ịrịba ama dị ezigbo mkpa ka a ghọta ya karịa ịkọwa otú ihu ígwé nkịtị si acha. Jizọs buru amụma na a ga-ebibi ajọ ụwa a ka e wee nwee ike inwe ụwa ka mma. O kwuru ọtụtụ ihe ndị ọ ga-abụ ha na-eme a mara na oge mgbanwe a ga-amalite eruola. Ụfọdụ n’ime ihe ndị a ga-eme bụ agha nke a ga na-alụ n’ụwa nile na ụnwụ nri. Jizọs kwuru na mgbe anyị hụrụ ihe ndị a ka ha na-eme, anyị mara na mgbe Chineke ga-abịa idozi ọnọdụ ụwa eruola nso.—Matiu 24:3-21.

Ị̀ na-ahụ “ihe ịrịba ama nke oge ndị a”?